Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 5/15 p. 24-25
  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Thailand

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Thailand
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Gbara Ọsọ Agha Anụ Ozi Ọma Ahụ
  • Vidio Akpalite Mmasị
  • Na-enyere “Ndị Mbịarambịa” Aka Ka Ha ‘Jiri Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Gịnị Bụ Ihe Ngwọta Ya?
    Teta!—1996
  • Ọnụ Ọgụgụ Na-arị Elu nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ
    Teta!—1996
  • Ụwa Ebe Ụkwụ Ga-eru Onye Ọ Bụla Ala
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 5/15 p. 24-25

Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Thailand

“ALA ndị nweere onwe ha.” Nke ahụ bụ ihe aha ahụ bụ́ Thailand pụtara. Ihe karịrị 57,000,000 mmadụ dị nro, na-arụsi ọrụ ike, bụ́ ndị bi na ya nwere ọtụtụ echiche dị iche iche nke okpukpe. Ọ bụ ezie na okpukpe Buddha kasị, a na-ekpekwa okpukpe dị iche iche nke Krisendọm ná mba nke a nke ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Esia. Ọ dị ndị a nile mkpa ịnụ ozi ọma nke Alaeze Chineke.​—⁠Matiu 24:14.a

Ndị Gbara Ọsọ Agha Anụ Ozi Ọma Ahụ

N’ogige dị iche iche dịsasịrị n’ugwu nile nke Thailand n’akụkụ ókèala Myanmar, eziokwu Bible na-agba mkpọrọgwụ n’etiti ihe karịrị 10,000 ndị Karen gbara ọsọ agha. Ndị òtù nke otu ezinụlọ ndị Karen bi n’ógbè ahụ bụ Ndịàmà Jehova. Ha anọwo na-agbasa ozi ọma ahụ n’etiti ndị gbara ọsọ agha. Olee otú ọrụ ha si malite?

Ọtụtụ afọ gara aga otu nwa okorobịa kewapụrụ ihe nile jikọrọ ya na Chọọchị Anglikan ma ghọọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ịbụ ndị onye ụkọchukwu ha kwaliri, ndị ikwu ya megidere ya. Otú ọ dị, o ji ndidi tachie obi, mmegide ezinụlọ ya jikwa nwayọọ nwayọọ belata. Ndị ụkọchukwu nke Chọọchị Anglikan nọgidere na-akwa ya emo ruo ihe dị ka afọ abụọ gara aga mgbe a chụrụ ha n’ọrụ ha n’ihi omume rụrụ arụ. Ebe ọ bụ na chọọchị ahụ enweghị onye ọzụzụ atụrụ, ezinụlọ nwoke ahụ kpọmkwem na ndị ikwu ndị ọzọ nke Onyeàmà ahụ nọ n’ijuanya ma ghara inwe enyemaka ọ bụla. Iri na otu n’ime ha hapụrụ chọọchị ahụ ma rịọ Ndịàmà ka a mụọrọ ha ihe.

Ọmụmụ ihe a gara n’ihu nke ọma, na-enwe ndị ọzọ gbara ọsọ agha na-esonye. Eziokwu ahụ gbasara ngwa ngwa, na-akpata ime Ndịàmà ọhụrụ 17 baptism n’osimiri si n’ogige ndị gbara ọsọ agha ahụ na-asọfe. Lee ihe nkiri na-enye obi ụtọ ọ bụ mgbe e mikpuru otu nne ochie dị 88 afọ ná mmiri ya na ha!

Vidio Akpalite Mmasị

Ohere e nwere maka uto dị ukwuu n’etiti ndị gbatara ọsọ agha. Na 1993 n’’Ememe Ncheta, 57 mmadụ bịara. N’oge nleta onye nlekọta sekit na May nke afọ ahụ, 67 mmadụ zukọrọ maka otu n’ime okwu ndị o kwuru. Ihe dịkwa ka 250 zukọrọ ikiri vidio Watchtower Society bụ́ Jehovah’s Witnesses​—⁠The Organization Behind the Name.

Nwunye nke otu pastọ ndị Baptist n’ogige ndị gbara ọsọ agha ahụ bịara okwu ihu ọha nke Bible nke Ndịàmà ahụ na-ahụ maka ya ma rịba ama akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a tụlere. Ọ gwara di ya otú afọ si ghara ịdị na-eju ya n’okwuchukwu ndị a na-ekwughachi mgbe nile na chọọchị ha. O kwugidere ya, na-asị na ọ bụrụ na ọ ga-aga nzukọ Ndịàmà Jehova, ndị ọzọ nile nọ na parish ahụ ga-eso ya. Mgbe ọzọ ọ gara nzukọ ndị ahụ, di ya ji mmà chụso ya ma suo ihe ndị o deturu na akwụkwọ ya ndị e ji amụ Bible ọkụ. N’agbanyeghị nke a, mgbe e gosiri vidio ahụ, ọ bịara ọzọ. E mesịa nwanyị nke a gwara di ya ihe ọ hụrụ. Site n’obi gbanwere agbanwe, ọ chọrọ ịhụ vidio ahụ, nweekwa mwute na ya esuwo ihe ndị ahụ o deturu na akwụkwọ ya ndị e ji amụ Bible ọkụ.

Ya bụ na ndị mmadụ na-anụ ozi ọma ahụ na Thailand. Ha si otú a na-enweta nnwere onwe ime mmụọ ‘n’ala nke ndị nweere onwe ha.’​—⁠Jọn 8:32.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma lee 1994 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

Igbe dị na peeji nke 24]

IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ Afọ Ije Ozi 1993

ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 1,434

NKEZI: 1 Onyeàmà maka 40,299

NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 3,342

NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ ỌSỤ ỤZỌ: 232

NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 1,489

ỌNỤ ỌGỤGỤ E MERE BAPTISM: 92

ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 39

ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: BANGKOK

[Foto dị na peeji nke 25]

Ndị nkwusa Alaeze ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 25]

Alaka ụlọ ọrụ nke mbụ, 1947

[Foto dị na peeji nke 25]

Ezinụlọ Betel, n’ihu alaka ụlọ ọrụ nke ọhụrụ na Bangkok, a raara ya nye na February 8, 1992

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya