N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nwee Mmasị n’Okpukpe?
NÁ MBA ọ bụla dị n’elu ụwa, e nwere ndị nwere mmasị n’okpukpe. N’aka nke ọzọ, e nwekwara ọtụtụ ndị na-ekwu hoo haa na ha enweghị mmasị n’okpukpe. Ma hà nọrọwo na-eche otú ahụ mgbe nile?
Ọdịdị mmadụ bụ ụdị nke na mmadụ adịghị enwe afọ ojuju n’ezie n’ihe onwunwe nanị. Ihe ime mmụọ dị ụmụ mmadụ mkpa. Ndụ a na-adị kwa ụbọchị nke e wukwasịrị gburugburu ihe onwunwe ndị a na-ahụ anya, na ntụrụndụ a na-enwe mgbe ụfọdụ, adịghị egbo mkpa mmadụ nwere n’ime n’ụzọ zuru ezu. N’adịghị ka anụmanụ, ụmụ mmadụ chọrọ ịmata, ‘Gịnị bụ nzube nke ndụ?’ ‘Ndụ nke a dị mkpirikpi, nke gụnyere ọtụtụ ihe ndị dị mma na ọtụtụ ihe ndị na-adịghị mma, ọ̀ gwụla nke dịnụ?’ Ọ̀ bụ na ị jụbeghị ajụjụ ndị yiri ndị a?
N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ nde mmadụ ndị dị ndụ taa tolitere na gburugburu ọnọdụ ndị na-adịghị agba ume inwe mmasị ọ bụla nwere isi n’okpukpe. Mmetụta dị otú ahụ pụrụ isiteworị n’aka ndị mụrụ ha, ndị nkụzi, ndị ọgbọ, ma ọ bụ ọbụna site n’aka gọọmentị.
Skalabrino, bụ́ nwa okorobịa sitere Albania, kọwara na n’okpuru ọchịchị Kọmụnist, a kụzịịrị ndị mmadụ na Chineke adịghị. Ọzọkwa, ọ dị ize ndụ nye ha ikwu okwu banyere okpukpe; ime otú ahụ pụrụ iduje n’ịbụ onye a tụrụ mkpọrọ. Ma, na 1991, mgbe ọ nọ ná Switzerland dị ka onye gbara ọsọ ndụ, e nyere ya ohere nke ịmụ Bible. Ọ nakweere. N’ihi gịnị?
Otú ọ dị, n’Albania ọ nụrụ na e nwere akwụkwọ a na-akpọ Bible, ma ọ dịghị ihe ọ maara n’ezie banyere ya. Otú a, ná mmalite ọ pụrụ ịbụ na ọ bụghị kpọmkwem ọchịchọ ịghọta Bible bụ ihe kpalịrị ya. Ọ bụ ezie na a gwara ya na ọ ga na-amụ banyere nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ na elu ala, ọ hụkwara ya dị ka ohere o nwere iji meziwanye ojiji ọ na-eji asụsụ obodo ahụ ọ nọ na ya eme ihe. Otú ọ dị, ngwa ngwa ọ chọpụtara na ihe ọ na-amụta mejụrụ oké ọchịchọ ime mmụọ siri ike o nwere n’ime. Obi ụtọ juru ya obi n’ihi nkwa Chineke banyere ụwa ọhụrụ ebe udo ga-ejupụta, ụwa ebe ndị mmadụ pụrụ ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi wee nụ ụtọ ụbara nke ihe nile dị mkpa maka ndụ. A kpalikwuru mmasị ya mgbe ọ mụtara na ya na ezinụlọ ya pụrụ ịbụ akụkụ nke ụwa ọhụrụ nke a. Ebe ọ na-enweghị ike ijigide eziokwu ahụ nanị ya, ọ kpọrọ ezinụlọ ya nọ n’ebe dị anya n’Albania na fon iso ha kerịta ya.
Mmetụta nke ezi ihe ọmụma Bible pụrụ inwe ná ndụ mmadụ tụkwara Aleksei, bụ onye bi na Russia n’anya. N’ịbụ onye nsogbu dị iche iche rikpuru, n’enweghịkwa ike ịchọta nkọwa na-eju afọ nke nzube ndụ, o mere atụmatụ igbu onwe ya. Otú ọ dị, o bu ụzọ jee Finland ije leta otu enyi ya. Ka o so ụgbọ okporo igwe na-eje, ọ kọtaara ụfọdụ ndị njem ibe ya nsogbu ya. Otu Onyeàmà Jehova so n’ime ha, bụ́ onye gbara ya ume ịmụ Bible n’ihi na ọ na-enye ihe ngwọta nke nsogbu dị iche iche dị otú ahụ. O kwetachaghị. Ka ọ na-alaghachi, o nwekwara otu ụdị ahụmahụ ahụ ọzọ. Nke ugbu a, ọ bụ Onyeàmà ọzọ bụ onye kwuru okwu wee gwa ya na ya na-enwebu ụdị nsogbu ndị ahụ ma Bible enyeworo ya aka imeri ihe ndị a. Ọ gbakwara ya ume ịmụ Bible. Mgbe ọ larutere n’ụlọ, fon kụrụ. Ọ bụ enyi ya ọzọ so Ndịàmà na-amụ ihe ma nwee obi ụtọ dị ukwuu. Nwoke ahụ malitere ịghọta na ma eleghị anya, Bible pụrụ n’ezie inye ya ihe dị ya mkpa, ma ọ matara na ọ bụrụ na enyereghị ya aka, ọ pụghị ịghọta ya. O kwetara iso Ndịàmà Jehova na-amụchi Bible anya, ọ malitekwara ije nzukọ ha dị iche iche. O weghị ya ogologo oge ịghọta ihe mere ndị ahụ ji ihe Bible na-akụzi kpụzie ndụ ha ji enwe obi ụtọ dị ukwuu, n’agbanyeghị na ha na-echekwa nsogbu ndị na-emetụta mmadụ nile ihu.
N’ighọta ọdịdị mmadụ, Jịsọs Kraịst kwuru, sị: “Mmadụ apụghị ịdị ndụ nanị n’achịcha.” (Matiu 4:4, The New English Bible) O kwukwara, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị bụ ogbenye n’ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) Ngọzi ha na-abịa n’ihi na ha matara nke ọma mkpa na-akpa ha, na-emekwa ihe ndị kwesịrị ekwesi iji gboo ha, ma na-enweta ngọzi Chineke. Otú ọ dị, adịghị egbo mkpa ime mmụọ anyị nanị site n’isonyere otu chọọchị ma ọ bụ ije ihe omume dị iche iche nke okpukpe. Okpukpe nke jupụtara n’usoro mmeghachi ihe omume efu pụrụ ịdị na-amasị mmetụta uche, ma ọ̀ na-enye ihe ngwọta bụ ezie maka nsogbu dị iche iche nke ndụ? Ọbụna ma asị na òtù okpukpe na-akụzi ụkpụrụ ụfọdụ bụ́ isi ndị dị mma, ọ bụrụ na ọ dịghị akụzi ihe bụ nzube nke ndụ n’ezie, ọ̀ ga-egbo mkpa ime mmụọ gị? Ọbụna nke ka mkpa, ikpe okpukpe dị otú ahụ ọ̀ ga-eduje n’iso Chineke nwee ezi mmekọrịta? Ma enweghị nke ahụ, agaghị enwe ezi afọ ojuju.
N’akụkụ nke a, ọtụtụ ndị mmadụ na-achọgharị ihe ha na-achọtabeghị.
[Foto dị na peeji nke 3]
À ga-egbo mkpa ime mmụọ gị n’eziokwu site n’isonyere otu chọọchị?
[Foto dị na peeji nke 4]
Ọtụtụ ndị achọpụtawo na mgbe ha ghọtara Bible, ndụ ha na-enwe nzube ọhụrụ