AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 22-24
Ì Nwere “Obi Ị Ga-eji Mara” Jehova?
Jehova ji ụmụ mmadụ tụnyere mkpụrụ fig
Ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi a dọọrọ n’agha laa Babịlọn dị ka mkpụrụ fig ndị dị mma
Eze Zedekaya na ndị ọzọ na-ekwesịghị ntụkwasị obi, bụ́ ndị mere ihe dị njọ, dị ka mkpụrụ fig ndị mebiri emebi
Olee otú anyị ga-esi nweta ‘obi anyị ga-eji mara’ Jehova?
Jehova ga-enye anyị ‘obi anyị ga-eji mara’ ya ma ọ bụrụ na anyị amụọ Okwu ya ma mee ihe anyị mụtara
Anyị kwesịrị inyocha obi anyị nke ọma ma wepụ àgwà ọjọọ ma ọ bụ ọchịchọ ọjọọ ọ bụla nwere ike imebi mmekọrịta anyị na Jehova