Ịmụ Ihe Na-enye Ụgwọ Ọrụ
Ị̀ HỤTỤWO ebe ndị mmadụ na-ahọrọ mkpụrụ osisi? Ihe ka ọtụtụ na-eleru anya n’otú ọ na-acha na otú ọ hà iji mata ma ọ̀ kaala aka. Ụfọdụ ndị na-esitụ mkpụrụ osisi ahụ n’imi. Ndị ọzọ na-emetụ ya aka, ọbụna na-apị ya aka. Ndị ọzọkwa na-ele ịdị arọ ya, na-ewere ya otu otu n’aka ha abụọ iji chọpụta nke ka nwee mmiri. Gịnị ka ndị a na-eche? Ha na-atụle ihe ụfọdụ, na-achọpụta ọdịiche ndị e nwere, na-echeta ndị ha họtara n’oge gara aga, jirikwa ihe ha na-ahụ ugbu a na-atụnyere ihe ha mabu ama. Ezi ụgwọ ọrụ na-echere ha n’ihi na ha ji nlezianya na-elebara okwu ahụ anya.
Ee, ụgwọ ọrụ nke ịmụ Okwu Chineke dị nnọọ ukwuu karị. Mgbe ọmụmụ ihe dị otú ahụ weere ọnọdụ dị mkpa ná ndụ anyị, okwukwe anyị na-esiwanye ike, ịhụnanya anyị na-emiwanye emi, ozi anyị na-amị mkpụrụ karị, mkpebi ndị anyị na-eme na-egosikwa ihe àmà ka ukwuu nke inwe nghọta na amamihe Chineke. Banyere ụgwọ ọrụ dị otú ahụ, Ilu 3:15 na-asị: “Ihe nile kwa nke na-atọ gị ụtọ, ha agaghị aha ka ya.” Ị̀ na-enweta ụgwọ ọrụ dị otú ahụ? Otú i si amụ ihe pụrụ iso kpebie nke ahụ.—Kọl. 1:9, 10.
Wepụta oge tụgharịa uche
Gịnị bụ ịmụ ihe? Ọ bụghị nanị ịgụ ihe elu elu. Ọ na-agụnye iji ike iche echiche gị were nlezianya na-atụle ihe ma ọ bụ ịtụle ya n’ụzọ sara mbara. Ọ na-agụnye ịtụle ihe ị na-agụ, iji ya na-atụnyere ihe ndị ị mabu, na ịrịba ama ihe a sị na ọ bụ ha kpatara e ji kwuo ihe ndị e kwuru. Mgbe ị na-amụ ihe, chemie echiche banyere ihe ọ bụla e kwuru nke pụrụ ịbụ ihe ọhụrụ nye gị. Ọzọ, tụlee otú gị onwe gị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu karị. Dị ka Onyeàmà Jehova, ị ga-achọkwa iche echiche banyere ohere ndị ị ga-eji jiri ihe ọmụma ahụ nyere ndị ọzọ aka. O doro anya na ịmụ ihe na-agụnye ịtụgharị uche.
Inwe Ọnọdụ Uche Kwesịrị Ekwesị
Iji rite uru n’ụzọ zuru ezu n’ọmụmụ ihe gị, dozie obi gị
Mgbe ị na-akwado ịmụ ihe, ị na-ewepụtasị ihe ndị dị ka Bible, akwụkwọ ọ bụla ị chọrọ iji mee ihe, pensịl ma ọ bụ mkpịsị akwụkwọ ide ihe, na, ma eleghị anya, akwụkwọ e ji edetu ihe. Ma ị̀ na-edozikwa obi gị? Bible na-agwa anyị na Ezra “doziri obi ya ịchọ iwu Jehova, na ime ya, na izi ụkpụrụ Ya na ikpe Ya n’Izrel.” (Ezra 7:10) Gịnị ka ndozi obi dị otú ahụ na-agụnye?
Ekpere na-eme ka anyị nwee ike iji ezi ọnọdụ uche na-amụ Okwu Chineke. Anyị chọrọ ka obi anyị, mmadụ anyị bụ n’ime, na-anabata ntụziaka nke Jehova na-enye anyị. Ná mmalite oge ọmụmụ ihe ọ bụla, rịọ Jehova maka enyemaka nke mmụọ ya. (Luk 11:13) Rịọ ya ka o nyere gị aka ịghọta ihe ihe ị ga-amụ pụtara, otú o si emetụta nzube ya, otú ọ pụrụ isi nyere gị aka ịghọta ọdịiche dị n’ihe ọma na ihe ọjọọ, otú i kwesiri isi tinye ụkpụrụ ya n’ọrụ ná ndụ gị, na otú ihe ọmụmụ ahụ si emetụta mmekọrịta gị na ya. (Ilu 9:10) Ka ị na-amụ ihe, “nọgide na-arịọ Chineke” maka amamihe. (Jes. 1:5) Jiri obi eziokwu nyochaa onwe gị dabere n’ihe ị na-amụta ka ị na-achọ enyemaka Jehova iji wepụ echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ ọchịchọ ọjọọ. ‘Were ekele na-azaghachi Jehova’ mgbe nile maka ihe ndị ọ na-ekpughe. (Ọma 147:7) Iji ekpere na-amụ ihe otú a na-eme ka mmadụ na Jehova nwee mmekọrịta chiri anya, ebe ọ bụ na ọ na-eme ka anyị nwee ike ịṅa ya ntị mgbe ọ na-agwa anyị okwu site n’Okwu ya.—Ọma 145:18.
Ịṅa ntị dị otú ahụ na-eme ka ndị Jehova dị iche n’ebe ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nọ. N’etiti ndị na-enweghị nsọpụrụ Chineke, ọ bụ ihe na-ewu ewu ịgbagha ihe e dere ede na ịrụ ya ụka. Ma nke ahụ abụghị àgwà anyị. Anyị tụkwasịrị Jehova obi. (Ilu 3:5-7) Ọ bụrụ na ọ dị ihe anyị na-aghọtaghị, anyị adịghị eji mpako kwubie na ọ ga-abụrịrị na o zighị ezi. Ka anyị na-achọ ma na-egwu ala maka azịza ya, anyị na-echere Jehova. (Maị. 7:7) Dị ka Ezra, ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ime na ịkụzi ihe anyị na-amụta. Ebe anyị nwere ọchịchọ obi dị otú a, anyị nọ n’ọnọdụ inweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu site n’ọmụmụ ihe anyị.
Ụzọ Isi Mụọ Ihe
Kama ịmalite na paragraf nke 1 ma gụrụ ya ruo ná ngwụsị, buru ụzọ wepụta oge lee isiokwu ma ọ bụ isiakwụkwọ dum nke dị n’ihe ọmụmụ ahụ anya. Malite site n’inyocha okwu ndị dị n’isiokwu ahụ. Nke a bụ isiokwu nke ihe ị na-aga ịmụ. Mgbe ahụ jiri nlezianya rịba ama njikọ dị n’agbata isiokwu nta dị iche iche na isiokwu ahụ. Tụlee ihe atụ, chaatị, ma ọ bụ igbe izi ihe ọ bụla dị n’ihe ọmụmụ ahụ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Dabere n’anya a m lere ya, gịnị ka m na-atụ anya ịmụta? N’ụzọ dị aṅaa ka ọ ga-esi baara m uru?’ Nke a na-eme ka ihe ị na-aga ịmụ nwee nzube.
Mata ihe ndị e ji eme nnyocha ndị e nwere n’asụsụ gị
Ugbu a nweta ihe ọmụma ndị ahụ. Isiokwu Ụlọ Nche ndị dịịrị ọmụmụ na akwụkwọ ụfọdụ na-enwe ajụjụ ndị e biri ebi. Ka ị na-agụ paragraf nke ọ bụla, ọ bara uru ịdị na-akanye akara n’azịza ha. Ọ bụrụgodị na e nweghị ajụjụ ndị dịịrị ọmụmụ, ị ka pụrụ ịkanye akara n’isi ihe ndị dị mkpa ị chọrọ icheta. Ọ bụrụ na otu ihe e kwuru bụ ihe ọhụrụ nye gị, tinyetụkwuo oge na ya iji jide n’aka na ị ghọtara ya nke ọma. Chebiri ihe atụ ma ọ bụ arụmụka ndị ga-abara gị uru n’ozi ubi ma ọ bụ ndị ị pụrụ iwebata n’ihe omume ị ga-eme n’isi nso. Chee echiche banyere ndị ụfọdụ kpọmkwem bụ́ ndị ị pụrụ iwusiwanye okwukwe ha ike ma ọ bụrụ na i soro ha kerịta ihe ị na-amụ. Kanye akara n’isi ihe ndị ị chọrọ iji mee ihe, tụleghachikwa ha mgbe ị mụsịrị ihe.
Ka ị na-atụle ihe ọmụmụ ahụ, chọta ma gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Tụlee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke ọ bụla si emetụta isi ihe paragraf ahụ na-ekwu.
Ị pụrụ ịgụta isi ihe ndị siiri gị ike ịghọta ma ọ bụ ndị ị ga-achọ imekwu nchọpụta nke ọma banyere ha. Kama ikwe ka ha dọpụ uche gị, detuo ha ka i wee lebakwuoro ha anya mgbe e mesịrị. Ọtụtụ mgbe, isi ihe dị iche iche na-edokwu anya ka ị na-aga n’ihu n’ihe ọmụmụ ahụ. Ọ bụrụ na ha edokwughị anya, ị pụrụ imekwu nnyocha. Ihe ndị dị aṅaa ka ị pụrụ idetu maka nlebara anya dị otú ahụ? Ma eleghị anya e nwere akụkụ Akwụkwọ Nsọ e hotara nke ị na-aghọtaghị nke ọma. Ma ọ bụ ikekwe ị hụchaghị otú o si metụta isiokwu a na-atụle. Ma eleghị anya i chere na ị ghọtara otu echiche dị n’ihe ọmụmụ ahụ ma ọ bụghị ruo n’ókè nke ịkọwara ya onye ọzọ. Kama nanị ileghara ha anya, ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe ime nnyocha na ha mgbe ị mụsịworo ihe ị malitere ịmụ.
Jide n’aka na ị chọtara ma gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị ihe iche
Mgbe Pọl onyeozi degaara ndị Hibru bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi ya nke nyere nkọwa sara mbara, ọ kwụsịtụrụ mgbe ọ gara ọkara, sị: “Nke a bụ ihe bụ isi.” (Hib. 8:1) Ị̀ na-echetara onwe gị ihe dị otú ahụ site n’oge ruo n’oge? Tụlee ihe mere Pọl ji mee nke ahụ. N’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ n’akwụkwọ ozi ya sitere n’ike mmụọ nsọ, o gosiworị na Kraịst, dị ka nnukwu Onyeisi Nchụàjà nke Chineke, abanyewo n’eluigwe kpọmkwem. (Hib. 4:14–5:10; 6:20) N’agbanyeghị nke ahụ, site n’iwepụta ihe bụ́ isi ihe na imesi ya ike ná mmalite Hib nke isi 8 amaokwu 1, Pọl doziri obi ndị ga-agụ akwụkwọ ya ka ha chemie echiche banyere otú o si metụta ndụ ha. O mere ka ọ pụta ìhè na Kraịst apụtawo n’ihu Chineke n’ihi ha nakwa na o meghewo ụzọ ka ha onwe ha wee banye “n’ebe nsọ” ahụ dị n’eluigwe. (Hib. 9:24; 10:19-22) Olileanya ha ịbụ nke e ji n’aka ga-enye aka ịkpali ha itinye ndụmọdụ ndị ọzọ dị n’akwụkwọ ozi a n’ọrụ, nke bụ́ banyere okwukwe, ntachi obi, na àgwà Ndị Kraịst. N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe anyị na-amụ ihe, ilekwasị anya n’ihe ndị bụ́ isi ihe ga-enyere anyị aka ịghọta otú e si akọwapụta isiokwu ahụ, ọ ga-emesikwa ike n’uche anyị ezi ihe mere a ga-eji mee ihe kwekọrọ na ya.
Ọmụmụ ihe onwe onye gị ọ̀ ga-akpali gị ime ihe? Nke a bụ ajụjụ dị oké mkpa. Mgbe ị mụtara ihe, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú nke a kwesịrị isi metụta àgwà m na ihe mgbaru ọsọ m ná ndụ? Olee otú m pụrụ isi tinye ihe ọmụma a n’ọrụ n’idozi nsogbu, ime mkpebi, ma ọ bụ iru ihe mgbaru ọsọ? Olee otú m pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ezinụlọ m, n’ozi ubi, n’ọgbakọ?’ Jiri ekpere tụlee ajụjụ ndị a, na-atụgharị uche n’ọnọdụ ndị a na-enwe n’ezie ndị ị pụrụ iji ihe ọmụma i nwere mee ihe na ha.
Mgbe ị tụlesịrị otu isiakwụkwọ ma ọ bụ isiokwu, wepụta oge maka ntụleghachi dị mkpirikpi. Lee ma ị pụrụ ichetaghachi ihe ndị bụ́ isi ihe na ihe ndị e kwuru iji kwadoo ha. Ime nke a ga-enyere gị aka icheta ihe ọmụma ahụ maka iji ya mee ihe n’ọdịnihu.
Ihe Ị Ga-amụ
Dị ka ndị Jehova, anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụ. Ma olee ebe anyị kwesịrị ịmalite? Kwa ụbọchị, anyị ga-eme nke ọma ịmụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ na nkọwa ndị dị n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Kwa izu, anyị na-aga nzukọ ọgbakọ, ihe a na-amụ iji kwadebe maka ha ga-enyekwara anyị aka irite uru ka ukwuu. Tụkwasị na nke a, ụfọdụ ejiriwo amamihe tinye oge n’ịmụ ụfọdụ n’ime akwụkwọ Ndị Kraịst anyị ndị e bipụtara tupu ha amata eziokwu. Ndị ọzọ na-ahọrọ akụkụ ụfọdụ nke ọgụgụ Bible kwa izu ha ma mụọ amaokwu ndị ahụ n’ụzọ miri emi karị.
Gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ gị adịghị ekwe ka i jiri nlezianya mụọ ihe nile a ga-atụle ná nzukọ ọgbakọ ndị a na-enwe kwa izu? Zere ọnyà nke iji oké ọsọ ọsọ mụọ ihe ndị a ga-amụ nanị ka ọ bụrụkwa na i meela ya, ma ọ bụ nke ka njọ, amụghị nke ọ bụla n’ime ha n’ihi na ị pụghị ịmụcha ha nile. Kama nke ahụ, kpebie ókè ị pụrụ ịmụ ma mụọ ha nke ọma. Na-eme ya kwa izu. Ka oge na-aga, gbalịa imekwu ihe iji na-akwadebe nzukọ ndị ọzọ.
‘Wulite Ezinụlọ Gị’
Jehova maara na ndị isi ezinụlọ aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji gboo mkpa nke ndị ha hụrụ n’anya. “Kwadebe ọrụ gị n’èzí,” ka Ilu 24:27 (NW) na-ekwu, “kwadebekwara ya onwe gị n’ubi.” N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụghị ileghara mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ gị anya. N’ihi ya, amaokwu ahụ gara n’ihu ịsị: “E mesịa ị ghaghịkwa iwulite ezinụlọ gị.” Olee otú ndị isi ezinụlọ pụrụ isi mee nke a? Ilu 24:3 na-asị: “Nghọta ka e ji eme ka [ezinụlọ] guzosie ike.”
Olee otú nghọta pụrụ isi baara ezinụlọ gị uru? Nghọta bụ ikike nke uche nke inwe ike ịhụ ihe gafere ihe ndị pụtara ìhè. A pụkwara ikwu na ọmụmụ ihe ezinụlọ nke dị irè na-amalite site n’ịmụta ezinụlọ gị n’onwe ya nke ọma. Olee ọganihu ndị ezinụlọ gị na-enwe n’ụzọ ime mmụọ? Gee ntị nke ọma mgbe gị na ha na-enwe mkparịta ụka. È nwere mmụọ nke ime mkpesa ma ọ bụ nke ibu iwe n’obi? Ọ̀ bụ ịchụso ihe onwunwe bụ ihe dị mkpa? Mgbe gị na ụmụ gị nọ n’ozi ubi, ahụ́ ọ̀ na-eru ha ala ịkọwa onwe ha n’ihu ndị ọgbọ ha dị ka Ndịàmà Jehova? Usoro unu nwere maka ọgụgụ Bible na ọmụmụ ihe ezinụlọ ọ̀ na-amasị ha? Hà na-anakwere ụzọ Jehova n’ezie dị ka ụzọ ndụ ha? Ileru anya nke ọma ga-ekpughe ihe ndị dị mkpa ka i mee dị ka onyeisi ezinụlọ iji guzobe ma wulite àgwà ime mmụọ n’ime onye nke ọ bụla n’ezinụlọ gị.
Lee Ụlọ Nche na Teta! maka isiokwu ndị na-ekwu banyere mkpa ụfọdụ kpọmkwem. Mgbe ahụ gwa ezinụlọ gị ihe a ga-amụ tupu oge eruo ka ha nwee ike ichebara ihe ọmụma ahụ echiche. Hụ na e nwere ịhụnanya n’oge a na-amụ ihe. N’abaraghị onye ọ bụla n’ezinụlọ gị mba ma ọ bụ menye ya ihere, mee ka uru ihe a na-amụ bara pụta ìhè, gosikwa kpọmkwem otú ha si metụta mkpa ezinụlọ gị. Mee ka onye ọ bụla na-ekere òkè. Nyere onye nke ọ bụla aka ịhụ otú Okwu Jehova si bụrụ nke “zuru okè” n’inye ihe dị nnọọ mkpa ná ndụ.—Ọma 19:7.
Inweta Ụgwọ Ọrụ
Ndị na-eleru anya ala, bụ́ ndị na-enweghị nghọta ime mmụọ, pụrụ ịmụ banyere eluigwe na ala, ihe ndị na-eme n’ụwa, na ọbụna banyere onwe ha ma ha agaghị aghọta ihe ihe ndị ha na-ahụ pụtara n’ezie. N’aka nke ọzọ, site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ndị na-amụchi Okwu Chineke anya pụrụ isi n’ihe ha na-amụta ghọta ọrụ aka Chineke, mmezu amụma Bible, na mkpughe nke nzube Chineke maka ịgọzi ụmụ mmadụ ndị na-erube isi.—Mak 13:4-29; Rom 1:20; Mkpu. 12:12.
N’agbanyeghị otú nke ahụ dịruru ebube, o kwesịghị ime ka anyị dị mpako. Kama nke ahụ, inyocha Okwu Chineke kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ịnọgide na-adị obi umeala. (Deut. 17:18-20) Ọ na-echebekwa anyị pụọ ‘n’ike dị aghụghọ nke mmehie’ n’ihi na mgbe Okwu Chineke dị ndụ n’ime obi anyị, ndọrọ nke mmehie eyikarịghị ka ọ ga-emeri mkpebi siri ike anyị mere iguzogide ya. (Hib. 2:1; 3:13; Kọl. 3:5-10) Otú a, anyị ‘ga-eje ije n’ụzọ kwesịrị Jehova iji bụrụ ndị na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka anyị na-anọgide na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ ọ bụla.’ (Kọl. 1:10) Ime otú ahụ bụ ihe anyị bu n’uche na-amụ Okwu Chineke, imezu ya bụkwa ụgwọ ọrụ kasịnụ.