Chọọchị Kewara Ekewa—Ọ̀ Pụrụ Ịlanarị?
“NDỊ nile na-asị na ha kwenyere n’eziokwu na-azọpụta azọpụta nke Kraịst dịnyeere Chọọchị ahụ a na-ahụ anya. Nkewa nile nke Krisendọm—n’etiti Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ na n’etiti Rom na chọọchị nile nke Reformation—bụ nkewa ndị dị n’ime otu Chọọchị ahụ.” (Christians in Communion) Otú ahụ ka otu onye na-ede akwụkwọ si lee Iso Ụzọ Kraịst anya—dị ka ezinụlọ okpukpe dị iche iche gbasasịrị ebe nile, nke ha nile na-egosikwa ụdị okwukwe ụfọdụ na Jisọs Kraịst.
Otú ọ dị, ọ bụ ezinụlọ kewara ekewa, nke nwere ozizi dị iche iche na ụkpụrụ omume ndị na-emegiderịta onwe ha. “Iso Ụzọ Kraịst nke oge a . . . nwere ụkpụrụ ndị dị ala iji bụrụ onye òtù chọọchị karịa ndị e ji abanye na bọs,” ka otu onye na-ahụ ihe na-emenụ kwuru. Mgbe ahụ, olee otú anyị kwesịrị isi nyochaa ọnọdụ ime mmụọ ya? Bishọp ndị Katọlik bụ́ Basil Butler kwubiri, sị: “Iso Ụzọ Kraịst kewara ekewa nọ nnọọ n’ezigbo ọrịa.” (The Church and Unity) Olee otú ọrịa ahụ si malite? È nwere olileanya maka inweghachi ahụ ike?
“Onye ahụ Na-emebi Iwu”
Pọl onyeozi dọrọ aka na ntị na adịghị n’otu ga-ebilite. Nye ndị Kraịst na Tesalọnaịka bụ́ ndị chere na ọnụnọ Kraịst dị nso, o dere, sị: “Unu ekwela ka onye ọ bụla ghọgbuo unu n’ụzọ ọ bụla: n’ihi na ọ [ụbọchị Jehova] gaghị adị, ma ọ bụrụ na mwezụga ahụ ebughị ụzọ bịa, e wee kpughee onye ahụ na-emebi iwu, bụ́ nwa nke ịla n’iyi.”—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3.
‘Onye a na-emebi iwu’ webatara ndapụ n’ezi ofufe na nnupụisi n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ònye ka ọ bụ? Ọ bụghị otu mmadụ ọ bụla, kama, òtù ndị ndú okpukpe nke Krisendọm. Òtù nke a buliri onwe ya elu karịa ọgbakọ ahụ si n’ezi ofufe dapụ n’oge na-adịghị anya ka ọnwụ ndị ozi Jisọs gasịrị, ma e mesịa malite izi nkà ihe ọmụma ndị ọgọ mmụọ, ndị dị ka Atọ n’Ime Otu na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:1-3) Dị ka nje na-egbu egbu, o ji echiche sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ merụọ ọgbakọ ahụ na-asị na ya bụ nke ndị Kraịst, ndị ga-edugarịrị n’adịghị n’otu.—Ndị Galetia 5:7-10.
Mmerụ ahụ amaliteworị n’ụbọchị Pọl onyeozi. O dere sị: “N’ihi na ihe omimi nke mmebi iwu na-arụsi ọrụ ike ugbu a: nanị ruo mgbe a ga-ewepụ onye ahụ n’etiti, bụ́ onye na-egbochi ugbu a.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:7) Ndị ozi nọbu dị ka ihe mgbochi megide nsì nke ndapụ n’ezi ofufe. Mgbe e wepụrụ mmetụta ha na-eme ka a dị n’otu, ndapụ n’ezi ofufe na-enweghị ihe mgbochi basara dị ka ọnyá gangrene.—1 Timoti 4:1-3; 2 Timoti 2:16-18.
Ihe omume dị iche iche nke ‘onye a na-emebi iwu’ anọgidewo na-ebeletaghị ebelata. N’otu akụkọ e nwetara na nso nso a banyere “chọọchị nke nọ ná mmekpa ahụ mmekọahụ na ọkà mmụta okpukpe,” e hotara otu achịdikin nke Church of England ka ọ na-eme mkpesa, sị: “Aro nile a na-atụrụ ndị ndú okpukpe ka ha hapụ itinye aka n’omume mmekọahụ n’ebe onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha nọ bụ nke a jụrụ. A na-echikwa ndị na-edina ụdị onwe ha echichi. Ha emewo ezi ihe ihe ọjọọ na ihe ọjọọ ezi ihe.”—The Sunday Times Magazine, London, November 22, 1992.
Ọka na Ata
Jisọs Kraịst n’onwe ya kụziri na ezi Iso Ụzọ Kraịst ga-apụ n’anya ruo nwa oge. Ọ sịrị na mmalite nke ọgbakọ ndị Kraịst yiri nwoke nke na-akụ mkpụrụ ọma n’ubi ya. Ma, Jisọs sịrị, “onye iro ya bịara wee ghaakwa ata n’etiti ọka.” Mgbe ndị ohu ya jụrụ ma ha kwesịrị ịnwa ifopụ ata ndị ahụ, onye nwe ubi ahụ sịrị: “Ee e, ka unu wee ghara ifopụ ha na ọka ma eleghị anya, mgbe unu na-achịkọpụta ata.” Ruo ogologo oge ha aṅaa ka ngwakọta nke ata na ọka nke a ga-anọgide? Onye nwe ubi ahụ sịrị: “Hapụnụ ha abụọ ka ha na-abakọta ụba ruo owuwe ihe ubi.”—Matthew 13:25, 29, 30.
Ruo “owuwe ihe ubi,” ma ọ bụ oge nkewa n’ime oge ikpeazụ nke “usoro ihe dị iche iche,” ndị Kraịst adịgboroja toro n’akụkụ ezi ndị Kraịst. (Matiu 28:20) Setan bụ́ Ekwensu ji ndị si n’ezi ofufe dapụ malite ọgbakọ ndị Kraịst adịgboroja nke rụrụ arụ ma kewaakwa ekewa. (Matiu 13:36-39) Ha mịpụtara adịgboroja na-eme ihere nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. (2 Ndị Kọrint 11:3, 13-15; Ndị Kọlọsi 2:8) Ka chọọchị ahụ na-ekewa eri ọtụtụ narị afọ, o siwanyere ike ịmata ezi ndị Kraịst.
Nkewa Ndị Ọhụrụ
N’oge ndị na-adịkebeghị anya, ka akwụkwọ bụ́ The Testing of the Churches—1932-1982 na-asị, “nkewa ndị [ọ]hụrụ apụtawo, karịsịa n’òtù ụka mmụọ nsọ, ya na okwu ọ na-ekwusi ike banyere okwukwe na ahụmahụ onwe onye.” N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ụfọdụ na-ele òtù ịmụ ọzọ, nke ụka mmụọ nsọ anya dị ka ihe àmà nke inweghachi ahụ ike ime mmụọ kama ịbụ nkewa ndị ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, Ebe Ugwu Ireland, nwere ahụmahụ nke ntụteghachi dị otu ahụ n’afọ ndị 1850. E welitere olileanya ndị dị elu. Otu akụkọ kọrọ banyere “njikọ ụmụnna . . . n’etiti ndị ụkọchukwu Presbyterian, nke ndị Wesley na ndị ozi Nọọrọ Onwe ha” wee kwuo sị na “ụbọchị ọ bụla na-eweta akụkọ ndi ọhụrụ nke ịmụ anya arọ nrọ, ụra, ọhụụ, nrọ na ọrụ ebube dị iche iche.”—Religious Revivals.
Ọtụtụ lere oké ngosipụta ndị a dị egwu anya dị ka ihe àmà nke mmụọ Chineke nke na-arụ ọrụ ịtụteghachi chọọchị ya. “Chọọchị nke Chineke,” ka otu onye na-ahụ ihe na-emenụ kwuru, “n’echiche ya kasị elu abụrụwo nke a tụteghachiri na distrikti ndị a.” Otú ọ dị, n’agbanyeghị na a kpọsara ntụteghachi nke a dị ka “ihe omume dị ebube nke a na-enwetụbeghị n’akụkọ ihe mere eme nke okpukpe nke Ulster,” ya na ntụteghachi ndị ọzọ yiri ya arụpụtabeghị ịdị n’otu nke okpukpe n’etiti ndị ahụ na-azọrọ ịmụ ọzọ nke ime mmụọ.
Ndị dị otú a ga-arụ ụka na ha dị n’otu n’ihe ndị bụ́ isi. Ma nke a bụ otu ịrụ ụka ahụ nke ndị ọzọ nile nke Krisendọm ji eme ihe, bụ́ ndị na-akọwa na “ihe na-ejikọ ndị Kraịst n’otu abụwo n’ụzọ dị ukwuu ihe dị mkpa karịa ihe ndị nọgidere na-ekewa ha.” (The Church and Unity) Krisendọm na-azọrọ, sị: “Ịdị n’otu anyị n’ụzọ bụ isi nke otu onye na ibe ya na nke anyị na ndị Kraịst ibe anyị nile gbanyere mkpọrọgwụ na baptism anyị n’ime Kraịst.” (Christians in Communion) Otú ọ dị, ikwu na nkewa ndị ahụ adịghị mkpa n’ihi otu okwukwe n’ime Jisọs, yiri ikwu na ọrịa cancer abụghị oké ihe ma ọ bụrụhaala na obi gị siri ike.
Ihe bụ eziokwu bụ na òtù okpukpe ọgbara ọhụrụ ndị dị otu ahụ atụkwasịwo ihe n’ọgba aghara ahụ ma rụpụta adịghị n’otu ime mmụọ ebe ndị ozizi na-arụgide ndị mmadụ na-ekpokọba ụmụazụ nye onwe ha. Jim Jones na David Koresh bụ ihe atụ ndị na-adịbeghị anya nke ndị ndú ime mmụọ ndị duhiere ọtụtụ puku. (Matiu 15:14) Otu onye ụkọchukwu Baptist bụ onye ndú nke òtù Ku Klux Klan. O jikọtara mkpọsa ya maka nkarị ndị ọcha karịrị ndị ọ bụla ọzọ na ntụte okpukpe wee sị na ndị nile keere oké na ya bụ ndị a “ga-enye ume nke nduzi Chineke, nye ha obi ike nke Onye ahụ nwụrụ na Kalvarị [Jisọs Kraịst].”
Gịnị banyere ọrụ ebube ndị ahụ e chere na e mere, oké ọrụ dị iche iche, na ihe àmà ndị a rụrụ n’aha Jisọs? Cheta ịdọ aka ná ntị siri ike nke Jisọs Kraịst na ọ bụghị ndị ahụ na-asị nanị “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị” bụ ndị ga-enweta nnwapụta ya, kama nke ahụ, ‘ndị ahụ na-eme ihe Nna ya na-achọ.’ Ọtụtụ ndị taa amaghị ọbụna aha Nna ya, bụ́ Jehova. Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ndị ahụ ‘ga-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha ya, rụọkwa ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha ya’ n’agbanyeghịkwa nke ahụ ha ga-abụ “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.”—Matiu 7:21-23.
“Ndị nke M, Sinụ n’Ime Ya Pụta”
Gịnị bụ olileanya mgbake nke dịịrị Krisendọm na-arịa ọrịa? Ọ jọka. Mgbe ahụ, ànyị ga-ewere okwu ndụmọdụ onye bishọp Katọlik bụ́ Butler, ‘isonye [chọọchị ahụ] na-egbughị oge ọzọ na anyị inye aka “n’ime ka ọ dị ọcha” nke ọ nọgideworo na-eme site n’ime’? Ee e! Krisendọm kewara ekewa ma na-akpatakwa adịghị n’otu agaghị alanarị. (Mak 3:24, 25) Ọ bụ akụkụ nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha a na-akpọ Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 18:2, 3) Usoro okpukpe nke a ikpe ọbara mara na-eche mbibi dị nso ihu site n’aka Chineke.
Bible adịghị atụ aro ka ezi ndị Kraịst nọrọ n’ime òtù okpukpe nke a rụrụ arụ ma gbalịa ịgbanwe ya site n’ime. Kama, ọ na-agba ume, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile: n’ihi na mmehie ya nile rapakọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.”—Mkpughe 18:4, 5.
“Pụta” baa n’olè ebe? Cheta, Jisọs kwere nkwa na n’oge owuwe ihe ubi, na a ga-achịkọta ezi ndị Kraịst ọzọ n’otu n’ime ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ. Onye amụma bụ́ Maịka bukwara amụma banyere nchịkọtaghachi dị otú ahụ n’okwu ndị a: “N’otu ka m ga-edokọ ha dị ka ìgwè ewu na atụrụ.” (Maịka 2:12) Nke a ò mewo?
Ee! a na-achịkọta ezi ndị Kraịst ugbu a n’ime otu òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu. Olee ndị ka ha bụ? Ha bụ ọgbakọ ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova, ndị jikọtara ọnụ na-ekwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke n’ime 231 ala. Ha ajụwo ozizi nile na-akpata adịghị n’otu nke Krisendọm ma na-achọ ife Chineke dị ka eziokwu nke Okwu ya si dị.—Jọn 8:31, 32; 17:17.
E ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọ gị iso ha kwurịta okwu. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu banyere Ndịàmà Jehova, biko kpọtụrụ ha n’ógbè unu ma ọ bụ site n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2 nke magazin a.
[Foto dị na peeji nke 7]
“Chineke chetakwara ajọ omume ya nile”