Ị̀ Na-akwanyere Ebe Ofufe Gị Ùgwù?
“Site na mgbe oziọma ahụ di ọhụrụ, ndị Kraịst anọgidewo na-enwe ebe eguzobere ma kpebie a ga na-anọ maka ofufe nke Chineke.”—“Primitive Christianity,” nke William Cave dere.
NDỊ Chineke anọgidewo na-enwe obi ụtọ n’izukọ ọnụ maka ofufe. Nke a bụ eziokwu ugbu a dị ka ọ bụ na narị afọ mbụ. Ndị oge ochie na-ede ihe na ndị ọkà mmụta okpukpe, dị ka Lucian, Clement, Justin Martyr, na Tertullian, ha nile kwenyere na ndị Kraịst nwere kpọmkwem ebe dị iche iche ha na-ezukọ iji fekọọ ofufe ọnụ n’ụzọ chiri anya.
Bible na-ewepụtakwa otu isi ihe ahụ, na-arụtụ aka ọtụtụ ugboro ná nzụkọ a na-enwe kwa mgbe nke ìgwè dị iche iche nke ndị Kraịst mere. A maara ìgwè ndị a dị ka ọgbakọ. Nke a kwesịrị ekwesị n’ihi na okwu ahụ bụ́ “ọgbakọ” n’asụsụ ndị mbụ nke Bible nwere echiche nke ndị zukọrọ ọnụ maka otu nzube ma ọ bụ ọrụ.
Ebe Ofufe Dị Iche iche nke Ndị Kraịst n’Oge Ochie
Gịnị ka ndị Kraịst narị afọ mbụ na-eme mgbe ha zukọrọ ọnụ? Bible kọwara ọtụtụ n’ime nzukọ ahụ ma gosi na izi ihe bụ otu akụkụ dị mkpa. (Ọrụ 2:42; 11:26; 1 Ndị Kọrint 14:19, 26) A haziri usoro izi ihe, ya na okwu dị iche iche, ịkọ ahụmahụ ndị na-agba ume, na iji nlezianya tụlee akwụkwọ ozi nke a na-atara n’aka òtù na-achị isi nọ na Jerusalem ma ọ bụ site n’aka otu onyeozi.
N’Ọrụ Ndị Ozi 15:22-35, anyị na-agụ na mgbe a gụsịrị otu n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ nye ndị Kraịst nọ n’Antiọk, Judas na Sailas “weere ọtụtụ okwu kasie ụmụnna ahụ obi, mekwa ka obi ha guzosie ike.” Ihe ndekọ ọzọ kwuru na mgbe Pọl na Banabas rutere n’Antiọk “meekwa ka nzukọ Kraịst zukọta, ha wee kọọrọ ha ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke Chineke sooro ha mee.” Ikpegara Jehova ekpere bụkwa otu akụkụ dị mkpa nke nzukọ ndị Kraịst.—Ọrụ 14:27.
Ebe dị iche iche ọgbakọ narị afọ mbụ zukọrọ maka ofufe abụghị ụlọ dị ukwuu dị ka nke ọtụtụ chọọchị Krisendọm taa. N’ihe ka ọtụtụ, ndị Kraịst oge ochie zukọrọ n’ebe obibi ndị mmadụ. (Ndị Rom 16:5; 1 Ndị Kọrint 16:19; Ndị Kọlọsị 4:15; Faịlimon 2) Mgbe mgbe a na-ejikarị ụlọ elu dị n’elu ụlọ ma ọ bụ n’ime ụlọ dị n’elu ụlọ nke ebe obibi mmadụ eme ihe. Ọ bụ n’ụlọ elu dị n’elu ụlọ ka a nọ mee Nri Anyasị Onyenwe anyị. Ọ bụkwa n’ime ụlọ dị n’elu ụlọ ka a nọ jiri mmụọ nsọ tee 120 ndị na-eso ụzọ mmanụ na Pentikọst.—Luk 22:11, 12, 19, 20; Ọrụ 1:13, 14; 2:1-4; 20:7, 9.
Taa, Ndịàmà Jehova na-agbaso ụkpụrụ ahụ ndị ozi guzobere. Ha na-eji ebe ezumezu dị iche iche a ma dị ka Ụlọ Nzụkọ Alaeze eme ihe. A na-enye ha ọzụzụ n’ebe ahụ dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) N’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha na-amụkwa Akwụkwọ Nsọ, kpeekwa ekpere, ma na-agbarịta ibe ha ume. Nke a kwekọrọ na ndụmọdụ Bible ahụ dị ná Ndị Hibru 10:24, 25: “Ka anyị na-atụgharịkwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-adụsị ndị ọzọ ọdụ ike; ka anyị mee karị kwa otú a, n’ụzọ ha otú unu na-ele ụbọchị ahụ anya ka ọ na-abịaru nso.”
Iji Ebe Anyị Na-efe Ofufe Eme Ihe N’ụzọ Kwesịrị Ekwesị
Ị̀ na-echeta okwu Pọl onyeozi: “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo” na “Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro”? Ọ bụrụ na i nyochaa echiche ndị gbara okwu ndị a gburugburu, ị ga-achọpụta na Pọl na-ekwu banyere ụzọ e kwesịrị isi duzie nzukọ ndị Kraịst. Dị ka n’oge ndị ozi, ndị Kraịst taa na-ejide n’aka na ebe ha na-ezukọ dị n’usoro ma bụrụ nke a haziri nke ọma.—1 Ndị Kọrint 14:26-40.
Mbipụta Ụlọ Nche nke October 15, 1969 (Bekee) kwuru, sị: “Ọnọdụ ime mmụọ nke dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ nke ezie, na-esite n’ezi mmasị n’ezi ofufe na n’izi ihe nke Bible. Gburugburu ụlọ nzukọ ahụ na-egbuke egbuke na-agbakwa ndị bịaranụ ume ịdị na-emesapụ ahụ ma na-eme omume enyi, n’abụghị ndị a kpọchibidoro n’ememe okpukpe dị omimi.” N’ezie a ga-enwekwa nlezianya ka iji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe bụrụ nke na-egosipụta nsopụrụ na ùgwù.
Krisendọm egosipụtawo oké enweghị nsọpụrụ n’akụkụ a. Ụfọdụ nzukọ okpukpe na-eji ebe ha na-efe ofufe eme ihe dị ka ọgbọ ntụrụndụ nke obodo. Ha na-enwe ihe ngosi nke ndị na-akụ egwú rock nke okpukpe, ọnụ ụlọ maka ibuli ígwè dị arọ dị ka ihe mmega ahụ, table a na-akụ billiard, ụlọ akwụkwọ ọta akara, ụlọ sinima. Otu chọọchị nwere ịsọ mpi ịgba mgba dị ka otu n’ime ihe omume ha. Nke a ekwekọghị n’ụkpụrụ ndị ozi setịpụrụ ma ọlị.
Ọ bụrụ na ọgbakọ narị afọ mbụ ọ bụla mere omume n’ụzọ na-ezighị ezi, mgbazi olu kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị n’ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint na-eji ememe nke Nri Anyasị Onyenwe anyị eme ihe dị ka oge oriri na ọṅụṅụ. Ha ga-ebu nri abali ha bịa iri ya tupu ma ọ bụ mgbe e nwesịrị nzukọ ahụ, ụfọdụ ọbụna na-eribiga nri oké ma na-aṅụbiga mmanya oké. Nke a n’ezie ekwesịghị ekwesị. Pọl onyeozi degaara ha akwụkwọ, sị: “Ọ̀ ga-abụ na unu enweghị nnọọ ụlọ iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ n’ime ha?”—1 Ndị Kọrint 11:20-29.
N’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl, Ndịàmà Jehova na-agbalị ilekọta ihe onwe onye n’ebe obibi ma ọ bụ n’ebe ọzọ kama ịbụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ee, nzukọ anyị na-enwe kwa mgbe na-enye ohere kwesịrị ekwesị iji hụ ọtụtụ ndị enyi n’otu oge. Otú ọ dị, a raara Ụlọ Nzukọ Alaeze nye Jehova, ya mere a ga-eji ya eme ihe nanị maka ife ya ofufe. Anyị adịghị eji ọbịbịa anyị na-abịa n’ebe ahụ eme ihe iji chụsoo azụmahịa ego ma ọ bụ hụ maka iji ego achụ ego nke onwe onye.
Ọzọkwa, ọgbakọ adịghị eji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe maka usoro ihe omume ntụrụndụ, ịgba ọnya ego, ma ọ bụ ijere ọha ozi, dị ka ilekọta ụmụaka. E nwere ebe ndị ọzọ mmadụ pụrụ ilekọta ụdị ihe onwe onye na ihe azụmahịa ndị dị otú ahụ.
Ndị okenye n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze rịbara ama na ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-eme omume nke ịgbaziri na ịkwụghachi ihe ndị a gbaziri agbaziri ná nzukọ dị iche iche. Ọzọkwa, ọ bụkwa àgwà ha ịdị na agbanwerịta kaseti vidio n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụ ezie na ihe ndị a abụghị ụdị ihe a na-enweta ego na ya, ndị okenye nyeere ha aka ịhụ amamihe dị n’ịhụ maka ihe ndị a n’ebe obibi mgbe ọ bụla o kwere mee.
Iji zere ọnọdụ nke ga-egosipụta ihe na-ezighị ezi na ijide n’aka na a na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị, onye ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘È nwere ihe onwe onye ọ bụla nke m nọworo na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke a pụrụ ịme n’ebe obibi?’ Dị ka ihe atụ, mgbe a na-ahazi mkpapụ ma ọ bụ nnọkọ ntụrụndụ ndị ọzọ, ọ bụ na ọ gaghị akacha mma ikwurịta ụdị nhazi ahụ n’ebe obibi? Ànyị pụrụ iji telifon ma ọ bụ gaa n’ebe obibi nke ndị anyị chọrọ ịkpọtụrụ? Ịgbaziri okwu Pọl, anyị pụrụ ịsị: ‘N’ezie anyị nwere ụlọ maka ime ihe ndị a ahụ, ọ̀ bụ na anyị enweghị?’
Oge na Ebe A Kara Aka Iji Fee Jehova Ofufe
Bible kwuru n’Eklisiastis 3:1, sị: “Ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe.” Mgbe anyị na-eje nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị pụrụ imikpu onwe anyị n’ụzọ zuru ezu n’ihe omume nke metụtara ozi ndị Kraịst. Ọ bụ oge a kara aka ife Jehova ofufe.
Onye nne ji ya na Jisọs bụ́ Jemes nyere ndụmọdụ megide ile mmadụ anya n’ihu n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. (Jemes 2:1-9) Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ a n’omume n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị? A pụrụ igosipụta ile mmadụ anya n’ihu mgbe a na-enyefe ndị mmadụ ọkpụkpọ òkù e dere ede n’ụzọ na-adọrọ uche n’ebe ahụ. N’otu ọgbakọ, ihe ha na-eme bụ itinye ụdị ọkpụkpọ òkù ahụ n’ime akpa akwụkwọ ma ọ bụ Bible ndị nọ ebe ahụ. Ọ bụ ezie na ọ dị mfe karịa iziga ọkpụkpọ òkù ahụ site na post ọfịs ma ọ bụ ịga nye ha ya n’ụlọ onye ọ bụla. Otú ọ dị, olee mmetụta ndị na-anataghị ọkpụkpọ òkù ahụ na-enwe mgbe ha hụsịrị na a na-enyefe ndị ọzọ ọkpụkpọ òkù? Nke a ọ pụrụ inye ihe ngosi nke ile mmadụ anya n’ihu?
N’ezie, ọ dịghị mkpa inwe iwu siri ike nke sịrị na o nweghị onye pụrụ inye onye ọzọ ozi ma ọ bụ ngwugwu mgbe a nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze; ọ dịghịkwa njọ ikwu banyere ọrụ ma ọ bụ ihe omume ndị e mere n’ụbọchị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ịkpọ mmadụ òkù ịbịa n’ebe obibi gị, ma ọ bụ ịgwa mmadụ ka o sonyere gị n’ụfọdụ ihe ntụrụndụ. Ma nke a ga-abụ ihe mberede na nke e mere n’ụzọ akọ na egosipụtaghị onwe onye. Ndokwa onwe onye ekwesịghị ịdọpụ uche mmadụ site n’ezi nzube nke anyị ji nọkọọ ọnụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya bụ, iwuli elu n’ụzọ ime mmụọ.—Matiu 6:33; Ndị Filipaị 1:10.
Ndị Ikom Na-esetịpụ Ihe Nlereanya
Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ji ịnụ ọkụ n’obi na-esetipụ ihe nlereanya n’igosi nkwanye ùgwù maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ozuzu ya e nwere otu ma ọ bụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi abụọ e kenyere orụ ilekọta ihe ndị metụtara idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Ebe e nwere karịa otu ọgbakọ na-eji otu ụlọ nzukọ ahụ eme ihe, kọmitii nke ndị okenye na-elekọta ihe ndị a.
Ọ bụ ezie na e kenyere ụfọdụ ọrụ ilekọta ọrụ ndị ahụ kpọmkwem, ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye nile kwesịrị igosipụta ezi mmasị n’ụlọ nzukọ ahụ. Ha na-amata na a rarawo Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nye Jehova, e jikwa ya eme ihe maka ofufe ya.
Ndị Okenye ekwesịghị igbu oge ọ bụla mgbe e nwere mkpa maka ịrụzi ihe. (2 Ihe Emere 24:5, 13; 29:3; 34:8; Nehemaịa 10:39; 13:11) N’ụfọdụ ọgbakọ a na-eme nnyocha nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ mgbe mgbe iji hụ maka nrụzi ihe ọ bụla dị mkpa ngwa ngwa. A na-edekọ ihe ndị e nwere iji jide n’aka na ihe a chọrọ dị ya ma dịrị ebe aka ga-eru ngwa ngwa. Ọ bụrụ na e nwere ebe a na-akwakọba ihe ndị a chọrọ, ígwè ọrụ, na ihe eji ehicha ihe, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile kwesịrị igosipụta mmasị n’ọnọdụ ya, na-ejide n’aka na e debere ya ọcha. Ndị na-arụ ọrụ n’ebe a na-akpọsa akwụkwọ na magazin pụrụ igosi mmasị ha site n’ịhụ ozugbo na atụsasịghị okpokoro katọn n’ụlọ nzukọ ahụ.
Site n’ịsetịpụ ihe nlereanya, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka igosipụta ịnụ ọkụ n’obi maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. (Ndị Hibru 13:7) Mmadụ nile pụrụ igosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị site n’ikere òkè n’ihicha ụlọ nzukọ ahụ na igosi ezi mmasị n’ihe nile metụtara otú ọ dị n’ile anya.
Jisọs sịrị na Matiu 18:20: “Ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọworo n’aha m, n’ebe ahụ ka m nọ n’etiti ha.” Ee, Jisọs nwere mmasị n’ihe anyị na-eme mgbe anyị zukọrọ ife Jehova ofufe. Nke a gụnyere nzukọ ọ bụla e nwere n’ụlọ ebe obibi mmadụ ma ọ bụ nzukọ buru ibu dị ka ná mgbakọ ukwuu ma ọ bụ mgbakọ dị iche iche.
Nye ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova, e nweghị ebe ọzọ dị nso n’obi ha ma ọ bụghị ebe ha na-efe ofufe kwa mgbe, Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na-egosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ebe ahụ. Ha na-egosipụta mmụọ ịrụsi ọrụ ike n’ilekọta ya, ha na-agbalịkwa mgbe ọ bụla iji ya eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ka gị onwe gị kwa gbasoo ndụmọdụ nke Jehova n’onwe ya na-enye: “Debe ụkwụ gị mgbe ị na-ejeru ụlọ Chineke.”—Eklisiastis 5:1.