Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/15 p. 25-26
  • Isi Iyi nke Obi Ike Na-adịghị Ada Ada

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Isi Iyi nke Obi Ike Na-adịghị Ada Ada
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mmụta Dịịrị Ndị Kraịst
  • Otu Okpukpe Ga-afọdụ
    Teta!—1996
  • Nwee Obi Ike!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Nye M Obi Ike
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • “Nwee Obi Ike, Dịkwa Ike Nke Ukwuu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/15 p. 25-26

Isi Iyi nke Obi Ike Na-adịghị Ada Ada

“OBERE mkpọtụ mere ka anyị kwụsị kpọmkwem ebe anyị guzo. Mgbe ahụ, ụmụ nnụnụ abụọ saghesịrị nku ha si n’ime ọhịa dị anyị n’aka ekpe gbaara na-abịa ebe anyị nọ. N’ihu anyị, àkwá abụọ dị n’ime ntakịrị okukoro dị n’ala. Ụmụ nnụnụ ahụ egbochiwo anyị ịzọ akwụ ha ụkwụ n’amaghị ama. Oge ọ bụla anyị nwara ịgaru ya nso ma sere foto nke ọmarịcha àkwá abụọ ahụ nwere ntụpọ na-acha nchara nchara, ụmụ nnụnụ ahụ na-emeghachi ihe ngosi iyi egwu ha. ‘Lee ka ha si nwee obi ike,’ ka anyị chere.”

Nke ahụ bụ ahụmahụ mmadụ anọ toworo eto nwere mgbe ha na-abịaru nso akwụ nnụnụ dikkop nwere ntụpọ ntụpọ n’ahụ ya. Nnụnụ nke ka nta bụ blacksmith plover. N’akwụkwọ bụ́ Everyone’s Guide to South African Birds, ndị ọkà mmụta banyere nnụnụ bụ́ Sinclair na Mendelsohn na-akọwa: “Oké na nne na-amụ ụmụ na-echedo akwụ na ụmụ ọhụrụ ha n’ụzọ siri ike ma ghọọ ndị na-eme ihe ike mgbe onye na-agafe n’ókèala ha na-abịa. Otú onye ahụ zọbatara ụkwụ n’ókèala ha hà adịghị eme ka ha sụlaa azụ, ha na-efeli elu na-akpọ ube ike ike, na-eme mkpọda n’atụghị egwu ọbụna n’ebe mmadụ nọ ná mgbalị nke ịdọ ha aka ná ntị ka ha pụọ.”

Ụfọdụ ekiriwo enyí ndị buru ibu na-aga nanị ha ka ha na-aga ebe akwụ nke nnụnụ blacksmith plover dị n’amaghị ụma, nanị ịhụ ka a kpaliri ihe ngosi nke nnụnụ ahụ. Enyí ndị ahụ na-emere ha ihe ọma site n’iche ihu n’ụzọ ọzọ.

Ebee ka nnụnụ na-enweta ụdị obi ike ahụ pụtara ìhè? O si n’ebe Onye ahụ kere ha nọ pụta. Jehova Chineke etinyewo n’ime ihe e kere eke ndị a dị nta usoro amamihe ebumpụta ụwa iji gbochie anụmanụ ndị ka ukwuu imebi akwụ ha ma ọ bụ uriom ọhụrụ ha.

Ihe Mmụta Dịịrị Ndị Kraịst

Ndị Kraịst pụrụ ịmụta ihe site na nke a, ọ bụ ezie na ha ga-achọ inwe ihe karịrị obi ike amamihe ebumpụta ụwa. A na-agwa ha ka ha ṅomie Nna ha Ukwu, Jisọs Kraịst, bụ́ onye rubere isi n’iwu Chineke nile n’atụghị egwu. (Ndị Hibru 12:​1-⁠3) Bible na-akatọ ndị ụjọ bụ́ ndị na-asụla azụ ijere Chineke ozi. (Ndị Hibru 10:39; Mkpughe 21:8) N’otu mgbe ahụ, Jehova na-aghọta ọdịdị ezughị okè anyị ma mara na anyị pụrụ mgbe ụfọdụ ime mmehie ma ọ bụ ghara inwe obi ike ahụ dị mkpa iji mee uche ya n’ụzọ zuru ezu. (Abụ Ọma 103:​12-⁠14) Gịnị ka mmadụ pụrụ ime ma ọ bụrụ na ụjọ emee ya ka ọ laa azụ n’ime ihe ziri ezi?

Onye Kraịst aghaghị ịgakwuru Chineke n’ekpere maka ike iji chee ule dị iche iche ihu ma nọgide na-eme uche Chineke. Bible nwere nkwa nke a na-emesi obi ike nke enyemaka Jehova: “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba. Ọbụna ụmụ okoro na-ada mbà, ike na-agwụkwa ha, ọbụna ụmụ okorobịa na-asụ ngọngọ daa: ma ndị na-ele anya Jehova ga-agbanwe ike ha; ha ga-efego elu na nku dị ka ugo; ha ga-agba ọsọ, ike agaghị agwụkwa ha; ha ga-eje ije, ghara ịda mbà.” (Aịsaịa 40:​29-⁠31) Ọtụtụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè ahụtawo eziokwu nke okwu ndị a, ‘e mewokwa ka ha dị ike site n’adịghị ike.’ (Ndị Hibru 11:34) Ezi ihe atụ bụ onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi, bụ́ onye dere, sị: “Onyenwe anyị guzoro m nso, wee mee ka m dị ike; ka e wee were ọnụ m kwusazuo nkwusa ahụ, ka ndị mba ọzọ nile wee nụkwa.”​—⁠2 Timoti 4:17.

Ọbụna ndị ka na-enwe mmasị ọhụrụ chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst pụrụ inwe ahụmahụ nke ụdị ihe inyeaka ahụ na-ewusi ike. Tụlee otu nwoke South Africa a na-akpọ Henry, bụ́ onye nlekọta ego nke chọọchị ya ma bidebe ụkọchukwu ya nso. Henry na-achọ eziokwu ahụ. N’agbanyeghị nrapagidesi ike ya na chọọchị ahụ, otu ụbọchị ọ nakweere isoro Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ka oge na-aga, o kwupụtara ọchịchọ ya ịghọ Onyeàmà ma jụọ nzọụkwụ ndị ọ ga-ewere iji ruo ihe mgbaru ọsọ ahụ. A kọwara na ihe mbụ ọ ga-eme bụ isi na chọọchị ya pụta. (Mkpughe 18:4) Ebe onye ụkọchukwu ahụ bụ ma onye agbata obi ma enyi ya, Henry chere na ọ pụghị nanị ide akwụkwọ ọpụpụ ya kama ọ ga-adị mkpa ịkọwa okwu ahụ ihu na ihu. Nke ahụ ka o ji obi ike mee.

Ahụ mara onye ụkọchukwu ahụ jijiji, o mesịkwara kpọrọ onyeisi oche nke nzukọ ha na ndị òtù ndị ọzọ nke chọọchị ahụ ije leta Henry. Ha chọrọ ịmata ihe mere o ji hapụ chọọchị ha iji ghọọ onye òtù nke okpukpe nke, dị ka ha si kwuo ya, na-enweghị mmụọ nsọ Chineke. “Na mbụ, ụjọ ekweghị m zaa ha ihe ọ bụla,” ka Henry kọwara, “n’ihi na ha anọwo mgbe nile na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ebe m nọ. Ma ekpekuru m Jehova ekpere maka enyemaka, o nyekwaara m aka ịza nke a: ‘N’ime okpukpe mba nile dị iche iche, olee nanị nke na-eji aha Chineke, bụ́ Jehova eme ihe? Ọ̀ bụ na ọ bụghị Ndịàmà Jehova? Ùnu chere na Chineke ga-ekwere ka ha zaa aha ya ma ghara inyekwa ha mmụọ nsọ ya?’” Ndị isi chọọchị ahụ enweghị ike ịgbagha ụdị echiche ahụ. N’inwe ekele maka ihe ọmụma na ike nke Chineke na-enye, Henry ji obi ike na-eso Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ozi ụlọ n’ụlọ ugbu a.

Ee, ịbụ ezi onye Kraịst na-ewe obi ike. Ka ọgwụgwụ ụwa nke a na-abịaru nso, ule dị iche iche nke okwukwe ga-amụba. Setan chọrọ ịnapụ ndị ohu Chineke olileanya ha magburu onwe ya nke ndụ ebighị ebi site n’ịgbalị imebi ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova. (Tụlee Mkpughe 2:10.) Ma anyị agaghị ada mbà ma ọlị. Ọbụna ọ bụrụ na anyị ga-enweta ihe ndọghachi azụ na-adị nwa mgbe n’ihi egwu, Jehova pụrụ inyere anyị aka inweghachi ike. Nọgide na-elegara ya anya maka ike iji nọgide na-eme uche ya. Cheta, onye ahụ kere ụmụ nnụnụ na-adịghị atụ egwu bụ isi iyi nke obi ike na-adịghị ada ada. N’ezie, ezi ndị Kraịst kwesịrị ‘iwere obi ike sị, Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka; m gaghị atụ egwu: gịnị ka mmadụ ga-eme m?’​—⁠Ndị Hibru 13:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya