Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 2/1 p. 25-29
  • Enwetara M Afọ Ojuju n’Ijere Chineke Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enwetara M Afọ Ojuju n’Ijere Chineke Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzụlite n’Ụzọ Okpukpe
  • Oge Oké Mgbanwe
  • Ezinụlọ M na Ndị Ọzọ Azaghachi
  • Ọrụ Ọhụrụ
  • Ije Ozi n’Ime Lesotho na Botswana
  • Izi Ihe na Ịsụgharị Asụsụ
  • “Nọmba Ị Kpọrọ Abụghị Ya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Iso Nzukọ Jehova Na-eto Na South Africa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nọgide Na-akụ Mkpụrụ—Jehova Ga-eme Ka O Too
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 2/1 p. 25-29

Enwetara M Afọ Ojuju n’Ijere Chineke Ozi

DỊ KA JOSHUA THONGOANA SI KỌỌ

Laa azụ na 1942, enwere m ezigbo mgbagwoju anya. M na-amụ otu akwụkwọ ọgụgụ nke ndị chọọchị Seventh-Day Adventists na nke Watch Tower Society bipụtara. Dị ka ndị Israel oge ochie, m nọ “na-erugharị n’etiti ụzọ abụọ.”​—⁠1 Ndị Eze 18:21.

NDỊ chọọchị Seventh-Day Adventists na-ezitere m ihe mmụta ndị e biri ebi nke a kpọrọ “Olu nke Amụma.” Obi tọrọ m ụtọ ịza ajụjụ ha dị iche iche, ha kwekwara nkwa inye m asambodo mara mma ma ọ bụrụ na m gafee n’ule m nile. Ma m chọpụtara na ma “Olu nke Amụma” ma akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society bụ ndị e zitere site n’obodo Cape Town nke South Africa. M chere n’echiche, sị: ‘Òtù abụọ ndị a hà maara onwe ha? Ozizi ha ò kwekọrọ? Ọ bụrụ na ọ dịghị òtù a, ònye ziri ezi?’

Iji dozie okwu ahụ, m zigaara òtù nke ọ bụla otu ụdị akwụkwọ ozi ahụ. Dị ka ihe atụ, m degaara Watch Tower Society, sị: “Ùnù maara ndị e jikọtara ha na ‘Olu nke Amụma,’ ọ bụrụ na unu maara, gịnị ka unu nwere ikwu banyere ozizi ha dị iche iche?” Ka oge na-aga, m natara nzaghachi site n’aka òtù abụọ ndị a. Akwụkwọ ozi sitere n’aka Watch Tower Society kwuru na ha maara banyere “Olu nke Amụma” ma kọwaa na ozizi ya dị iche iche, dị ka Atọ n’Ime Otu na nlaghachi Kraịst n’anụ ahụ n’elu ụwa, esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ. Akwụkwọ ozi ha nwere akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche na-egosi ezighị ezi nke ozizi ndị a.​—⁠Jọn 14:​19, 28.

Nzaghachi sitere n’aka “Olu nke Amụma” kwuru nanị na ha maara “ndị Watch Tower,” ma na ha ekwetaghị ná nkụzi ha dị iche iche. Ha ekwughị ihe ọ bụla mere o ji dị otú a. Ya mere m kpebiri ịgbaso Watch Tower Society, nke bụ ihe ọrụ iwu kwadoro nke Ndịàmà Jehova ji eme ihe. Taa, mgbe 50 afọ nke isoro Ndịàmà na-ejekọ ije gasịrị, lee ka obi si dị m ụtọ na m mere mkpebi ahụ ziri ezi!

Nzụlite n’Ụzọ Okpukpe

A mụrụ m na 1912 n’otu ime obodo na-emepeghị emepe nke a na-akpọ Makanye, akụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo Pietersburg nke South Africa. Makanye nọ n’oge ahụ n’okpuru ọchịchị ndị Chọọchị Anglikan n’ụzọ nke okpukpe, ya mere m ghọrọ onye òtù nke chọọchị ahụ. Mgbe m gbara afọ iri, ezinụlọ anyị kwagara n’otu ógbè nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị Chọọchị Lutheran Berlin Mission, ndị mụrụ m banyekwara na chọọchị ahụ. N’oge na-adịghị anya m ruru eru ije ụka Nnata Oriri na ịnata otu ibe achịcha na otu nṅụrụtụ mmanya, ma o gboghị mkpa ime mmụọ m.

Mgbe m gụsịrị akwụkwọ ahụ were afọ asatọ, nna m zigara m n’ụlọ akwụkwọ Kilnerton Training Institution, na 1935, m natara Asambodo Onye Nkụzi nke Afọ nke Atọ. Otu n’ime ndị nkụzi mụ na ya rụkọrọ ọrụ bụ nwa agbọghọ, a na-akpọ Caroline. Anyị lụrụ di na nwunye, e mesịakwa Caroline mụrụ otu nwa nwanyị onye anyị kpọrọ Damaris. Afọ ole na ole mgbe nke a gasịrị, aghọrọ m onye nkụzi na Sehlale School n’ime ime obodo nke Mamatsha. Ebe ọ bụ na ndị nwe ụlọ akwụkwọ ahụ bụ Chọọchị Dutch Reformed, anyị banyere na chọọchị ahụ, na-eje nzukọ ha mgbe nile. Anyị mere nke a n’ihi na ọ bụ ihe bụ omenala ime, ma o wetaghịrị m afọ ojuju.

Oge Oké Mgbanwe

N’otu Sunday na 1942, anyị na-amụgharị abụ na chọọchị mgbe otu nwa okoro onye ọcha ji akwụkwọ atọ nke Watch Tower Society bipụtara​—⁠Creation, Vindication, na Preparation guzoro n’ọnụ ụzọ. M chere na akwụkwọ ndị ahụ ga-ama mma n’ebe ndebe akwụkwọ m, ya mere m natara ha n’ọnụ ego shilling atọ. Mgbe e mesịrị aghọtara m na Tienie Bezuidenhout bụ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova, nanị ya n’ógbè ahụ. Ná nleta na-esonu nke Tienie o ji ìgwè okwu phonograph bịa ma kpọọ okwu ndị Judge Rutherford kwuru n’efere egwu. Nke ahụ a maara dị ka “Ọnyà na Ihe Aghụghọ” masịrị m n’ụzọ zuru ezu, ma Caroline na nwanne m nwanyị, Priscilla bụ́ onye anyị na ya bi enweghị mmasị. Ná nleta nke atọ nke Tienie, o nyere m ìgwè okwu phonograph ahụ ka m wee nwee ike ịkpọrọ ndị enyi efere egwu ndị ahụ.

Otu ụbọchị m legharịrị anya na peji dị iche iche nke akwụkwọ ahụ bụ́ Creation ma hụta isiakwụkwọ bụ “Where are the Dead?” [Olee Ebe Ndị Nwụrụ Anwụ Nọ?] M malitere ịgụ ya n’olileanya nke ịmụta banyere ọṅụ dị iche iche nke mkpụrụ obi ndị hapụrụ ahapụ na-enwe n’eluigwe. Ma n’ụzọ megidere ihe m tụrụ anya ya, akwụkwọ ahụ kwuru na ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ili ha, ha amaghịkwa ihe ọ bụla. E hotara amaokwu dị iche iche site na Bible, dị ka Eklisiastis 9:​5, 10 iji nye nkwado. A kpọrọ isiakwụkwọ ọzọ “Awakening the Dead” [Ịkpọte Ndị Nwụrụ Anwụ], e zokwara aka na Jọn 5:​28, 29 dị ka ihe na-egosi na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha na-echerekwa mbilite n’ọnwụ. Nke a bụ ihe ezi echiche dị na ya. Ọ bụ ihe na-eju afọ.

Ọ bụ n’oge ahụ na 1942, ka m gbubiri mmekọrịta mụ na “Olu nke Amụma” ma malite ịgwa ndị ọzọ banyere ihe m na-amụta site n’akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower Society. Otu n’ime ndị mbụ zaghachiri bụ enyi m, Judah Letsoalo, bụ́ onye bụworo otu n’ime ụmụ klasị m na ụlọ akwụkwọ Kilnerton Training Institution.

Mụ na Judah gbara ịnyịnya ígwè 51 kilomita iji gaa mgbakọ nke Ndịàmà bụ ndị Africa na Pietersburg. Mgbe e mesịrị, ndị enyi sitere na Pietersburg na-abịakarị n’ogologo ụzọ ahụ nile ruo Mamatsha iji nyere m aka iche ozi Alaeze ahụ n’ihu ndị agbata obi m. N’ikpeazụ, ná mgbakọ ọzọ na Pietersburg, na December 1944, e mere m baptism ná ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Jehova.

Ezinụlọ M na Ndị Ọzọ Azaghachi

Caroline, Priscilla, na ada m bụ́ Damaris, nọgidere na-aga Chọọchị Dutch Reformed. Mgbe ahụ ihe ọdachi dakwasịrị anyị. Caroline mụrụ nwa anyị nke abụọ​—⁠nwa nwoke yiri ka o nwere ahụ ike, bụ́ onye anyị kpọrọ Samuel. Ma ná mberede ọ dara ọrịa ma nwụọ. Ndị enyi Caroline bụ́ ndị chọọchị ya akasighị ya obi, na-ekwu na Chineke chọrọ ka ya na nwa anyị nwoke nọrọ n’eluigwe. N’obi ịda mba, Caroline nọgidere na-ajụ, sị: “N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji kpọpụnahụ anyị nwa anyị nwoke?”

Mgbe okwu banyere ihe ọdachi anyị ruru Ndịàmà nọ na Pietersburg ntị, ha bịara ma nye anyị ezi nkasi obi nke dabeere n’Okwu Chineke. Caroline mesịrị kwuo: “Ihe Bible kwuru banyere ihe na-akpata ọnwụ, banyere ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ, na banyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ bụ ihe ezi uche dị na ya, a kasikwara m obi nke ukwuu. Achọrọ m ịnọ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ma nataghachi nwa m nwoke site n’ili.”

Caroline kwụsịrị ịga chọọchị, na 1946 kwa ya, Priscilla, na Judah bụ ndị e mere baptism. Mgbe na-adịghị anya ka e mesịrị ha baptism, Judah hapụrụ ụlọ iji mepee ọrụ nkwusa ahụ n’ime ime obodo ebe a na-akpọ Mamahlola, ọ nọgidekwara na-ekwesị ntụkwasị obi ruo oge ọ nwụrụ na 1991.

Mgbe Judah hapụrụ, ọ bụ nanị m bụ nwoke fọdụrụ ilekọta ọgbakọ anyị, bụ́ nke a kpọrọ Boyne. Mgbe ahụ Gracely Mahlatji kwabatara n’ókèala anyị, n’ikpeazụkwa ọ lụrụ Priscilla. Kwa izu, mụ na Gracely na-ekwu okwu ihu ọha onye kwuo ibe ya ekwuo na Sepedi, bụ́ asụsụ Africa nke ndị bi n’ebe ahụ na-asụ. Iji hụ na ndị mmadụ nwere akwụkwọ e ji amụ Bible, Society gwara m ka m sụgharịa akwụkwọ gaa na Sepedi. O nyere m ezi afọ ojuju ịhụ ka ndị mmadụ na-erite uru n’akwụkwọ nke a.

Iji mee ka nkwusa ihu ọha anyị dakwuo ụda, anyị zụtara ígwè okwu phonograph nke nwere ihe na-eme ka ụda olu buo ibu iji kpọọ okwu ihu ọha Bible n’efere egwu n’ókèala anyị nile. Anyị gbazitere ụgbọ ịnyịnya ibu na-adọkpụ iji buru ihe ọrụ nke a dị arọ site n’otu ebe ruo ebe ọzọ. Dị ka ihe si na ya pụta, ndị agbata obi anyị kpọkwasịrị anyị aha ọzọ bụ́ “Ndị Chọọchị Ịnyịnya Ibu.”

Ka ọ dị ugbu a obere ọgbakọ anyị a nọgidewo na-eto. Mgbe e mesịrị, ụmụnne m ndị inyom abụọ tọrọ m na ndị di ha ghọrọ Ndịàmà, ha nile nọgidekwara na-ekwesi ntụkwasị obi ruo ọnwụ ha. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị sitere n’ọgbakọ Boyne (nke a na-akpọ ugbu a Mphogodiba) weere ọrụ ime nkwusa oge nile, ụfọdụ n’ime ha kwa ka nọ n’ozi ahụ. Taa, e nwere ọgbakọ abụọ n’ógbè nke a buru ibu nke nwere ime obodo ndị nọsasịrị anọsasị, na ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ihe karịrị 70 ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike n’ọrụ nkwusa ahụ.

Ọrụ Ọhụrụ

Na 1949, akwụsịrị m ịkụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ ma ghọọ onye ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ọrụ mbụ e kenyere m bụ ịkpọtụrụ ndị ojii na-arụ ọrụ n’ugbo bụ́ ndị bi n’ugbo nke ndị ọcha nwe n’ebe dị gburugburu Vaalwater na Transvaal. Ụfọdụ ndị nwe ugbo kwadoro nchepụta ịkpa òkè agbụrụ bụ́ nke a nakweere n’oge na-adịbeghị anya, wee kpebisiekwa ike na ndị ojii kwesịrị ikwenyere ọnọdụ ịdị ala a sị na ha dị n’ebe ndị ọcha nọ, kwesịkwa ijere ndị ọcha nwe ha ozi. Ya mere mgbe m mere nkwusa nye ndị ojii na-arụ ọrụ, ụfọdụ ndị ọcha n’ụzọ na-ezighị ezi weere m ịbụ onye na-ekwusa nnupụisi nye ndị isi. Ọbụna ụfọdụ boro m ebubo ịbụ onye Kọmụnist ma yie m egwu ịgbagbu m.

M kọọrọ alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society ihe banyere ọnọdụ ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya e zigara m n’ebe ọzọ ịrụ ọrụ n’otu ime ime obodo nke a na-akpọ Duiwelskloof. Ihe dị ka n’oge a, nwunye m hapụkwara ọrụ nkụzi ya ma sonyere m n’ozi ọsụ ụzọ ahụ. N’otu ehihie na 1950, anyị lọtara ozi ubi ịhụ otu envelop buru ibu nke sitere n’aka Society. N’ịbụrụ anyị ihe ịtụ n’anya, ihe dị nime ya bụ òkù a kpọrọ m ịnata ọ̀zụ̀zụ̀ dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Ruo afọ atọ anyị letara ọgbakọ dị iche iche na South Africa, mgbe ahụkwa na 1953 e kenyere anyị ọrụ na Lesotho, mba ala ndị ọzọ gbara gburugburu n’etiti South Africa.

Ije Ozi n’Ime Lesotho na Botswana

Mgbe anyị malitere ije ozi na Lesotho, e nwere ọtụtụ okwu a na-ekwugharị ebe nile na ndị bịara abịa bụ ndị a na-egbukarị maka iji mee ememe. O chegburu ma mụ ma nwunye, ma ịhụnanya nke ụmụnna anyị ndị Sotho na ile ọbịa ha nyeere anyị aka n’oge na-adịghị anya ichefu egwu ndị dị otú ahụ.

N’ije ozi n’ọgbakọ dị iche iche n’Oké Ugwu Maluti dị iche iche nke Lesotho, m na-eji ụgbọ elu, na-ahapụ nwunye m n’ebe ndị na-abụghị ugwu bụ́ ebe ọ nogidere n’ọrụ ọsụ ụzọ ahụ ruo mgbe m lọtara. Ndị enyi jiri obi ọma dupụ m site n’otu ọgbakọ ruo n’ọzọ iji nyere m aka izere ifu n’ugwu ndị ahụ.

N’otu oge a gwara m na iji ruo n’ọgbakọ nke na-esonụ, na ọ ga-adị mkpa ka anyị jiri ịnyịnya gafee Osimiri Orange. E mesiri m obi ike na ịnyịnya m dị nro ma a dọrọ m aka ná ntị na mgbe mmiri siwere oké ike, ịnyịnya na-anwakarị ịtụpụ ibu ndị o bu. M nwere nchegbu n’ihi na amaghị m ma otú e si agba ịnyịnya nke ọma ma ọ bụ ka e si egwu mmiri nke ọma. N’oge na-adịghị anya anyi banyere n’ime mmiri ahụ, mmiri ahụ gbagorutere n’elu ebe a na-anọkwasị ịnyịnya n’elu. Egwu tụrụ m nke ukwuu nke na m hapụrụ eriri e ji eduzi ịnyịnya ahụ ma jidesie ajị dị n’olu ya ike. Lee ihe nkuda ume ọ bụ mgbe anyị rutere n’ofe nke ọzọ nke akụkụ mmiri ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụla!

N’abalị ahụ o siiri m ike ihi ụra n’ihi na ahụ gburu m mgbu nke ukwuu n’ihi ịgba ịnyịnya ahụ. Ma o kwesịrị ihe isi ike ahụ nile n’ihi na ndị enyi ahụ gosiri ekele dị ukwuu n’ihi nleta ahụ. Mgbe m malitere ọrụ sekit na Lesotho, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 113 ndị nkwusa. Taa, ọnụ ọgụgụ ahụ etowo ruo 1,649.

Na 1956 a gbanwere ọrụ nkwusa anyị gaa Ógbè Ọchịchị Bechuanaland, bụ́ nke a na-akpọ ugbu a Botswana. Botswana bụ mba ka buo ibu, a ga-agakwa ogologo njem karị iji rute ndị nkwusa nile. Anyị na-eji ụgbọ okporo ígwè ma ọ bụ gwongworo a na-emechighị azụ ya emechi eme njem. E nweghị oche, ya mere anyị aghaghị ịnọdụ n’ala, anyị na ibu anyị. Ọtụtụ mgbe anyị na-erute ebe anyị na-eje n’oké ike ọgwụgwụ na ntụ. Ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst na-anabata anyị mgbe nile, ihu ha nke na-egosi obi ụtọ na-enyekwa anyị ume ọhụrụ.

N’oge ahụ, a machibidoro akwụkwọ dị iche iche nke Society iwu na Botswana, ya mere a na-eji akọ na-eme nkwusa ụlọ n’ụlọ anyị, n’ejighị akwụkwọ Society. N’otu oge a hụrụ anyị mgbe anyị na-arụ ọrụ n’ebe dị nso ime obodo nke Maphashalala, e wee jide anyị. N’ịzara ọnụ anyị, anyị gụrụ site na Bible, na-ezo aka n’ọrụ e nyere anyị dị ka e dekọrọ ya na Matiu 28:​19, 20. Ọ bụ ezie na nke a masịrị ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị ahụ, onye isi ahụ nyere iwu ka a pịa Ndịàmà nọ n’ebe ahụ ihe. Mgbe ahụ, n’ịbụ ihe ịtụ n’anya nye anyị, onye ụkọchukwu rịọrọ onye isi ahụ ka o mee ebere ma gbaghara anyị. Onye isi ahụ kwenyere, e wee hapụ anyị.

N’agbanyeghị nsogbu na mmachibido a machibidoro akwụkwọ anyị, ọrụ Alaeze ahụ nọgidere na-aga n’ihu. Mgbe m bịarutere na Botswana, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 154 ndị nkwusa. Afọ atọ mgbe nke a gasịrị mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, ọnụ ọgụgụ ahụ etowo ruo 192. Taa, e nwere 777 Ndịàmà nke Jehova na-eme nkwusa n’ala ahụ.

Izi Ihe na Ịsụgharị Asụsụ

Ka oge na-aga, e jiri m mee ihe dị ka onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze maka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst. Ka oge na-aga enwetara m ihe ùgwù nke ịbụ onye nkụzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ndị Ọsụ Ụzọ. Site n’oge ruo n’oge mụ na nwunye m na-eje ozi n’alaka nke South Africa. N’oge ndị dị otú ahụ, enyere m aka n’ịsụgharị asụsụ, Caroline rụkwara ọrụ na kichin.

Otu ụbọchị na 1969, onye nlekọta alaka ahụ, bụ́ Frans Muller, bịakwutere m wee sị: “Nwanna Thongoana, ọ ga-amasị m ịhụ gị na nwunye gị n’ọfis m.” N’ebe ahụ ọ kọwara na anyị esonyewo ná ndị ahụ a họpụtara dị ka ndị ga-eso jee Mgbakọ “Udo n’Elu Ụwa” nke 1969 na London. Anyị nwere obi ụtọ n’ile ọbịa ịhụnanya nke Ụmụnna anyị n’England na Scotland, o mekwara ka ekele anyị maka òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ baa ụba.

N’ime iri afọ anọ gara aga, Caroline abụwo onye na-esonyere m nke na-eguzosi ike n’ihe n’ọrụ anyị dị ka ndị nkwusa oge nile. Anyị ekerịtawo ọtụtụ ọṅụ na ụfọdụ iru újú n’otu. Ọ bụ ezie na ụmụ anyị abụọ nwụnahụrụ anyị, ada anyị nwanyị, bụ́ Damaris, tolitere ịbụ ezi Onyeàmà, o kerekwara òkè n’ọrụ nsụgharị asụsụ n’alaka dị na South Africa.

Ahụ ike anyị adịghịzi enye anyị ohere n’ikere òkè n’ọrụ njegharị ahụ, ya mere kemgbe afọ ole na ole gara aga, anyị abụwo ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’otu ọgbakọ na Seshego, otu obodo ukwu nke Africa nke dị nso Pietersburg. M na-eje ozi dị ka onyeisi oche ndị nlekọta. Bible na-ekwu na “ojuju afọ ọṅụ dị n’ihu [Jehova],” n’ezie achọtawokwa m ọṅụ na afọ ojuju n’ijere Chineke ozi n’ebe ọdịda anyanwụ Africa.​—⁠Abụ Ọma 16:11.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ịgba àmà n’obodo ukwu nke Seshego, South Africa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya