Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w01 12/1 p. 8
  • “Nọmba Ị Kpọrọ Abụghị Ya”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Nọmba Ị Kpọrọ Abụghị Ya”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enwetara M Afọ Ojuju n’Ijere Chineke Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nọgide Na-akụ Mkpụrụ—Jehova Ga-eme Ka O Too
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ihe Anyị Ga-eme Ka Obi Na-eru Anyị Ala
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ime Ma Ọ Bụrụ na Enyi M Abaa ná Nsogbu?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
w01 12/1 p. 8

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Nọmba Ị Kpọrọ Abụghị Ya”

NA Johannesburg, South Africa, Leslie na Caroline nọ na-eme onye kpọọ ibe ya akpọọ ka ha ji telifon na-agba àmà n’otu ógbè ndị lara ezumike nká bi bụ́ nke a na-eche nche na ya. Ha nwetara mmadụ ole na ole n’ebe obibi ha, ndị ha nwetara enwechaghịkwa mmasị n’ozi ndị Kraịst ha na-ezi, n’ihi ya, Caroline nwetara agbamume mgbe otu nwanyị zara ya.

“Ọ̀ bụ Odozi Akụ̀ B—?” ka Caroline jụrụ.

“Mba, ọ bụghị ya,” ka otu olu yiri nke enyi kwuru, “abụ m Odozi Akụ̀ G—. Nọmba ị kpọrọ abụghị ya.”

N’ịchọpụta mmetụta na-ekpo ọkụ o nwere n’ụda olu ya, Caroline kwuru, sị: “Ọ dị mma, ka m kọwaara gị ihe m chọrọ ịgwa Odozi Akụ̀ B—.” Mgbe ahụ, ọ malitere ikwu banyere ngọzi nke Alaeze Chineke na-abịanụ. Mgbe ha mesịrị ndokwa iweta broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, Odozi Akụ̀ G— jụrụ sị: “Cheregodị, olee okpukpe ị na-ekpe?”

“Anyị bụ Ndịàmà Jehova,” ka Caroline zara.

“Mba, ọ bụghị okpukpe ahụ! Echeghị m na m chọrọ ịhụ gị.”

“Ma Odozi Akụ̀ G—,” ka Caroline rịọrọ, “n’ime minit 20 gara aga, esorowo m gị kerịta olileanya kasị ebube, na-akọwa site na Bible ihe Alaeze Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ n’isi nso. Obi dị gị nnọọ ụtọ ịnụ ihe ndị a—ọbụna i nwere mkpali—ị chọkwara ịmụtakwu ihe. Gịnị ka ị maara n’ezie banyere Ndịàmà Jehova? Ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa, ị̀ ga-agakwuru onye odozi ụgbọ? Gịnị ma m gwa gị ihe Ndịàmà Jehova kweere?”

Mgbe ọ gbasịrị nkịtị ruo oge ụfọdụ, o kwuru, sị: “Echere m na ihe i kwuru bụ eziokwu. Ọ ka mma ka ị bịa. Ma buru n’uche na ị gaghị atọghata m ma ọlị!”

“Odozi Akụ̀ G—, agaghị m atọghatali gị ọbụna ma a sị na m chọrọ ime otú ahụ,” ka Caroline zaghachiri. “Ọ bụ nanị Jehova ga-emeli ya.”

Nleta ahụ ha yiri iji weta broshuọ ahụ gara nke ọma, Odozi Akụ̀ G— (Betty) kwetakwara ka ọ bịa ọzọ. Mgbe Caroline bịaghachiri, Betty gwara ya na ya agwala ndị inyom ya na ha na-erikọ nri n’otu tebụl na ya na Ndịàmà Jehova na-enwe nkwurịta okwu. “Maka gịnị?” ka ha jụrụ ya, na-agba n’aka. “Ndị ahụ ekweghịdị na Jisọs!”

Caroline chetaara Betty ozugbo banyere otu isi ihe ha tụlere ná nkwurịta okwu ikpeazụ ha banyere Alaeze Chineke.

“Ònye ga-abụ Eze ya?” ka Caroline jụrụ.

“Ọ bụnụ Jisọs,” ka Betty zara.

“Ọ bụ ya,” ka Caroline kwuru. Mgbe ahụ, ọ gara n’ihu ịkọwa na Ndịàmà Jehova kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, ma na ya na Chineke ahaghị nhata dị ka akụkụ nke Atọ n’Ime Otu.—Mak 13:32; Luk 22:42; Jọn 14:28.

Mgbe ha letasịrị ya ugboro ole na ole ọzọ, ọ bịara doo anya na, n’agbanyeghị na Betty nwere mmụọ dị mma na nke obi ụtọ, ahụ adịghị ya. N’ezie, ọ na-arịa ọrịa cancer ma na-atụ egwu ọnwụ. “Ọ dị m ka ya bụrụ na m nụrụ ihe ndị a ọtụtụ afọ gara aga ma nwee ụdị okwukwe i nwere,” ka o kwupụtara. Caroline kasiri ya obi site n’igosi ya akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-akọwa ọnwụ dị ka oké ụra nke mmadụ pụrụ isi na ya bilie ná mbilite n’ọnwụ. (Jọn 11:11, 25) Nke a bụ nnọọ ihe agbamume nye Betty, bụ́ onye a na-amụrụ Bible ugbu a n’ụzọ chiri anya. Ọ bụ nanị ahụ ike ya na-akawanye njọ gbochirila ya ịga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Caroline na-ekwu, sị: “O doro m anya na ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ a. Nọmba Betty ‘abụghị nọmba m bu n’obi ịkpọ,’ cheekwa nnọọ echiche, ọ dị afọ 89!”—Mkpughe 14:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya