Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w10 5/1 p. 31
  • Gịnị Bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Gịnị Mere Anyị Ji Arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa Otú E Si Enweta Ego E Ji Arụ Ha?
    Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
w10 5/1 p. 31

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Gịnị Bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?

▪ Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ụlọ ofufe Ndịàmà Jehova na-anọ ekpe okpukpe ha. E nwere ọtụtụ iri puku Ụlọ Nzukọ Alaeze ha na-eji eme nke a n’ụwa niile. Kwa izu, ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ Ndịàmà Jehova na puku ise na-ezukọ n’ụlọ nzukọ ndị ahụ.

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ọ bụla nwere ebe a na-anọ amụ Baịbụl ma na-ezi ihe. Ihe ka ọtụtụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nwere ebe ikpo okwu a na-anọ eduzi ọmụmụ ihe. A na-enwekarị oche ga-aba n’agbata otu narị mmadụ na narị mmadụ atọ. Ụlọ Nzukọ Alaeze nwekwara ike inwe otu obere ụlọ ọmụmụ ihe ma ọ bụ karị, ọfịs, na obere ọ́bá akwụkwọ nke akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha dị na ya, bụ́ ndị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere ike iji mee nnyocha.

Ma, ị gaghị ahụ ihe oyiyi okpukpe na ihe ndị ọzọ na-adịkarị na chọọchị Krisendọm n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A naghị enwe ọlta, ihe oyiyi, ma ọ bụ obe na ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ndịàmà Jehova kweere na iji ihe ndị ahụ efe ofufe megidere iwu Baịbụl bụ́ “gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:14; Jọn 4:24) A na-achọ ọtụtụ ụlọ chọọchị na ụlọ nsọ oké mma. Ma, a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze otú akụkụ ya niile ga-aba uru, a naghịkwa achọ ya oké mma. Ihe ka mkpa bụ ọmụmụ Baịbụl a na-anọ n’ime ya amụ, ọ bụghị ụlọ ahụ n’onwe ya.

Gịnị mere e ji akpọ ya Ụlọ Nzukọ Alaeze? Nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-elekwasị anya n’ozizi Baịbụl na isi ihe ọ na-akụzi banyere “alaeze Chineke,” bụ́ isiokwu nke ozi Jizọs. (Luk 4:43) N’ihi ya, aha ahụ bụ́ Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ nke a gụrụ ya n’afọ ndị sochiri 1930, kọwara nnọọ nzube e ji arụ ya, ya bụ, ịkwado ezi ofufe na ịbụ ebe bụ́ isi a ga-esi na-ekwusa “ozi ọma nke alaeze Chineke.” (Matiu 24:14) Ya mere, a naghị eji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme oriri na nkwari ma ọ bụkwanụ azụ ahịa. Ọ bụ naanị onyinye si ndị mmadụ n’obi ka e ji ewu ma na-elekọta ya. A natụghị ebugharị efere onyinye na ya. Kama nke ahụ, a na-enwe igbe e debere n’otu akụkụ maka ndị chọrọ inye onyinye.

Ụlọ Nzukọ Alaeze na-arụ otu ọrụ n’ụwa niile, ma, ọdịdị ha na-adị iche iche, ha anaghịkwa aha nhata. Ọdịdị ha na-adabere n’ụdị ihe e ji arụ ụlọ n’ebe a chọrọ ịrụ ya, ihu ígwé, na otú Ndịàmà Jehova nọ n’ebe ahụ nweruru ego. A na-eji brik, osisi, na okwute ewu ụfọdụ n’ime ha. Ndị ọzọ nwere ike ịbụ achara ndị e gwunyere n’ala ma tụọ ha akịrịka n’elu, akụkụ ha eghere oghe.

Ndị ọbịa nwere nnọọ ike ịbịa ọmụmụ ihe niile a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla. (Ndị Hibru 10:25) N’eziokwu, kwa izu, a na-enwe nzukọ a haziri maka ọha na eze, bụ́ nke na-elekwasị anya n’isiokwu si na Baịbụl ga-amasị ma ndị nọ n’ọgbakọ ma ndị ọbịa. Ọ́ gaghị adị mma ka ị gaa ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ebe i bi?

[Foto dị na peeji nke 31]

Malawi, Afrịka

[Foto dị na peeji nke 31]

Ịngland, Briten

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya