Wezụga Onwe Gị Mgbe Ihe Ize Ndụ Na-abịa
MMADỤ ole na ole na-enwe nchegbu banyere ihe ize ndụ karịa ndị na-akwọ ụgbọ mmiri. Ha aghaghị ịdị na-eleru ihu igwe anya, ntoju na ntalata nke osimiri, na ụgbọ ha ịnọ nso n’ụsọ osimiri. Mgbe ma ọnọdụ ito eto na ntalata nke osimiri na ikuku jikọrọ aka na-akwaga ụgbọ mmiri n’ikpere mmiri, ndị na-akwọ ụgbọ na-eche ọrụ dị ike na ihe ize ndụ ihu.
N’ọnọdụ ndị a—nke a maara dị ka ikuku ịkwapụ ụgbọ—onye na-akwọ ụgbọ na-ahụ na e nwere ohere zuru ezu maka mmiri n’etiti ụgbọ ya na ụsọ osimiri ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na e ji nanị ákwà ụgbọ mmiri na-anya ụgbọ ahụ. Otu akwụkwọ ịkwọ ụgbọ mmiri na-akọwa na ‘ịbụ onye e jidere n’oké ikuku nso ikpere mmiri bụ ma eleghị anya ọnọdụ kasị njọ’ nke onye na-akwọ ụgbọ mmiri pụrụ inweta onwe ya. Olee ihe ngwọta a na-atụ aro ya? ‘Ekwela mgbe ọ bụla ka a chọta ụgbọ gị n’ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ.’ Ụzọ ihe ize ndụ na-adịghị ya isi zere ịbụ onye ájá dị n’oké osimiri ma ọ bụ ụsọ osimiri bụ nkume nkume kpuru ụgbọ ya bụ ịnọte nnọọ aka n’ebe ihe ize ndụ dị.
Ndị Kraịst aghaghị ịdị na-enwe nchegbu banyere ihe ize ndụ ndị pụrụ ikpu okwukwe ha ihu. (1 Timoti 1:19) N’ụbọchị ndị a, ọnọdụ adịghị mma ma ọlị maka ime ihe n’ụzọ na-aga were were. Dị nnọọ ka ụgbọ mmiri pụrụ ịbụ nke ikuku na mbili na ntalata nke mmiri pụrụ ịkwapụ n’ụzọ, otú ahụ ka ndụ anyị raara nye pụrụ ịghọ nke na-enwekwaghị nduzi n’ihi ọgụ anụ ahụ anyị na-emehie emehie nọgidere na-alụ na mwakwasị na-adịghị akwụsị akwụsị nke mmụọ nke ụwa—nke yiri ikike nke oké ifufe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ugbu a.
Otu Nwoke nke Biri Ndụ n’Ụzọ Dị Ize Ndụ
Lee ka o si dị mfe ịnwa ịbanye ná mmiri dị ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ n’amaghị ama!
Tụlee ihe nlereanya nke mere na nso otu mmiri ala gbara gburugburu, Osimiri Nwụrụ Anwụ. Anyị na-ezo aka n’ihe atụ nke Lọt. Mkpebi ya ibi n’ime Sọdọm wetaara ya ọtụtụ nsogbu na oké iru újú. Mgbe e nwesịrị esemokwu n’etiti ndị na-akpara ha anụ, Abraham na Lọt kwetara ibiri n’ebe ndị dị iche iche. Lọt, ka a gwara anyị, họọrọ Gburugburu Ala Jọdan wee maa ụlọikwu ya n’etiti obodo ndị dị na Gburugburu Ala ahụ. E mesịa, o kpebiri ibiri n’ime Sọdọm, ọ bụ ezie na ụzọ ndụ ndị Sọdọm na-ewute ya.—Jenesis 13:5-13; 2 Pita 2:8.
N’ihi gịnị ka Lọt ji nọgide na-ebi n’obodo nke jupụtara n’omume rụrụ arụ nke mejọrọ Jehova nke ukwuu ọbụnakwa kpata mkpu ákwá nke ọha mmadụ site n’ọnụ ndị bi ya nso? Sọdọm bara ọgaranya, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na nwunye Lọt nwere mmasị n’uru ihe onwunwe nke ndụ n’obodo ukwu. (Ezikiel 16:49, 50) Ma eleghị anya ọbụna Lọt bụkwa onye ọnọdụ akụ̀ na ụba dị mma nke Sọdọm dọọrọ mmasị ya. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya mere o ji biri ebe ahụ, o kwesịrị ịhapụwo n’oge karịa ka o mere. Ọ bụ nanị mgbe ndị mmụọ ozi Jehova siri ọnwụ ka ezinụlọ Lọt mesịrị hapụ ebe ahụ dị ize ndụ.
Ihe ndekọ Jenesis na-asị: “Mgbe chi bọrọ, ndị mmụọ ozi ahụ nụkpọrọ Lọt, sị, Bilie, chịrị nwunye gị, na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a hụrụ n’ebe a: ka e wee ghara ikpochapụ gị n’ahụhụ ajọ omume obodo a.” Ma ọbụna mgbe ịdọ aka ná ntị ahụ dị ngwa gasịrị, Lọt ka nọ “na-egbu oge.” (NW) Ndị mmụọ ozi ahụ mesịrị “jide aka ya, jidekwa aka nwunye ya, jidekwa aka ụmụ ya ndị inyom abụọ; n’ihi na Jehova nwere ọmịiko n’ahụ ya: ha wee mee ka ọ pụta, mee ka ọ nọdụ n’azụ obodo.”—Jenesis 19:15, 16.
Ná mpụga obodo ahụ, ndị mmụọ ozi ahụ nyere ezinụlọ Lọt ntụziaka ndị ikpeazụ: “Wepụga onwe gị n’ihi ndụ gị; elegidela anya n’azụ gị, eguzokwala na Gburugburu ala a nile; wepụga onwe gị jee n’ugwu ahụ, ka e wee ghara ikpochapụ gị.” (Jenesis 19:17) Ọbụna mgbe ahụ, Lọt rịọrọ ka e kwere ka ọ gaa n’obodo Zoa dị nso kama ịhapụ ógbè ahụ kpam kpam. (Jenesis 19:18-22) N’ụzọ doro anya, Lọt na-egbu oge iwepụga onwe ya ruo ókè o kwere omume site n’ihe ize ndụ.
N’ụzọ ịga Zoa, nwunye Lọt leghachiri anya na Sọdọm, ma eleghị anya na-enwe agụụ maka ihe ndị ọ hapụrụ. N’ihi ileghara ntụziaka ndị mmụọ ozi anya, ọ tụfuru ndụ ya. Lọt—nwoke ezi omume—lanarịrị mbibi obodo ahụ ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ. Ma lee aha ọnụ ahịa ọ kwụrụ maka ịhọrọ ibiri nso n’ebe ihe ize ndụ dị!—Jenesis 19:18-26; 2 Pita 2:7.
Ịchara Ihe Ize Ndụ Ụzọ
Ahụmahụ dị ilu nke Lọt na-egosi ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na anyị abịa nso ma ọ bụ nọgide n’ebe dị ize ndụ. Ihe amamihe ga-abụ anyị ịghara mgbe ọ bụla, dị ka ndị na-akwọ ụgbọ mmiri nke ọma, ikwere ka anyị banye n’ọnọdụ ọjọọ dị otú ahụ. Olee ebe ọjọọ ụfọdụ anyị kwesịrị ịchara ụzọ? Ụfọdụ ndị Kraịst akpafuwo site n’itinyebiga aka ókè n’ihe azụmahịa, site n’ịzụlite ọbụbụenyi chiri anya nke ha na ndị ụwa, ma ọ bụ ijikọ onwe ha n’ụzọ mmetụta uche n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha nọ, bụ́ onye ha na-apụghị ịlụ alụ.
Ụzọ nke amamihe, n’ọnọdụ nke ọ bụla, bụ ịnọte aka pụọ n’ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, ànyị mụ anya n’ebe ihe ize ndụ ime mmụọ nke ihe a sị na ọ bụ ohere azụmahịa magburu onwe ya dị? Ụmụnna ụfọdụ etinymiwo onwe ha n’ọrụ azụmahịa n’ụzọ na-ebibi ezinụlọ ha, ahụ ike ha, na ibu ọrụ ha dị iche iche nke ọchịchị Chineke. Mgbe ụfọdụ, ihe ndọrọ ya na-abụ ụzọ ndụ ntụsara ahụ kanụ nke ego pụrụ iweta. N’oge ndị ọzọ ọ bụ ihe ịma aka nke ịnwapụta ịbụ ọkaibe ha n’azụmahịa. Ụfọdụ pụrụ iche na ebumnobi ha bụ ime ka ụmụnna ndị ọzọ nwee ọrụ ma ọ bụ iji nwee ike ịtụnyekwu ụtụ ná mmesapụ aka maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ. Ma eleghị anya ha na-eche na mgbe azụmahịa ahụ na-aga nke ọma, ha ga-enwe oge ka ukwuu itinye n’ọdịmma Alaeze.
Olee ọnyà ụfọdụ dị na ya? Ọnọdụ akụ̀ na ụba a na-ejighị n’aka na “ihe ndabara” pụrụ ikpu ọrụ azụmahịa ọ bụla e meere atụmatụ kasị mma ihu. (Eklisiastis 9:11) Ịgbaso oké ụgwọ e ji mgba pụrụ iweta ahụhụ, ọ pụkwara iwezụga ihe ime mmụọ n’ụsọ. Ọbụnakwa mgbe azụmahịa na-aga nke ọma, o yikarịrị ka ọ ga-eri oge na ike ọgụgụ isi dị ukwuu, ọ pụkwara ịchọ ka e nwee ọtụtụ ndị ụwa a ga-eso na-akpakọrịta.
Otu okenye bụ́ onye Kraịst na Spain nọ n’oké ihe isi ike akụ̀ na ụba mgbe otu ụlọ ọrụ inshọransi kwere ya nkwa na-adọrọ adọrọ. Ọ bụ ezie na e nwere olileanya nke inweta ego buru ibu dị ka onye na-arụrụ ndị inshọransi ọrụ n’oge nke aka ya, o mesịrị jụ onyinye ahụ. “Ọ bụghị mkpebi dị mfe, ma obi dị m ụtọ na m sịrị mba,” ka ọ na-akọwa. “Otu ihe bụ na obi ekweghị m iji ndị m maara site n’ihe omume ọchịchị Chineke kpaa ego—ọbụna n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè. Ọ bụkwa ezie na m nwere mmasị ịbụụrụ onwe m onye isi, ọ gaara adịwo m mkpa ime ọtụtụ njem na itinye ọtụtụ hour n’ọrụ ahụ. Ọ ga-emesịa pụta mụ ileghara ezinụlọ m na ọgbakọ anya. Karịsịa, obi siri m ike na à sị na m nakweere onyinye ahụ, m gaara atụfuwo nchịkwa nke ndụ m.”
Ọ dịghị onye Kraịst ọ ga-adịrị mma ịtụfu nchịkwa nke ndụ ya. Jisọs gosiri ihe ọdachi ụzọ dị otú ahụ na-arụpụta site n’ịkọ ihe atụ nke otu nwoke nọgidere na-akwakọba akụ̀ iji laa ezumike wee tụsara ahụ ná ndụ ya. Ma kpọmkwem n’anyasị ahụ o kpebiri na ya emesịwo kpakọba ego zuru ezu, ọ nwụrụ. “Otú a ka ọ dị, bụ̀ onye na-akpadoro onwe ya akụ̀, ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ,” ka Jisọs dọrọ aka ná ntị ya.—Luk 12:16-21; Tụlee Jemes 4:13-17.
Anyị aghaghịkwa ịnọ na nche megide iso ndị ụwa kpakọrịta gabiga ókè. Ma eleghị anya ọ bụ onye agbata obi, enyi n’ụlọ akwụkwọ, onye ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ onye òtù azụmahịa. Anyị pụrụ iche sị, ‘Ọ na-akwanyere Ndịàmà ùgwù, ọ na-ebi ndụ dị ọcha, anyị na-ekwukwa banyere eziokwu ahụ mgbe mgbe.’ Ma, ahụmahụ nke ndị ọzọ na-anwapụta na mgbe oge na-aga anyị pụrụ ọbụna ịdị na-ahọrọ mkpakọrịta ndị ụwa dị otú ahụ karịa nke nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị n’ime mmụọ. Gịnị bụ ihe ize ndụ ụfọdụ n’ọbụbụenyi dị otú ahụ?
Anyị pụrụ ịmalite iwere ịdị ngwa nke oge ndị anyị bi n’ime ha n’ihe nta ma ọ bụ na-enwekwu mmasị n’ihe ndị a na-ahụ anya karịa n’ihe ime mmụọ. Ma eleghị anya, n’ihi egwu nke imejọ enyi anyị bụ́ onye ụwa, anyị ga-enwe ọbụna ọchịchọ nke ịbụ ndị ndị ụwa na-anakwere. (Tụlee 1 Pita 4:3-7.) Ọbụ abụ bụ́ Devid, n’aka nke ọzọ, họọrọ isoro ndị hụrụ Jehova n’anya na-akpakọrịta. “Aga m akọrọ ụmụnne m aha Gị: n’etiti mkpọkọta Gị ka m ga-eto Gị,” ka o dere. (Abụ Ọma 22:22) A ga-echebe anyị ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ihe nlereanya Devid, na-achọ ọbụbụenyi nke pụrụ iwuli anyị elu n’ime mmụọ.
Ụzọ ọzọ dị ize ndụ bụ nke ikekọta onwe anyị ná mmetụta uche n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nọ, bụ́ onye anyị na-enwereghị onwe anyị ịlụ. Ihe ize ndụ ahụ pụrụ ibilite mgbe mmadụ na-enwe mmasị n’onye mara mma, onye nkwurịta okwu ya na-akpali akpali, na onye na-ele ihe anya n’ụzọ anyị si ele, na-ejikwa otu ụdị ihe ndị ahụ anyị ji emere ihe ọchị emere ihe ọchị. Mmadụ pụrụ inwe mmasị ná mkpakọrịta ya, na-eche sị, ‘Amaara m ebe m ga-eru. Anyị bụ nanị enyi.’ Ka o sina dị, ozugbo a kpalitere mmetụta, ọ naghị adị mfe ịchịkwa ya.
Mary, nwanna nwanyị na-eto eto nke lụworo di, nwere mmasị ná mkpakọrịta Michael.a Ọ bụ ezi nwanna nwoke ma o siiri ya ike inweta ndị enyi. Ha nwere ọtụtụ ihe na-amasịkọrịta ha, ha hụkwara na ha pụrụ ịmakọ njakịrị ọnụ. O riri Mary isi na nwanna nwoke na-alụbeghị nwunye chọrọ ịdị na-agwa ya ihe nzuzo. N’oge na-adịghị anya, ihe yiri ọbụbụenyi ihe ọjọọ na-adịghị ya ghọrọ nkekọ mmetụta uche miri emi. Ha nọkọrọ ọnụ ọgụgụ oge karị ma mesịa mee omume rụrụ arụ. “M kwesịrị ịhụtawo ihe ize ndụ ahụ site ná mmalite,” ka Mary mara ọsụ kwuo. “Ozugbo ọbụbụenyi ahụ tolitere, o yiri ka ájá uzuzu na-eriri eriri nke na-erikpu anyị na-abami ime.”
Anyị agaghị echefu mgbe ọ bụla ịdọ aka ná ntị Bible, bụ́: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) Obi anyị dị aghụghọ, dị ka mbili mmiri nke na-akwara ụgbọ na-ese n’elu mmiri gaa ná nkume, pụrụ ịkwaga anyị ná mmekọrịta mmetụta uche na-eweta mbibi. Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Ọ bụrụ na i nwereghị onwe gị ịlụ alụ, rụsie ọrụ ike ịnọte anya n’ụzọ mmetụta uche pụọ n’ebe onye ị hụrụ na i na-enwe mmasị n’ebe ọ nọ nọ.—Ilu 10:23.
Ikewapụ na Ịnọgide Na-anọpụ n’Ebe Ihe Ize Ndụ Dị
Gịnị ma ọ bụrụ na anyị achọtaworị onwe anyị n’ihe ize ndụ ime mmụọ? Ndị na-akwọ ụgbọ mmiri, bụ́ ndị ikuku na mmali mmiri kwaara na-aga n’ikpere mmiri bụ nkume nkume, na-arụsi ọrụ ike ịkwọghachi ụgbọ ha n’ime osimiri, ma ọ bụ ịkpapụ nnọọ site n’ụsọ osimiri, ruo mgbe ha ruru mmiri ndị ka mma. N’otu aka ahụ, anyị aghaghị ịgba mgba iji kewapụ onwe anyị. Site n’ịṅa ntị ná ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, isi n’ala ala obi kpee ekpere maka enyemaka Jehova na ịchọ enyemaka site n’aka ụmụnna bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị tozuru okè, anyị pụrụ ịlaghachite n’ụzọ na-adịghị ize ndụ. A ga-eji udo nke uche na obi gọziekwa anyị ọzọ.—1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.
Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ọnọdụ anyị, ọ bụụrụ anyị ihe amamihe ịnọte nnọọ aka n’ebe “ihe nke ụwa” dị. (Ndị Galetia 4:3) N’adịghị ka Lọt, Abraham họọrọ ibipụ iche pụọ n’ebe ndị Kenean bụ́ ndị ụwa nọ, ọ bụ ezie na ọ pụtara ịdị na-ebi n’ụlọikwuu ruo ọtụtụ afọ. Ma eleghị anya o nweghị ihe ntụsara ahụ ụfọdụ nke ihe onwunwe, ma ụzọ ndụ ya dị mfe chebere ya n’ụzọ ime mmụọ. Kama ịbụ onye okwukwe ya kpuru ihu, ọ ghọrọ “nna nke ndị nile nwere okwukwe.”—Ndị Rom 4:11.
Ebe ụwa nke ime ihe na-atọ onwe onye ụtọ gbara anyị gburugburu bụ́ nke “mmụọ” ya na-adị ike mgbe nile, ọ dị anyị mkpa ịgbaso ihe nlereanya Abraham. (Ndị Efesọs 2:2) Ọ bụrụ na anyị anakwere nduzi Jehova n’okwu nile, a ga-agọzi anyị site n’inwe n’onwe anyị ahụmahụ nke nchebe ịhụnanya ya. Ọ ga-adị anyị ka ọ dịrị Devid: “Ọ na-eweghachi mkpụrụ obi m: ọ na-edu m n’ụzọ nile nke ezi omume n’ihi aha Ya. Nanị ịdị mma na ebere ga-agbaso m ụbọchị nile nke ndụ m: m ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ruo ogologo ụbọchị nile.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ịga “n’ụzọ nile nke ezi omume,” kama ịsọnye isi n’ụzọ nke dị ize ndụ, ga-eweta ngọzi ndị na-adịru ebighị ebi.—Abụ Ọma 23:3, 6.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
[Foto dị na peeji nke 24]
Ọ bụrụ na unu enwereghị onwe unu ịlụ, nọpụ ebe dị anya ná mmetụta uche pụọ n’ebe onye mara gị mma n’anya nọ