Mkpụrụ—nke Ọma na nke Ọjọọ
“Jehova wee mee ka m hụ, ma, lee, nkata fig abụọ . . . Fig nke dị mma nke ukwuu dị n’otu nkata, dị ka fig nke buru ụzọ chaa: ma fig nke jọrọ njọ nke ukwuu dị na nkata nke ọzọ, nke a na-agaghị eri, site n’ịjọ njọ ha.”—JEREMAỊA 24:1, 2.
1. Olee otú Jehova si gosi ndị ya, bụ́ Israel, ọmịiko, ma olee otú ha si zaghachi?
AFỌ ahụ bụ 617 T.O.A. Ọ bụ nanị afọ iri tupu e mezuo ikpe ziri ezi nke Jehova megide Jerusalem na ndị ya. Jeremaịa anọworị na-eme nkwusa siri ike ruo 30 afọ. Rịba ama nkọwa doro anya nke Ezra kọwara ọnọdụ ahụ dị ka a na-achọta na 2 Ihe Emere 36:15: “Jehova, bụ́ Chineke nke ndị bụ nna ha, wee zigara ha ozi n’aka ndị ozi Ya, na-ebili n’isi ụtụtụ, na-ezikwa; n’ihi na O nwere ọmịiko n’ahụ ndị Ya na n’ebe ebe obibi Ya dị.” Gịnịkwa si n’ime mgbalị nile nke a pụta? N’ụzọ dị mwute, Ezra gara n’ihu ịkọ n’amaokwu nke 16, sị: “Ha wee na-eme ndị ozi Chineke ka ha bụrụ ihe ọchị, ha na-elelịkwa okwu Ya anya, na-emekwa onwe ha ndị aghụghọ n’ebe ndị amụma Ya nọ, ruo mgbe ọnụma Jehova lara elu imegide ndị Ya, ruo mgbe ngwọta na-adịghị.”
2, 3. Kọwaa ọhụụ dị ịrịba ama nke Jehova gosiri Jeremaịa.
2 Nke a ọ̀ pụtara na a ga-ekpochapụ mba Juda kpam kpam? Iji chọta azịza ya, ka anyị tụlee otu ọhụụ dị ịrịba ama nke e nyere Jeremaịa ugbu a, nke e dekọkwara n’isi 24 nke akwụkwọ ahụ a kpọkwasịrị aha ya. Chineke ji nkata mkpụrụ osisi fig abụọ mee ihe n’ọhụụ nke a iji mee ihe atụ nke ihe ndị mere n’etiti ndị ya nke ha na ya gbara ndụ. A ga-eji ụdị mkpụrụ abụọ pụrụ iche, nke ọma na nke ọjọọ, mee ihe nnọchịanya ndị a.
3 Jeremaịa isi 24, amaokwu nke 1 na 2, kọwara ihe onye amụma Chineke hụrụ: “Jehova wee mee ka m hụ, ma, lee, nkata fig abụọ a dọbara n’ihu ụlọ ukwu nke Jehova; mgbe Nebukadreza, bụ́ eze Babilọn, mesịrị ka Jekonaịa nwa Jehoịakim, bụ́ eze Juda, na ndị isi Juda, na ndị ọkà, na ndị ụzụ́, si na Jerusalem jee biri n’ala ọzọ, wee mee ka ha bịaruo Babilọn. Fig nke dị mma nke ukwuu dị n’otu nkata, dị ka fig nke buru ụzọ chaa: ma fig nke jọrọ njọ nke ukwuu dị na nkata nke ọzọ, nke a na-agaghị eri, site n’ịjọ njọ ha.”
Fig Ọma Ndị Dị n’Ọhụụ
4. Ozi dị aṅaa na-akasi obi ka ọhụụ ahụ nke mkpụrụ fig ndị ahụ nwere maka ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi?
4 Mgbe ọ jụsịrị Jeremaịa ajụjụ banyere ihe ọ hụrụ, Jehova gara n’ihu ikwu n’amaokwu nke 5 ruo 7, sị: “Dị ka ezi fig ndị a, otú a ka M ga-amata ndị Juda e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ndị M siri n’ebe a ziga n’ala ndị Kaldea, ime ha mma. N’ihi na M ga-atụkwasị ha anya m ime ha mma, M ga-emekwa ka ha lata n’ala nke a: M ga-ewukwa ha dị ka ụlọ, ghara ịkwada ha; M ga-akụkwa ha dị ka osisi, ghara ifopụ ha. M ga-enyekwa ha obi ịmara m, na Mụ onwe m bụ Jehova: ha ga-abụkwara m otu ndị, Mụ onwe m ga-abụkwara ha Chineke: n’ihi na ha ga-eji obi ha nile laghachikwute m.”
5, 6. (a) Olee otú e si ‘zilaga ụfọdụ ndị Israel, ime ha mma’ na Kaldea? (b) Olee otú Jehova si ‘tụkwasị anya ya maka ime mma’ n’ahụ ndị Israel na-ekwesị ntụkwasị obi nọ ná ndọrọ laa n’agha?
5 Ya mere o yiri ka site n’ihe Jehova kwuru n’ebe a na oge ka mma dị n’ihu, na a gaghị ekpochapụ mba Juda kpam kpam. Ma gịnị banyere ịdị mkpa nke nkata nke a nke fig ọma?
6 Jekonaịa, ma ọ bụ Jehoịakin, abụwo eze Juda ruo nanị ọnwa atọ na ụbọchị iri tupu o nyefee Jerusalem n’aka Eze Nebukadneza n’abụghị onye a manyere amanye. N’etiti ndị a dọọrọ ya na ha n’agha gaa n’ala ọzọ bụ Daniel na ndị Hibru enyi ya atọ bụ́ Hananaịa, Mishael, na Azaraịa, tinyere Ezikiel. Eze Babilọn chebere ndụ ha, ya mere a pụrụ ikwu na Jehova lere ndị a nile a dọtara n’agha anya dị ka ndị e zigara n’ala Kaldea, ime ha mma. Ị̀ rịbara ama na Jehova kwekwara nkwa ‘ịtụkwasị ha anya ime ha mma’? Olee otú e si mezuo nke a? Na 537 T.O.A., 80 afọ n’ihu, Jehova mere ka Eze Saịrọs nye iwu nke na-enye ohere ka ihe fọdụrụ n’ụmụ ha laghachi n’ala Juda. Ndị Juu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi wughachiri obodo Jerusalem; ha wuru ụlọ nsọ ọhụrụ maka ofufe nke Chineke ha, bụ́ Jehova; ha ji obi ha nile laghachikwuru ya. Ya mere n’ihe a nile, nye Jehova ndị a a dọọrọ n’agha na ụmụ ha yiri ezigbo fig bu ụzọ chaa.
7. Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka anya Jehova si dịkwasị òtù Jeremaịa nke oge a “ime ha mma”?
7 Ị pụrụ icheta na n’isiokwu bu ụzọ banyere okwu amụma dị iche iche nke Jeremaịa, anyị mụtara na ha nwere ihe ha pụtara nye narị afọ nke 20 anyị. Isi nke 24 apụghịkwa iche. N’ime afọ ndị ahụ gbara ọchịchịrị nke Agha Ụwa Mbụ, ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova raara onwe ha nye batara n’okpuru mmetụta nke Babilọn Ukwu ahụ n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Ma anya nlekọta Jehova ‘tụkwasịrị ha ime ha mma.’ Otú a kwa ka o si bụrụ na site n’aka Saịrọs Ka Ukwu ahụ bụ́ Kraịst Jisọs, Jehova bibiri ike Babilọn Ukwu ahụ nwere n’ahụ ha, ma jiri nwayọọ nwayọọ kpọbata ha n’ime paradaịs ime mmụọ. Ndị Israel ime mmụọ ndị a zaghachiri ma jiri obi ha nile laghachikwute Jehova. Mgbe ahụ, na 1931, ha ṅụrịrị ọṅụ ịnakwere aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. N’ezie, a pụrụ ikwu ugbu a na ha aghọwo ndị dị ka nkata nke ezi fig n’anya Jehova.
8. N’ụzọ dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova siworo kwusaa n’ebe nile ịdị ụtọ dị ka nke mkpụrụ fig nke ozi Alaeze ahụ?
8 Nzube nke amara Chineke n’ịtọhapụ ha site na Babilọn Ukwu ahụ efunahụbeghị Ndịàmà Jehova. Ha edebereghị onwe ha ịdị ụtọ yiri nke fig nke ozi Alaeze ahụ nke ozi ọma, kama ha akpọsawo ya n’ebe nile n’ikwekọ n’okwu Jisọs na Matiu 24:14: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” Gịnị sikwa n’ime ya pụta? Ihe karịrị 4,700,000 ndị yiri atụrụ, ndị na-abụghị ndị Israel ime mmụọ atọhapụwo onwe ha site na Babilọn Ukwu ahụ!
Fig Ọjọọ Ndị Dị n’Ọhụụ
9. Olè ndị ka fig ọjọọ ndị ahụ nke ọhụụ Jeremaịa nọchitere anya ha, gịnị gajekwa ime ha?
9 Ma gịnị banyere nkata fig ọjọọ ahụ n’ọhụụ Jeremaịa? Ugbu a Jeremaịa chere uche ya n’okwu Jehova ndị a na-achọta na Jeremaịa isi 24, amaokwu nke 8 ruo 10: “Dị ka fig ọjọọ ndị a, nke a na-agaghị eri eri, site n’ịjọ njọ ha; n’ezie otú a ka Jehova sịrị, Otú a ka M ga-ewere Zedekaịa, bụ́ eze Juda, na ndị isi ya, na ndị Jerusalem fọdụrụ, bụ́ ndị fọdụrụ n’ala nke a, na ndị bi n’ala Ijipt, nye: M ga-ewere ha nye ịbụrụ alaeze nile nke ụwa ihe ntụgharị, ịbụrụ ha ihe ọjọọ; ịbụ ihe ịta ụta, na ilu, na ihe àkụ̀kụ̀, na ihe nkọcha, n’ebe nile m ga-achụsa ha. M ga-ezigakwa mmà agha na oké ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe n’etiti ha, ruo mgbe a ga-eme ka ha gwụpụsịa n’elu ala ahụ nke M nyere ha, nyekwa ndị bụ nna ha.”
10. N’ihi gịnị ka Jehova ji were Zedekaịa ịbụ ‘fig ọjọọ’?
10 Ya mere Zedekaịa n’ezie mesịrị bụrụ “fig ọjọọ” n’anya Jehova. Ọ bụghị nanị na o nupụrụ isi megide Eze Nebukadneza site n’imebi ịṅụ iyi ọ ṅụrụ iguzosi ike n’ihe nye eze ahụ n’aha Jehova kamakwa ọ jụrụ kpam kpam ọmịiko Jehova gosiri ya site n’aka Jeremaịa. N’ezie, o ruru n’ókè nke ịkpọchi Jeremaịa! Ka a sịkwa ihe mere Ezra ji chịkọta àgwà eze ahụ dị ka o mere na 2 Ihe Emere 36:12: “O mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, bụ́ Chineke ya; o rughị ala.” N’anya Jehova Zedekaịa na ndị ahụ fọdụrụ na Jerusalem yiri nkata fig ọjọọ rere ure!
Fig Rere Ure nke Ihe Atụ n’Ụbọchị Anyị
11, 12. Olè ndị ka a kọwara ịbụ fig ọjọọ taa, gịnị ga-emekwa ha?
11 Ugbu a lee anya gburugburu ụwa taa. Ì chere na anyị pụrụ ịhụ nkata fig ọjọọ nke ihe atụ? Ka anyị tụlee ihe ndị bụ eziokwu site n’iji ụbọchị Jeremaịa tụnyere ụbọchị anyị. Na narị afọ nke 20 nke a, Jehova ejiwo òtù Jeremaịa, bụ́ ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ, mee ihe iji dọọ mba nile aka ná ntị mgbe nile banyere iwe ya na-abịanụ n’oge mkpagbu ukwu ahụ. Ọ gbara ndị si mba nile ume inye ya otuto nke kwesịrị aha ya, ife ya ofufe n’ime mmụọ na eziokwu, na ịnakwere Ọkpara ya na-achị achị, bụ́ Kraịst Jisọs, dị ka Onye Ọchịchị o ruuru ịchị ụwa. Olee otú e siworo meghachi omume? Dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Jeremaịa. Mba nile anọgidewo na-eme ihe ọjọọ n’anya Jehova.
12 Olè ndị bụ ndị na-akwalite omume nnupụisi nke a? Olè ndị nọgideworo na-eji ndị ozi ndị a nke Chineke, bụ́ ndị yiri Jeremaịa eme ihe ọchị site n’ịrụ ụka banyere ikike ha ime ihe dị ka ndị ozi Chineke? Olè ndị nọgideworo na-eme Okwu Chineke dị ka ihe na-abaghị uru? Olee ndị taa nọworo n’azụ ihe kanụ ná mkpagbu nile a na-akpagbu Ndịàmà Jehova? Azịza ya doro anya maka mmadụ nile ịhụ—ọ bụ Krisendọm, karịsịa ndị ụkọchukwu! Leekwa nnọọ anya n’ajọ mkpụrụ nile rere ure nke Krisendọm ndị a tụlere n’isiokwu bu ụzọ. Ee, e nwere n’ezie nkata fig ọjọọ nke ihe atụ n’ụwa taa. N’ezie, Jehova kwuru na ‘a gaghị eri ha eri n’ihi ịjọ njọ ha.’ Okwu Jehova gwara Jeremaịa na-ada ụda ruo ụbọchị anyị: ‘Ha ga-agwụpụsị’! Ngwọta agaghị adị n’iwe Jehova megide Krisendọm.
Ihe Mmụta Ịdọ Aka ná Ntị Nye Anyị
13. N’ihi okwu Pọl ndị a na-achọta ná 1 Ndị Kọrint 10:11, olee otú anyị kwesịrị isi ghọta ọhụụ nke nkata fig abụọ ahụ anya?
13 Ka anyị na-enyocha ihe ndị dị n’ozi ịdọ aka ná ntị Jeremaịa ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, okwu ndị ahụ nke onyeozi Pọl ná 1 Ndị Kọrint 10:11 na-ada ụda ná ntị anyị: “Ma ihe ndị a na-emeri ndị ahụ n’ụzọ ihe atụ; e wee dee ha n’akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.” Ànyị eburuwo n’obi ịdọ aka ná ntị ahụ e nyere anyị site n’ọhụụ nke a nke nkata fig abụọ? Ihe anyị nọworo na-atụle bụ akụkụ dị mkpa nke ihe ndị dakwasịrị Israel dị ka ihe atụ ịdọ aka ná ntị nye anyị.
14. Olee otú Israel si meghachi omume ná nlekọta dị nro nke Jehova?
14 N’ikpeazụ, ka anyị cheta okwu ndị ahụ Jehova gwara Eze Devid banyere Israel, dị ka a na-achọta na 2 Samuel 7:10: “M ga-edokwara ndị m, bụ́ Israel, otu ebe, kụọkwa ha dị ka osisi.” N’ụzọ dị nro Jehova lekọtara ndị ya, bụ́ Israel, n’ụzọ nile. E nwere ihe nile mere ndị Israel ga-eji mịa ezi mkpụrụ ná ndụ ha. Nanị ihe ha ga-eme bụ ige ntị n’izi ihe dị nsọ nke Jehova na idebe iwu ya nile. Ma, ọ bụ nanị ole na ole n’ime ha mere otú ahụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ gbara isi akwara nke ukwuu ma dị isi ike nke na ha mịrị mkpụrụ ọjọọ nke rere ure.
15. Olee otú Israel ime mmụọ taa na ndị na-esonyere ha yiri atụrụ siworo meghachi omume n’ọmịiko Jehova?
15 Otú ọ dị, gịnị banyere ụbọchị nke anyị? Jehova egosiwo ọmịiko dị ukwuu n’ebe ihe ya fọdụrụ nke Israel ime mmụọ na ndị yiri atụrụ na-esonyere ha nọ. Anya ya atụkwasịwo ha mgbe nile kemgbe a gbapụtara ha n’ụzọ ime mmụọ na 1919. Dị ka o buru n’amụma site n’ọnụ Aịsaịa, ha na-anata ntụziaka Chineke kwa ụbọchị site n’aka Onye Ozizi ahụ kasị ukwuu n’eluigwe na ala, bụ́ Jehova Chineke. (Aịsaịa 54:13) Izi ihe a nke Chineke, bụ́ nke a na-ezi site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Jisọs Kraịst arụpụtawo udo bara ụba n’etiti ha ma mee ka ha nọgide bụrụ ndị e webatara ná mmekọrịta chiri anya karị nke ha na Jehova. Lee nnọọ ọnọdụ ime mmụọ nke nke a na-eme ka anyị nile nwee iji mara Jehova, iji gee ya ntị, ma mgbe ahụ nọgide na-amị ezi mkpụrụ ná ndụ anyị—mkpụrụ nke na-ewetara Jehova otuto! Ọ pụtara kpọmkwem ndụ anyị!
16. Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi jiri ọhụụ nke nkata fig abụọ ahụ mee ihe n’onwe anyị?
16 Ma n’agbanyeghị amara Chineke nile, a ka nwere ụfọdụ ndị ghọworo ndị nnupụisi na ndị obi ha kpọrọ nkụ, dị ka ọtụtụ ndị mere na Juda oge ochie, bụ́kwa ndị mịrị mkpụrụ ọjọọ nke rere ure ná ndụ ha. Lee ka nke a si bụrụ ihe ọdachi! Ka onye ọ bụla n’ime anyị ghara ichefu ihe mmụta ịdọ aka ná ntị e mere ka o doo anyị anya site na nkata fig abụọ ahụ na mkpụrụ ha—nke ọma na nke ọjọọ. Ka ikpe kwesịrị ekwesị nke Jehova megide Krisendọm ahụ si n’ezi ofufe dapụ ji ọsọ na-abịaru nso karị, ka anyị tinye okwu ntụziaka Pọl onyeozi n’obi ma jiri ya mee ihe: “Unu jegharịa n’ụzọ kwesịrị Onyenwe anyị ime otú ọ ga-atọ Ya ụtọ n’ụzọ nile, na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ nile ọ bụla.”—1 Ndị Kọlọsi 1:10.
Ịtụleghachi—“Mkpụrụ—Nke Ọma na nke Ọjọọ” na paragraf nke 1-4 nke “Esemokwu Jehova na Mba Nile”
◻ Gịnị ka nkata fig ọma nọchitere anya ya?
◻ Olee otú nkata fig ọma ahụ nke ọhụụ siworo pụta ìhè?
◻ Ihe mmụta ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ozi Jeremaịa na-enye anyị?
◻ Gịnị kwesịrị ịrịba ama banyere afọ 607 T.O.A.? na 1914 O.A.?
[Foto dị na peeji nke 15]
Dị ka fig ọma, ndị Chineke amịpụtawo mkpụrụ na-atọ ụtọ nke Alaeze
[Foto dị na peeji nke 15]
Krisendọm egosipụtawo na ya dị ka nkata fig ọjọọ