William Whiston—Onye Mmụta Jụrụ Okwukwe ka ọ bụ nke Nwere Obi Eziokwu?
Ị̀ GA-ACHỤ ọrụ gị n’àjà maka ihe ndị i kwere na ha? William Whiston mere ya.
Ọ ghọrọ ihe na-akpata esemokwu okpukpe ná mmalite narị afọ nke 18, mgbe ọ gbaghara okwu Church of England banyere nkụzi dị iche iche nke Bible. N’ihi ya, e mesịrị kpọọ ya onye jụrụ okwukwe. Ụzọ ọ gbasoro si otú a wetara ya ịkwa emo ma wetakwara ya nkwanye ùgwù.
Ònye bụ William Whiston? Gịnịkwa ka ọ rụzuru?
Onye Mmụta Bible
William Whiston bụ onye maara akwụkwọ nke ya na Sir Isaac Newton gakọrọ Cambridge University. Ọ bụrụ na ị gụọ mbipụta Bekee nke ihe ndị onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Flavius Josephus dere, ma eleghị anya ị ga na-agụ nsụgharị Whiston mere na 1736. Ọ bụ ezie na nsụgharị ndị ọzọ dị, nsụgharị ya nke nkà mmụta, ya na nkọwa na edemede ya nile, enwebeghị nke yiri ya, a ka na-ebipụtakwa ha. Ụfọdụ na-ele ọrụ nke a anya dị ka nke kasị n’ihe ndị Whiston rụzuru.
Otú ọ dị, a gaghị eleghara Primitive New Testament anya, bụ́ nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst nke Whiston mere. E bipụtara ya na 1745, mgbe ọ gbara 78 afọ. Whiston sụgharịrị Oziọma anọ ahụ na Ọrụ Ndị Ozi site na Codex Bezae, akwụkwọ ozi ndị Pọl dere site na Clermont Codex, na akụkụ ndị fọdụrụnụ, gụnyere Mkpughe, site n’Ihe Odide nke Alexandra. O ji nlezianya hapụ akụkụ e webatara ewebata nke 1 John 5:7. Whiston họọrọ ihe odide Grik oge ochie atọ ndị a dị ka ndị kasị mma e nwere n’oge ahụ.
Ịhụnanya maka Bible aghaghị ịbụ ihe mkpali maka ihe Whiston mere. Ihe juru ebe nile n’oge ya bụ nkụzi nke na nanị usoro nchepụta echiche bụ ihe ndabere zuru ezu maka ikwere na Chineke. Dị ka akwụkwọ bụ́ William Whiston—Honest Newtonian na-ekwu, ọ kwadosiri ike “echiche achọghị mgbanwe nke na Bible bụ isi iyi na-adịghị ada ada e nwere nanị ya maka akụkọ ihe mere n’oge ochie.” Okwu ahụ bụ́ “Newtonian” [nke Newton] n’ebe a bụ izo aka n’ebe Isaac Newton nọ, onye a kasị mara maka akwụkwọ Principia ya, ebe ọ kọwapụtara iwu nke ike ndọda nke usoro eluigwe na ala. Echiche Newton nwere mmetụta miri emi n’ebe William Whiston nọ. N’ụzọ dị aṅaa?
Ọdịdị Mmadụ Dịgasị Iche
A mụrụ William Whiston na 1667, ọ bụ nwa nwoke nke otu ụkọchukwu nke Church of England. Mgbe e chisịrị ya ụkọchukwu na 1693, ọ laghachiri Cambridge University ịmụ mgbakọ na mwepụ wee ghọọ onye na-enyere Newton aka. Nkekọ chiri anya bilitere n’etiti ha. Mgbe Newton hapụrụ ọkwá ya dị ka Prọfesọ Lucasia nke Mmụta Mgbakọ na Mwepụ n’ihe dị ka na mgbe afọ atọ gasịrị, ọ hụrụ na a họpụtara Whiston n’ọnọdụ ya. Ka ọ na-arụ ọrụ ya, Whiston kụziri nkụzi ná mmụta inyocha mbara igwe na mgbakọ na mwepụ, ma mmetụta Newton kpalikwara ya itinyekwu mmasị miri emi n’ọgụgụ oge na ozizi Bible.
Newton bụ nwoke ji okpukpe kpọrọ ihe. Dị ka onye tinyere uche ya na Narị Afọ Iri nke Bible, o dere ihe dị ukwuu banyere amụma dị iche iche nke Daniel na Mkpughe. Otú ọ dị, ọ dịghị ka e nwere nke n’ime ihe odide ndị a e bipụtara n’oge ọ nọ ndụ. Ọ jụrụ ozizi Atọ n’Ime Otu. Ma mgbe a bịara n’ibipụta ihe àmà ya megide Atọ n’Ime Otu, “Newton lara azụ n’ihi egwu nke na a ga-amara echiche ya ndị megidere Atọ n’Ime Otu,” ka akwụkwọ The New Encyclopædia Britannica kwuru. F. E. Manuel tinyere ya otú a n’akwụkwọ bụ́ Isaac Newton, Historian: “Ndị òtù Newton debere echiche ha nzuzo ma ọ bụ jichie ịnụ ọkụ n’obi ha aka. . . . Ebe Newton na-ezo ọnụ, Whiston na-eti mkpu n’ọma ahịa.” Ndị ikom abụọ ahụ si otú a nwee ọdịdị mmadụ dịgasị iche.
Nkewapụ
Na July 1708, Whiston degaara achịbishọp nke Canterbury na York akwụkwọ, na-agba ume ka e nwee mgbanwe n’ozizi Church of England n’ihi nkụzi ụgha nke Atọ n’Ime Otu dị ka e gosiri ná Nkwenkwe Athanasius. O kwere nghọta na a dọrọ ya aka ná ntị ka ọ kpachara anya. Ma Whiston siri ọnwụ. “Amụrụwo m isi ihe ndị a ala,” ka ọ sịrị, “o dowokwa m nnọọ anya na chọọchị ndị Kraịst abụwo nke a nọworo ogologo oge na-aghọgbu n’ụzọ dị ukwuu n’isi ihe ndị a; site ná ngọzi Chineke, ọ bụrụkwa na ọ dị n’ike aka m, a gaghị aghọgbukwa ya ọzọ gaa n’ihu.”
Newton tụrụ egwu maka ọkwá ya n’ọha na eze na nke agụmakwụkwọ. Whiston n’aka nke ọzọ, atụghị. Ebe o guzobeworo nkweta ya ndị na-emegide Atọ n’Ime Otu, o dere otu akwụkwọ nta na-akọwa echiche ya. Ma n’August 1708, Cambridge University jụrụ inye Whiston laịsensị ibipụta akwụkwọ ahụ, ebe e lere ya anya dị ka nke na-emegide ihe ọha mmadụ kwenyere.
Na 1710, e boro Whiston ebubo ịkụzi ozizi na-emegide nkwenkwe Church of England. A mara ya ikpe, napụ ya ọkwá prọfesọ ya, chụpụkwa ya na Cambridge. Otú ọ dị, n’agbanyeghị usoro ikpe e kpere megide ya, bụ́ nke gara n’ihu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ise ọzọ, ọ dịghị mgbe a mara Whiston ikpe ịjụ okwukwe.
Ọ bụ ezie na echiche ya ndị megidere Atọ n’Ime Otu yiri nke Whiston, Newton azọchitereghị enyi ya, o mesịkwara kewapụ ya. Na 1754, akwụkwọ nkà mmụta Bible nke Newton nke na-ekpughe Atọ n’Ime Otu mesịrị bụrụ nke e bipụtara—27 afọ mgbe ọ nwụsịrị. Ma oge agafeela nke ukwuu inyere Whiston aka ọ bụla, bụ́ onye nwụrụ afọ abụọ tupu mgbe ahụ.
A na-echekwa na ọ bụ Newton kpatara igbochi Whiston isonye n’òtù ahụ a ma ama bụ́ Royal Society. Ma a kụdaghị Whiston obi. Ya na nwunye ya kwagara London, ebe o hiwere òtù Society for Promoting Primitive Christianity. O tinyere ume ya nile n’ide akwụkwọ, akwụkwọ ya kasị mkpa ka ọ dị na mgbe ahụ bụ mpịakọta anọ nke Primitive Christianity Revived.
Ọ Bụ Ihe Iseokwu ruo Ọgwụgwụ
Dị ka ọkà mmụta sayensị, Whiston rụrụ ọrụ n’ụzọ dị iche iche ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ga-esi na-amata ogologo ụwa n’elu mmiri. Ọ bụ ezie na a nakwereghị echiche ya, ya ịnọgidesi ike n’ọrụ mesịrị duga n’imepụta ígwè ọrụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ji amata oge na ebe ha nọ n’elu mmiri. Ọ bụ ezie na ọtụtụ n’ime echiche Whiston banyere amụma Bible, dị ka nke ndị biri n’oge ya, aghọwo ndị na-ezighị ezi, ọ dịghị ihe ọ na-akpaghị aka n’ọchịchọ ọ na-achọ eziokwu. Traktị ya dị iche iche banyere ngagharị nke kpakpando comet na nzọrọ ya nile banyere mmetụta nke Iju Mmiri ụbọchị Noa so n’ọtụtụ ihe ndị o dere iji gbachitere ma eziokwu nkà mmụta sayensị ma nke Bible. Otú ọ dị, nke kasị ihe nile ndị ọzọ o dere bụ ndị nke na-ekpughe ozizi Atọ n’Ime Otu dị ka nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị.
Dị ka àgwà ya si dị, Whiston hapụrụ Church of England na 1747. O mere otú ahụ ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ihe atụ, mgbe o si na chọọchị pụọ ka otu onye ụkọchukwu malitere ịgụ Nkwenkwe Athanasius. Akwụkwọ A Religious Encyclopædia na-ekwu banyere Whiston, sị: “Mmadụ aghaghị inwe mmasị n’obi ike nwoke ya n’ikwuwapụ okwu na àgwà ya nke ime ihe n’eziokwu, nguzosi ike nke ndụ ya, na omume ya nke ịkwụwa aka ọtọ.”
Nye William Whiston, a pụghị ịgwagbu eziokwu, ihe mmadụ kwere na ha dịkwa ọnụ ahịa karịa otuto na ịja mma nke ụmụ mmadụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye a na-esere okwu, Whiston bụ onye ọkà mmụta nwere obi eziokwu nke ji atụghị egwu kpọsaa Bible dị ka Okwu nke Chineke.—2 Timoti 3:16, 17.
[Ebe e si nweta foto Dị na peeji 26]
A natara British Museum ike