Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 7/15 p. 21-24
  • Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Esemokwu Ndị Dị Nta
  • Idozi Esemokwu Ndị Siri Ike
  • Ị̀ Pụrụ Nnọọ Ịgbaghara?
  • Jiri Ịhụnanya Na-edozi Nghọtahie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • ‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Gbaghara Site n’Obi Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 7/15 p. 21-24

Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?

Ihe nugharịrị​—⁠nke atọ n’ime ahịrị enyi ise a kpụrụ akpụ wee si n’elu uko ahụ daa. A ghaghị idochi nke ahụ daranụ. Ma ọ bụghị ya, a gaghị enwekwa nkwekọrịta dị n’etiti ìgwè ahụ dum. Otú ọ dị, usoro iji dochie ya siri ike, ọ na-eyikwa gị ka i rughị eru ime ya. Ị gaje ịchọ okwu ndụmọdụ ma ọ bụ ọbụna gwa onye ọkà ka ọ rụọ ọrụ ahụ.

NKWEKỌRỊTA dị n’etiti ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị n’ime mmụọ dị nnọọ oké ọnụ ahịa karịa ihe ịchọ mma nkịtị. Onye ọbụ abụ ahụ n’izi ezi bụrụ abụ, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!” (Abụ Ọma 133:1) Isoro onye Kraịst ibe anyị dozie okwu pụrụ mgbe ụfọdụ ịbụ ihe siri ike. Ọzọkwa, ụfọdụ adịghị eme nke a n’ụzọ ziri ezi. Ọtụtụ mgbe “mweghachi” ahụ na-egbu mgbu n’ụzọ na-adịghị mkpa ma ọ bụ ghara ịdịcha mma, na-ahapụ ihe ncheta ndị na-adịghị mma n’anya.

Ụfọdụ ndị Kraịst na-achọ iwebata ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’okwu ndị ha pụrụ ilekọta n’onwe ha n’ụzọ na-adịghị mkpa. Nke a pụrụ ịdị otú ahụ n’ihi na ha ejighị n’aka ihe ha ga-eme. “Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị amaghị ụzọ isi tinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ iji dozie esemokwu ha,” ka otu nwanna nwoke nweworo ahụmahụ n’inye ndụmọdụ Bible kwuru. “Ọtụtụ mgbe karị,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “ha adịghị agbaso ụzọ Jisọs si eme ihe.” Ya mere, gịnị ka Jisọs kwuru n’ezie banyere ụzọ onye Kraịst kwesịrị isi soro nwanna ya dozie okwu? N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ịmara ndụmọdụ nke a nke ọma ma mụta ụzọ isi tinye ya n’ọrụ?

Esemokwu Ndị Dị Nta

“Ya mere ọ bụrụ na ị na-eche onyinye gị n’ihu Chineke n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na nwanne gị nwere ihe megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, laba, buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụ bịakwa chee onyinye gị.”​—⁠Matiu 5:​23, 24.

Mgbe Jisọs kwuru okwu ndị ahụ, ọ bụ omenala ndị Juu ịchụ àjà, ma ọ bụ inye onyinye, n’ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Ọ bụrụ na onye Juu emehiewo onye Israel ibe ya, onye ahụ mehiere pụrụ ịchụ àjà nsuresị ọkụ ma ọ bụ àjà mkpuchi mmehie. Ihe atụ Jisọs kọrọ akụkọ ya batara n’oge ọ kasị sie ike. Mgbe onye ahụ nọ n’ebe ịchụàjà ma na-achọ inye onyinye Chineke ya, o cheta na nwanna ya nwere ihe megide ya. Ee, ọ dị onye Israel ahụ mkpa ịghọta na idozi okwu dị n’etiti ya na nwanna ya kwesịrị ibute ụzọ tupu imezu ibu ọrụ dị otú ahụ nke okpukpe.

Ọ bụ ezie na àjà ndị dị otú ahụ bụ ihe a chọrọ n’okpuru Iwu Mosis, ha n’onwe ha abaghị uru n’ụzọ kasị elu n’anya Chineke. Samuel onye amụma gwara Eze Sọl na-ekwesịghị ntụkwasị obi, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu.”​—⁠1 Samuel 15:22.

N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwughachiri usoro ihe ịka mkpa nke a ma gosi ndị na-eso ụzọ ya na ha aghaghị idozi esemokwu ha dị iche iche tupu ịchụ àjà ha. Taa, àjà ndị a chọrọ n’aka ndị Kraịst bụ ụdị nke ime mmụọ​—⁠“àjà, bụ́ otuto, nye Chineke mgbe nile, nke ahụ bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya.” (Ndị Hibru 13:15) Ka o sina dị, ụkpụrụ ahụ ka dịkwa irè. Jọn onyeozi gosiri n’ụzọ yiri nke ahụ na ọ ga-abụ ihe efu ka mmadụ na-azọrọ na ya hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na ọ na-akpọ nwanna ya asị.​—⁠1 Jọn 4:​20, 21.

N’ụzọ na-akpali mmasị, onye chetara na nwanna ya nwere ihe megide ya gaje iwere nzọụkwụ nke mbụ. Obi umeala nke o si otú a gosipụta ma eleghị anya ga-amịpụta ezi mkpụrụ. O yiri ka onye e mejọworo agaghị ajụ ikwenyere onye nke bịakwutere ya nke na-anakwere ihie ụzọ ya. Iwu Mosis ahụ setịpụrụ na a ga-eweghachi n’ozuzu ya ihe ọ bụla e weere n’ụzọ iwu na-akwadoghị ma gbakwụnyere ya otu ụzọ ọzọ n’ime ụzọ ise. (Levitikọs 6:5) A ga-eme ka mweghachi nke mmekọrịta udo, nke nkwekọrịta dị mfe karị n’otu ụzọ ahụ ma ọ bụrụ na onye ahụ mejọrọnụ egosi ọchịchọ ya gabiga ihe a chọrọ, n’ụzọ sikarịsịrị ike nke okwu ahụ, dozie ihe ọ bụla ọ pụrụ imebiwo.

Otú ọ dị, mgbalị nile iji weghachi mmekọrịta udo adịghị enwe ihe ịga nke ọma mgbe nile. Akwụkwọ Ilu na-echetara anyị na o siri ike isoro onye ọ na-esiri ike ịnakwere ihe dozie esemokwu. Ilu 18:19 na-asị: “Nwanne e jehieworo megide dị ike iwere karịa obodo siri ike: ise okwu dịkwa ka ihe ntụchi nile nke ụlọ elu.” Nsụgharị ọzọ na-agụ sị: “Nwanne nke e mejọrọ na-esi ike imeri karịa obodo ukwu dị ike: Ibu iro ha dị ka ihe ntụchi nile nke oké ụlọ.” (The Englishman’s Bible) Otú ọ dị, n’ikpeazụ, mgbalị ndị sitere n’ezi obi na nke obi umeala yikarịrị ka ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ọnọdụ nke ndị na-efekọ ofufe bụ́ ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ma n’ebe e nwere ebubo nke mmehie dị oké njọ, ọ na-adị mkpa itinye ndụmọdụ Jisọs e dekọrọ na Matiu isi 18 n’ọrụ.

Idozi Esemokwu Ndị Siri Ike

“Ọzọ, ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritere nwanna gị n’uru. Ma ọ bụrụ na ọ nụghị, kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ tinyere onwe gị, ka e wee mee okwu ọ bụla e kwuru ka o guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ. Ma ọ bụrụ na ọ ṅaghị ntị, gwa nzukọ m: ma ọ bụrụ na ọ ṅaghịkwa nzukọ m ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.”​—⁠Matiu 18:​15-⁠17.

Gịnị ma ọ bụrụ na onye Juu (ma ọ bụ mgbe e mesịrị, onye Kraịst) ezute nsogbu ndị siri ike n’ebe onye ya na ya na-efekọ Jehova nọ? Onye nke chere na e mehiewo megide ya gaje iwere nzọụkwụ nke mbụ. Ọ gaje isoro onye mejọrọ ya tụlee okwu ahụ ná nzuzo. Site n’anwaghị ịchịkọta nkwado maka akụkụ nke ya n’okwu ahụ, n’ezie o yikarịrị ka ọ ga-erite nwanna ya n’uru, karịsịa ma ọ bụrụ na e nwewo nanị nghọtahie nke a pụrụ ịgbazi ngwa ngwa. A ga-edozi okwu ahụ dum n’ụzọ dị mfe karị ma ọ bụrụ na ndị o metụtara kpọmkwem bụ nanị ndị maara banyere okwu ahụ.

Otú ọ dị, nzọụkwụ mbụ ahụ nwere ike ọ gaghị ezu. Iji hụ maka ọnọdụ ahụ, Jisọs sịrị: “Kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ.” Ndị a ga-akasị mma ịbụ ndị ji anya ha hụ ihe mere. Ma eleghị anya ha anụwo ka otu n’ime ndị ahụ kwutọrọ onye nke ọzọ, ma ọ bụ na ndị akpọ eje abụwo ndị akaebe n’otu nkwekọrịta e dere ede nke ọ bụ banyere ya ka akụkụ abụọ ahụ na-esere okwu ugbu a. N’aka nke ọzọ, ndị akpọ eje pụrụ ịghọ ndị akaebe mgbe ọ bụla e wepụtara ihe ngosi, dị ka okwu e dere ede ma ọ bụ nke e kwuru n’ọnụ, bụ́ nke e wepụtara iji mee ka ihe kpatara nsogbu ahụ pụta ìhè. N’ebe a kwa, nanị ọnụ ọgụgụ dịkarịsịrị nta dị ka o kwere omume​—⁠“otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ”​—⁠kwesịrị ịma banyere okwu ahụ. Nke a ga-egbochi ọnọdụ ịkawanye njọ ma ọ bụrụ na okwu ahụ bụ nanị nghọtahie.

Ebumnuche ndị dị aṅaa ka onye e mejọrọ kwesịrị inwe? Ò kwesịrị ịgbalị iweda onye Kraịst ibe ya ala ma chọọ ka ọ tụọ onwe ya n’ala rịọ biko? Site ná ndụmọdụ Jisọs, ndị Kraịst ekwesịghị ịdị ngwa ịkatọ ụmụnna ha. Ọ bụrụ na onye ahụ mejọrọnụ anabata mmejọ ya, rịọ mgbaghara, ma gbalịa idozi okwu, onye nke e mehiere megide ‘ga-eritewo nwanna ya n’uru.’​—⁠Matiu 18:15.

Ọ bụrụ na a pụghị idozi okwu ahụ, a gaje iwegara ya ọgbakọ. Na mbụ, nke a pụtara ndị okenye ndị Juu ma mesịa, bụrụ ndị okenye nke ọgbakọ ndị Kraịst. A pụrụ ịchụpụ onye ahụ mejọrọnụ nke na-enweghị nchegharị site n’ọgbakọ. Nke ahụ bụ ihe ọ pụtara bụ́ ‘iwere ya dị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ,’ ụmụ mmadụ ndị ndị Juu na-eze eze. Ime ihe nke a siri ike abụghị nke onye Kraịst ọ bụla n’onwe ya pụrụ ime. Ndị okenye a họpụtara ahọpụta, bụ́ ndị na-anọchite anya ọgbakọ, agwụla ndị e nyere ikike ime ihe dị otú ahụ.​—⁠Tụlee 1 Ndị Kọrint 5:13.

Ohere nke onye mejọrọnụ nke na-enweghị nchegharị ịbụ onye a chụpụrụ na-egosi na Matiu 18:​15-⁠17 emetụtaghị esemokwu ndị dị nta. Jisọs na-ezo aka ná mmejọ ndị siri ike, ma bụrụ ụdị nke a pụrụ idozi n’etiti nanị mmadụ abụọ o metụtara. Dị ka ihe atụ, mmejọ ahụ pụrụ ịbụ nkwujọ, na-emetụta aha onye e kwujọrọ n’ụzọ dị oké njọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ imetụta okwu ego, n’ihi na amaokwu ndị na-esochi nwere ihe atụ Jisọs nke ohu na-enweghị obi ebere nke a gbaghaara nnukwute ụgwọ. (Matiu 18:​23-⁠35) Ego a naara n’íbé nke a na-akwụghachighị n’oge a kara aka pụrụ ịbụ ihe isi ike na-agabiga agabiga nke a pụrụ idozi n’ụzọ dị mfe n’etiti mmadụ abụọ. Ma ọ pụrụ ịghọ mmehie dị oké njọ, ya bụ, ohi, ma ọ bụrụ na onye gbaziiri ego agbaa isi akwara jụ ịkwụghachi ihe o ji ụgwọ ya.

Mmehie ndị ọzọ bụ ndị a na-apụghị idozi nanị n’etiti ndị Kraịst abụọ. N’okpuru Iwu Mosis, a na-eme mkpesa mmehie ndị dị oké njọ. (Levitikọs 5:1; Ilu 29:24) N’otu aka ahụ, a ghaghị ikpesara ndị okenye ndị Kraịst ajọ mmehie ndị metụtara ịdị ọcha nke ọgbakọ.

Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’esemokwu n’etiti ndị Kraịst adịghị adaba n’usoro nke a.

Ị̀ Pụrụ Nnọọ Ịgbaghara?

Kpọmkwem ka Jisọs kọwasịrị ụzọ isi dozie esemokwu ndị siri ike, ọ kụziri ihe mmụta ọzọ dị mkpa. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ahụ Pita bịakwutere Ya, sị Ya, Onyenwe anyị, ugbo ole ka nwanna m ga-emehie megide m, ewee m gbaghara ya? ruo ugbo asaa? Jisọs sị ya, Asịghị m gị, Ruo ugbo asaa; kama, [iri ugbo asaa na asaa].” ( Matiu 18:​21, 22) N’oge ọzọ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-agbaghara “ugbo asaa n’otu ụbọchị.” (Luk 17:​3, 4) Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, a na-akpọku ndị na-eso ụzọ Kraịst idozi esemokwu site n’iwere amara gbaghara ibe ha.

Nke a bụ akụkụ nke chọrọ mgbalị dị ukwuu. “Ụmụnna ụfọdụ amaghị nnọọ ụzọ isi gbaghara,” ka onye ahụ e hotara ná mmalite kwuru. O kwukwasịrị: “O yiri ka ọ na-eju ha anya mgbe mmadụ kọwara na ha pụrụ ịhọrọ ịgbaghara, n’ụzọ kasị mkpa iji chebe udo dị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst.”

Pọl onyeozi dere, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, a sị na onye ọ bụla nwere ihe ịta onye ọ bụla ụta; ọbụna dị ka Onyenwe anyị weere amara gbaghara unu, unu onwe unu meekwa otú a.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Ya mere, tupu a gakwuru nwanna nke pụrụ imejọwo anyị, ọ ga-adị mma ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị na-esonụ: Mmejọ ahụ ò ruru eru ịgwa ya okwu banyere ya? Ọ̀ bụ ihe na-agaghị ekwe omume n’ezie nye m ikwere ka ihe gafeworo gafere n’ezi mmụọ nke Iso Ụzọ Kraịst? Ọ bụrụ na m nọ n’ọnọdụ ya, ọ̀ bụ na mụ agaghị achọ ka a gbaghara m? Ọ bụrụkwa na mụ ahọrọ ịhapụ ịgbaghara, m̀ pụrụ ịtụ anya Chineke ịza ekpere m ma gbaghara m? (Matiu 6:​12, 14, 15) Ajụjụ ndị dị otú ahụ pụrụ nnọọ inyere anyị aka ịdị na-agbaghara.

Dị ka ndị Kraịst, otu n’ime ibu ọrụ anyị ndị dị mkpa bụ ichebe udo dị n’ime ọgbakọ nke ndị Jehova. Ya mere, ka anyị tinye ndụmọdụ Jisọs n’ọrụ. Nke a ga-enyere anyị aka iwere amara gbaghara. Mmụọ mgbaghara dị otú ahụ ga-etinye ihe n’ịhụnanya ụmụnna nke bụ akara e ji ama ndị na-eso ụzọ Jisọs.​—⁠Jọn 13:​34, 35.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị Kraịst pụrụ idozi esemokwu ha dị iche iche site n’ịgbaso ndụmọdụ Jisọs

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya