Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/1 p. 8-13
  • Olee Table nke I Na-eri Nri na Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Table nke I Na-eri Nri na Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Izere “Table Ndị Mmụọ Ọjọọ”
  • ‘Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi’ Na-adọsa Nri na Table Jehova
  • Lezie Anya Maka Nri Nwere Nsí nke Dị na Table Ndị Mmụọ Ọjọọ
  • Nanị Table Jehova Ga-afọdụ
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2024
  • Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Izi Ihe Chineke Megide Ozizi Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Mmụọ Ọjọọ—Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Guzogide Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/1 p. 8-13

Olee Table nke I Na-eri Nri na Ya?

“Unu apụghị iketa table Onyenwe anyị na table ndị mmụọ ọjọọ.” —⁠1 NDỊ KỌRINT 10:21.

1. Table ndị dị aṅaa ka e debere n’ihu anyị, ịdọ aka ná ntị dịkwa aṅaa ka Pọl onyeozi nyere banyere ha?

OKWU ndị a nke Pọl onyeozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ gosiri na e debere table ihe atụ abụọ n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ. A na-amata table nke ọ bụla site na nri ihe atụ a dọbara n’elu ya, anyị nile na-erikwa n’otu table ma ọ bụ na nke ọzọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, anyị apụghị ịdị na-eri na table ya ma mgbe ahụkwa na-eritụ na table ndị mmụọ ọjọọ. Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa Chineke ka ha na-achụrụ: ma achọghị m ka unu ghọọ ndị unu na ndị mmụọ ọjọọ na-enwekọ. Unu apụghị ịṅụ iko Onyenwe anyị na iko ndị mmụọ ọjọọ: unu apụghị iketa table Onyenwe anyị na table ndị mmụọ ọjọọ.”​—⁠1 Ndị Kọrint 10:​20, 21.

2. (a) Table dị aṅaa nke Jehova ka e nwere n’ụbọchị Israel oge ochie, ònyekwa keere òkè n’àjà udo ya nile? (b) Gịnị ka iri na table Jehova pụtara taa?

2 Okwu Pọl na-echetara anyị banyere àjà udo nile nke ndị Israel oge ochie chụrụ n’okpuru Iwu Jehova. A kpọrọ ebe ịchụàjà Chineke table, a na-asịkwa na onye na-eweta anụmanụ iji chụọ àjà na-eso Jehova na ndị nchụàjà na-erikọ ihe. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, Jehova keere òkè n’àjà ahụ n’ihi na e fesara ọbara ya n’elu ebe ịchụàjà ya, ọkụ dị n’okpuru ya rechapụkwara abụba ya. Nke abụọ, onye nchụàjà keere òkè n’ihi na ya (na ezinụlọ ya) riri obi na ụkwụ aka nri nke anụmanụ ahụ e ji chụọ àjà. Nke atọ kwa, onye nyere ya keere òkè site n’iri ihe ndị fọdụrụ na ya. (Levitikọs 7:​11-⁠36) Taa, iketa na table Jehova pụtara na anyị ga-enye ya ụdị ofufe ọ chọrọ, dị ka Jisọs na ndị ozi ya gosipụtara ihe nlereanya ya. Iji mee nke a, anyị aghaghị iri n’ụzọ ime mmụọ ihe ndị Jehova na-enye site n’Okwu na ọgbakọ ya. A machibidoro ndị Israel, ndị ha na Jehova rikọrọ n’ụzọ pụrụ iche na table ya, ịchụ àjà dị iche iche nye ndị mmụọ ọjọọ na table ha. Ndị Israel ime mmụọ na “atụrụ ọzọ” bụ́ ndị enyi ha nọkwa n’otu ụdị mmachibido iwu ahụ si n’aka Chineke.

3. Olee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye ikpe iri na table ndị mmụọ ọjọọ mara n’ụbọchị anyị?

3 Olee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ onye ikpe iri na table ndị mmụọ ọjọọ mara n’ụbọchị anyị? Site n’ijere ọdịmma nke ihe ọ bụla megidere Jehova ozi. Table ndị mmụọ ọjọọ gụnyere okwu nrafu nile nke ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ nke a haziri iji duhie ma wezụga anyị pụọ n’ebe Jehova nọ. Ònye ga-achọ ịzụ uche na obi ya ná nsí dị otú ahụ? Ezi ndị Kraịst na-ajụ ikere òkè n’àjà ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ndị mmadụ taa na-achụrụ chi nke agha na nke akụ na ụba.​—⁠Matiu 6:24.

Izere “Table Ndị Mmụọ Ọjọọ”

4. Ajụjụ dị aṅaa chere anyị nile ihu, n’ihi gịnịkwa ka anyị na-agaghị eji kpachara anya chọọ iri na table ndị mmụọ ọjọọ?

4 Ajụjụ anyị nile na-eche ihu bụ, Olee table nke m na-eri nri na ya? Anyị apụghị ịgbanarị eziokwu ahụ nke bụ na anyị aghaghị iri n’otu table ma ọ bụ na nke ọzọ. (Tụlee Matiu 12:30.) Anyị agaghị ama ụma chọọ ịdị na-eri na table ndị mmụọ ọjọọ. Ime nke ahụ ga-eme ka anyị tụfuo ihu ọma nke nanị otu ezi Chineke ahụ nke dị ndụ, bụ́ Jehova. N’aka nke ọzọ, iri nri nanị na table Jehova na-eduga n’anyị inwe ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ! (Jọn 17:3) A na-ekwu na mmadụ bụ ihe ọ na-eri. Ya mere, onye ọ bụla chọrọ ịnọgide n’ezi ahụ ike anụ ahụ na nke uche ga-elebara nri ya anya. Dị nnọọ ka nri ratụ ratụ nwere oké abụba, ọ bụ ezie na e ji ihe dị iche iche na-eme ka nri tọwanye ụtọ mee ka ha dị ụtọ, na-adịghị eme ka anyị nọgide na-enwe ahụ ike anụ ahụ, otú a ka okwu nrafu nke ụwa nke a nke e ji echiche dị iche iche nke ndị mmụọ ọjọọ mee ka ọ dị ụtọ si bụrụ nri ratụ ratụ ihe atụ dị njọ nke ga-emerụ uche anyị.

5. Olee otú anyị pụrụ isi zere ịnara nkụzi ndị mmụọ ọjọọ taa?

5 Pọl onyeozi buru amụma na n’oge ikpeazụ, a ga-eji “ozizi ndi mmụọ ọjọọ” duhie ndị mmadụ. (1 Timoti 4:1) Ọ bụghị nanị na a na-achọta ozizi ndị mmụọ ọjọọ dị otú a ná nkwenkwe ụgha nile nke okpukpe kama a na-agbasakwa ha n’ụzọ sara mbara n’ụzọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọ dị anyị mkpa inyocha ma nwalee ụdị akwụkwọ na magazin ndị anyị na ụmụ anyị na-agụ, ụdị ihe omume telivishọn ndị anyị na-ekiri, na ụdị egwuregwu na ihe nkiri ndị anyị na-ekiri. (Ilu 14:15) Ọ bụrụ na anyị na-agụ akwụkwọ akụkọ ndị e chepụtara echepụta maka ntụrụndụ, ọ̀ na-ekwu banyere ime ihe ike nke ezi echiche na-adịghị n’ime ya, mmekọahụ rụrụ arụ, ma ọ bụ omume anwansi dị iche iche? Ọ bụrụ na anyị na-agụ akwụkwọ nke ihe ndị mere eme ka anyị wee mụta ihe, ọ̀ na-akọwa nkà ihe ọmụma ma ọ bụ ụzọ ndụ ‘na-adịghị ka Kraịst si dị’? (Ndị Kọlọsi 2:8) Ọ̀ na-enye ịkọ nkọ efu, ka ọ̀ na-akwado itinye aka n’òtù ọrụ ebere dị iche iche nke ụwa? Ọ̀ na-akwalite mkpebi siri ike nke ịba ezigbo ọgaranya? (1 Timoti 6:9) Ọ̀ bụ mbipụta na-eji ụzọ akọ na-ezi ozizi dị iche iche na-akpata nkewa ndị na-adịghị ka Kraịst? Ọ bụrụ na azịza ya bụ ee, ma anyị anọgide na-agụ ma ọ bụ na-ekiri ihe ndị dị otú ahụ, anyị nọ n’ihe ize ndụ nke iri na table ndị mmụọ ọjọọ. Taa, e nwere ọtụtụ narị puku nke mbipụta ndị na-akwalite nkà ihe ọmụma ụwa ndị yiri ka ha mepere anya ma mara nke a na-akọ ugbu a. (Eklisiastis 12:12) Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’okwu nrafu ndị a nke bụ ihe ọhụrụ n’ezie; ọ dịghịkwa arụ ọrụ maka abamuru na ọdịmma mmadụ, dịkwa ka ihe Setan ji aghụghọ gwa Iv na-arụghị ọrụ maka ọdịmma ya.​—⁠2 Ndị Kọrint 11:3.

6. Mgbe Setan kpọrọ anyị òkù ịdetụ nri ratụ ratụ ya ọnụ, olee otú anyị kwesịrị isi zaghachị?

6 Ya mere, mgbe Setan kpọrọ anyị òkù idetụ nri ratụ ratụ ndị mmụọ ọjọo ya ire, olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi? Dị ka Jisọs mere mgbe Setan nwara ya ime nkume ka ọ ghọọ achịcha. Jisọs zaghachiri: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ sị, Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” Ma mgbe Ekwensu nyere Jisọs “alaeze nile nke ụwa na ebube ha” ma ọ bụrụ na ọ ga-ada n’ala ma kpọọ isiala nye Setan, Jisọs zaghachiri sị: “Laba, Setan: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị ya ka ị ga-ekpere.”​—⁠Matiu 4:​3, 4, 8-⁠10.

7. Gịnị mere anyị ji na-arafu onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị echee na anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’iri na table Jehova nakwa table ndị mmụọ ọjọọ?

7 A pụghị ime ka table Jehova na table nke ndị iro ya bụ ndị mmụọ ọjọọ kwadebere dị n’otu ma ọlị! Eenụ, a nwawo ime otú ahụ na mbụ. Cheta ndị Israel oge ochie n’ụbọchị Elaịja onye amụma. Ndị ahụ na-azọrọ na ha na-efe Jehova, ma ha kwetara na chi ndị ọzọ, dị ka Beal, kwere nkwa ịba ụba. Elaịja jekwuuru ndị ahụ wee sị: “Ruo ole mgbe ka unu onwe unu ga na-arụgharị n’etiti ụzọ abụọ ndị a? Ọ bụrụ na Jehova bụ Chineke, jesoonụ ya; ọ bụrụ Beal, jesoonụ ya.” N’ụzọ a na-apụghị ịgọnarị agọnarị, ndị Israel ahụ na-arụgharị “na mbụ n’otu ụkwụ e mesịa na nke ọzọ.” (1 Ndị Eze 18:21, The Jerusalem Bible) Elaịja mara ndị nchụàjà nke Beal aka ka ha gosipụta ịbụ chi nke chi ha. Chi nke ga-enwe ike isi n’eluigwe wedata ọkụ n’elu àjà ahụ ga-abụ ezi Chineke. N’agbanyeghị mgbalị dị ukwuu ha tinyere, ndị nchụàjà nke Beal dara. Mgbe ahụ Elaịja kpere nanị ekpere, sị: “Jehova, za m, ka ndị nke a wee mara na gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke.” Ngwa ngwa ọkụ si n’ebe Jehova nọ si n’eluigwe rịdata wee rechapụ àjà ahụ e ji anụmanụ chụọ nke mmiri dọrọ na ya. N’ịbụ ndị ngosipụta doro anya nke ịbụ chi Jehova kpaliri, ndị ahụ gere Elaịja ntị wee gbuo 450 ndị amụma nile nke Beal. (1 Ndị Eze 18:​24-⁠40) N’otu aka ahụ taa, anyị aghaghị ịmata Jehova dị ka ezi Chineke ma jiri mkpebisi ike chigharịa ịmalite iri nri na table ya ma ọ bụrụ na anyị a ka amalitebeghị ime otú ahụ.

‘Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi’ Na-adọsa Nri na Table Jehova

8. Ohu dị aṅaa ka Jisọs buru amụma na ya ga-eji azụ ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ ime mmụọ n’oge ọnụnọ ya, gịnịkwa ka e ji amata ohu ahụ?

8 Onyenwenụ bụ́ Jisọs Kraịst buru amụma na n’oge ọnụnọ ya “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ga na-enye ndị na-eso ụzọ ya nri ime mmụọ: “Ngọzi na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otu a. N’ezie asị m unu, na ọ ga-eme ya onye isi ihe nile o nwere.” (Matiu 24:​45-⁠47) Ohu a abụghị otu mmadụ ọ bụla, kama òtù ndị Kraịst raara onwe ha nye, e tere mmanụ. Òtù a adọkwasịwo nri ime mmụọ kachasị mma n’elu table Jehova maka ihe fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmadụ nakwa “oké ìgwè mmadụ” ahụ. Ugbu a n’ihe karịrị nde mmadụ anọ siri ike, oké ìgwè mmadụ ahụ ewerewo ọnọdụ ha n’akụkụ ihe fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ maka ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova Chineke na maka Alaeze ya nke ọ ga-eji mee ka aha nsọ ya dị nsọ.​—⁠Mkpughe 7:​9-⁠17.

9. Ngwa ọrụ dị aṅaa ka òtù ohu ahụ jiworo na-enye Ndịàmà Jehova nri ime mmụọ, oleekwa otú e si kọwaa oriri ime mmụọ ha n’okwu amụma?

9 Òtù ohu a kwesịrị ntụkwasị obi anọwo na-eji Watch Tower Bible and Tract Society na-eme ihe n’iwepụta nri ime mmụọ ndị na-edozi ahụ nye Ndịàmà Jehova nile. Ebe Krisendọm na akụkụ nile ọzọ nke usoro ihe nke a nọ n’agụụ n’ihi enweghi nri ime mmụọ na-enye ndụ, ndị Jehova nọ n’oké oriri. (Emọs 8:11) Nke a bụ ná mmezu nke amụma dị n’Aịsaịa 25:6: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmị, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma.” Dị ka amaokwu nke 7 na nke 8 gosiri, oriri nke a ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. Lee aha ngọzi nke a bụ nye ndị nile nọ n’ọgbakọ Jehova a na-ahụ anya ugbu a, leekwa aha ngọzi ọ ga-anọgide na-abụ n’ọdịnihu!

Lezie Anya Maka Nri Nwere Nsí nke Dị na Table Ndị Mmụọ Ọjọọ

10. (a) Ụdị nri dị aṅaa ka òtù ohu ọjọọ ahụ na-enye, gịnịkwa bụ ihe na-akpali ha? (b) Olee otú òtù ohu ọjọọ ahụ si emeso ndị bụbu ndi ohu ibe ha?

10 Nri dị na table ndị mmụọ ọjọọ nwere nsí. Dị ka ihe atụ, tụlee nri nke òtù ohu ọjọọ ahụ na ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekesa. Ọ dịghị edozi ma ọ bụ na-ewulite ahụ; ọ dịghị enye ahụ ike. Ọ pụghị ịdị na-enye, n’ihi na ndị si n’ezi ofufe dapụ akwụsịwo iri nri site na table Jehova. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, ihe ọ bụla ha zụliteworo na mmadụ ọhụrụ ahụ agawo. Ihe na-akpali ha, abụghị mmụọ nsọ, kama ajọ obi ilu. Nanị otu nzube bụ ihe jupụtara ha obi​—⁠iti ndị bụbu ndị ohu ibe ha ihe, dị ka Jisọs buru n’amụma.​—⁠Matiu 24:​48, 49.

11. Gịnị ka C. T. Russell dere banyere nhọrọ nke nri ime mmụọ mmadụ na-eme, oleekwa otú o si kọwaa ndị ahụ hapụrụ table Jehova?

11 Dị ka ihe atụ, laa azụ na 1909, onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ bụ C. T. Russell, dere ihe banyere ndị ahụ si na table Jehova pụọ ma malite imeso ndị bụbu ndị ohu ibe ha n’ụzọ na-adịghị mma. Ụlọ Nche (Bekee) nke October 1, 1909, sịrị: “Ndị nile kewapụrụ onwe ha n’ebe Society na ọrụ ya dị, kama inwe ihe ịga nke ọma n’onwe ha ma ọ bụ iwulite ndị ọzọ elu n’okwukwe na n’ịzụlite mkpụrụ nke mmụọ nsọ, yiri ka ha na-eme ihe megidere nke ahụ​—⁠na-anwa imebi Nzube nke ha jewooro ozi na mbụ, ma n’emeghị mkpọtụ, jiri nwayọọ nwayọọ pụọ n’anya, na-emerụ nanị onwe ha na ndị ọzọ nwere otu ụdị mmụọ ahụ nke iseokwu ahụ. . . . Ọ bụrụ na ụfọdụ chere na ha pụrụ inweta nri dịruru mma ma ọ bụ nke ka mma na table ndị ọzọ, ma ọ bụ na ha pụrụ imepụta nri dịruru mma ma ọ bụ nke ka mma n’onwe ha​—⁠ka ndị a gaa n’ihu n’ụzọ ha. . . . Ma, ọ bụ ezie na anyị dị njikere ịhapụ ndị ọzọ ka ha gaa ebe ọ bụla na ebe nile inweta nri na ìhè nke ga-eju ha afọ, ọ bụ ihe ijuanya ikwu na ndị a ghọrọ ndị na-emegide anyị na-agbaso ụzọ dị iche kpam kpam. Kama ikwu n’ụzọ nke onye bụ dike nke ụwa, ‘Achọtawo m ihe m nwere mmasị na ya karị; ka e mesịa!’ ndị a na-egosipụta ọnụma, obi ilu, ikpọasị, esemokwu, ‘ọrụ nke anụ ahụ na nke ekwensu’ ruo ókè gafere nke anyị maara ndị ụwa na-egosipụta. O yiri ka a gbanyere ha ara n’ahụ, oké ụjọ mmiri nke Setan [ọrịa rabies]. Ụfọdụ n’ime ha na-eti anyị ihe ma tụgharịa na-azọrọ na ọ bụ anyị tiri ha ihe. Ha dị njikere ikwu na ide ụgha dị iche iche na-asọ oyi ma weda onwe ha ime omume onye obi tara mmiri.”

12. (a) Olee otú ndị si n’ezi ofufe dapụ si eti ndị ohu ibe ha ihe? (b) Gịnị mere o ji dị ize ndụ ịgụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ dere n’ihi ọchịchọ ịmata ihe?

12 Ee, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ebipụta akwụkwọ na-eduga n’ịgbagọ eziokwu, okwu ndị na-abụchaghị eziokwu, na ụgha doro anya. Ọbụna na ha na-eji iwe na-akwụgharị ná mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà, na-agbalị ịmata ndị na-anọghị ná nche n’ọnyà. N’ihi ya, ọ ga-abụ oké ihe ize ndụ ikwe ka ọchịchọ anyị ịmata ihe kpalie anyị ịgụ ihe odide ndị dị otú ahụ ma ọ bụ ige ntị n’okwu ịkpọ iyi ha! Ọ bụ ezie na anyị pụrụ iche na ọ bụghị ihe ize ndụ nye anyị onwe anyị, ihe ize ndụ ya na-anọgide. N’ihi gịnị? Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ewepụta okwu ụgha site n’iji “okwu ụtọ” na “okwu nrafu dị iche iche.” (Ndị Rom 16:17, 18; 2 Pita 2:3) Gịnị ka ị ga-atụ anya ya site na table ndị mmụọ ọjọọ? Ọ bụ ezie na ndị si n’ezi ofufe dapụ pụkwara iwepụta ihe ụfọdụ bụ eziokwu, ọ na-abụkarị ihe na-ekwekọghị n’ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu, ná nzube nke ịdọrọ ndị ọzọ pụọ na table Jehova. Ihe odide ha nile na-akatọ nanị akatọ ma na-eweda ala! Ọ dịghị ihe na-ewuli elu dị na ya.

13, 14. Gịnị bụgasị mkpụrụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na okwu nrafu ha?

13 Jisọs sịrị: “Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.” (Matiu 7:16) Ugbu a, gịnị bụ mkpụrụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na ihe ndị ha na-ebipụta? Ihe anọ kara okwu nrafu ha akara. (1) Ịdị akọ. Ndị Efesọs 4:14 na-ekwu na ha dị “aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.” (2) Ọgụgụ isi mpako. (3) Enweghị ịhụnanya. (4) Emeghị ihe n’eziokwu n’ụdị dị iche iche. Ihe ndị a bụ nnọọ ihe dị iche iche e ji sie nri dị na table ndị mmụọ ọjọọ, e doziri ha nile iji bibie okwukwe ndị Jehova.

14 E nwekwara akụkụ ọzọ. Na gịnị ka ndị si n’ezi ofufe dapụ laghachiworo? N’ọtụtụ ọnọdụ, ha abanyeghachiwo n’ọchịchịrị nke Krisendọm na nkụzi ya dị iche iche, dị ka nkwenkwe nke na ndị Kraịst nile ga-aga eluigwe. Ọzọkwa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ adịghị ewerekwa nguzo siri ike nke Akwụkwo Nsọ banyere ọbara, nnọpụiche, na mkpa ọ dị ịgba àmà banyere Alaeze Chineke. Otú ọ dị, anyị agbanarịwo ọchịchịrị nke Babilọn Ukwu ahụ, anyị achọghịkwa ịlaghachi na ya ma ọlị. (Mkpughe 18:​2, 4) Dị ka ndị ohu Jehova na-anọgidesi ike n’ezi ihe, gịnị mere anyị ga-eji ọbụna chọọ iletụ anya n’okwu nrafu nke ndị a jụrụ table Jehova wepụtara bụ́ ndị ji okwu ọnụ na-eti ndị ahụ na-enyere anyị aka ịnara “okwu na-enye ezi ndụ” ihe ugbu a?​—⁠2 Timoti 1:13.

15. Ụkpụrụ Bible dị aṅaa na-enyere anyị aka ịgbaso ụzọ amamihe mgbe anyị nụrụ banyere ebubo dị iche iche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ebo?

15 Ụfọdụ pụrụ ịchọ ịma banyere ebubo dị iche iche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ebo. Ma anyị kwesịrị iburu n’obi ụkpụrụ ahụ dị na Deuterọnọmi 12:​30, 31. N’ebe a Jehova sitere na Mosis dọọ ndị Israel aka ná ntị banyere ihe ha ga-ezere ngwa ngwa ha chụpụsịrị ndị na-ekpere arụsị bi n’Ala Nkwa ahụ. “Gị lezie onwe gị anya ka a ghara ịma gị n’ọnyà iso ha n’azụ, mgbe e kpochapụsịrị ha n’ihu gị; ka ị gharakwa ịjụ ajụjụ banyere chi nile ha, sị, Mba ndị a si aṅaa na-efe chi nile ha ofufe? M ga-emekwa otú a, ọbụna mụ onwe m. Emerela Jehova, bụ Chineke gị, otú a.” Ee, Jehova Chineke maara otú ọchịchọ ụmụ mmadụ si arụ ọrụ. Cheta Iv, nakwa nwunye Lọt! (Luk 17:32; 1 Timoti 2:14) Ka anyị ghara ige ntị ihe ndi si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu ma ọ bụ na-eme. Kama, ka anyị jide ọrụ n’aka n’iwulite ndị mmadụ elu na iji ịnọgidesi ike n’ezi ihe na-eri nri na table Jehova!

Nanị Table Jehova Ga-afọdụ

16. (a) N’isi nso gịnị ga-eme Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na table ihe atụ ahụ nke mba nile nke ụwa nọgideworo na-eri nri na ya? (b) Gịnị ga-eme mmadụ nile ndị nọgidere na-eri nri na table ndị mmụọ ọjọọ?

16 N’isi nso, mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite na mberede, na-aga ngwa ngwa ná ngwụsị ya “n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.” (Mkpughe 16:​14, 16) Ọ ga-eru n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu mgbe Jehova bibiri usoro ihe nke a na table ihe atụ ahụ nke mba nile nke ụwa nọworo na-eri nri na ya. Jehova ga-akwatukwa nzukọ nile a na-adịghị ahụ anya nke Setan bụ́ Ekwensu ya na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya. Ndị ahụ nọgideworo na-eri nri na table ime mmụọ nke Setan, table nke ndị mmụọ ọjọọ, ga-abụ ndị a manyere ịbịa oriri nkịtị, ee e, ọ bụghị dị ka ndị ga-ekere òkè, kama dị ka akụkụ bụ isi nke nri ahụ n’onwe ya​—⁠gaa ná mbibi ha!​—⁠Lee Ezikiel 39:4; Mkpughe 19:​17, 18.

17. Ngọzi dịgasị aṅaa na-abịara ndị na-eri nri nanị na table Jehova?

17 Nanị table Jehova ga-afọdụ. A ga-echebe ndị ji obi ekele na-eri nri na ya, ha ga-enwekwa ihe ùgwù nke iri na ya ruo mgbe ebighi ebi. Ọ dịghịkwa mgbe ụkọ nri nke ụdị ọ bụla ga-emenye ha ụjọ ọzọ. (Abụ Ọma 67:6; 72:16) Ha ga-efe Jehova Chineke n’ahụ ike zuru okè, n’ime Paradaịs! N’ikpeazụ, okwu ndị ahụ na-akpali akpali nke Mkpughe 21:4 ga-emezu n’ụzọ dị ebube: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ, iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ, ihe mbụ nile agabigawo.” Ebe ọ bụ na mmegide aghọwo ihe gara aga, a ga-enwe ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova Chineke ebe nile ruo mgbe ebighị ebi ka ihu ọma na-adịghị agwụ agwụ nke Chineke na-awụkwasị ụmụ mmadụ a gbapụtara agbapụta ndị bi na Paradaịs elu ala. Iji nweta nkwụghachi ụgwọ nke a, ka anyị nile kpebisie ike iri nri nanị site na table Jehova, nke jupụtara ná nri ime mmụọ ndị kasị mma!

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị e ji ozizi ndị mmụọ ọjọọ duhie?

◻ Gịnị mere anyị apụghị inwe ihe ịga nke ọma n’iri na table Jehova nakwa na table ndị mmụọ ọjọọ?

◻ Ụdị nri dị aṅaa ka ndị si n’ezi ofufe dapụ na-enye?

◻ Gịnị mere o ji dị ize ndụ ịchọ ịmata banyere ebubo dị iche iche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ebo?

◻ Gịnị bụgasị mkpụrụ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Table Jehova jupụtara na nri ime mmụọ ndị kasị mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya