Bịa Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke”
ACHỌRỌ n’aka ndị ohu Jehova n’oge ochie n’okpuru Iwu Mosis ịbịakọta ọnụ ugbo atọ kwa afọ maka ememe ụfọdụ kpọmkwem. Ndị a bụ oge obi ụtọ na ndị na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ.—Deuterọnọmi 16:16.
N’oge ndị dị ugbu a ndị ohu Jehova n’otu aka ahụ na-abịakọta ọnụ ugbo atọ kwa afọ: maka ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, maka mgbakọ sekit ụbọchị abụọ, na maka mgbakọ distrikti na-ewe ụbọchị atọ ma ọ bụ anọ. N’ime afọ ije ozi 1994, Ndịàmà Jehova ga-abịakọta ọnụ maka Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke.”
Okwu Chineke na-eme ka a ghara inwe ịrụ ụka banyere ịdị mkpa nke egwu Chineke. E hotara ụdị egwu ahụ n’ime ya ihe dị ka 200 ugboro. Egwu Chineke bụ ihe nchebe, dị ka a pụrụ ịhụ site n’Ilu 16:6: “Egwu Jehova ka mmadụ ji esi n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” Ee, a gwara anyị n’Abụ Ọma 111:10 na egwu Chineke bụ mmalite amamihe!
A pụrụ ikwu na e nwere akụkụ abụọ nke egwu Chineke. Otu ihe bụ na egwu dị otú ahụ bụ nke ịhụnaya na-akpalite. Anyị na-atụ egwu imejọ Chineke n’ihi oké ịhụnanya anyị nwere maka ya. (Ilu 27:11) Ọzọkwa, amamihe n’akụkụ nke anyị ga-enye aka ịkụnye egwu Chineke n’ime anyị, ebe ọ bụ na anyị maara na Chineke bụ “ọkụ na-erechapụ” nye ndị nile na-eme ihe ọjọọ.—Ndị Hibru 12:29.
Ná Mgbakọ Distrikti “Egwu Chineke” anyị, anyị ga-anata ntụziaka na agbamume iji too eto n’egwu Chineke. A ga-enye nkụzi dị otú ahụ site n’okwu, ihe ngosi, na otu ihe nkiri, nakwa site n’ịkọ ahụmahụ dị iche iche.
Ọbụna dị ka e nyere ndị Israel oge ochie iwu ka ha ghara ịgba aka bịa mgbakọ ha dị iche iche, ya mere anyị kwesịrị ịchọ ime òkè nke anyị maka ọṅụ na ịga nke ọma nke mgbakọ anyị. (Deuterọnọmi 16:17) Anyị pụrụ ime nke a site n’igosipụta nkwanye ùgwù maka table Jehova. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịbịa n’oge, site n’igesi ntị ike n’ihe a na-ekwu site n’ikpo okwu, site n’iji obi dum sonye n’ịbụ abụ. Anyị agaghị na-ekere òkè ná mkparịta ụka na ime ngagharị mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Anyị ga-achọkwa itinye ihe ruo otú anyị nwere ike site n’inye onwe anyị n’afọ ofufo maka ije ozi dị iche iche. Nhazi mgbakọ na-agụnye ọtụtụ ngalaba, ndị ha nile chọrọ ndị ọrụ ga-arụ ọrụ na ha. Anyị ga-achọkwa inye onyinye ego, ruo n’ókè Jehova gọziworo anyị.
Ka ohu ọ bụla nke Jehova mee atụmatụ ugbu a iji nọrọ ya maka ụbọchị atọ ahụ dum nke Mgbakọ Distrikti “Egwu Jehova,” bido n’abụ mmepe n’ụtụtụ Friday ruo n’ekpere mmechi n’ehihie Sunday.
Ebe Ndị A Ga-eme Mgbakọ Distrikti na 1994
November 4-6, 1994
IKOT AKAN 1 (Efịk)
KADUNA (Bekee)
MGBOKO UMUORIA 1 (Igbo)
OTA 1 (Bekee)
UBOGO 1 (Ijaw)
UYO 1 (Efịk)
November 11-13, 1994
IKOT AKAN 2 (Efịk)
JOS (Bekee, Hausa)
MGBOKO UMUORIA 2 (Igbo)
OTA 2 (Bekee)
UBOGO 2 (Urhobo)
UYO 2 (Efịk)
November 18-20, 1994
AGBOR 1 (Bekee)
IBADAN 1 (Yoruba)
IMALA 1 (Yoruba)
KATSINA ALA (Bekee, Tiv)
MGBOKO UMUORIA 3 (Igbo)
OTA 3 (Yoruba)
UBOGO 3 (Urhobo)
UYO 3 (Efịk)
December 2-4, 1994
AGBOR 2 (Bekee)
BENIN CITY 1 (Bekee)
IBADAN 2 (Yoruba)
ILESHA 1 (Yoruba)
IMALA 2 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 4 (Igbo)
OTA 4 (Yoruba)
UBOGO 4 (Urhobo)
ULI 1 (Bekee)
UYO 4 (Bekee)
December 9-11, 1994
AGBOR 3 (Bekee)
BENIN CITY 2 (Bekee)
IBADAN 3 (Bekee)
IGWURUTA ALI 1 (Bekee)
IMALA 3 (Bekee)
ILESHA 2 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 5 (Igbo)
OTA 5 (Yoruba)
UBOGO 5 (Bekee)
ULI 2 (Igbo)
UYO 5 (Bekee)
December 16-18, 1994
AGBOR 4 (Bekee)
BADAGRY 1 (Gun)
BENIN CITY 3 (Bekee)
IBADAN 4 (Bekee)
IGWURUTA ALI 2 (Igbo)
ILESHA 3 (Bekee)
MGBOKO UMUORIA 6 (Igbo)
OTA 6 (Yoruba)
UBOGO 6 (Bekee)
ULI 3 (Igbo)
December 23-25, 1994
AGBANI 1 (Igbo)
AKURE 1 (Yoruba)
BADAGRY 2 (Yoruba)
BENIN CITY 4 (Bekee)
IGWURUTA ALI 3 (Abua)
IKOT EKPENE 1 (Efịk)
MGBOKO UMUORIA 7 (Igbo)
OTA 7 (Yoruba)
OYEDE 1 (Isoko)
UBOGO 7 (Bekee)
ULI 4 (Igbo)
December 30–January 1, 1995
MGBOKO UMUORIA 8 (Bekee)
OTA 8 (Yoruba)
January 6-8, 1995
AGBANI 2 (Igbo)
AKURE 2 (Yoruba)
BADAGRY 3 (Bekee)
BENIN CITY 5 (Edo)
CALABAR 1 (Efịk)
IGWURUTA ALI 4 (Ogoni)
IKOT EKPENE 2 (Efịk)
ILORIN 1 (Yoruba)
MGBOKO UMUORIA 9 (Igbo)
OKITIPUPA 1 (Yoruba)
OTA 9 (Bekee)
OYEDE 2 (Isoko)
ULI 5 (Igbo)
January 13-15, 1995
AGBANI 3 (Bekee)
AKURE 3 (Yoruba)
BADAGRY 4 (Bekee)
CALABAR 2 (Efịk)
IGWURUTA ALI 5 (Bekee)
IKOT EKPENE 3 (Efịk)
ILORIN 2 (Bekee)
MGBOKO UMUORIA 10 (Bekee)
OKITIPUPA 2 (Yoruba)
OTA 10 (Bekee)
OYEDE 3 (Isoko)
ULI 6 (Igbo)
January 20-22, 1995
AGBANI 4 (Bekee)
AKURE 4 (Bekee)
BADAGRY 5 (Bekee)
CALABAR 3 (Bekee)
IKOT EKPENE 4 (Bekee)
MGBOKO UMUORIA 11 (Bekee)
OTA 11 (Bekee)
OYEDE 4 (Bekee)
ULI 7 (Bekee)