Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 10/15 p. 17-22
  • Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’Uru
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka O Bu n’Uche?
  • Gbalịa Irite Nwanna Gị n’Uru
  • Inweta Enyemaka Rijuru Afọ
  • Mgbalị Ikpeazụ Iji Rite Ya n’Uru
  • Olee Otú I Si Edozi Esemokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịhụ na Ọgbakọ Na-adị n’Udo ma Na-adị Ọcha
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ṅomie Obi Ebere Chineke Taa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jiri Ịhụnanya Na-edozi Nghọtahie
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 10/15 p. 17-22

Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’Uru

“Jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritere nwanna gị n’uru.”—MATIU 18:15.

1, 2. Olee ndụmọdụ dị irè nke Jisọs nyere banyere ime ihe banyere mmejọ?

N’ỊBỤ onye oge ije ozi ya na-erughịzi otu afọ, Jisọs nwere ihe ndị dị mkpa ọ ga-akụziri ndị na-eso ụzọ ya. Ị pụrụ ịgụ ha na Matiu isi nke 18. Otu bụ mkpa ọ dị anyị ịdị umeala n’obi, dị ka ụmụaka. O kwuziri na anyị aghaghị izere ime ka “otu n’ime ndị nta ndị a” maa n’ọnya nakwa na anyị kwesịrị ịgbalị iweghachite “ndị nta” na-akpafu akpafu ka ha wee ghara ịla n’iyi. Mgbe ahụ Jisọs gbakwụnyere ndụmọdụ dị irè ma baa uru banyere idozi esemokwu n’etiti ndị Kraịst.

2 Ị pụrụ icheta okwu ya: “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritere nwanna gị n’uru. Ma ọ bụrụ na ọ nụghị, kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ tinyere onwe gị, ka e wee mee okwu ọ bụla e kwuru ka o guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ. Ma ọ bụrụ na ọ ṅaghị ha ntị, gwa nzukọ m: ma ọ bụrụ na ọ ṅaghịkwa nzukọ m ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.” (Matiu 18:15-17) Olee mgbe anyị kwesịrị itinye ndụmọdụ dị otú ahụ n’ọrụ, gịnịkwa kwesịrị ịbụ omume anyị n’ime otú ahụ?

3. N’ozuzu, olee nzọụkwụ anyị kwesịrị iwere banyere njehie nke ndị ọzọ?

3 Isiokwu bu ụzọ mesiri ya ike na ebe ọ bụ na anyị nile ezughị okè ma bụrụ ndị na-ejehie ejehie, ọ dị anyị mkpa ịrụ ọrụ n’ịbụ ndị na-agbaghara. Nke ahụ dị otú ahụ karịsịa mgbe ihe onye Kraịst ibe anyị kwuru ma ọ bụ mee wutere anyị. (1 Pita 4:8) Ọ na-akasị mma mgbe mgbe ịgabiga mmejọ ahụ—ịgbaghara ma chefuo ya. Anyị pụrụ ile ime nke a anya dị ka ịtụnye ụtụ n’udo nke ọgbakọ ndị Kraịst. (Abụ Ọma 133:1; Ilu 19:11) Ma, a pụrụ inwe oge mgbe ị pụrụ iche na ị ghaghị isoro nwanna gị nwoke ma ọ bụ nwanna gị nwanyị nke mere ihe wutere gị dozie okwu. N’ọnọdụ dị otú ahụ, okwu Jisọs ndị dị n’elu na-enye nduzi.

4. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ụkpụrụ dị na Matiu 18:15 n’ọrụ n’ebe mmejọ nke ndị ọzọ dị?

4 Jisọs nyere ndụmọdụ ka ị “tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Nke ahụ bụ ihe amamihe dị na ya. Otú nsụgharị ụfọdụ nke asụsụ German si tinye nkebi ahịrịokwu a bụ, chee mmejọ ya “n’ebe anya anọ na-ahụ ya,” nke pụtara anya gị na nke ya. Mgbe i ji obiọma welite okwu banyere nghọtahie ahụ n’etiti nanị gị na ya abụọ, ọ na-akakarị adị mfe idozi ya. Nwanna nke mere ma ọ bụ kwuo ihe wutere gị ma ọ bụ ihe na-adịghị gị mma pụrụ ịnabata mmejọ ahụ ngwa ngwa mgbe ọ bụ nanị gị na ya. Ọ bụrụ na ndị ọzọ na-ege ntị, ọdịdị nke mmadụ na-ezughị okè nwere ike ime ka ọ ghara ikweta na ya emezighị emezi ma ọ bụ nwaa ime ka a ga-asị na ihe o mere ziri ezi. Ma ka ị na-ewelite okwu ahụ “n’ebe anya anọ na-ahụ ya,” ị pụrụ ịchọpụta na ọ bụ nghọtahie kama ịbụ mmehie ma ọ bụ mmejọ a ma ụma mee. Ozugbo unu abụọ ghọtara na ọ bụ nghọtahie, unu pụrụ idozi ya, n’ekweghị ka okwu na-enweghị ihe ọ pụtara too ma mebie mmekọrịta unu. N’ikwu ya kpọmkwem, a pụrụ itinye ụkpụrụ ahụ dị na Matiu 18:15 n’ọrụ ọbụna n’ebe obere mmejọ ndị a na-enwe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị dị.

Gịnị Ka O Bu n’Uche?

5, 6. Dị ka ihe a na-ekwu banyere ya si dị, ụdị mmehie dị aṅaa ka Matiu 18:15 na-ekwu banyere ha, oleekwa ihe na-egosi nke ahụ?

5 N’ikwu ya n’ụzọ a kapịrị ọnụ, ihe Jisọs dụrụ n’ọdụ metụtara okwu ndị siri ike karị. Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie.” N’echiche sara mbara, ‘mmehie’ pụrụ ịbụ ihie ụzọ ma ọ bụ mmejọ ọ bụla. (Job 2:10; Ilu 21:4; Jemes 4:17) Otú ọ dị, ihe a na-ekwu banyere ya na-enye echiche na mmehie Jisọs bu n’uche aghaghị ịbụ nke dị oké njọ. Ọ jọgburu nnọọ onwe ya nke na ọ pụrụ iduga n’ile onye mmehie ahụ anya dị “ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.” Gịnị ka nkebi ahịrịokwu ahụ pụtara?

6 Ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị na-anụ okwu ndị ahụ maara na ndị obodo ha agaghị esoro ndị Jentaịl mekọọ ihe. (Jọn 4:9; 18:28; Ọrụ 10:28) N’ezie ha zekwaara ndị ọna ụtụ, bụ́ ndị ikom a mụrụ dị ka ndị Juu ma bụrụ ndị ghọrọ ndị na-erigbu ndị mmadụ. Ya mere, izo aka ahụ e zoro na Matiu 18:15-17 bụ maka mmehie ndị dị oké njọ, ọ bụghị mmejọ ma ọ bụ ihe mwute mmadụ mere gị bụ́ nke ị pụrụ nnọọ ịgbaghara ma chefuo.—Matiu 18:21, 22.a

7, 8. (a) Ụdị mmehie ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka ndị okenye mee ihe banyere ha? (b) Ụdị mmehie ndị dị aṅaa ka ndị Kraịst abụọ pụrụ idozi, n’ikwekọ na Matiu 18:15-17?

7 N’okpuru Iwu ahụ, mmehie ụfọdụ chọrọ ihe karịrị mgbaghara n’aka onye e mejọrọ. A ga-akọsara ndị okenye (ma ọ bụ ndị nchụàjà) banyere nkwulu, ndapụ n’ezi ofufe, ikpere arụsị, na mmehie mmekọahụ bụ́ ịkwa iko nile, na ndina ụdị onwe, ha ga-emekwa ihe banyere ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Levitikọs 5:1; 20:10-13; Ọnụ Ọgụgụ 5:30; 35:12; Deuterọnọmi 17:9; 19:16-19; Ilu 29:24) Otú ọ dị, rịba ama na mmadụ abụọ pụrụ idozi ụdị mmehie ndị Jisọs kwuru banyere ha n’ebe a. Dị ka ihe atụ: N’ihi iwe ma ọ bụ ekworo, mmadụ ekwutọọ mmadụ ibe ya. Onye Kraịst anara ọrụ ngo nke ọ ga-eji ụdị ngwá ọrụ a kpọrọ aha rụọ nakwa ịrụsị ya n’oge a kara aka. Mmadụ ekweta na ya ga-akwụghachi ego n’oge a kara aka. Mmadụ ekwe nkwa na ọ bụrụ na onye were ya n’ọrụ azụọ ya, na ya agaghị (ọbụna ma ọ bụrụ na ya na-agbanwe ọrụ) ama onye were ya n’ọrụ aka ma ọ bụ nwaa iweghara ndị ahịa ya ruo oge a kara aka ma ọ bụ n’ógbè a kpọrọ aha.b Ọ bụrụ na nwanna emezughị ihe o kwere ná nkwa ma ghara inwe nchegharị n’okwu ndị dị otú ahụ, ọ ga-adị oké njọ n’ezie. (Mkpughe 21:8) Ma mmadụ abụọ ahụ o metụtara pụrụ idozi mmejọ dị otú ahụ.

8 Otú ọ dị, olee otú ị ga-esi gaa n’ihu n’idozi okwu ahụ? E lewo okwu Jisọs anya mgbe mgbe ná nkebi atọ. Ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime ha. Kama ile ha anya dị ka usoro iwu a na-aghaghị ịgbaso otú ha si dị, gbalịa ịghọta nzube e ji kwuo ha, n’echefughị ihe mgbaru ọsọ ịhụnanya gị.

Gbalịa Irite Nwanna Gị n’Uru

9. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere itinye Matiu 18:15 n’ọrụ?

9 Jisọs si otú a malite: “Ọ bụrụ na nwanna gị emehie megide gị, jee, tụọ ya mmehie ya n’anya n’etiti nanị gị na ya abụọ: ọ bụrụ na ọ nụrụ olu gị, i ritere nwanna gị n’uru.” N’ụzọ doro anya, nke a abụghị nzọụkwụ a ga-ewere na-adabere nanị n’inyo mmadụ enyo. I kwesịrị inwe ihe àmà ma ọ bụ ihe ọmụma doro anya bụ́ nke ị pụrụ iji mee ihe inyere nwanna gị aka ịhụ na o mezighị emezi nakwa na ọ dị ya mkpa idozi okwu ahụ. Ọ dị mma ime ihe ozugbo, n’ekweghị ka okwu ahụ dịkwuo njọ ma ọ bụ ka omume ya gbakwuo mkpọrọgwụ. Echefukwala na itinye uche gị na ya pụkwara imerụ gị ahụ. Ebe ọ bụ na nkwurịta okwu ahụ gaje ịdị n’etiti nanị gị na ya, zere ibu ụzọ gwa ya ndị ọzọ iji mee ka ha nwee ọmịiko n’ahụ gị ma ọ bụ iji welitekwuo ùgwù onwe onye gị. (Ilu 12:25; 17:9) N’ihi gịnị? N’ihi ihe mgbaru ọsọ gị.

10. Gịnị ga-enyere anyị aka irite nwanna anyị n’uru?

10 Nzube gị kwesịrị ịbụ irite nwanna gị n’uru, ọ bụghị inye ya ahụhụ, iweda ya ala, ma ọ bụ imebi aha ya. Ọ bụrụ na o mere ihe na-ezighị ezi n’ezie, mmekọrịta ya na Jehova dị n’ihe ize ndụ. N’ezie, ị chọrọ ka ọ nọgide na-abụ nwanna gị bụ́ onye Kraịst. Ohere e nwere maka inwe ihe ịga nke ọma ga-aka adị ukwuu ma ọ bụrụ na i jiri ụzọ dị jụụ, na-ezere okwu na-agbakasị ahụ ma ọ bụ olu okwu na-egosipụta ibo ebubo na-eme ihe ná nkwurịta okwu ahụ nanị unu abụọ na-enwe. Ná nkwurịta okwu ihu na ihu a unu ji ịhụnanya na-enwe, cheta na unu abụọ bụ mmadụ ndị na-ezughị okè, na-emehie emehie. (Ndị Rom 3:23, 24) Ka ọ na-aghọta na i jibeghị ya gbaa asịrị, na-ahụkwa na i ji ezi obi achọ inyere ya aka, ihe ngwọta pụrụ ịbịa ngwa ngwa. Ụzọ obiọma a nke doro anya ga-egosipụta amamihe karịsịa ma ọ bụrụ na o mesịrị bụrụ na unu abụọ nwechara ebe unu na-emezighị emezi ma ọ bụ na ọ bụ nghọtahie kpatara okwu ahụ n’ezie.—Ilu 25:9, 10; 26:20; Jemes 3:5, 6.

11. Ọ bụrụgodị na onye mejọrọ anyị egeghị anyị ntị, gịnị ka anyị pụrụ ime?

11 Ọ bụrụ na i nyere ya aka ịhụ na o mere ihe ọjọọ nakwa na ọ dị oké njọ, ọ pụrụ ịbụ onye a kpaliri ichegharị. Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, nganga pụrụ ịbụ ihe mgbochi. (Ilu 16:18; 17:19) Ya mere ọ bụrụgodị na ọ nabataghị mmejọ ahụ na mbụ ma chegharịa, ị pụrụ icheretụ tupu i were okwu ahụ gaa n’ihu. Jisọs asịghị ‘jee nanị otu ugbo tụọ ya mmehie ya n’anya.’ Ebe ọ bụ mmehie nke unu pụrụ idozi, tụlee ijekwuru ya ọzọ ná mmụọ nke Ndị Galetia 6:1 nakwa “n’ebe anya anọ na-ahụ ya.” Ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. (Tụlee Jud 22, 23.) Ma, gịnị ma ọ bụrụ na o weela gị anya na o mere mmehie nakwa na ọ gaghị eme ihe banyere ya?

Inweta Enyemaka Rijuru Afọ

12, 13. (a) Olee nzọụkwụ nke abụọ Jisọs kwupụtara banyere idozi mmejọ? (b) Olee ihe ndị e kwesịrị ịkpachara anya banyere ha mgbe a na-ewere nzọụkwụ a?

12 Ị̀ ga-achọ ka ndị ọzọ hapụ gị ngwa ngwa ma ọ bụrụ na i mere otu mmehie dị oké njọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’otu aka ahụ, Jisọs gosiri na mgbe i wesịịrị nzọụkwụ mbụ ahụ, i kwesịghị ịkwụsị ịgbalị irite nwanna gị n’uru, ka gị na ya na ndị ọzọ wee nọgide na-adị n’otu n’ife Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. Jisọs kwupụtara nzọụkwụ nke abụọ: “Ọ bụrụ na ọ nụghị, kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ tinyere onwe gị, ka e wee mee okwu ọ bụla e kwuru ka o guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ.”

13 Ọ sịrị ka e kuru “otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ.” Ọ sịghị na mgbe i wesịịrị nzọụkwụ nke mbụ ahụ na i nweere onwe gị ịkọrọ ọtụtụ ndị ọzọ nsogbu ahụ, ịkpọtụrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ idegara ụmụnna akwụkwọ banyere nsogbu ahụ. N’agbanyeghị otu o si wee gị anya na o mejọrọ ihe, a nwapụtabeghị ya n’ezie n’ụzọ zuru ezu. Ị gaghị achọ ịgbasa ihe ọmụma na-ezighị ezi nke pụrụ imesị bụrụ na i kwutọrọ mmadụ. (Ilu 16:28; 18:8) Kama Jisọs sịrị ka i kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ. N’ihi gịnị? Oleekwa ndị ha pụrụ ịbụ?

14. Olee ndị anyị pụrụ ikuru gaa maka nzọụkwụ nke abụọ?

14 Ị na-agbalị irite nwanna gị n’uru site n’ime ka o kweta na o meela mmehie nakwa site n’ịkpali ya ichegharị ka gị na ya na Chineke wee dị n’udo. Iji mezuo nke ahụ, ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na “otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ” ahụ bụ ndị akaebe nke mmejọ ahụ. Ikekwe ha nọ mgbe o mere, ma ọ bụ ha nwere ihe ọmụma ziri ezi banyere ihe e mere (ma ọ bụ ihe a na-emeghị) n’okwu achụmnta ego. Ọ bụrụ na ndị akaebe dị otú ahụ anọghị ya, ndị ị ga-ekuru pụrụ inwe ahụmahụ n’okwu ahụ ma nwee ike ịnwapụta ma e mejọrọ ihe n’ezie. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọ dị mkpa mgbe e mesịrị, ha pụrụ ịbụ ndị akaebe nke ihe e kwuru, na-emesi eziokwu ndị e wepụtara na mgbalị ndị e mere ike. (Ọnụ Ọgụgụ 35:30; Deuterọnọmi 17:6) N’ihi ya, ha abụghị ndị na-enweghị ebe ha kwụ n’okwu ahụ, ndị nchọpụta nkịtị; ma, ọnụnọ ha nọ ya bụ iji nye aka irite nwanna gị na ha n’uru.

15. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ iji bụrụ ihe enyemaka ma ọ bụrụ na anyị aghaghị iwere nzọụkwụ nke abụọ ahụ?

15 Ọ dịghị gị mkpa iche na ndị ị ga-ekuru aghaghị ịbụ ndị ikom bụ́ ndị okenye n’ọgbakọ. Otú ọ dị, ndị ikom tozuru okè bụ́ ndị okenye pụrụ ịtụnye ụtụ site n’iru eru ime mmụọ ha. Ndị okenye dị otú ahụ dị “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ha nwere ahụmahụ n’isoro ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị tụgharịa uche nakwa n’ịgbazi ha. Onye ahụ mere ihe ọjọọ nwekwara ezi ihe mere ọ ga-eji gosipụta obi ike n’ebe “onyinye n’ụdị mmadụ” dị otú ahụ nọ.c (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12, NW) Ikwupụta ihe ahụ n’ihu ndị dị otú ahụ tozuru okè na isonyere ha n’ekpere pụrụ ime ka e nwee ọnọdụ ọhụrụ ma dozie ihe yiri ka a pụghị idozi ya edozi.—Tụlee 5:14, 15.

Mgbalị Ikpeazụ Iji Rite Ya n’Uru

16. Gịnị bụ nzọụkwụ nke atọ nke Jisọs kwupụtara?

16 Ọ bụrụ na nzọụkwụ nke abụọ edozighị okwu ahụ, ndị nlekọta ọgbakọ ga-abatarịrị na nzọụkwụ nke atọ. “Ọ bụrụ na ọ ṅaghị [otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ahụ] ntị, gwa nzukọ m: ma ọ bụrụ na ọ ṅaghịkwa nzukọ m ntị, ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.” Gịnị ka nke a na-agụnye?

17, 18. (a) Ụkpụrụ dị aṅaa na-enyere anyị aka ịghọta ihe ‘ịgwa nzukọ Chineke’ pụtara? (b) Olee otú anyị si ewere nzọụkwụ a taa?

17 Anyị adịghị aghọta ya dị ka ntụziaka iwelite mmehie ma ọ bụ mmejọ ahụ n’otu n’ime nzukọ ọgbakọ na-enwe mgbe nile ma ọ bụ ná nzukọ pụrụ iche nke ndị ọgbakọ ahụ dum nọ na ya. Anyị pụrụ ịchọpụta usoro kwesịrị ekwesị site n’Okwu Chineke. Lee ihe a ga-eme n’Israel oge ochie banyere okwu metụtara nnupụisi, imefusị ihe, na ịṅụbiga mmanya ókè: “Mgbe nwoke nwere nwa nwoke na-ewezụga onwe ya, na-enupụkwa isi, nke na-agaghị ege ntị n’olu nna ya, na n’olu nne ya, ha wee dọọ ya aka ná ntị, ma o geghị ha ntị: nna ya na nne ya ga-ejidekwa ya aka, mee ka ọ pụkwuru ndị okenye obodo ya, wee ruo ọnụ ụzọ ama ebe nke ya; ha ga-asịkwa ndị okenye obodo ya, Nwa anyị nke a na-ewezụga onwe ya, na-enupụkwa isi, ọ dịghị ege ntị n’olu anyị; ọ bụ onye mmefu, na onye na-aṅụbiga mmanya ókè. Ndị ikom nile nke obodo ya ga-ewere nkume tụgbuo ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Deuterọnọmi 21:18-21.

18 Mba ahụ nile ma ọ bụ ndị nile nọ n’ebo nke nwoke ahụ anụghị mmehie ya ma ọ bụ kpee ya ikpe. Kama nke ahụ, “ndị okenye” a maara nke ọma mere ihe banyere ya dị ka ndị nnọchiteanya nke mkpọkọta ahụ. (Tụlee Deuterọnọmi 19:16, 17 banyere okwu nke ‘ndị nchụàjà na ndị ikpe ndị nọrọ na mgbe ahụ’ lebara anya.) N’ụzọ yiri nke ahụ taa, mgbe ọ dị mkpa ka e were nzọụkwụ nke atọ ahụ, ndị okenye, bụ́ ndị na-anọchite anya ọgbakọ, na-eme ihe banyere okwu ahụ. Ihe mgbaru ọsọ ha bụ otu ihe ahụ, irite nwanna ahụ bụ́ onye Kraịst n’uru ma ọ bụrụ na o nwere otú ọ ga-esi kwe omume. Ha na-egosipụta nke a site n’igosi ikpe ziri ezi, ọ bụghị ibu ụzọ kpee ikpe tupu ha anụ okwu ahụ ma ọ bụ ile mmadụ anya n’ihu.

19. Gịnị ka ndị okenye a họpụtara ịnụ okwu ahụ ga-agbalịsi ike ime?

19 Ha ga-agbalịsi ike ịchọpụta ihe bụ́ eziokwu ma nụrụ ihe akaebe ndị dị mkpa iji chọpụta ma e mere mmehie n’ezie (ma ọ bụ ka nọgide na-emehie). Ha chọrọ ichebe ọgbakọ pụọ ná mmetọ na iwepụ mmụọ nke ụwa. (1 Ndị Kọrint 2:12; 5:7) N’ikwekọ n’iru eru ha ruru n’ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ, ha ga-agbalị “ịdụsi ọdụ ike n’ime ozizi nke na-enye ezi ndụ, na ịtụkwa ndị na-ekwugide ekwugide mmehie ha n’anya.” (Taịtọs 1:9) E nwere olileanya na onye ahụ mere ihe ọjọọ agaghị adị ka ụmụ Israel bụ́ ndị onye amụma Jehova dere banyere ha, sị: “Akpọrọ m unu òkù, ma unu azaghị m; ekwuru m okwu, ma unu anụghị; unu wee mee ihe jọrọ njọ n’anya m abụọ, ọ bụkwa ihe nke na-atọghị m ụtọ ka unu họpụtara.”—Aịsaịa 65:12.

20. Gịnị ka Jisọs sịrị na ọ ghaghị ime ma ọ bụrụ na onye mmehie ahụ ajụ ige ntị na ichegharị?

20 Otú ọ dị, n’ọnọdụ dị nnọọ ole na ole, onye ahụ mere ihe ọjọọ na-egosipụta otu ụdị omume ahụ. Ọ bụrụ otú ahụ, ntụzi Jisọs nyere doro anya: “Ka ọ dịrị gị ka onye mba ọzọ na onye ọna ụtụ.” Onyenwe anyị atụghị aro ka e megbuo ma ọ bụ na-achọsi ike ime ihe ọ bụla ga-ewute onye ahụ. Otú ọ dị, e nweghị ihe mgbagwoju anya dị ná ntụziaka Pọl onyeozi ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) Ọbụna nke a pụrụ n’ikpeazụ ịrụpụta ihe mgbaru ọsọ nke irite onye mmehie ahụ n’uru.

21. Olee ohere ka dịịrị onye a chụpụrụ n’ọgbakọ?

21 Anyị pụrụ ịhụ otú nke ahụ pụrụ isi kwe omume site n’ilu Jisọs banyere nwa mmefu. Dị ka ihe atụ ahụ si kọọ, mgbe o bisịrị n’ebe ọzọ ruo oge ụfọdụ n’enweghị mkpakọrịta ịhụnanya a na-enwe n’ụlọ nna ya, onye mmehie ahụ bịara “mara onwe ya.” (Luk 15:11-18) Pọl gwara Timoti na ka oge na-aga, ndị mmehie ụfọdụ ga-echegharị “wee teta n’ụra mmanya pụọ n’ọnyà ekwensu.” (2 Timoti 2:24-26) N’ezie, anyị ga-enwe olileanya na ndị ọ bụla nke na-eme mmehie n’enweghị nchegharị ma bụrụ ndị a na-aghaghị ịchụpụ n’ọgbakọ, ga-enwe mmetụta nke mfu—ma nke ihu ọma Chineke ma nke iso ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe na-enwe mkpakọrịta ịhụnanya—mgbe ahụkwa bịa mara onwe ha.

22. Olee otú anyị ka pụrụ isi rite nwanna anyị n’uru?

22 Jisọs eleghị ndị mba ọzọ na ndị ọna ụtụ anya dị ka ndị na-enweghị mmekwata. Otu n’ime ndị ọna ụtụ, bụ́ Matiu Livaị, chegharịrị, jiri ezi obi ‘na-eso Jisọs,’ ọbụna bụrụ onye a họpụtara dị ka onyeozi. (Mak 2:15; Luk 15:1) Ya mere, ọ bụrụ na onye mmehie ‘aṅaghịkwa nzukọ ntị’ taa ma bụrụ onye a chụpụrụ na ya, anyị pụrụ ichere iji hụ ma ọ̀ ga-echegharị ka oge na-aga, meekwa ka ụzọ ya guzozie. Mgbe o mere otú ahụ ma bụrụghachi onye òtù nke ọgbakọ, mgbe ahụ anyị ga-enwe obi ụtọ na anyị eriteghachila nwanna anyị n’uru n’ọgbakọ nke ezi ofufe.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Cyclopedia nke McClintock na Strong dere na-ekwu, sị: “A gụrụ ndị na-anakọta ụtụ [ndị na-achụ nta taks] nke Agba Ọhụrụ dị ka ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ya na ndị wezụgara onwe ha n’ezi ofufe, ndị merụrụ onwe ha site n’iso ndị na-ekpere arụsị na-enwe mmekọrịta mgbe nile, bụ́ ndị kwere ka ndị mmegbu were ha na-arụ ọrụ. A gụkọtara ha na ndị mmehie . . . N’ịbụ ndị a gbahapụrụ, ndị ndị na-ebi obi dị ọcha na-asọ oyi, ha nwere ndị enyi ma ọ bụ ndị ibe nanị n’etiti ndị, dị ka ha onwe ha, bụ ndị a na-asọ oyi.”

b Okwu banyere achụmnta ego ma ọ bụ ego bụ́ ndị metụtara ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke aghụghọ ma ọ bụ wayo pụrụ iso n’ụdị mmehie Jisọs bu n’uche. Iji gosi nke ahụ, mgbe o nyesịrị ntụziaka ahụ e dekọrọ na Matiu 18:15-17, Jisọs nyere ihe atụ nke ndị ohu (ndị e were n’ọrụ) bụ́ ndị ji ụgwọ ma ghara ịkwụghachi ya.

c Otu ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “Ọ na-eme mgbe ụfọdụ na onye mere ihe ọjọọ na-aka adị njikere ịṅa mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ntị (karịsịa ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ruru eru ka a kwanyere ha ùgwù) karịa ka ọ ga-aṅa otu onye, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ya na ya nweworo echiche dịrịtara iche.”

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ụzọ bụ́ isi, ụdị mmehie dị aṅaa ka Matiu 18:15-17 na-ekwu banyere ya?

◻ Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na anyị aghaghị iwere nzọụkwụ mbụ ahụ?

◻ Olee ndị pụrụ inye aka ma ọ bụrụ na anyị aghaghị iwere nzọụkwụ nke abụọ?

◻ Olee ndị a gụnyere n’iwere nzọụkwụ nke atọ, oleekwa otú anyị ka pụrụ isi rite nwanna anyị n’uru?

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị Juu zeere ndị ọna ụtụ. Matiu si n’ụzọ ya chigharịa ma soo ụzọ Jisọs

[Foto dị na peeji nke 20]

Mgbe mgbe anyị pụrụ idozi okwu “n’ebe anya anọ na-ahụ ya”  

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya