Ọmụmụ Ihe Onwe Onye Ọ̀ Na-atọ Gị Ụtọ?
EZI onye ozi ọ bụla nke Chineke ga-enwe obi ụtọ itinye oge dị ukwuu n’ọmụmụ Bible onwe onye. (Abụ Ọma 1:1, 2) Ma, n’ihi inwe mmetụta nke ọtụtụ ihe na-eri oge na ume ha, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike itinye oge na ume dị ukwuu dị ka ha ga-achọ n’ọmụmụ ihe onwe onye.
Otú ọ dị, iji na-aga n’ihu dị ka ndị ozi na-arụsi ọrụ ike nke Chineke, ọ dị mmadụ nile mkpa ime ka ọṅụ na ume ha na-adị ọhụrụ kwa ụbọchị site n’ịchọpụta akụkụ ndị dị ọhụrụ ma ọ bụ ndị miri emi karị nke eziokwu nke Okwu Chineke. Eziokwu nile nke Bible ndị kpaliri gị n’ụzọ miri emi ọtụtụ afọ gara aga nwere ike ha agaghịkwa na-akpali gị otú ahụ ugbu a. N’ihi ya, ọ dị mma, ọbụna dị oké mkpa, na anyị na-eji uche anyị na-etinye mgbalị mgbe nile iji nweta nghọta ọhụrụ n’eziokwu ahụ iji wee nọgide na-akpali onwe anyị n’ime mmụọ.
Olee otú ndị ikom oge ochie nke okwukwe si mee ka ha sie ike n’ime mmụọ site n’ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke? Olee otú ụfọdụ ndị na-ejere Jehova ozi n’oge a siworo mee ka ọmụmụ ihe ha na-atọ ụtọ karị ma na-amịpụtakwu mkpụrụ? Olee otú e siworo nyeghachi mgbalị ha nile ụgwọ ọrụ?
Ha Mere Ka Ume Ha Dị Ọhụrụ Site n’Ọmụmụ Ihe Onwe Onye
Eze Josaịa nke Juda ji ịnụ ọkụ n’obi ọbụna nke ka ukwuu lụso ikpere arụsị ọgụ mgbe a gụsịịrị ya “akwụkwọ iwu Jehova nke e nyere site n’aka Mosis.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke ahụ abụghị oge mbụ ọ tụleworo akụkụ nke a nke Okwu Chineke; ma ịnụ ozi ahụ kpọmkwem site n’ihe odide mbụ ya kpaliri ya n’ọgụ ya maka ofufe dị ọcha.—2 Ihe Emere 34:14-19.
Daniel onye amụma ghọtara ‘ọnụ ọgụgụ afọ ahụ maka imezu mkpọmkpọ ebe nile nke Jerusalem’ na ịbụ eziokwu ya ọ bụghị nanị site n’akwụkwọ Jeremaịa kamakwa site ‘n’akwụkwọ anyị nile.’ Ndị a yikarịrị ka ọ gụnyere akwụkwọ ndị dị ka Levitikọs (26:34, 35), Aịsaịa (44:26-28), Hosea (14:4-7), na Emọs (9:13-15). Ihe o mesiri ike site n’ọmụmụ o ji ịdị uchu mụọ Bible dubara nwoke a ji okpukpe kpọrọ ihe n’ịchọ Chineke n’ekpere sitere n’ala ala obi. A zara arịrịọ ya sitere n’obi site ná mkpughe ndị ọzọ na mmesighachi obi ike n’ihe banyere obodo ahụ bụ́ Jerusalem nakwa ndị ya.—Daniel, isi nke 9.
Josaịa, onye ‘mere ihe ziri ezi n’anya Jehova,’ na Daniel, onye bụ “ihe a na-achọsi ike” n’anya Chineke, adịkebeghị iche n’ebe anyị nọ taa. (2 Ndị Eze 22:2; Daniel 9:23) Mgbalị onwe onye ha nile n’ihe banyere ọmụmụ ihe e ji nzube dị elu na-amụ Akwụkwọ Nsọ e nwere n’oge ahụ dubara ha n’ọnọdụ ime mmụọ kanụ ma nyere ha aka inwe ihe nkekọ ndị siri ike karị ha na Chineke. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ọtụtụ ndị oge ochie ndị ọzọ jeere Jehova ozi, dị ka Jefta, onye ọbụ abụ sitere n’ezinụlọ Esaf, Nehemaịa, na Stifen. Ndị a nile nyere ihe àmà nke ọmụmụ ihe onwe onye e ji nlezianya na-eme nke akụkụ Bible e nwere n’oge ha.—Ndị Ikpe 11:14-27; Abụ Ọma 79, 80; Nehemaịa 1:8-10; 8:9-12; 13:29-31; Ọrụ 6:15–7:53.
Ka Ozi ahụ Bụrụ Ihe Mkpali
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ejere Jehova ozi bụ́ ndị jewooro ya ozi ruo ọtụtụ afọ nwere usoro ihe omume nke ọmụmụ Bible onwe onye. Ha achọpụtawo na nke a dị mkpa iji nọgide na-amụ anya ma mezuo ibu ọrụ ha nke ndị Kraịst n’ụzọ zuru ezu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ n’ime ha na-ekweta na ọ dịghị mfe mgbe nile ịhazi ụzọ iji oge na ume ha na-eme ihe n’etiti ọmụmụ ihe na ihe ndị ọzọ a na-ekwesịghị ileghara anya.
Ma, ịnọgide na-amụ anya n’ime mmụọ site n’ọmụmụ ihe onwe onye e ji ịdị uchu na-amụ dị mkpa n’ịhụ maka mkpa dị iche iche nke ozi ndị Kraịst n’ọnọdụ nke a gaworo n’ihu nke ọrụ nkwusa Alaeze gburugburu ụwa. Ndị nghọta ndị dị ọhụrụ na ndị dị omimi karị n’Okwu Chineke na-akpali pụrụ ịnagide ihe ịma aka nke iru n’obi ndị agụụ na-agụ. Nke a bụ eziokwu ma è kenyere mmadụ ọrụ n’ebe a pụrụ ịtụ anya ịnwụde azụ dị ukwuu n’ụzọ nke ịkụ azụ ime mmụọ ma ọ bụ na mmadụ na-atachi obi n’ókèala a rụworo ọrụ nke ọma na ya n’ebe ihe jupụtara na ya bụ ọha mmadụ na-enweghị mmasị.
Na-eri Okwu Chineke Mgbe Nile
Ihe ndị ọzọ na-eme pụrụ inye gị echiche nke ụzọ ị pụrụ isi nụkwuo ụtọ nke usoro ọmụmụ ihe gị ma ọ bụ ụzọ gị na ezinụlọ gị pụrụ isi jiri oge ọmụmụ ihe mee ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ karị. N’ime ihe ndị onye na-ejere Chineke ozi na-agaghị achọ ịhapụ bụ ịgụ Okwu Chineke n’onwe ya mgbe nile. Ọtụtụ emewo ya ihe mgbaru ọsọ ha ịgụ ma ọ dịkarịa ala isiakwụkwọ atọ ruo anọ nke Bible kwa izu. Ị̀ chọrọ ịguzu Bible dum n’ime otu afọ? Mgbe ahụ ị ga-enwe obi ụtọ itinyekwu oge n’ịgụ ya, ma eleghị anya ọkara hour kwa ụbọchị.
Ị̀ gụsịwo Bible dum ihe karịrị otu ugbo? Gịnị ma i setịpụ ihe mgbaru ọsọ ọhụrụ n’oge ọzọ? Dị ka ihe mgbanwe, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst gụrụ akwụkwọ nile nke Bible dị ka ha si na-eso ibe ha. Ọ hụtara ọtụtụ ụmụ irighiri ihe, na-adabere n’echiche nke ọgụgụ oge, bụ́ ndị ọ na-ahụtaghị na mbụ. Nwanyị ọzọ bụ́ onye Kraịst agụwo Bible site ná mmalite ruo ná ngwụcha ugboro ise n’ime afọ ise gara aga, oge nke ọ bụla site n’ụzọ ile ihe anya dị iche. N’oge nke mbụ, ọ gụpụrụ ya nnọọ. N’oge ọgụgụ nke abụọ, o mere nchịkọta nke ihe dị n’isiakwụkwọ nke ọ bụla n’otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ n’akwụkwọ ndetu ihe. Site n’afọ nke atọ gaa n’ihu, ọ gafere ná mbipụta ka ibu nke nwere ntụaka, buru ụzọ na-atụle ntụaka ndị a họọrọ ahọrọ n’etiti ma mesịa na-eleru anya ná nkọwa ala ala peji nakwa n’ihe ọmụma a gbakwụnyere agbakwụnye. N’oge nke ise, o jiri map ndị dị na Bible mee ka nghọta ya rịa elu site n’echiche nke mmụta ọdịdị ala. Ọ na-asị: “Nye m, ịgụ Bible ghọrọ ihe na-atọ ụtọ dị ka nri.”
Ụfọdụ ndị mmụta na-anụ ọkụ n’obi nke Bible ahụwo ya dị ka ihe bara uru inwe otu Bible nke e ji enwe nanị ọmụmụ ihe onwe onye, na-edetu n’akụkụ ya okwu ndị na-akpali mmasị, ihe atụ ndị na-akpali iche echiche, ma ọ bụ nọmba peji nke akwụkwọ ndị ọzọ ha pụrụ ịga na ha ma e mesịa. Otu onye ozi oge nile na-ewere ya n’ihe obi ụtọ ná ngwụsị nke ọnwa ọ bụla idenye na nke o ji enwe ọmụmụ ihe isi ihe ndị ọhụrụ ọ mụtara n’ọnwa ahụ. “Ịtụ anya hour ndị a bụụrụ m oké ihe,” ka ọ na-ekwu, “na-enyere m aka iru ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ maka ọnwa ahụ ngwa ngwa karị.”
Echiche Ụfọdụ Magburu Onwe Ha
Ọ̀ na-eyi gị ka usoro ihe omume gị ò jupụtara n’ihe ndị a na-aghaghị ime kwa ụbọchị na kwa izu nakwa na i nwere mkpa maka aro ụfọdụ maka iji ntakịrị oge i nwere mee ihe nke ọma karị? Ọ dị mma, na-eji ihe i bu n’uche ịgụ, na-ejikwa oge ndị i ji ezu ike na-eme ihe. N’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ị na-amụkarị ihe, ruo n’ókè o kwere omume n’ụzọ ezi uche dị na ya, hazie akwụkwọ na ihe ndị ọzọ e ji amụ ihe ka ha wee dị mfe aka iru ha. Mee ka ebe ị na-amụ ihe na-edo ahụ ma ọ bụghị ka ọ na-enye ntụsara ahụ nke ukwuu nke na ị na-ero ụra. Ì nwere ihe omume ikwu okwu? Gụọ ihe ahụ n’oge kasị nso o kwere omume, mgbe ahụ kwee ka echiche dị iche iche na-abata gị n’ime mgbe ị na-ezu ike ma ọ bụ na-arụ ọrụ dị iche iche.
Ndị ọzọ pụrụ iso gị mee ihe n’iji oge gị mee ihe n’ụzọ ka mma maka abamuru nke unu nile. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ime ka mmadụ na-agụpụtara gị ihe dị mfe nghọta mgbe ị na-arụ ọrụ gị ma ọ bụ na-enye onye ji obi ọma na-agụrụ gị ihe ọjị. Gịnị banyere mmadụ nile n’ụlọ ikwekọrịta n’otu oge nke emeghị mkpọtụ maka ọmụmụ ihe onwe onye? “Gịnị tọworo gị ụtọ ịgụ ya n’oge na-adịbeghị anya?” Mgbe ụfọdụ ị pụrụ inwe ike inweta ihe ndị enyi gị mụtaworo site n’ịmalite mkparịta ụka n’ụzọ dị otú a.
Ì nwere mmasị n’iwebata echiche ndị ọhụrụ n’usoro ọmụmụ ihe gị? Ị pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke oge maka ịmụ ihe n’otu ụzọ ahụ ọtụtụ ndị na-esetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke oge maka ịgwa ndị ọzọ banyere Bible. Otu onye nkwusa oge nile (ọsụ ụzọ) setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ kasị nta maka hour ole na ole nke ọmụmụ ihe ma na-enwe obi ụtọ ka ọ na-ahụ ka chaatị ihe mgbaru ọsọ ya na-ejupụta. Ndị ọzọ na-ebelata oge maka ikiri telivishọn, sitekwa n’ụzọ dị otú ahụ wepụta oge maka ọmụmụ ihe. Ọtụtụ na-ahọrọ isiokwu ọmụmụ ihe nke ha na-agbaso ruo oge ụfọdụ, dị ka mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ọnọdụ dị gburugburu akwụkwọ Bible dị iche iche, ma ọ bụ nkà izi ihe. Ọ na-atọ ụfọdụ ụtọ ise chaatị ọgụgụ oge, dị ka ndị na-egosi ihe jikọrọ eze ndị Israel na ndị amụma ma ọ bụ Ọrụ Ndị Ozi na akwụkwọ ozi dị iche iche ndị Pọl dere.
Ndị na-eto eto, ùnu chọrọ okwukwe siri ike karị? Gịnị ma unu tụtụrụ otu akwụkwọ maka ịmụ ya nke ọma n’oge ezumike ụlọ akwụkwọ ọzọ? Otu nwa akwụkwọ kọleji nke e meworo baptism họọrọ Mankind’s Search for God, akwụkwọ Watch Tower Society na-ebipụta. Site n’isiakwụkwọ gaa n’isiakwụkwọ, o mere nchịkọta dị mkpirikpi n’akwụkwọ ndetu ihe nke ihe ọ mụtara. Ọ bụ ihe ịma aka ma wee oge dị ukwuu karịa otú o cheburu. Otú ọ dị, mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ahụ dum, ịbụ eziokwu nke ozi Bible nwere mmetụta dị omimi n’obi ya.
Na-anụ Ọkụ n’Obi Mgbe Nile Ịmụta Ihe
Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi n’oge a anọworị “na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Ọbụna site n’usoro ihe omume a hazigharịrị ahazi na mgbalị ndị sitere n’ezi obi, usoro ime ihe ị gbasoro n’otu izu nwere ike ọ gaghị agbanwe nke ukwuu. Ma, ịnụ ọkụ n’obi na-adịghị ada ada n’akụkụ nke gị inweta nghọta miri emi karị nke eziokwu ahụ na ịmụ anya nke ọma na-ele mmezu nke nzube dị iche iche nke Jehova ga-akpata ọdịiche.
Ọ bụ ihe agbamume ịnụ ụgwọ ọrụ nke ndị nweworo ọganihu n’usoro ọmụmụ ihe ha. Otu nwoke bụ́ onye Kraịst, n’ịghọta na ya na-atụfu àgwà nke dị mma n’ebe ịchọ nghọta miri emi karị nke eziokwu ahụ dị, haziri ndụ ya ka o wee tinyekwuo hour ndị ọ na-adịghị ihe ọ na-eme na ha n’ọmụmụ ihe onwe onye. “O wetaworo m obi ụtọ nke m na-enwebughị,” ka ọ sịrị. “Site n’obi ike na-arịwanye elu na Bible sitere n’aka Chineke, m na-achọpụta na m pụrụ ịgwa ndị ọzọ banyere okwukwe m site n’ezi ịnụ ọkụ n’obi. M na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a zụrụ nri nke ọma, nwee ahụ ike ime mmụọ, na afọ ojuju ná ngwụsị nke ụbọchị nke ọ bụla.”
Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova, onye na-eleta ọtụtụ ọgbakọ, kọwara abamuru ndị ọzọ n’ụzọ dị otú a: “Ndị dị uchu n’ọmụmụ ihe onwe onye na-ekpokarị ọkụ ma na-adị gara gara n’okwu ha. Ha na ndị ọzọ na-emekọtakarị ihe nke ọma, ọ naghịkwa adị mfe okwu ndị na-ezighị ezi site n’ọnụ ndị ọzọ ịkwagharị ha. Mgbe ha nọ n’ozi ubi, ha na-eme mgbanwe ma na-adịkwa nkọ n’ihe banyere mkpa nke ndị ha na-ezute.”
Ọ gbakwụnyere otu isi ihe nke ụfọdụ ndị pụrụ ịchọ iburu n’uche mgbe ha na-atụle usoro ọmụmụ ihe nke ha. “Ná nzukọ nile maka ntụle Akwụkwọ Nsọ, ọtụtụ na-achọ ịgụpụta azịza ha kpọmkwem site n’ihe e dere n’akwụkwọ ahụ. Ha ga-erite uru karị ma ọ bụrụ na ha ga-atụgharị uche n’ụzọ ihe ahụ si metụta ihe ha mụtaburu mbụ ma ọ bụ ndụ nke onwe ha.” Ì chere na ị pụrụ imeziwanye ihe n’akụkụ nke a?
Daniel onye amụma, mgbe ọ gafeworo 90 afọ ndụ nke ukwuu, echeghị na ya aghọtazuwo ụzọ nile nke Jehova. N’afọ ya ndị ikpeazụ, ọ jụrụ banyere otu okwu nke ọ na-apụghị ịghọta nke ọma: “Onyenwe m, Gịnị bụ mgbe ikpeazụ nke ihe ndị a?” (Daniel 12:8) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịnụ ọkụ n’obi nke a na-enweghị mgbanwe maka ịmụtakwu eziokwu Chineke bụ isi ihe kpatara iguzosi ike n’ezi ihe ya nke magburu onwe ya gabiga oge ndụ ya jupụtara n’ihe omume.—Daniel 7:8, 16, 19, 20.
Nke ọ bụla n’ime ndị na-ejere Jehova ozi enweghị ibu ọrụ dị nta iguzosi ike dị ka otu n’ime Ndịàmà Ya. Na-anụ ọkụ n’obi mgbe nile ịmụta ihe iji nọgide na-eme ka ị dị ike n’ime mmụọ. Gbalịa itinye otu ihe ọhụrụ ma ọ bụ abụọ n’usoro ọmụmụ ihe onwe onye gị kwa ụbọchị, kwa ọnwa, ma ọ bụ kwa afọ. Lee otú Chineke ga-esi gọzie obere mgbalị ọ bụla nke i mere. Ee, nụ ụtọ nke ọmụmụ Bible onwe onye gị na ihe ndị ọ na-arụpụta.—Abụ Ọma 107:43.