Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 8/1 p. 21-26
  • Isoro Nzukọ Kasị Enwe Ọganihu Na-ejekọ Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isoro Nzukọ Kasị Enwe Ọganihu Na-ejekọ Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụbọchị Ndị Mbụ
  • Ndụ Ọhụrụ na Betel
  • Iso Nwanna Rutherford Mekọọ Ihe
  • Oge Ụfọdụ nke Ihe Isi Ike Ego
  • Iji Redio ahụ Arụ Ọrụ
  • Ígwè Phonograph
  • Ọrụ Na-enye Ọṅụ n’Ubi
  • Nduzi Chineke
  • Ndụ Jupụtara n’Ezi Ihe n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Otú Anyị Si Ezi Ozi Ọma—Anyị Na-esi Ụzọ Dị Iche Iche Ezi Ozi Ọma
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Nke A Ọ̀ Pụrụ Ịbụ Ụzọ Ndụ Kasị Mma Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ị̀ Pụrụ Iwepụta Onwe Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 8/1 p. 21-26

Isoro Nzukọ Kasị Enwe Ọganihu Na-ejekọ Ozi

DỊ KA ROBERT HATZFELD SI KỌỌ

Taa ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ na-eji remote control gbanwuo telivishọn iji kirie akụkọ mgbede ka ihe a na-akọ banyere ha na-apụta dị ka ha dị n’ezie, ghara ma ọlị iwere ya dị ka ijuanya ọ bụla. Ma, ọ dị nnọọ ka ọ bụ ụnyaahụ ka m bụ nwa okoro dị afọ 12 nke saghesịrị anya na-ekiri n’ihu enyo sịnịma onyinyo otu nwoke nke karịrị otú mmadụ na-aha, ọ na-ekwukwa okwu!

ỌBỤCHAGHỊ oké ihe akụkọ, ka ị pụrụ iche. Ma o yiri n’ezie ọrụ ebube nke oge a nye m laa azụ na 1915, n’ụbọchị ndị mbụ nke ihe nkiri tụrụ àgwà oji na ọcha nanị. Nwoke dị ebube nke gbara afụ ọnụ pụtara n’ihu enyo ahụ ma kwuo, sị: “Foto Ihe Nkiri nke Okike bụ́ nke I.B.S.A., Òtù Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile, na-egosi.” Ruo hour abụọ na-esonụ, akụkọ Bible ahụ kpughere n’ihu anyị. Ozi Akwụkwọ Nsọ ya doro anya ma na-enye ume ọhụrụ. Ma, ọ bụ ihe nkiri nke a na-emegharị ahụ na ya, nke e tinyetụrụ slide foto ndị tụrụ àgwà àgwà, na okwu ndị a gụnyere na ya dọọrọ mmasị m n’ezie.

Amataghị m ya mgbe ahụ, ma ịnụ ọkụ n’obi m nke onye ntorobịa maka oké ihe nkà na ụzụ ahụ bụ mmalite nke ọrụ a ga-arụ ná ndụ nile n’isonyere nzukọ kasị enwe ọganihu n’elu ụwa.

Ụbọchị Ndị Mbụ

Na 1891 nna m si Dillenburg, Germany, bịa n’ógbè ndị Germany dị n’Allegheny, Pennsylvania, U.S.A. E mesịa o zutere otu nwa agbọghọ nọ n’otu ezinụlọ ndị Germany bi n’ebe ahụ, ha wee lụọ. A mụrụ m na July 7, 1903, a zụlitekwara m ịsụ ma German ma Bekee. Kpọmkwem tupu Agha Ụwa Mbụ amalite na 1914, ntiwapụ nke ụkwara nta napụrụ m ma nne m ma nna m ma hapụ m ịbụ nwa na-enweghị nne na nna. Nna mụ ochie nwụrụ site n’ahụ mkpọnwụ n’ihe dị ka n’otu oge ahụ.

Nwanne nna m nke nwanyị, bụ́ Minna Boemer, ji obi ọma kpọbata m n’ezinụlọ ya. “Enwere m ụmụ ise,” ka o kwuru. “Apụkwara m inwe otu ọzọ.” Ọ bụ ezie na agụụ ndị mụrụ m na-agụ m, Dada Minna nyere m ezigbote ebe obibi.

Nwanne nna m bụ onye nọteworo aka n’Ọgbakọ Allegheny nke Ndị Mmụta Bible (dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’ụbọchị ndị ahụ). Tupu 1909, Nwanna C. T. Russell, onye isi oche oge ahụ nke Watch Tower Society, nọkwa n’ọgbakọ ahụ. Deede Minna kpọọrọ m na-aga nzukọ. Ọ bụ ezie na ezinụlọ anyị emeghị oké mgbalị ịmụ ihe ma ọ bụ ime nkwusa laa azụ n’oge ahụ, ihe ọ bụla anyị nụrụ ná nzukọ, anyị na-eso ndị anyị maara na-ekerịta ya n’ụzọ a na-akwadoghị akwado.

Ọ bụ n’oge a ka “Foto Ihe Nkiri” ahụ mere ka m nwee ihe ijuanya dị ukwuu. Ebe ọ bụ na uche m dị n’ọrụ mekanik, nkà ọhụrụ ahụ e ji ese foto na ijikọ ụda olu na onyoonyo masịrị m nke ukwuu, dị ka ise foto n’ụzọ na-eme ka ihe gbaa ọsọ karịa ka ọ na-adị n’ìhè. Ikiri mmeghe nke okooko osisi na-akpali akpali!

Na 1916 ọnwụ nke Nwanna Russell mere ka anyị nwee obi ilu. Ebe ọ bụ na anyị nọ kpọmkwem n’Allegheny, anyị gara ememe ili ozu ya n’Ụlọ Nzukọ Carnegie. Nke a bụ ụlọ nzukọ ebe Nwanna Russell soro E. L. Eaton rụọ ụka na 1903. Anụwo m akụkọ banyere ụkọchukwu chọọchị Episcopalian ndị Metọdist nke a bụ́ onye mara C. T. Russell aka maka ịrụ ụka were ụbọchị isii, na-enwe olileanya iwetu mmụta Nwanna Russell nwere maka Bible ala. Kama nke ahụ, ka e kwuru, Russell ‘chere okporo mmiri ahụ ihu na hell.’ Sara Kaelin, onye colporteur a maara nke ọma na Pittsburgh, maara Russell na nwunye ya n’onwe ya. N’ememe ili ozu ahụ ọ hụrụ ka Maria Russell dọsara okooko osisi ụfọdụ n’igbe ozu ahụ ya na akwụkwọ e dere, “Nye Di Mụ Ọma.” Ọ bụ ezie na o kewapụwo n’ebe nwanna ahụ nọ ruo afọ ụfọdụ tupu mgbe ahụ, Maria ka wekwaara ya dị ka di ya.

Ka ọtụtụ afọ na-agafe, enwere m ọtụtụ ohere iji nweta ikike nkà na ụzụ bara uru maka ọrụ m n’ọdịnihu. Nwanne nne m nke nwoke bụ́ onye na-ahụ maka ọdịmma m bụ onye ọrụ owuwu ihe. N’oge m nọ ezumike ụlọ akwụkwọ, ọ na-eme ka m soro ndị ọrụ eletrik ya na-arụ ọrụ, na-eme ka ụlọ ochie ndị ji gas arụ ọrụ gbanwee malite iji eletrik. Na 1918 ụmụ akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ anyị wuru otu ígwè ọrụ redio na teligraf nke ụmụaka. Anyị na-ezukọ n’uhuruchi ma na-eji eletrik na magnet na-eme nnwale. Na 1926 mụ na otu enyi m kpebiri ịchụso nrọ anyị nwere na nwata​—⁠ịrụ ọrụ n’ụgbọ mmiri ma gaa njem gburugburu ụwa. Anyị denyere aha anyị n’ụlọ akwụkwọ Radio Corporation of America maka ndị ji ígwè ọrụ redio na teligraf arụ ọrụ.

Ndụ Ọhụrụ na Betel

Ụlọ akwụkwọ redio ahụ anyị gara dị na New York City, ya mere emere m njem gafere osimiri ahụ gaa Brooklyn maka nzukọ Ndị Mmụta Bible, bụ́ ndị a na-eme n’ụlọ nzukọ a na-akwụ ụgwọ ya kwa ọnwa nke Ụlọ Nsọ Ndị Mason bụ́ nke meworo ochie. Laa azụ n’oge ahụ, e nwere nanị otu ọgbakọ n’ógbè obodo ukwu dum ahụ nke New York. Mgbe ụmụnna si Betel (ebe obibi nke ezinụlọ isi ụlọ ọrụ nke Ndị Mmụta Bible) matara na mụ na-amụ akwụkwọ maka inweta laịsensị redio azụmahịa, ha sịrị: “Gịnị ka ị ga-eji gaa n’oké osimiri? Anyị nwere ụlọ ọrụ redio kpọmkwem n’ebe a, anyị chọkwara onye ga-ahụ maka ya.” Ha kpọrọ m òkù ịbịa n’ụlọ ọrụ ahụ maka ịgba ajụjụ ọnụ. Ọ dịghị ihe m maara banyere Betel e wezụga na ọ bụ isi ụlọ ọrụ nke Ndị Mmụta Bible.

Ụmụnna ahụ gbara m ajụjụ ọnụ ma gbaa mụ ume ka m gụsịa akwụkwọ m, nweta laịsensị, ma bịa Betel. Mgbe m gụpụrụ akwụkwọ, kama ịbanye n’ụgbọ nke chere ihu n’oké osimiri, achịkọọrọ m uwe ole na ole m nwere ma rịkwasị n’ụgbọ okporo ígwè na-agba n’okpuru ala nke chere ihu n’ebe Betel dị. Ọ bụ ezie na m raara onwe m nye Jehova na-ekerekwa òkè n’ọrụ nkwusa ahụ ruo ọtụtụ afọ, e meghị m baptism ruo December 1926, izu abụọ ka m rutesịrị na Betel. Nke ahụ abụghị ihe a na-adịghị ahụkarị n’oge ahụ.

N’ịbụ nke nwere 150 mmadụ na ya, Betel jubigara ókè n’ụbọchị ndị ahụ. Anyị nwere ndị ikom anọ n’ọnụ ụlọ ọ bụla. Ngwa ngwa amatara m ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha, ebe ọ bụ na anyị nile na-eri nri, na-arụ ọrụ, na-ehi ụra n’otu ụlọ, anyị nile na-ejekwa otu ọgbakọ ahụ e nwere nanị ya na New York City. E wusịrị Ebe Obibi Betel ọhụrụ ahụ dị na 124 Columbia Heights na 1927, anyị wee nwee ike ibi abụọ abụọ n’otu ọnụ ụlọ.

Ọzọkwa na 1927 e meghere ebe obibi akwụkwọ ọhụrụ dị na 117 Adams Street. Enyere m aka isi n’ebe obibi akwụkwọ ochie dị na 55 Concord Street kwaga ihe. Tinyere ígwè redio ahụ, n’ebe obibi akwụkwọ ahụ e nwere ígwè mbuli ụfọdụ, ígwè obibi akwụkwọ, ígwè ndị e ji asa ákwà, oriọna ndị a na-agbanye mmanụ​—⁠ọ bụrụ na o nwee waya, m na-edozi ya.

Ma, Betel karịrị nanị ebe obibi akwụkwọ, Ìgwè ndị ozi dị umeala n’obi, ndị na-arụsi ọrụ ike na-ahụ maka akwụkwọ ọ bụla, traktị ọ bụla, ma ọ bụ magazin ọ bụla e wepụtara. Ebumnobi ha abụghị ka ha bụrụ ndị a ma ama n’ụwa dum. Kama nke ahụ, ha chọrọ nanị ịrụzu ọrụ Onyenwe anyị​—⁠e nwekwara ọtụtụ ihe ịrụ!

Iso Nwanna Rutherford Mekọọ Ihe

Eritere m uru nke ukwuu site n’ihe ùgwù nke iso Joseph F. Rutherford, onye isi oche nke abụọ nke Society rụkọọ ọrụ. Ọ bụ nwoke gbara agba, gafee 183 sentimita n’ogologo, o bughị ibu, ma e wusiri ya ike. Egwu ya na-atụ ọtụtụ n’ime ụmụnna bụ́ nwata karị na Betel ruo mgbe ha matara ya. Ọ na-amụ ihe mgbe nile, na-akwadebe ihe a ga-ede.

Nwanna Rutherford ma ka e si eme ihe ọchị nke ọma. E nwere ụmụnna nwanyị abụọ meworo okenye bụ́ ndị nọ n’ezinụlọ Betel eri oge Nwanna Russell. Ha na-atachi nnọọ ihu ma kwenye na o zighị ezi ịchị ọchị n’ụzọ dara ụda ọbụna ma ihe ọchị mee. Mgbe ụfọdụ n’oge nri, Nwanna Rutherford ga-akọ akụkọ nke ga-eme ka onye ọ bụla chịa ọchị, bụ́ ihe na-agbakasị ụmụnna nwanyị abụọ ndị a ahụ. Ma, ọtụtụ mgbe ọ na-eduzikwa nkwurịta okwu ndị siri ike nke Bible n’oge nri.

Nwanna Rutherford maara esi nri, ọ na-atọkwa ya ụtọ ịkwadebere ndị enyi ya nri. Otu oge ndị na-esiri Betel nri kpewasịrị ọkpụkpụ ọkụkọ ekpewasị mgbe ha na-abọkasị ọkụkọ. Ọ banyere n’ime kichin ma gosi ha ụzọ ziri ezi isi bọkasịa ọkụkọ. Ọ dịghị achọ ọkpụkpụ ndị e kpewasịrị ekpewasị ná nri ya!

Ana m anọkarị Nwanna Rutherford nso n’ọnọdụ ndị a na-akwadoghị akwado, dị ka n’ụlọ ọrụ redio anyị, bụ́ WBBR, ma ọ bụ n’ọnụ ụlọ ebe ọ na-amụ akwụkwọ na Staten Island. Ọ bụ nwoke nwere nnọọ obi ọma ma na-eme ihe ọ na-ekwusa eme. Ọ tụghị anya ihe ọ na-agaghị eme n’onwe ya n’aka ndị ọzọ. N’adịghị ka ndị nọ n’isi ọrụ n’ọtụtụ nzukọ okpukpe ndị ọzọ, Nwanna Rutherford bụ onye kasị nwee ọnọdụ ime mmụọ na omume ọma. N’ụzọ pụtara ìhè o biri ndụ maka Alaeze Jehova.

Oge Ụfọdụ nke Ihe Isi Ike Ego

Afọ ole na ole ka m rutesịrị na Betel, ụwa banyere n’oge Oké Ndakpọ ahụ. Ahịa ego dakpọrọ, dị ka ọnụ ahịa nke ihe dị iche iche mekwara. Ọrụ dị ụkọ, ego adịghịkwa ezu. Betel ji ego a tụtara n’ụtụ arụ ọrụ, Jehova na-ahụkwa mgbe nile na e nwere nke zuru ezu iji lekọta ọrụ ahụ. Ọ dịghị mgbe anyị na-enweghị nri, ọ bụ ezie na o nwere ike ọ gaghị abụ ihe onye ọ bụla chọrọ. Anyị gbochiri mmefu dị ka e nwere ike, ụmụnna ndị na-anọghịkwa na Betel nyekwaara anyị aka dị ka ha nwere ike.

Na 1932, Nwanna Robert Martin, onye nlekọta ebe obibi akwụkwọ anyị nke kwesịrị ntụkwasị obi, nwụrụ. A họpụtara Nathan Knorr gbara 27 afọ n’ọnọdụ ya. Ọ bụ okorobịa nwere ike n’ezie. Adịghị m echeta onye ọ bụla nwere ihe isi ike ịnakwere ya dị ka onye nlekọta ebe obibi akwụkwọ. Ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, n’etiti ha e nwere John Kurzen, George Kelly, Doug Galbraith, Ralph Leffler, na Ed Becker​—⁠ezi ndị ọrụ ibe m⁠—​ji obi ha tinye nkà ha na ihe ọmụma ha n’ije ozi Alaeze.​—⁠Tụlee Ọpụpụ 35:​34, 35.

Iji Redio ahụ Arụ Ọrụ

Ruo n’ala ala ya, nzukọ anyị mikpuru emikpu n’ịgbasa ozi ọma ahụ site n’ụzọ ọ bụla dịnụ. Ọ dị ụwa dum mkpa ịmara banyere Alaeze ahụ, ma anyị dị nanị ole na ole. Nkà na ụzụ redio nọ n’ọnọdụ nwa ọhụrụ ya mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị. Otú ọ dị, ụmụnna ndị nwere nghọta chere na ụzọ nke a nke nzirịta ozi bụ ihe Jehova wepụtara n’oge ahụ. Ya mere na 1923 ha malitere iwu ụlọ ọrụ redio WBBR na Staten Island, otu n’ime obodo ukwu ise nke New York City.

Mgbe ụfọdụ ọ bụ nanị m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ redio anyị. Ebi m ebe ahụ na Staten Island ma na-eji ụgbọ mmiri na ụgbọ okporo ígwè eme njem hour atọ gaa n’ebe obibi akwụkwọ dị na Brooklyn ịga rụọ ọrụ eletrik ma ọ bụ mekanik. Iji hụ na ụlọ ọrụ redio anyị na-elekọta nnọọ onwe ya, anyị zụtara ígwè ọkụ ji mmanụ diesel arụ ọrụ. Na Staten Island anyị nwekwara olulu mmiri ndị nke anyị na otu ugbo nke na-enye nri maka mmadụ ole na ole na-arụ ọrụ ebe ahụ, nakwa maka ezinụlọ Betel dị na Brooklyn.

Ruo mgbe enyemaka bịakwuru, ibu ọrụ nile nke ọrụ redio ahụ kpaara ọgịga nzukọ m na ije ozi ubi ókè nke ukwuu. E nweghị oge ma ọlị maka nnọkọ ntụrụndụ ma ọ bụ ime njem ngwụsị izu e wezụga oge ezumike anyị na-enwe kwa afọ. N’otu oge otu onye jụrụ m, sị: “N’inwe usoro ihe omume siri ike otú a, ọ́ dịghị mgbe i chere echiche ịhapụ Betel?” N’eziokwu, aghaghị m ịsị: “Ee e.” Ọ bụwo ihe ùgwù na ihe ọṅụ ibi na ịrụ ọrụ n’akụkụ ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị ndị uche ha dị n’ọrụ. A na-enwekwa mgbe nile ọrụ dị mkpa ka a rụọ, ihe ọhụrụ ndị a ga-eme.

Anyị na-emepụta egwuregwu redio ndị na-akpali akpali. N’enweghị ígwè e ji emepụta ụda ihe dị iche iche, anyị aghaghị imepụta ụzọ ndị nke anyị. Anyị wuru ígwè ọrụ nke ga-eme ụzụ ikuku ọma ma ọ bụ ajọ ifufe na-efesi ike. Ụda nke mkpo akụ bekee ndị e bewasịrị ebewa ma a kụtụ ha n’elu osisi plankị ghọrọ ụda nke ụkwụ ịnyịnya n’elu okporo ụzọ. Egwuregwu nke ọ bụla na-abụ oké ihe omume. Ndị mmadụ na-egekwa ntị. N’ụbọchị ndị ahụ nke na-enwekebeghị ihe ndọpụ uche, ọtụtụ ndị na-anọdụ ala na-aṅa ntị.

N’afọ ndị 1920 na ná mmalite afọ ndị 1930, Society mepụtara ihe ọhụrụ n’akụkọ ihe mere eme nke redio, ugboro ugboro na-ejikọta ọnụ ọgụgụ kasị ukwu nke ụlọ ọrụ dị iche iche n’otu ihe omume. Otú a ozi Alaeze ahụ ruru ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa.

Ígwè Phonograph

N’etiti afọ ndị 1930 na mmalite afọ ndị 1940, anyị tụrụ ụkpụrụ ma wuo ígwè e ji akpọ efere egwú, phonograph, na ígwè okwu ndị ọzọ. N’iji mmà pụrụ iche eme ihe, anyị na-esi ná mpekere wax ndị na-akwọ mụrụmụrụ ka enyo bepụta efere egwú ndị bụ́ isi. Mgbe ahụ anyị na-enyocha isi efere egwú nke ọ bụla nke ọma n’okpuru enyo e ji ahụ ihe ndị pere oké mpe iji jide n’aka na ọ gbaghị ọrụ. Ọ bụrụ na e nwere ihe ọ bụla na-adịzighị adịzi, a ga-amalitekwa nnọkọ imepụta rekọd ahụ ọzọ, a ga-ebepụtakwa efere egwú ọzọ. Anyị na-ezigazị isi efere egwú wax ahụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta rekọd, bụ́ ndị ga-emepụta efere egwú na ígwè e ji akpọ ha na redio.

Otu ihe na-akpali akpali nke merenụ bụ́ nke m na-echeta nke ọma bụ okwu Nwanna Rutherford na 1933 nke isiokwu ya bụ́ “Mmetụta nke Afọ Dị Nsọ ahụ n’Udo na Ịba Ụba.” Popu akpọsawo afọ ahụ ịbụ “afọ dị nsọ,” sitekwa ná mkpọsa redio na efere egwú, anyị kpughere ya ma gosi na ọ dịghị ihe ọ bụla dị nsọ ga-esi na ya pụta. Dị ka o si dapụta, Hitler weghaara ike ọchịchị n’afọ ahụ site ná nkwado Chọọchị Katọlik, ya mere olileanya ọ bụla maka udo pụrụ n’anya.

N’ime United States, e guzobere òtù Catholic Action ime ihe chọọchị ahụ chọrọ. Ha tinyere onye nke ha n’òtù nlekọta ụlọ ọrụ mgbasa ozi nile nke ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ, magazin, na akwụkwọ dị iche iche. Ha tinyere aka ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma yie egwu ịsọ ụlọ ọrụ redio ọ bụla buru okwu Bible anyị nsọ. Ìgwè dị iche iche nke òtù Catholic Action tiri ọtụtụ Ndịàmà ihe, karịsịa na New Jersey dị nso. Ndị ahụ bụ ụbọchị ndị na-akpali akpali!

Ọrụ Na-enye Ọṅụ n’Ubi

Ka ọ na-erule etiti afọ ndị 1950, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị nkwusa Alaeze na-erute ọtụtụ mmadụ karị kpọmkwem n’ọnụ ụlọ ebe obibi nke ha. Nke a ghọrọ ihe dị irè nke ukwuu karịa redio ahụ n’inyere ndị mmadụ n’otu n’otu aka ịghọta eziokwu Bible. Ya mere na 1957 e kpebiri ire WBBR ma tinye ego ya n’ịgbasawanye ọrụ ozi ala ọzọ n’ala ndị ọzọ.

Na 1955, e kenyere m n’Ọgbakọ Bedford dị na Brooklyn, ebe m duziri mgbe nile Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Society zipụkwara m dị ka ọkà okwu na-ejegharị ejegharị gaa n’ebe ugwu nke New York, Pennsylvania, Connecticut, na New Jersey. Mgbe e kenyere m n’Ọgbakọ Bedford, agwara m onwe m sị, ‘Agafewo m 50 afọ. Ọ ga-akara m mma ikere òkè nke ukwuu dị ka m nwere ike n’ije ozi ubi ugbu a. E mesịa apụrụ m ịrịa ọrịa agba, ọ gharakwa ịtọ m ụtọ nke ukwuu.’

Mgbe m rụsịrị ọrụ afọ ahụ dum n’akụkụ nkà na ụzụ nke iji redio na-akpọsa mkpụrụ Alaeze, ọ bụ nnọọ ihe obi ụtọ nye m ịkụ na ịkwọsa mkpụrụ nke eziokwu Bible mmiri kpọmkwem n’obi ndị mmadụ. Ọ tọrọ m nnọọ ụtọ iso ọgbakọ ahụ na-arụkọ ọrụ. Ndị dị iche iche kpọbatara m, na-eme nnọọ ka ahụ ruo m ala. Ụfọdụ n’ime ụmụntakịrị ahụ, bụ́ ndị toworo eto ugbu a, ka na-akpọ m papa nnukwu. Ruo 30 afọ anyị nwere oge ndị mara mma n’ozi ubi, ruo mgbe nsogbu dị iche iche n’ụkwụ m mere ka m ghara inwekwa ike ịrị stepụ ma ọ bụ jiri ụgbọ okporo ígwè na-agba n’okpuru ala mee njem. Na 1985, m gbanwere gaa n’Ọgbakọ Brooklyn Heights, nke na-ezukọ kpọmkwem na Betel.

Ka nzukọ Jehova na-enwe mgbasawanye dị ukwuu, enwere m n’onwe m ihe ùgwù nke ịhụ ngọzi ya n’ubi ala ọzọ dị iche iche ka m na-aga mgbakọ ndị buru ibu nke Ndịàmà Jehova n’ala ndị dị anya. M mesịrị nwee ike ịga njem gburugburu ụwa! Na-amalite n’afọ ndị 1950, ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị Betel ji anya anyị hụ London, Paris, Rom, Nuremberg, na Copenhagen. Anyị ji ụgbọ elu e ji atụ bọmbụ bụ́ ndị a gbanwere agbanwe, ụgbọ mmiri, na ụgbọ okporo ígwè mee njem. Ma njem ndị ahụ na-eweta ọtụtụ ihe nkiri, ma ihe nkiri kasị ha nile akpali akpali bụ ọtụtụ ìgwè nke ụmụnna ndị obi dị ụtọ, ndị na-anabata anyị. Iri afọ ndị sochiri wetara njem gaa n’Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Ọdịda Anyanwụ Europe ọzọkwa, na n’oge kasị dịrị nso gaa n’Ọwụwa Anyanwụ Europe. Mgbakọ ndị dị ebube e nwere na Poland, Germany, na Czechoslovakia magburu onwe ha. Lee ka ezinụlọ ọchịchị Chineke anyị siworo too kemgbe oge mbụ m ghọrọ akụkụ ya!

Nduzi Chineke

Ihe ndị yiri nzọụkwụ ndị dị ntakịrị nke nzukọ ahụ weere mesịrị ghọọ nnukwute m̀màụkwụ. Mgbe anyị na-arụ ọrụ n’imepụta ihe a na-ahụtụbeghị mbụ, nanị ngwá ọrụ iji nyere anyị aka ịrụ ọrụ ịgba àmà ahụ, ònye pụrụ ịhụtawo oké uto ahụ? Anyị agawo n’ihu n’okwukwe, na-anakwere idu ndú Jehova.

Nzukọ nke a na-enwe ọganihu atụbeghị egwu iji nkà na ụzụ ndị kasị ọhụrụ e nwere mee ihe ma ọ bụ imepụta nke ya iji nye aka ilekọta ubi ahụ zuru ụwa ọnụ. N’etiti ụzọ ndị e ji mee ihe n’ime ka nkwusa Alaeze ahụ gaa n’ihu e nwewo nkwusa ụlọ n’ụlọ, iji usoro redio mee ihe, ịgba àmà phonograph, na usoro ihe omume nke iduzi ọmụmụ Bible n’ebe obibi ndị mmadụ. Iguzobe usoro ọrụ nke anyị nke ibi akwụkwọ n’ụbọchị mbụ ndị ahụ na iji ugbu a usoro iji ígwè eletrik a rụnyere kọmpụta na-ahazi akwụkwọ na usoro ibi akwụkwọ offset na-eme ihe n’ọtụtụ asụsụ abụghị ihe nta ma ọlị. Ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na mgbakọ ndị a na-enwe mgbe nile ekerewo òkè n’iwetara Jehova Chineke na Ọkpara ya otuto. Ọ bụworo m ihe ùgwù ikiri n’onwe m na ikere òkè n’ihe omume ndị a nile.

O doro m anya na nzukọ Jehova e ji mmụọ na-eduzi n’elu ụwa na-anata nduzi banyere ihe a ga-eme na ụzọ a ga-esi mee ya. Nzukọ ya dum nke eluigwe na ala, nke a na-ahụ anya na nke a na-adịghị ahụ anya, na-arụkọ ọrụ.

Ọ dịbeghị mgbe m kwara ụta ịhapụ atụmatụ m dị ka nwa okorobịa isoro ụgbọ mmiri jegharịa. Leenụ, ihe ndị kasị na-akpali akpali, ndị kasị baa uru n’elu ụwa na-eme kpọmkwem n’ebe a n’ime nzukọ Jehova! Ya mere njem n’okporo ụzọ ịgaru “ọkpụkpọ dị elu” ahụ abụwo nke e ji ọtụtụ ihe ọṅụ nnọọ na ngọzi na enweghị ihe ịkwa ụta ọ bụla kaa akara.​—⁠Ndị Filipaị 3:​13, 14.

M na-agwa ndị na-eto eto mgbe nile ka ha cheta 1914​—⁠ya bụ, Abụ Ọma 19:14, nke na-asị: “Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova, bụ́ oké nkume m, na onye mgbapụta m.” Anyị chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ n’ihe ọ bụla ma kpee ekpere dị ka Devid mere: “Jehova, mee ka m mara ụzọ Gị nile; zi m okporo ụzọ Gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu Gị, Gị ziekwa m ihe; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m; Gị ka m na-ele anya Gị ogologo ụbọchị nile.” (Abụ Ọma 25:​4, 5) E nwere ihe dị ukwuu okwu ndị ahụ pụtara. Icheta ha pụrụ inyere anyị aka ịnọgide nnọọ n’okporo ụzọ ahụ, na-eche ihu n’ebe kwesịrị ekwesị, na-eso nzukọ Jehova na-enwe ọganihu na-aga ụkwụ na ụkwụ.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ na-atọ Nwanna Rutherford ụtọ ịkwadebere ndị enyi ya nri

[Foto dị na peeji nke 25]

Robert Hatzfeld n’ụlọ nchịkwa nke ụlọ ọrụ redio WBBR

[Foto dị na peeji nke 26]

Foto ọhụrụ nke Nwanna Hatzfeld

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya