“Zụọ Ọnụ, Ọ Bụghị Ụkwụ”
Ileba Anya n’Omenala Ọdịnala Dị Iche Iche nke Ili Ozu n’Africa
“HA ADỊGHỊ eli ndị ha nwụrụ anwụ!” Nke a bụ okwu a na-anụkarị banyere Ndịàmà Jehova n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Ma, a maara nke ọma na Ndịàmà n’ezie na-eli ndị ha nwụrụ anwụ.
Gịnị mere ndị mmadụ ji asị na Ndịàmà Jehova adịghị eli ndị ha nwụrụ anwụ? Ha na-eme otú ahụ n’ihi na Ndịàmà adịghị edebe ọtụtụ n’ime omenala obodo ndị na-ewu ewu maka ili ozu.
Omenala Ọdịnala Dị Iche Iche Maka Ili Ozu
Aliu bi n’otu obodo nta dị n’Ebe Etiti Nigeria. Mgbe nne ya nwụrụ, ọ gwara ndị ikwu ya maka ọnwụ ya ma mee ndokwa ka e nye okwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nne ya. N’ịbụ nke otu onye okenye n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na be ha nyere, okwu ahụ tụkwasịrị uche n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na olileanya na-akasi obi nke mbilite n’ọnwụ bụ́ nke e zoro aka na ya n’ime Bible. Mgbe okwu ahụ gasịrị, e liri nne Aliu.
Ndị ikwu ya were iwe nke ukwuu. Nye ha adịghị elicha ozu n’anọghị nche abalị, bụ́ nke a na-emekarị n’abalị na-esote mgbe onye ahụ nwụrụ. N’ógbè Aliu, nche abalị bụ oge ememe, ọ bụghị iru újú. A na-asa ozu ahụ ahụ, yikwasị ya uwe ọcha, ma dinakwasị ya n’elu àkwá. Ndị mmadụ nwụnahụrụ na-akpọ ndị oti egwú, zụọ ọtụtụ katọn mmanya biya na udu mmanya ọcha, meekwa ndokwa ka a chụọ otu oké ehi ma ọ bụ ewu n’àjà. Mgbe ahụ ndị ikwu na ndị enyi ga-abịa ịgụ egwú, ịgba egwú, iri nri, na ịṅụ mmanya ruo chi ọbụbọ nke ụbọchị na-esonụ.
N’oge ememe ahụ nile, a na-adọba nri n’ụkwụ ozu ahụ. A na-ebepụta ma na-edebe akụkụ ụfọdụ nke ntutu, mbọ aka, na mbọ ụkwụ nke onye ahụ nwụrụ anwụ maka “akwamozu nke abụọ.” Ọ na-ewere ọnọdụ ọtụtụ ụbọchị, izu, ma ọ bụ ọbụna afọ n’ihu.
N’ụbọchị na-eso nche abalị ahụ, a na-eli ozu ahụ, ọ bụ ezie na ememe ịkwa ozu ahụ ga-aga n’ihu ruo otu izu ma ọ bụ karịa. E mesịa, akwamozu nke abụọ na-ewere ọnọdụ. A na-ekechi akụkụ ndị ahụ nke ntutu, mbọ aka, na mbọ ụkwụ, n’ákwà ọcha, bụ́ nke a na-ekegide n’osisi plankị dị 1.5 mita ruo 1.8. N’ịkwụ n’ahịrị nke ịgụ egwú na ịgba egwú, a na-ebuga plankị ahụ n’ebe e liri ozu ahụ ma lie ya nso onye ọ na-anọchite anya ya. Ọzọkwa, a na-enwe oké ite egwú, ịṅụ mmanya, na oriri. Iji mechie usoro akwamozu ahụ, a na-agbapụ égbè mkpọnala n’igwe otu ugbo.
Ebe ọ bụ na Aliu enyeghị ohere maka nke ọ bụla n’ihe ndị a, e boro ya ebubo nke enweghị nkwanye ùgwù ọ bụla maka ma ndị nwụrụ anwụ ma maka ọdịnala ndị e ji asọpụrụ ha. Ma n’ihi gịnị ka Aliu, bụ́ Onyeàmà Jehova, ji jụ ime ọdịnala? N’ihi na akọ na uche ya agaghị ekwe ya ka ọ nakwere echiche okpukpe ndị ọdịnala ndị a dabeere na ha.
Nkwenkwe Ọdịnala Dị Iche Iche nke Africa
N’akụkụ nile nke Africa, ndị mmadụ kwenyere na mmadụ nile sitere n’ógbè ndị bụ mmụọ, na ha ga-alaghachikwa ebe ahụ. Ndị Yoruba na Nigeria kwuru, sị: “Ụwa bụ ahịa, ma eluigwe bụ ụlọ.” Ndị Igbo na-asịkwa: “Onye ọ bụla na-apụta ụwa ga-emesịakwa laa, n’agbanyeghị ogologo oge mmadụ gburu oge n’ụwa.”
Tụlee omenala ndị a kpọtụrụ uche na mbụ. Nzube nke ịnọ nche abalị bụ iji sị mmụọ ahụ jee nke ọma n’ụzọ dị mma. A na-ele ákwà ọcha anya dị ka uwe kwesịrị ekwesị maka ógbè ndị mmụọ. E jikọrọ ịdọsa nri n’ụkwụ ya na echiche nke na ozu ahụ na-esi n’ụkwụ eri nri, a ghaghịkwa inye ya nri ka agụụ ghara ịgụ ya ná njem ya ịga n’ala ndị nna nna ya.
Ọzọkwa, ndị mmadụ n’ozuzu ha kwenyere na mgbe mmụọ hapụrụ ahụ ahụ, ọ na-akwụgharị gburugburu ndị dị ndụ, ọ dịghịkwa alaghachikwuru ndị nna nna ya ruo mgbe e mesịrị jiri akwamozu nke abụọ tọhapụ ya. Ọ gwụla ma e mere akwamozu nke abụọ ahụ, ndị mmadụ na-atụ egwu na mmụọ ahụ ga-ewe iwe ma jiri ọrịa ma ọ bụ ọnwụ tie ndị dị ndụ ihe otiti. Mgbapụ égbè ahụ bụ iji “zipụ mmụọ ahụ” gaa eluigwe.
Ọ bụ ezie omenala ịkwa ozu dịgasị iche site n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ n’Africa, echiche bụ isi na-abụkarị na mmụọ na-alanarị ọnwụ nke ahụ. Nzube bụ isi nke usoro ememe ndị ahụ bụ iji nyere mmụọ ahụ aka ịza “òkù a na-akpọ ya ka ọ lata.”
A gbawo nkwenkwe na ihe omume ndị a ume site n’ozizi Krisendọm nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ na ofufe ọ na-efe “ndị nsọ.” Ihe atụ bụ okwu nke otu ụkọchukwu ndị agha na Swaziland bụ́ onye sịrị na Jisọs bịara, ọ bụghị iji bibie nkwenkwe ọdịnala dị iche iche, kama iji mezuo ma ọ bụ gosi izi ezi ha. Ebe ọ bụ na ndị ụkọchukwu na-edukarị ndú n’ihe a na-eme n’usoro ili ozu, ọtụtụ ndị na-eche na Bible na-akwado ma nkwenkwe ọdịnala ma omenala ndị na-esite na ha.
Ihe Bible Na-ekwu
Bible ọ̀ na-akwado nkwenkwe ndị a? Banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, Eklisiastis 3:20 na-asị: “Ha nile [ma mmadụ ma anụmanụ] na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.” Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa gaa n’ihu, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma banyere ndị nwụrụ anwụ, ha adịghị ama ihe ọ bụla, . . . ịhụnanya ha na ịkpọasị ha na ekworo ha alaworị n’iyi . . . e nweghị ọrụ ma ọ bụ atụmatụ ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe na Sheol [ili], ebe nke ị na-aga.”—Eklisiastis 9:5, 6, 10, NW.
Ndị a na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ na-eme ka o doo anya na ndị nwụrụ anwụ apụghị ịhụ anyị ma ọ bụ ịnụ okwu anyị ma ọ bụ inyere anyị aka ma ọ bụ imerụ anyị ahụ. Ọ̀ bụ na nke a ekwekọghị n’ihe ị hụworo? Ị pụrụ ịma banyere otu nwoke nke bara ọgaranya na nke nwere ike bụ́ onye nwụworo na onye ezinụlọ ya mesịrị taa ahụhụ, ọ bụ ezie na ha mezuru ememe akwamozu nile a na-eme n’omenala. Ọ bụrụ na nwoke ahụ nọ ndụ n’ógbè ndị bụ mmụọ, gịnị mere ọ dịghị enyere ezinụlọ ya aka? Ọ pụghị ime otú ahụ n’ihi na ihe Bible na-ekwu bụ eziokwu—ndị nwụrụ anwụ enweghị ndụ ma ọlị, ha “enweghị ike n’ọnwụ,” n’ihi ya ha enweghịkwa ike inyere onye ọ bụla aka.—Aịsaịa 26:14, NW.
Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, maara na nke a bụ eziokwu. Tụlee ihe mere mgbe Lazarọs nwụsịrị. Bible na-asị: “Ọ [Jisọs] sị ha [ndị na-eso ụzọ ya], Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka M wee kpọtee ya n’ụra. Ya mere ndị na-eso ụzọ Ya sịrị Ya, Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ dawo n’ụra, a ga-azọpụta ya. Ma Jisọs kwururịị okwu banyere ọnwụ ya.”—Jọn 11:11-13.
Rịba ama na Jisọs ji ọnwụ tụnyere ụra, izu ike. Mgbe o rutere Betani, ọ kasiri ụmụnne Lazarọs bụ́ Meri na Mata obi. Site n’ọmịiko, anya mmiri pụrụ Jisọs n’anya. Ma, ọ dịghị ụzọ o si kwuo ma ọ bụ mee ihe na-atụ aro na Lazarọs nwere mmụọ nke ka nọ ndụ ma na-achọ enyemaka iji ruo n’ala ndị nna nna ya. Kama nke ahụ, Jisọs mere ihe o kwuru na ya ga-eme. Ọ kpọtere Lazarọs n’ụra ọnwụ site ná mbilite n’ọnwụ. Nke a nyere ihe àmà nke na Chineke ga-emesịa jiri Jisọs kpọlite ndị nile nọ n’ili ncheta.—Jọn 11:17-44; 5:28, 29.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Guzopụ Iche?
Ọ̀ dị ihe dị njọ n’ikwenyere omenala nile nke akwamozu bụ́ ndị dabeere ná nkwenkwe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị? Aliu na ọtụtụ nde ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova kwenyere na e nwere ihe dị njọ. Ha maara na ọ ga-adị njọ—ọbụna bụrụ ihe ihu abụọ—ka ha kwado ihe omume ọ bụla nke dabeere n’ụzọ doro anya n’ozizi ụgha na ndị na-eduhie eduhie. Ha achọghị ịdị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị Jisọs katọrọ n’ihi ihu abụọ nke okpukpe.—Matiu 23:1-36.
Pọl onyeozi dọrọ onye ọrụ ibe ya bụ́ Timoti aka ná ntị, sị: “Ma Mmụọ Nsọ na-ekwuwa okwu, sị, na n’oge ikpeazụ ụfọdụ ga-ewezụga onwe ha n’ebe okwukwe anyị dị, na-aṅa ntị ndị mmụọ na-eduhie eduhie na ozizi nke ndị mmụọ ọjọọ, site n’ihu abụọ nke ndị na-ekwu okwu ụgha.” (1 Timoti 4:1, 2) Echiche nke na ihe a kpọrọ mmadụ nwụrụ anwụ dị ndụ n’ógbè ndị bụ mmụọ ọ̀ bụ ozizi ndị mmụọ ọjọọ?
Ee, ọ bụ. Setan Ekwensu, ‘nna ụgha,’ gwara Iv na ọ gaghị anwụ, na-egosi na ọ ga-anọgide ndụ n’anụ ahụ. (Jọn 8:44; Jenesis 3:3, 4) Nke ahụ na ịsị na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na-anọgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị abụghị otu ihe ahụ. Otú ọ dị, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-agbalịsi ike ichigharị ndị mmadụ ihu pụọ n’eziokwu nke Okwu Chineke site n’ịkwalite echiche nke na ndụ na-anọgide na-aga n’ihu mgbe a nwụsịrị. N’ihi na ha kwenyere ihe Chineke na-ekwu n’ime Bible, Ndịàmà Jehova enweghị ókè ọ bụla n’echiche na ihe omume ndị na-akwado ụgha Setan.—2 Ndị Kọrint 6:14-18.
Site n’izere ihe omume ili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ndị ohu Jehova enwetaworo onwe ha iwe nke ụfọdụ ndị na-ekweghị n’echiche ha. A napụwo Ndịàmà ụfọdụ ihe nketa ha. Ndị ọzọ abụwo ndị ndị ezinụlọ ha mapụrụ n’iwu. Otú ọ dị, dị ka ezi ndị Kraịst, ha ghọtara na nrubeisi n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke na-eweta iwe ụwa. Dị ka ndị ozi na-eguzosi ike n’ihe nke Jisọs Kraịst, ha kpebisiri ike “ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29; Jọn 17:14.
Ka ha na-enwe ncheta ọma banyere ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ anwụ, ezi ndị Kraịst na-agbalịsi ike igosipụta ịhụnanya maka ndị dị ndụ. Dị ka ihe atụ, Aliu akpọbatawo nne ya n’ebe obibi ya mgbe nna ya nwụrụ, nyekwa ya nri ma lekọtaa ya ná ndụ ya nile fọrọnụ. Mgbe ndị ọzọ kwuru na Aliu elekọtaghị nne ya n’ihi na o lighị ya n’ụzọ omenala na-ewu ewu, o zoro aka n’okwu a na-ekwukarị n’etiti ndị ya: “Zụọ ọnụ m tupu ị na-azụ ụkwụ m.” Ịzụ ọnụ, ma ọ bụ ilekọta mmadụ mgbe ọ ka nọ ndụ, dị mkpa nke ukwuu karịa ịzụ ụkwụ, ihe omume e bu ụzọ kọwaa na nke e jikọrọ ya na ịnọ nche abalị mgbe mmadụ nwụsịrị. Ịzụ ụkwụ, n’ezie, adịghị abara onye nwụrụ anwụ uru ma ọlị.
Aliu jụrụ ndị na-akatọ ya sị, ‘Olee nke ị ga-ahọrọ—ka ezinụlọ gị lekọta gị ná nká gị ka ọ bụ ka ha mee oké oriri mgbe ị nwụsịrị?’ Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-ahọrọ ka e lekọta ha mgbe ha ka nọ ndụ. Ọ na-amasịkwa ha ịmara na mgbe ha nwụrụ, ha ga-enwe ememe ncheta dị ùgwù nke dabeere na Bible na olili ozu n’ụzọ dị mma.
Nke ahụ ka Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike imere ndị ha hụrụ n’anya. Ha na-azụ ọnụ, ọ bụghị ụkwụ.