Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ebe Jisọs si n’agbụrụ Jesi na Devid, gịnị mere e ji na-akpọ ya “mkpọrọgwụ” nke ndị nna ya ochie bụ́ Jesi na Devid?
Ị na-echekarị echiche banyere mkpọrọgwụ nke osisi ma ọ bụ ihe ọkụkụ ibu ụzọ pụta tupu ógwè ma ọ bụ alaka dị iche iche. Ya mere ọ pụrụ iyi ka a ga-ekwu banyere Jesi (ma ọ bụ nwa ya bụ́ Devid) dị ka mkpọrọgwụ Jisọs mesịrị si na ya pulite. Otú ọ dị, Aịsaịa 11:10 buru amụma na Mesaịa ahụ na-abịanụ ga-abụ “mkpọrọgwu Jesi,” Ndị Rom 15:12 kwa ji amụma a mee ihe banyere Jisọs Kraịst. E mesịa Mkpughe 5:5 kpọrọ ya “Ọdụm ahụ Nke si n’ebo Juda pụta, Onye bụ Mkpọrọgwụ nke Devid.” Utu aha ndị a nwere nzube.
Bible na-ejikarị ihe ọkụkụ, dị ka osisi, eme ihe atụ. Mgbe ụfọdụ nke a na-adabere n’eziokwu ahụ bụ na dị ka mkpụrụ si epupụta ma too, mkpọrọgwụ na-amalite tupu alaka dị iche iche, ma ọ bụ mkpụrụ, bụ́ ndị mkpọrọgwụ na-akwado. Dị ka ihe atụ, Aịsaịa 37:31 na-agụ, sị: “Ndị gbapụrụ agbapụ nke ụlọ Juda ndị fọdụrụ ga-agbagidekwa mkpọrọgwụ n’ala n’okpuru ọzọ, mịakwa mkpụrụ n’elu.”—Job 14:8, 9; Aịsaịa 14:29.
Ọ bụrụ na mkpọrọgwụ enwee nsogbu, ọ ga-emetụta osisi ahụ dum. (Tụlee Matiu 3:10; 13:6.) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Malakaị dere: “Ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ọ gaghị ahapụkwara ha mkpọrọgwụ ma ọ bụ alaka.” (Malakaị 4:1) Ihe ọ pụtara doro anya—mbipụ zuru ezu. Ndị mụrụ ụmụ (mkpọrọgwụ) ka a ga-ebipụ, ha na ndị bụ ụmụ ha (alaka).a Nke a na-emesi ike ịbụ ọrụ nke ndị mụrụ ụmụ nwere n’ebe ụmụntakịrị ha nọ; ọdịnihu na-adịgide adịgide nke ụmụntakịrị ka a pụrụ ikpebi site ná nguzo nke ndị mụrụ ha n’ihu Chineke.—1 Ndị Kọrint 7:14.
Okwu ahụ dị n’Aịsaịa 37:31 na Malakaị 4:1 dabeere n’eziokwu ahụ bụ na alaka (na mkpụrụ dị n’alaka ndị nke abụọ) na-enweta ndụ ha site ná mkpọrọgwụ. Nke a bụ otu isi ihe n’ighọta otú Jisọs si bụrụ “mkpọrọgwụ Jesi” na “Mkpọrọgwụ nke Devid.”
N’ụzọ anụ ahụ, Jesi na Devid bụ ndị nna ochie Jisọs; ha bụ mkpọrọgwụ, Jisọs bụ alaka. Aịsaịa 11:1 kwuru banyere Mesaịa ahụ na-abịanụ, sị: “Ome ga-esikwa n’ógwè osisi Jesi pụta, otu alaka nke sitere ná mkpọrọgwụ ya ga-amịkwa mkpụrụ.” N’ụzọ yiri nke ahụ, ná Mkpughe 22:16, Jisọs kpọrọ onwe ya ‘nwa Devid mụrụ.’ Ma o tukwara onwe ya “mkpọrọgwụ Devid.” N’ihi gịnị?
Otu ụzọ Jisọs si bụrụ “mkpọrọgwụ” Jesi na Devid bụ na site na ya ka eriri osuso ọmụmụ ha si na-adịgide. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla taa pụrụ ịnwapụta na ya si n’agbụrụ Livaị, Dan, ma ọ bụ ọbụna Juda, ma anyị pụrụ ijide n’aka na eriri Jesi na Devid na-adịgide n’ihi na Jisọs dị ndụ ugbu a n’eluigwe.—Matiu 1:1-16; Ndị Rom 6:9.
Jisọs natakwara ọkwá nke Eze eluigwe. (Luk 1:32, 33; 19:12, 15; 1 Ndị Kọrint 15:25) Nke a na-emetụta mmekọrịta ya na ọbụna ndị nna ya ochie. N’ụzọ amụma, Devid kpọrọ Jisọs Onyenwe ya.—Abụ Ọma 110:1; Ọrụ 2:34-36.
N’ikpeazụ, e nyere Jisọs Kraịst ike dị ka Onyeikpe. N’oge Narị Afọ Iri na-abịanụ, uru mgbapụta nile nke Jisọs ga-erutekwara Jesi na Devid. Ndụ ha n’elu ala mgbe ahụ ga-adabere na Jisọs, onye ga-eje ozi dị ka “Nna nke mgbe nile ebighị ebi” ha.—Aịsaịa 9:6.
Ya mere, ọ bụ ezie na Jisọs pulitere site n’eriri Jesi na Devid, ihe ọ ghọworo na ihe ọ gaje ime na-eme ka o ruo eru ịbụ onye a kpọrọ “mkpọrọgwụ Jesi” na “mkpọrọgwụ Devid.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe odide ememe ili ozu oge ochie ndị Finisia jiri okwu yiri ya mee ihe. O kwuru banyere onye ọ bụla meghere ebe ili ozu, sị: “Ka ha ghara inwe mkpọrọgwụ n’okpuru ma ọ bụ mkpụrụ n’elu!”—Vetus Testamentum, April 1961.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 31]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.