Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 8/1 p. 27-30
  • Igosi Ndị Agadi Ịhụnanya Ndị Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igosi Ndị Agadi Ịhụnanya Ndị Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ebe Nkwakọba nke Ihe Ọmụma”
  • “Mụta Ịsọpụrụ Chineke”
  • Nlekọta Mkpa Ime Mmụọ Mgbe Nile
  • Ihe Ọgbakọ Pụrụ Ime
  • “Bụrụ Agadi, Ndụ Ya Jukwara Ya Afọ”
  • Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-enyere Ndị Agadi Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ilekọta Ndị Agadi—Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ụzọ Ndị Kraịst Pụrụ Isi Nyere Ndị Agadi Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-asọpụrụ Ndị Agadi Nọ n’Ọgbakọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 8/1 p. 27-30

Igosi Ndị Agadi Ịhụnanya Ndị Kraịst

SAMUEL JOHNSON, onye na-ede akwụkwọ na narị afọ nke 18, kọrọ akụkọ nke otu nwa okorobịa onye, mgbe ọ na-eleta ndị enyi, chezọrọ ebe o debere okpu ya. Nke a akpaliteghị okwu ọ bụla. “Ma ọ bụrụ na a hụta otu etinyeghị uche n’ihe ahụ n’agadi nwoke,” ka Johnson gara n’ihu ikwu, “ndị mmadụ ga-akpọ n’ubu ma sị, ‘Ike ncheta ya na-adakpọ.’”

Akụkọ Johnson na-egosipụta na a na-etinyekarị ndị agadi, ma eleghị anya dị ka ìgwè ndị ọzọ pere mpe, n’okpuru ọ̀tụ̀tụ̀ na-ezighị ezi. Ọ bụ ezie na ilekọta mkpa nke ndị agadi bụ ihe ịma aka, ndị nile tinyere aka na ya na-erite uru. Gịnị bụ ihe ịma aka na uru ndị ahụ, n’ihi gịnịkwa ka isiokwu a ji emetụta ọtụtụ ndị karị?

Dị ka ngụkọ na-egosi, pasent 6 nke ụba mmadụ nọ n’ụwa gbara 65 afọ ma ọ bụ karịa, ná mba ndị mepeworo emepe kwa pasent ahụ ji okpukpu abụọ dị elu. Ná njikọ mba European Community, nke wepụtara 1993 ịbụ “Afọ Maka Ndị Agadi na Mmekọrịta n’Etiti Ọgbọ Nile nke Europe,” 1 onye n’ime mmadụ 3 agafewo 50 afọ. N’ebe ahụ, dị ka n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba ndị megheworo anya, ọ̀tụ̀tụ̀ ịmụ nwa nke na-adalata adalata na ịrị elu n’ogologo afọ ndụ a na-atụ anya ya na-eme ka e nwee ọtụtụ ndị meworo okenye n’ụba mmadụ e nwere. Ilekọta ndị gamiworo n’afọ ndụ n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ bụ nnọọ ọrụ buru oké ibu. Lee nnọọ ka ọnọdụ si dị iche n’Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nke oge gara aga!

“Ebe Nkwakọba nke Ihe Ọmụma”

Akwụkwọ Handwörterbuch des Biblischen Altertums für gebildete Bibelleser (Akwụkwọ Ọgụgụ nke Ihe Mgbe Ochie nke Bible Maka Ndị Gụrụ Akwụkwọ Na-agụ Bible) na-ekwu na n’ihe mgbe ochie ndị nke Ọwụwa Anyanwụ Ụwa “a na-ele ndị agadi anya dị ka ndị nchebe nke ụkpụrụ ọdịnala dị iche iche nke amamihe na ihe ọmụma ka elu, bụ́ ihe mere e ji gwa ndị na-eto eto ka ha soro ha na-akpakọrịta ma na-amụta ihe n’aka ha.” Akwụkwọ bụ́ Smith’s Bible Dictionary na-akọwa, sị: “Ná ndụ onwe onye a na-ele [ndị agadi] anya dị ka ebe nkwakọba nke ihe ọmụma . . . [Ndị na-eto eto] na-enye ha ohere ibu ụzọ kwuo echiche ha.”

E gosipụtara nsọpụrụ maka ndị agadi n’ime Iwu Mosis na Levitikọs 19:32: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.” Ya mere ndị agadi nọ n’ọnọdụ ihe ùgwù n’ime ọha mmadụ, a na-elekwa ha anya dị ka ngwá ndị bara uru. O doro anya na ọ bụ otú a ka Rut onye Moab si lee Naomi nne di ya bụ́ onye Israel anya.

Rut kpebisiri ike iso Naomi si Moab gaa Israel, mesịa na-ege ntị nke ọma n’okwu ndụmọdụ Naomi. Otu mgbe ha nọ na Betlehem, ọ bụ Naomi bụ onye hụtara aka Jehova n’iduzi ihe ndị na-eme na onye mesịrị kụziere Rut ụzọ ọ ga-esi kpaa àgwà. (Rut 2:20; 3:3, 4, 18) A kpụziri ndụ Rut n’ụzọ ọchịchị Chineke ka ọ na-amụta ihe site n’ahụmahụ Naomi. Nne di ya ghọrọ ebe nkwakọba nke ihe ọmụma.

N’otu ụzọ ahụ, ndị inyom ndị Kraịst bụ ụmụ agbọghọ taa pụrụ irite uru site n’iso agadi ndị inyom n’ọgbakọ na-akpakọrịta. Ma eleghị anya nwanna nwanyị na-eche echiche ịlụ di ma ọ bụ na-agbaso otu nsogbu onwe onye siri ike mgba. Lee ka o si bụrụ ihe amamihe ịchọ ndụmọdụ na nkwado nke nwanna nwanyị tozuru okè nke meworo agadi bụ́ onye nwere ahụmahụ n’okwu ahụ!

Ọzọkwa, òtù ndị okenye pụrụ irite uru site n’ige ntị n’ahụmahụ nke ndị meworo agadi nọ n’etiti ha. Anyị pụrụ ịmụta ihe n’ọdịda Lọt dara n’ime nke a. Esemokwu metụtara ndị na-azụ atụrụ nke Abraham na nke Lọt mere ka ọ dị mkpa ime mkpebi nke ga-emetụta onye ọ bụla. Lọt mere nhọrọ amamihe na-adịghị ya. Lee ka ọ ga-esiworị ka mma nke ukwuu ibuwo ụzọ chọọ ndụmọdụ n’aka Abraham! Lọt gaara anatawo nduzi tozuru okè, ọ gaara echebewokwa ezinụlọ ya pụọ ná nhụsianya nke sitere ná nhọrọ o mere ọkụ ọkụ. (Jenesis 13:7-⁠13; 14:12; 19:4, 5, 9, 26, 29) Ị̀ na-ege ntị nke ọma n’ihe ndị okenye tozuru okè na-ekwu tupu ị na-eru ná mkpebi ndị nke gị n’okwu?

Ọtụtụ ndị meworo agadi nwere ịnụ ọkụ n’obi na-adịgide adịgide maka ọrụ Jehova, dị ka Simeọn na Ana mere na narị afọ nke mbụ. (Luk 2:​25, 36, 37) Ọ bụ ihe nkwanye ùgwù na ngosipụta nke àgwà nlekọta n’ebe ndị dị otú ahụ meworo agadi nọ ịgụnye ha n’ihe dị iche iche a na-eme n’ọgbakọ ruo n’ókè ume ha nyere ohere ya, ọbụna gamie n’oge nká ha. Ma eleghị anya enyemaka dị onye ntorobịa mkpa ịkwadebe ihe omume maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Onye okenye dị akọ pụrụ ikwubi na onye ndụmọdụ dị mma ga-abụ onye agadi nọ n’ọgbakọ, nke amamihe mere ka ọ dị nro, nwee àgwà imenyere ndị ọzọ, ma na-enwe oge.

Otú ọ dị, ịhụ maka mkpa ndị pụrụ iche nke ndị agadi gụnyere ihe kanụ. Owu ọmụma, egwu maka mpụ, na ihe isi ike ego na-enye ọtụtụ nsogbu. Ọzọkwa, ozugbo onye agadi nwere ọrụsị, a na-eme ka nsogbu ndị a kawanye njọ site n’ahụ ike na-adakpọ adakpọ na mmechuihu n’ihi ikike ha na-agwụsị agwụsị. Mgbe ahụ ha chọrọ nlebara anya ka nnọọ ukwuu. Olee otú ndị mmadụ n’otu n’otu na dị ka ọgbakọ dum kwesịrị isi meghachi omume?

“Mụta Ịsọpụrụ Chineke”

N’ime narị afọ nke mbụ, Pọl n’okpuru ike mmụọ nsọ dere na 1 Timoti 5:​4, 16: “Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ka ha buru ụzọ mụta ịsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị ezinụlọ nke aka ha, na inyeghachi ndị mụrụ ha ihe: n’ihi na nke a bụ ihe a na-anara nke ọma n’ihu Chineke. Ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla nke kwere ekwe nwere ndị inyom di ha nwụrụ, ya gboo ha mkpa, ka a gharakwa ibogbu nzukọ Kraịst; ka o wee gboo ndị ahụ mkpa, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ.” Ilekọta ndị agadi bụ okwu dịịrị ezinụlọ. Ọ bụrụ na onye meworo okenye bụ́ onye nọ n’ime ọgbakọ nọ ná mkpa mgbe e mesịworo ihe nile a pụrụ ime n’ime ezinụlọ ya, ibu ọrụ ahụ na-adakwasị ọgbakọ. Ụkpụrụ ndị a agbanwebeghị.

Gịnị nyewooro ndị Kraịst aka igosi ịhụnanya ndị Kraịst n’ebe ndị agadi nọ site n’ịmụta ịsọpụrụ Chineke n’ime ezinụlọ nke aka ha? Lee okwu ndị na-esonụ nke ụfọdụ Ndịàmà bụ́ ndị nweworo ahụmahụ n’ilekọta ndị gamiworo n’afọ ndụ.

Nlekọta Mkpa Ime Mmụọ Mgbe Nile

“Ịtụlekọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị bụ ihe enyemaka bara oké uru,” ka Felix na-echeta, bụ́ onye nyeere nwunye ya aka ilekọta ndị mụrụ ya. “E kekọtara ahụmahụ onwe onye na oké ọchịchọ dị iche iche ha na ụkpụrụ dị iche iche nke Jehova.” N’ezie, n’iche ihe ịma aka nke ilekọta ndị ikwu meworo agadi ihu, otu isi ihe bụ igosi nlebara anya kwesịrị ekwesị ná nguzosi ike ha n’ime mmụọ. Ezi uche dị na nke a n’ihi okwu Jisọs ndị dị na Matiu 5:3 (NW): “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” A pụrụ iji usoro ihe omume nke ịgụ Bible, ntụle nke akwụkwọ ndị dabeere na Bible, na ekpere kwalite ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ. “O yiri ka ndị okenye hà na-enwe mmasị n’ókè ụfọdụ nke imechi ihe anya,” ka Peter na-ekwu.

Ee, imechi ihe anya dị mkpa n’ihe ime mmụọ. Ndị meworo okenye na-enwe mmasị n’inwe usoro ọ bụghị nanị n’ihe ime mmụọ kamakwa ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. A pụru ịgba ọbụna ndị nwere ọrụsị dị nta ume “iritu n’àkwà ma jie ejiji nke ọma kwa ụbọchị,” ka Ursula na-ekwu. Otú ọ dị, anyị ga-achọ izere inye echiche nke ịtụrụ ndị agadi ụkpụrụ. Doris kwetara na mgbalị ya ndị sitere n’ezi ebumnobi na-agahiekarị n’ụzọ dị mwute. “M na-agahie n’ụzọ dị iche iche. N’otu ụbọchị agwara m nna m ka ọ na-agbanwe uwe elu ya kwa ụbọchị. Nne m wee chetara m sị: ‘Ọ ka bụ di m!’”

E nwere mgbe ndị agadi bụ ndị na-eto eto, ma ka ndị na-eto eto tinye onwe ha n’ọnọdụ nke ndị agadi bụ oké ọrụ. Ma, nke ahụ bụ ụzọ isi malite ịghọta mkpa ha ndị pụrụ iche. Ịkawanye nká na-eweta nkụda mmụọ. Gerhard na-akọwa, sị: “Ọgọ m nwoke wesara m iwe n’ihi na ọ pụkwaghị ime ihe nile ọ na-emebu. Ịnakwere ọnọdụ ya bụ oké ihe mgbu. Ụdị mmadụ ya gbanwere.”

N’okpuru ọnọdụ ndị na-agbanwe agbanwe, ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ ka onye meworo okenye na-awụpụ nkụda mmụọ ndị juworo ya obi site n’ịkatọgharị ndị ọzọ, karịsịa ndị na-elekọta ya. Ihe kpatara ya dị mfe. Nlekọta ịhụnanya ha na-echetara ya ndalata nke ume ọrụ ya. Olee otú i kwesịrị isi meghachi omume banyere nkatọ ma ọ bụ mkpesa nke a na-ekwesịghị ekwesị?

Cheta, mmetụta ndị na-adịghị mma dị otú ahụ adịghị egosipụta echiche Jehova banyere mgbalị gị nile. Nọgide na-eme ihe ọma, nọgide na-enwekwa akọ na uche dị ọcha, ọbụna ma ọ bụrụ na i nweta okwu ndị na-adịghị mma site n’oge ruo n’oge. (Tụlee 1 Pita 2:19.) Ọgbakọ unu pụrụ inye gị nkwado dị ukwuu.

Ihe Ọgbakọ Pụrụ Ime

Ọtụtụ ọgbakọ nwere ihe mere ha ga-eji nwee ekele miri emi maka mgbalị ndị gara aga nke ezi ụmụnna anyị bụ́ agadi ndị ikom na ndị inyom. Ọ bụ ha bụ ndị ma eleghị anya tọrọ ntọala maka ọgbakọ ahụ, na-ewulite ya site nanị ná ndị nkwusa ole na ole n’ọtụtụ iri afọ gara aga. Olee ebe ọgbakọ ahụ ga-adị ma ọ bụghị maka ọrụ ha ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ n’oge gara aga na, ma eleghị anya, nkwado ego ha na-enye ugbu a?

Mgbe nlekọta ka elu dịrị mkpa n’ọnọdụ nke onye nkwusa meworo agadi, ọ bụghị iwu na nanị ndị ikwu ga-ahụ maka ibu ọrụ ahụ. Ndị ọzọ pụrụ inye aka site n’ije ozi dị iche iche, isi nri, ihichasị ihe, ịkpọrọ agadi ahụ mee ngagharị, ịdị na-aga na-ebute ya ná nzukọ ndị Kraịst, ma ọ bụ nanị iso ya kwurịta okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mmadụ nile pụrụ itinye aka, ọ bụ ezie na a na-enwetakarị ịdị irè na ịdị n’usoro mgbe e jikọtara mgbalị nile.

Njikọta bụ ihe nke ndị okenye pụrụ iburu n’uche mgbe ha na-ahazi nleta ọzụzụ atụrụ. Ọgbakọ ụfọdụ bụ ezi ihe ilereanya n’akụkụ nke a, ndị okenye na-ejide n’aka na a na-eme nleta ọzụzụ atụrụ mgbe mgbe ná nke ndị agadi na ndị na-adịghị ike, ọbụna na nke ndị ezinụlọ ha na-elekọta nke ọma. Otú ọ dị, o yiri ka ọgbakọ ndị ọzọ hà kwesịrị ịghọtakwu ibu ọrụ ha n’ebe ndị agadi nọ.

Otu nwanna nwoke na-ekwesị ntụkwasị obi, onye bamiworo n’afọ ndị 80 ya, ka ada ya na ọgọ ya nwoke lekọtara, bụ́ ndị hapụrụ Betel iji mee nke a. Ma, nleta nke ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ ka dịkwa ya mkpa. “Mgbe m na-eletabu ndị ahụ na-adịghị ike,” ka nwanna nwoke ahụ kwara arịrị kwuo, “m na-eso ha kpee ekpere. Ma ọ dịbeghị onye soro m kpee ekpere.” Nlebara anya ịhụnanya nke ndị ikwu adịghị anapụ ndị okenye ibu ọrụ nke ‘ịzụ atụrụ Chineke nke e tinyere n’aka ha.’ (1 Pita 5:2) Ọzọkwa, ndị na-elekọta ndị agadi nwere mkpa ka e wulie ha elu ma gbaa ha ume ịnọgide n’ọrụ ọma ha.

“Bụrụ Agadi, Ndụ Ya Jukwara Ya Afọ”

Alexander von Humboldt, onye Germany bụ́ ọkà mmụta sayensị na narị afọ nke 19, agamiwo n’afọ ndụ mgbe otu nwaada jụrụ ya ma ọ bụ na o leghị ime agadi anya dị ka ihe ike ọgwụgwụ. “I kwuru eziokwu,” ka nwoke ahụ gụrụ akwụkwọ zara. “Ma ọ gwụla ụzọ isi bie ndụ ruo ogologo oge.” N’otu echiche ahụ, ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị taa na-esetịpụ ihe nlereanya ọma n’ịnakwere ihe isi ike dị iche iche nke ịka nká dị ka ihe nkwụghachi ụgwọ maka ibi ndụ ruo ogologo oge. Ha na-egosipụta àgwà nke Abraham, Aịsak, Devid, na Job gosipụtara, bụ́ ndị ‘bụrụ agadị, ndụ ha jukwara ha afọ.’​—⁠Jenesis 25:8; 35:29; 1 Ihe Emere 23:1; Job 42:17.

Imewanye agadi na-eweta ihe ịma aka nke ịnakwere enyemaka n’ụzọ dị ùgwù na nke igosipụta ezigbo obi ekele. Amamihe na-achọ ka onye ọ bụla ghọta ebe ume ya ruru. Otú ọ dị, nke ahụ adịghị amanye onye na-aka nká ịnọ n’ọnọdụ nke arụghị ọrụ. Maria agafewo nnọọ 90 afọ, ma ọ ka na-aga nzukọ ndị Kraịst ma na-aza ajụjụ na ha. Olee otú o si na-eme ya? “Apụkwaghị m ịgụ ihe, ma m na-ege ntị na kasetị Ụlọ Nche. M na-echezọ ọtụtụ ihe nnọọ ma m na-agbalịkarị ịza otu ajụjụ.” Dị ka Maria, ịnọgide na-eji ọrụ n’aka n’ihe ndị na-ewuli elu na-enyere mmadụ aka ịnọgide na-adị garagara ma na-ejigide àgwà ndị Kraịst.

N’okpuru Alaeze Chineke, ịka nká agaghị adịkwa. N’oge ahụ ndị kara nká n’usoro ihe nke a na ma eleghị anya ọbụna nwụọ ga-enwe ihe ọma ndị ha ga-echeta banyere nlekọta na nlebara anya e gosiri ha. Ka ndị agadi dị otú ahụ na-ewetaghachi ndụ na ume, ha aghaghị inwe mmetụta nke ịhụnanya siri ike maka Jehova na obi ekele miri emi n’ebe ndị rapagidesiri ike n’ebe ha nọ n’oge ule ha n’usoro ihe ochie nke a.​—⁠Tụlee Luk 22:28.

Gịnị banyere ndị na-elekọta ndị agadi ugbu a? N’isi nso nnọọ, mgbe Alaeze ahụ weghaara nchịkwa nile nke ụwa, ha ga-eji ọṅụ na ahụ efe leghachi anya azụ na ha ahapụghị ibu ọrụ ha kama ha mụtara ịsọpụrụ Chineke site n’igosi ndị agadi ịhụnanya ndị Kraịst.​—⁠1 Timoti 5:4.

[Igbe dị na peeji nke 30]

Ndị Agadi Ga-enwe Ekele Maka Nleta Gị

A pụrụ ịrụzu ihe ọma dị ukwuu site n’ime atụmatụ ime nleta minit 15 ma eleghị anya, na nke onye meworo agadi mgbe ọrụ nkwusa gasịrị. Ma ọ kasị mma ịghara ịhapụ nleta ndị dị otú ahụ ruo mgbe ohere dapụtara, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.

Brigitte na Hannelore so na-eme nkwusa, soro otu nwoke meworo agadi na-ekwurịta okwu n’ọnụ ụzọ. Ụmụnna nwanyị ahụ gwara ya okwu ruo minit ise tupu ha achọpụta na ya onwe ya bụkwa Onyeàmà Jehova, onye nọ n’otu ọgbakọ ha nọ na ya. Lee ka o si bụrụ ihe mmechuihu! Ma ahụmahụ ahụ mechiri n’ụzọ na-enye obi ụtọ. Hannelore mere ndokwa ozugbo ileta nwanna ahụ na inyere ya aka ịbịa nzukọ ọgbakọ.

Ị̀ maara aha na ebe onye nkwusa ọ bụla meworo agadi nke bi n’ógbè ebe unu na-eme nkwusa bi? Ị̀ pụrụ ime ndokwa ime nleta dị mkpirikpi? O yiri ka a ga-enwe ekele dị ukwuu maka ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya