Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 5/1 p. 25-29
  • Nọgide Na-akụ Mkpụrụ—Jehova Ga-eme Ka O Too

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọgide Na-akụ Mkpụrụ—Jehova Ga-eme Ka O Too
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezi Ihe Nlereanya nke Ndị Mụrụ Ụmụ na Ọzụzụ
  • Ịbanye n’Ije Ozi Ọsụ Ụzọ
  • Ebe E Kenyere M Ọrụ—Ireland
  • Mwakwasị nke Ndị Na-eme Ihe Ike
  • Mkpụrụ nke Eziokwu Epulite
  • Àgwà Ndị Na-agbanwe Agbanwe
  • Ọzụzụ Pụrụ Iche n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead
  • Ngọzi Jehova Nọgidere Na-abịa
  • Ihe Kasị Mma Iji Ndụ M Mee
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jehova Na-agọzi Ndị Na-eme Uche Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “Mmụọ Ozi Jehova Na-ama Ụlọikwuu Gburugburu Ndị Na-atụ Egwu Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Enwetara M Afọ Ojuju n’Ijere Chineke Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 5/1 p. 25-29

Nọgide Na-akụ Mkpụrụ—Jehova Ga-eme Ka O Too

DỊ KA FRED METCALFE SI KỌỌ

NÁ MMALITE afọ 1948, mgbe m nọ n’ozi m site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ejere m n’otu ubi nta dị n’ebe mpụga mpụga nke obodo Cork n’ebe ndịda nke Ireland. Mgbe m kọwaara onye ọrụ ubi ahụ onye m bụ, ihu ya gbarụrụ nke ukwuu. O tiwapụrụ n’oké ọnụma, tie mkpu na m bụ onye Kọmunist, wee gbara ọsọ gaa iweta ndụdụ ya nke e ji arụ ọrụ ubi. N’echeretụghị echeretụ, agbapụrụ m site n’ubi ahụ wee makwasị n’elu ịnyịnya ígwè m nke m hapụworo n’akụkụ okporo ụzọ. Ugwu dị n’ebe ahụ kpọdara akpọda nke ukwuu, ma agbaara m ígwè rịda ya ọsọ ọsọ ruo ókè m pụrụ ime, n’eleghachighị anya n’azụ, ka m na-eche na onye ọrụ ubi ahụ ga-atụ m ndụdụ ahụ dị ka ube.

Mmeghachi omume dị otú ahụ amarawo m ahụ n’ime afọ abụọ m nọworo kemgbe m bịara na Republic of Ireland site England dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche na 1946. Ìgwè nta nke ndị nkwusa Alaeze ndị m sonyeere, ndị dị nanị 24 n’ọnụ ọgụgụ, enwewo ahụmahụ nke oké ịkpọ asị na nkwutọ. Ma enwere m obi ike na mmụọ Jehova ga-emesịa mịpụta mkpụrụ.—Ndị Galetia 6:8, 9.

Otú ọ dị, tupu m kọọ otú ihe si gaa, ka m kọọrọ unu obere ihe banyere mgbe m bụ nwata na ọzụzụ nke mere ka m nwee ike iguzosi ike n’okpuru ọnọdụ ọnwụnwa ndị dị otú ahụ.

Ezi Ihe Nlereanya nke Ndị Mụrụ Ụmụ na Ọzụzụ

E ji eziokwu ahụ bịakwute nna m ná mmalite nke 1914. Mgbe ọ nọ na njem na-alọghachi site n’otu ịsọ mpì egwu bọọlụ e nwere na Sheffield, England, ọ gụrụ otu trakti dabeere na Bible nke kọwara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. O jeworị chọọchị dị iche iche iji chọọ azịza nye ajụjụ ya dị iche iche ma o nwetaghị ezi ihe ịga nke ọma. Ihe ọ gụrụ na traktị ahụ ugbu a kpaliri mmasị ya. O zipụrụ ozi ka e wetara ya mpịakọta isii nke akwụkwọ Studies in the Scriptures nke a kpọsara na traktị ahụ, o jikwa ịnụ ọkụ n’obi gụọ ha, na-agụrụ ọtụtụ mgbe ruo n’isi ụtụtụ. Nna m ghọtara na nke a bụ eziokwu ahụ ọsọ ọsọ.

N’oge na-adịghị anya ọ malitere isonyere ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ, bụ́ mkpakọrịta nke nọgidere ruo ihe karịrị 40 afọ, nke o jere ozi n’ihe ka ọtụtụ n’ime ha dị ka onye isi oche ndị nlekọta. Ọ bụụrụ nna m ihe obi ụtọ ịhụ na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ na ndị nwanyị atọ dum nakweere eziokwu ahụ. Otu n’ime ụmụnne ya ndị nwoke gbaara otu nwa agbọghọ onye na-enye aka n’otu ụlọ ahịa àmà, onye ahụ na nwanne ya nwanyị ghọkwara ndị Kraịst raara onwe ha nye e tere mmanụ. Nna m na nwanne ya nwoke lụrụ ụmụ agbọghọ abụọ ndị a.

N’ime ezinụlọ anyị, abụ m otu n’ime ụmụ nwoke anọ ndị a zụlitere “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Enwere m obi ụtọ na ndị mụrụ m mere mgbalị nile ha pụrụ ime n’ịkụnye eziokwu ahụ n’ime anyị. N’oge ahụ, e nweghị akwụkwọ ndị e bipụtara kpọmkwem iji nyere ndị mụrụ ụmụ aka izi ụmụ ha eziokwu Bible dị iche iche; ma anyị na-enwe ọmụmụ Bible ezinụlọ ụgbọ abụọ kwa izu, na-eji akwụkwọ ahụ bụ The Harp of God, tinyekwara ntụle a na-eme mgbe mgbe nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị.—Deuterọnọmi 6:6, 7; 2 Timoti 3:14, 15.

Nne m na nna m bụkwa ezi ihe nlereanya ná nghọta ha nwere maka ịdị mkpa nke nzukọ dị iche iche a na-enwe na n’ịnụ ọkụ n’obi ha maka ije ozi ahụ. Tụkwasị n’ezi àgwà ime mmụọ ya, nna m maara ka e si eme ihe ọchị, bụ́ nke o bufeere ụmụ ya. Ịrụsi ọrụ ike nke ndị mụrụ m rụpụtara ezi ihe. Ụmụ ha ndị nwoke anọ dum, ndị nọ n’afọ 60 na ụma ha ugbu a, ka na-enwe obi ụtọ n’ijere Jehova ozi.

Ịbanye n’Ije Ozi Ọsụ Ụzọ

N’April 1939, mgbe m gbara afọ 16, agụsịrị m akwụkwọ wee ghọọ onye ọsụ ụzọ oge nile. Nna m sonyeere m n’ije ozi ọsụ ụzọ ahụ ma nye m ezi ọzụzụ. N’iji ịnyịnya ígwè na-aga njem, anyị jezuru ozi n’ókèala dum dị gburugburu kilomita 11 site n’ụlọ anyị. Kwa ụbọchị, anyị abụọ na-ewere 50 akwụkwọ nta, anyị adịghị alọghachikwa ruo mgbe anyị tinyesịrị ha dum.

Mgbe afọ abụọ gasịrị, enwere m ihe ùgwù nke ịbụ otu n’ime ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche mbụ a họpụtara na Britain. Ọ bụ ihe ọṅụ ịnara ngọzi nke a, ma ọ bụụrụ m ihe isi ike ịhapụ ịnọ ná ntụkwasị obi nke ezinụlọ ebe a na-agbaso ụkpụrụ ọchịchị Chineke. Mgbe oge na-aga, sitekwa n’enyemaka Jehova, ahazigharịrị m onwe m iji kwekọọ n’ọnọdụ ọhụrụ ahụ.

A kwụsịtụrụ ije ozi ọsụ ụzọ m n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe, tinyere Ndịàmà ndị ọzọ bụ ụmụ okoro, a tụrụ m mkpọrọ n’ihe banyere nnọpụiche. N’Ụlọ Mkpọrọ Durham, e debere m n’ọkwá YP (Young Prisoner [onye mkpọrọ bụ nwata]). Nke a pụtara na m ga na-eyi uwe úkwù dị mkpirikpi—bụ́ nke na-eweta ihe isi ike n’oge oyi. Jiri nnọọ anya nke uche gị lee ka Wilf Gooch (onye bụ onye nchịkọta Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ dị na Britain), Peter Ellis, (onye so na Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ Britain), Fred Adams, na mụ—anyị nile dịcha ihe fọrọ nke nta ma ọ bụ ihe karịrị 1.8 mita n’ogologo—ka anyị na-eguzokọ ọnụ na-eyi uwe úkwù dị mkpirikpi dị ka ụmụ akwụkwọ!

Ebe E Kenyere M Ọrụ—Ireland

Mgbe a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ, arụrụ m ọrụ ọsụ ụzọ n’akụkụ dị iche iche nke England ruo afọ atọ. Mgbe ahụ, anatara m ọrụ nke gaje ịbụ ma ihe ule ma ihe na-enye afọ ojuju dị ukwuu—Republic of Ireland. Nanị ihe m maara banyere ebe ndịda nke Ireland bụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla bi n’ebe ahụ bụ onye Roman Katọlik. Ma elefuuru m okwu mmegide ụfọdụ ndị kwuru anya ma ghara ịla azụ n’ịnakwere ọrụ ahụ. Nke a bụ oge maka mgbasa nke ezi ofufe, ejikwa m n’aka na Jehova, site ná mmụọ nsọ ya, ga-enyere m aka.

Ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà bi na Republic of Ireland bi n’isi obodo ahụ, bụ́, Dublin, ọ bụkwa nanị otu ma ọ bụ abụọ bisasịrị n’ebe ndị ọzọ. Ya mere, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ahụbeghị ọbụna otu n’ime Ndịàmà Jehova mbụ. Tinyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche atọ ndị ọzọ, amalitere m ịrụ ọrụ n’obodo Cork. Ọ dịghị mfe ịchọta onye ga-ege ntị. N’oge Mas ha, ndị ụkọchukwu na-anọgide na-adọ aka ná ntị megide anyị, na-akpọ anyị “ekwensu ndị Kọmunist.” Akwụkwọ akụkọ dị iche iche dọkwara aka ná ntị megide ọrụ anyị.

Otu ụbọchị, otu onye na-akpụ isi ji mma agụba dị oké nkọ́ na-akpụ m isi. Mgbe anyị nọ na-akparịta ụka, ọ jụrụ m ihe m na-eme n’obodo Cork. Mgbe m gwara ya, o tiwapụrụ n’oké iwe, wee malite ịkpọ m iyi. Aka ya nọ na-ama jijiji n’iwe, ahụkwara m ọhụụ ebe m zọọrọ ije na-ahapụ ebe ahụ na-ejide isi m n’aka! Lee nnọọ ka obi si ruo m ala isi n’ụlọ ọrụ ya pụọ n’enweghị ihe mere m.

Mwakwasị nke Ndị Na-eme Ihe Ike

Mgbe ụfọdụ, anyị chere ìgwè ndị na-eme ihe ike ihu. Dị ka ihe atụ, otu ụbọchị na March 1948, anyị nọ na-eje ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ mgbe otu ìgwè ndị na-eme ihe ike wakwasịrị onye mụ na ya so, bụ Fred Chaffin. Mgbe ìgwè mmadụ ahụ na-achụso ya, Fred gbaara ọsọ gaa n’otu ebe ụgbọ bọọsụ na-akwụsị ma rịọ onye draịva bọọsụ ahụ na onye na-eso ya ka ha bịa nyere ya aka. Kama nke ahụ, ha sonyere ná mwakwasị ahụ. Fred gbaara ọsọ gakwuo n’ihu n’okporo ụzọ ahụ ma nwee ike ije zoo n’azụ mgbidi dị elu nke e ji gbaa ụlọ onye ụkọchukwu gburugburu.

Ka ọ dị n’oge ahụ, ejewo m ebe m debere ịnyịnya ígwè m. Iji wee laghachi n’etiti obodo ahụ, esi m otu ụzọ dị n’akụkụ, ma mgbe m gbapụtara n’okporo ụzọ ukwu, ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike nọ na-eche m eche. Ndị ikom abụọ buuru akpa m, wee fefusịa ihe nile dị n’ime ya. Ha wee malite iti m ihe na ịgba m ụkwụ. Na mberede, otu nwoke pụtara. Ọ bụ onye uwe ojii nke na-adịghị eyi uwe e ji mara ndị uwe ojii, ọ kwụsịkwara mwakwasị ahụ, wee kpọrọ mụ na ndị ahụ na-eti m ihe jee n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii.

Mwakwasị nke a nyere anyị ohere ‘ịkwado ozi ọma ahụ na ime ka o guzosie ike n’ụzọ iwu.’ (Ndị Filipaị 1:7) Mgbe okwu ahụ rutere n’ụlọ ikpe, onye uwe ojii ahụ nke napụtara m, nke bụ onye Roman Katọlik n’onwe ya, gbara akaebe, a makwara mmadụ isii ikpe ime mwakwasị. Okwu ikpe ahụ gosiri na anyị nwere ikike iwu kwadoro ije site n’ụlọ ruo n’ụlọ, meekwa ihe dị ka ihe mgbochi nye ndị ọzọ ndị pụrụ iche echiche imeso anyị ihe ike.

Na mbụ, e lere ya anya dị ka ihe dịbigara ize ndụ ókè iduje ụmụnna nwanyị dị ka ndị ọsụ ụzọ n’ebe ndị dị ka Cork. Otú ọ dị, o yikarịrị ihe ka mma ka ọ bụrụ ụmụnna nwanyị ga-eje n’ụlọ ndị inyom nwere mmasị. Ya mere, nwa mgbe nta tupu oge mwakwasị ahụ, Society zitere ụmụnna nwanyị abụọ bụ ndị ọsụ ụzọ na Cork. Otu n’ime ha, bụ́ Evelyn MacFarlane, mesịrị ghọọ onye ozi ala ọzọ, rụọkwa ezi ọrụ na Chile. Onye nke ọzọ, bụ́ Caroline Francis, onye reworo ụlọ ya dị na London ka o wee nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’Ireland, ghọrọ nwunye m.

Mkpụrụ nke Eziokwu Epulite

Ọ gaara adịworị mfe iche na ọ bụ oge ka anyị na-egbu n’ịkụ mkpụrụ Alaeze n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Ma ịhụ ka eziokwu ahụ na-epulite n’ebe dị iche iche kwadoro obi ike anyị nwere n’ike Jehova ime ka ihe too eto. Dị ka ihe atụ, Society ziteere anyị aha na adres nke otu nwoke onye deworo akwụkwọ wee rịọ ka e wetara ya akwụkwọ ahụ bụ “Kwe Ka Chineke Buru Onye-Ezi-Okwu.” Adres ahụ dị na Fermoy, bụ́ obodo nta nke dị ihe dị ka 35 kilomita site n’obodo Cork. Ya mere, ejiri m ịnyịnya ígwè m gbapụ n’otu ụtụtụ ụbọchị Sunday ije chọta onye a.

Mgbe m ruru Fermoy, arịọrọ m otu nwoke ka o duzie m. Ọ sịrị, “Oo, ọ fọdụrụ kilomita 14 n’ogologo ụzọ a.” Agara m n’ihu ma mesịa rute n’otu ubi nke dị n’akụkụ otu okporo ụzọ ime obodo. Nwa okorobịa nke ziworo ozi ka e wetara ya akwụkwọ guzo n’ọnụ ụzọ ama nke ubi ahụ. Mgbe m kọwaara ya onye m bụ, ọ sịrị: “Akwụkwọ ahụ dị mma nke ukwuu!” Anyị nwere ezigbo mkparịta ụka, amaghịkwa m mgbe m ji gbaa ígwè ogologo 50 kilomita iji laghachi. Ọbụna ugbu a, mgbe 40 afọ gasịworo, ana m enwe obi ụtọ dị ukwuu mgbe m zutere “nwa okorobịa” ahụ bụ Charles Rinn, kwa afọ ná mgbakọ dị iche iche. Taa, e nwere ọgbakọ iri dị n’ógbè Cork.

N’ime afọ ndị 1950, mụ na Caroline ghara ọtụtụ mkpụrụ nke eziokwu n’obodo ndị dị n’ebe etiti Ireland. Anyị nwetara agbamume ịnọgide n’ọrụ na 1951 mgbe ndị dị umeala n’obi dị ka “Nne ochie” Hamilton na nwunye nwa ya zaghachiri ngwa ngwa. “Nne ochie” Hamilton ghọrọ onye nkwusa mbụ mere baptism na County Longford.—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.

Inweta ebe obibi bụ ihe isi ike. Ozugbo a malitere ịrụgide ndị nwe ụlọ ime ihe, ha na-agwa anyị ka anyị kwapụ. N’ihi ya, ebe a chụpụworo anyị n’ebe atọ dị iche iche n’oké nsochi, anyị zụrụ ákwà ụlọ ntú, ákwà a ga-atụ n’ala, nakwa ihe e ji ehi ụra, na-ebugharịkwa ha n’ime ụgbọ ala Y-model Ford anyị. Anyị na-eguzobe ụlọ ntú ahụ ebe ọ bụla anyị nwere ike ime ya ná ngwụsị nke ịgba àmà ụbọchị ọ bụla. Mgbe e mesịrị, anyị nwetara ụlọ ụgbọ ala na-adọkpụgharị nke dị 4 mita n’ogologo. Ọ dị ntakịrị, nweekwa nanị ihe ọgbara ọhụrụ ole na ole e ji ebi n’ụlọ—anyị na-eji ụkwụ jee ọkara otu kilomita inweta mmiri ọṅụṅụ—o nweghịkwa ihe ọ bụla e ji fachisịa ya iji chụọ oyi, ma nye anyị, ọ bụ ibi ndụ ntụsara ahụ. E tinyere àgwà m nke imekarị ihe ọchị n’ule otu ụbọchị mgbe otu mkpọrọgwụ osisi dere mmiri chịịrị m, m wee dalaa azụ daba n’ime otu olulu mmiri dị warawara ma dị omimi nke ukwuu. N’agbanyeghị nke ahụ, onye nlekọta sekit na nwunye ya binyeere anyị n’ụlọ ahụ ụgbọ ala na-adọkpụgharị mgbe ha bịara leta anyị.

Mgbe ụfọdụ, ndị obi ha ziri ezi na-egosi anyị obi ọma anyị na-atụghị anya ya. Dị ka ihe atụ, anyị jere Sligo nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Ireland na 1958, bụ́ afọ asatọ mgbe a chụpụsịrị di na nwunye ọzọ bụ ndị ọsụ ụzọ site n’obodo ahụ. Anyị kpere ekpere maka enyemaka Jehova iji chọta ebe anyị ga-adọba ụlọ ahụ ụgbọ ala na-adọkpụgharị, mgbe anyị chọgharịsịrị ruo ọtụtụ hour, anyị hụrụ otu ebe a na-akụrisị nkume, bụ́ nke a na-adịghị ejikwa eme ihe. Otu nwoke nke na-achị ìgwè ehi n’akụkụ obere okporo ụzọ ahụ gwara anyị na ọ bụ ezinụlọ ya nwe ụlọ ọrụ nkụri nkume ahụ. Anyị jụrụ ya, sị, “Ànyị pụrụ iji ya mee ihe?” na-agwa ya na anyị bụ ndị nnọchianya nke otu òtù Bible. O kwuru na nke ahụ dị nnọọ mma.

N’oge na-adịghị anya ọ jụrụ, sị: “Olee Òtù Bible nke unu nọ na ya?” Ọ bụụrụ anyị oge oké nchegbu. Anyị gwara ya na anyị bụ Ndịàmà Jehova. N’ịbụrụ anyị oké ihe ntụsara ahụ, ọ nọgidere na-emeso anyị omume enyi. Mgbe izu ole na ole gasịrị, o nyere anyị akwụkwọ risit nke na-egosi na a kwụwo ụgwọ maka iji ala ahụ mee ihe ruo otu afọ. Ọ sịrị, “Anyị achọghị ego ọ bụla. Ma anyị maara ụdị mmegide unu na-eche ihu, ya mere, ya bụrụ na onye ọ bụla ajụọ ikike unu nwere ịnọ n’ebe a, nke ahụ bụ ihe àmà unu nwere.”

Mgbe anyị nọ na Sligo, anyị nụrụ banyere otu nwoke, bụ́ onye a ma ama nke nwere ụlọ ahịa, bụrụkwa onye na-agba bọọlụ, bụ́ onye gositụworo mmasị mgbe ndị ọsụ ụzọ mbụ ahụ ka nọ n’obodo ahụ. Otú ọ dị, e jebeghị na nke ya ọtụtụ ugbo ruo afọ asatọ, ya mere, anyị chere echiche banyere otú ọ dị ugbu a. Nnukwute ihu ọchị nke Mattie Burn gosiri mgbe m kọwara onye m bụ nyere azịza ya. Mkpụrụ eziokwu nke a kụrụ n’ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ anwụbeghị. Ọ ka nọ n’ọgbakọ nta ahụ na-arụsi ọrụ ike na Sligo.

Àgwà Ndị Na-agbanwe Agbanwe

Otu ebe e mere ngosi kasị pụta ìhè nke àgwà ịkpọasị nke ọtụtụ ndị nwere n’ebe anyị nọ bụ n’obodo Athlone. Mgbe a malitere ịgbasi àmà ike n’ebe ahụ n’afọ ndị 1950, ndị ụkọchukwu mere ndokwa ka ndị nile bi n’otu akụkụ nke obodo ahụ bịanye aka n’otu akwụkwọ mkpesa nke na-ekwu na ha achọghị ka Ndịàmà Jehova bịa n’ụlọ ha. Ha zijeere gọọmenti akwụkwọ ahụ, na-eme ka ọ bụrụ ihe siri ike nke ukwuu ịrụ ọrụ n’Athlone ruo ọtụtụ afọ. N’otu mgbe, otu ìgwè ndị na-eto eto matara m dị ka Onyeàmà wee malite ịtụ m nkume. Mgbe m guzoro n’ihu window dị n’otu ụlọ ahịa, onye nwe ụlọ ahịa ahụ kpọrọ m ka m bata n’ime ụlọ ahịa ya—ọ bụ iji chebe window ya karịa iji chebe m—ma kwe ka m si n’ụzọ azụ ụlọ pụọ.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya gara aga, n’August 1989, mgbe m duziri otu ememe olili ozu n’Athlone nke otu nwanna nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, enwere m nnọọ ihe ijuanya n’ụzọ Jehova si mee ka ihe too eto n’ebe ahụ. E wezụga ndị nọ n’ọgbakọ ahụ, ihe dị ka 50 ndị obodo ahụ ji nkwanye ùgwù gee ntị n’okwu olili ozu ahụ e kwuru n’ime ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ụmụnna ahụ wuteworo.

Ọzụzụ Pụrụ Iche n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead

Na 1961, a kpọrọ m òkù ka m bịa ọzụzụ ga-ewe ọnwa iri n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. Ọzụzụ nke a pụru ịche dịịrị nanị ụmụnna nwoke, ya mere mụ na Caroline ji ekpere chebara ọkpụkpọ òkù ahụ echiche. Anyị anọkọtawo n’otu ruo afọ 12. Ọzọkwa, ebe ọ bụkwa na nwunye m chọsiri ike ije Ụlọ Akwụkwọ Gilead wee ghọọ onye ozi ala ọzọ, ọ bụụrụ ya ihe nkụda aka pụrụ iche mgbe a na-akpọghị ya òkù ịbịa. Ma, ebe ọ bụ onye na-enwe ezi uche, o debere ọdịmma Alaeze n’ọkwá mbụ wee kwere ka m jee. Ọzụzụ ahụ bụ oké ihe ùgwù. Ma ọ bụụrụ m ihe ọṅụ ịlọghachi wee tinyeghachi onwe m n’ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Society, na-agba ihe dị ka 200 ma ọ bụ karị Ndịàmà nọ n’ebe ahụ ume, bụ́ ndị nọ na-akụ mkpụrụ, na-akwọsakwa ya mmiri n’Ireland ná mmalite afọ ndị 1960.

Mgbe afọ ole na ole gasịrị, na 1979, Caroline nwere ohere ije n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke Ndịàmà Jehova na New York mgbe a kpọrọ m òkù ịbịa ọzụzụ Gilead pụrụ iche maka ndị so na Kọmitii Alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. Ọ bụ isi ihe dị n’ihe mesịrị ghọọ akụkụ ikpeazụ nke ndụ ya. Mgbe afọ abụọ gasịrị, ọ nwụrụ. N’ime 32 afọ dum ahụ anyị jekọrọ ozi n’ozi oge nile, ọ dịghị mgbe ọ bụla Caroline tụfuru ịnụ ọkụ n’obi o nwere maka ijere Jehova ozi ma ọ bụkwanụ obi ike ya na Ọ ga-eme ka ihe too eto.

Ọnụnọ ọ na-anọkwaghị ya wutere m nke ukwuu. Otu ihe nyeere m aka ịnagide ya bụ otu isiokwu dị n’otu magazin Teta! (Bekee) nke oge ahụ, nke isiokwu ya bụ “Ịmụta Otú E Si Ebi Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Na-anọkwaghị Ya.” (February 8, 1981) Anya mmiri na-abịa m n’anya mgbe ọ bụla m chetara onye òtù m ahụ nke na-anọkwaghị ya, ma emere m ihe ihe odide ahụ tụrụ aro ka e mee, ma nọgide n’ọrụ n’ijere Jehova ozi.

Ngọzi Jehova Nọgidere Na-abịa

Otu afọ tupu nke ahụ, n’April 1980, anọ m ya mgbe Nwanna Lyman Swingle onye so n’Òtù Na-achị Isi raara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ dị na Dublin nye. Lee nnọọ oké ihe mkpali ọ bụ ịhụ 1,854 ndị nkwusa nọ n’ubi, bụ́ nke gụnyekwara Northern Ireland n’oge ahụ! Ugbu a kwa, mgbe afọ iri gasịworo, Yearbook na-enye akụkọ nke ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 3,451 maka 1990!

Tupu ugbu a, enwewo m ngọzi ọzọ. Mgbe m na-eje ozi dị ka onye nduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, ezutere m Evelyn Halford, bụ́ nwanna nwanyị nke na-anụ ọkụ n’obi, onye bịaworo Ireland ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Anyị lụrụ di na nwunye na May 1986, ọ bụwokwara m ezi ihe nkwado n’ọrụ m nile nke ọchịchị Chineke.

N’ime 51 afọ nke m jeworo ozi oge nile kemgbe m hapụrụ ụlọ akwụkwọ, etinyewo m 44 n’Ireland. Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ ọtụtụ ndị m nyeere aka ka ha ka nọ na-ejere Jehova ozi, ụfọdụ dị ka ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi. Apụrụ m ikwu n’alaghị azụ ọ bụla na otu n’ime ọṅụ ndị kasị ukwuu onye ọ bụla pụrụ inwe bụ inyere onye ọzọ aka ịbịa n’ụzọ nke ndụ.

Ọ bụworo m ihe na-ewusi okwukwe ike ịhụ ka ezi ofufe tolitere n’ebe dị iche iche n’Ireland, n’agbanyeghị oké mmegide. Ugbu a, ihe dị ka 3,500 ndi nkwusa nọ n’ihe karịrị 90 ọgbakọ dị iche iche gburugburu mba ahụ. N’eziokwu, e nweghị ịkpa ókè ọ bụla dịịrị ihe Jehova pụrụ ime. Ọ ga-eme ka ihe too eto ma ọ bụrụ na anyị adịrị uchu n’ịkụ mkpụrụ na ịkwọsa ya mmiri. (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) Amaara m na nke a bụ eziokwu. Ahụwo m ka o mere n’Ireland.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya