Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 9/15 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Unu Ga-esi Kwụọ Ụgwọ Unu Ji
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri Ndị Ihe Na-esiri Ike na Ndị Ji Ụgwọ Aka?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ibinye na Ibiri Ego n’Etiti Ndị Enyi
    Teta!—1999
  • Ibinye Ndị Kraịst Ibe Anyị Ego
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 9/15 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ime oge ndị a nke ihe isi ike akụ̀ na ụba, ọtụtụ ndị mmadụ na ụlọ ọrụ na-akpọsa nrekpọsị ihe onwunwe. Ọ̀ bụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwadoro onye Kraịst idejupụta akwụkwọ maka nrekpọsị ihe onwunwe?

Azịza nye ajụjụ a na-enye ihe atụ dị mma otú Okwu Chineke si enye anyị nduzi dị irè n’okwu ndị pụrụ ịbụ ihe ndị ọgbara ọhụrụ n’ụzọ pụtara ìhè. Ọtụtụ mba nwere iwu ndị na-achịkwa nrekpọsị ihe onwunwe. Iwu ndị ahụ dị iche site ná mba ruo ná mba, ọ bụghịkwa ihe dịịrị ọgbakọ ndị Kraịst inye ndụmọdụ iwu na nke a. Ma ka anyị lebatu anya n’ihe iwu kwuru maka nrekpọsị ihe onwunwe.

Otu ihe mere gọọmenti ji enye ndị mmadụ na azụmahịa dị iche iche ohere ịkpọsa nrekpọsị ihe onwunwe bụ na ọ na-enye ndị na-ebinye ego ma ọ bụ nye (ndị e ji ụgwọ) ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe site n’aka ndị mmadụ ma ọ bụ azụmahịa dị iche iche biiri ego ma ọ bụ nakwere ụgwọ e ji (ịbụ ndị e ji ụgwọ) ma ghara ịkwụ ụgwọ ha ji. Nye ndị e ji ụgwọ ọ pụrụ iyi ka nanị ihe a ga-eme bụ ịga ụlọ ikpe iji mee ka onye ahụ ji ụgwọ kpọsaa nrekpọsị ihe onwunwe ka e wee kesaa arịa nile nke onye ahụ ji ụgwọ dị ka otu akụkụ nke ịkwụ ụgwọ e ji.

Ụzọ ọzọ nke nrekpọsị ihe onwunwe si arụ ọrụ bụ dị ka ihe nchebe nye ndị ji ụgwọ na-apụghị imezu ọchịchọ ndị ha ji ụgwọ n’eziokwu. A pụrụ ikwe ka onye ahụ ji ụgwọ dejupụta akwụkwọ maka nrekpọsị ihe onwunwe, nke ndị o ji ụgwọ pụrụ ịnọ na ya were ụfọdụ arịa ya. Ma, iwu ka pụrụ ịkwado ya ịka nwere ebe obibi ya ma ọ bụ arịa ụfọdụ ndị dịkarịsịrị nta ma nọgide na-adị ndụ gaa n’ihu pụọ n’iyi egwu nke mfu ma ọ bụ njichi site n’aka ndị o jibu ụgwọ.

Mgbe ahụ, ọ bụ ihe pụtara ìhè na iwu ndị a bụ maka inye akụkụ abụọ ahụ nọ ná mmekọrịta ihe ego ma ọ bụ azụmahịa ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe. Otú ọ dị, ka anyị rịba ama ndụmọdụ na-enye aka Bible na-enye.

Ọ ga-esi ike mmadụ ịgụzu Bible n’aghọtaghị na ọ dịghị agba ume ịbanye n’ụgwọ. Anyị na-achọta ụdị ịdọ aka ná ntị ndị dị ka Ilu 22:7: “Ọgaranya na-achị ndị ogbenye, ọzọ, ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye.”

Ọzọkwa, cheta ihe atụ Jisọs na Matiu 18:​23-⁠34 banyere otu ohu ji ụgwọ dị ukwuu. “Onyenwe ya sịrị ka e ree ya, na nwunye ya, na ụmụ ya, na ihe nile o nwere,” ma onyenwenụ ahụ, onye bụ eze, weturu obi ma meere ya ebere. Mgbe ohu ahụ mesịrị ghọọ onye na-enweghị obi ebere, eze ahụ nyere iwu ka ‘a rara ya nye n’aka ndị mmekpa ahụ, ruo mgbe ọ ga-akwụghachi ụgwọ nile o ji.’ N’ezie, ihe kasị mma, nke a tụworo aro ya, bụ izere ibiri ego.

Ndị ohu Chineke n’Israel oge ochie nwere mmekọrịta azụmahịa dị iche iche, mgbe ụfọdụ kwa mbiri na mbinye weere ọnọdụ. Gịnị ka Jehova gwara ha mee? Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ibiri ego iji banye ma ọ bụ iji mụbawanye azụmahịa, ọ bụ ihe iwu kwadoro ma ziekwa ezi onye Hibru ịnara ọmụrụ nwa. Otú ọ dị, Chineke gbara ndị ya ume ka ha ghara inwe ọchịchọ onwe onye mgbe ha na-ebinye onye Israel nọ ná mkpa ihe; ha agaghị enweta uru site n’ọnọdụ dị njọ site n’ịnara ọmụrụ nwa. (Ọpụpụ 22:25) Deuterọnọmi 15:​7, 8 na-asị: “Mgbe ogbenye dị n’etiti gị, bụ́ otu onye n’etiti ụmụnne gị . . . , ị ghaghị ịsaghere ya aka gị, ị ghaghịkwa inye ya ihe ga-ezuru ụkọ ya nke kọrọ ya n’ọnọdụ ihe ibe ya.”

Otu ụdị ebere ma ọ bụ nchebara echiche ahụ ka e gosiri n’ime ụkpụrụ ndị na-egosi na ndị e ji ụgwọ agaghị ejichi ihe ndị e ji adị ndụ nke onye ahụ ji ụgwọ, dị ka nkume igwé nri nke ezinụlọ ahụ ma ọ bụ uwe onye ahụ ji achụ oyi n’abalị.​—⁠Deuterọnọmi 24:​6, 10-⁠13; Ezikiel 18:​5-⁠9.

N’ezie, ọ bụghị ndị Juu nile naara ma nwee ọchịchọ itinye iwu ịhụnanya ndị a sitere n’aka Onyeikpe ukwu na Onye Na-enye Iwu ha n’ọrụ. (Aịsaịa 33:22) Ụfọdụ ndị Juu dị anyaukwu mesoro ụmụnna ha ihe n’obi ọjọọ. Taakwa, ụfọdụ ndị e ji ụgwọ pụrụ ịdị obi ọjọọ, gharakwa inwe ezi uche n’ihe ndị ha na-achọ inweta, ọbụna n’ebe onye Kraịst na-eme ihe n’eziokwu nọ, bụ́ onye na-apụghị ịkwụli ụgwọ ahụ n’oge ahụ n’ihi inwe ahụmahụ nke ụfọdụ ihe ndị a na-atụghị anya ha merenụ. (Eklisiastis 9:11) Site n’adịghị nro ha, nrụgide nke inweta ihe a na-achọ, ndị ụwa e ji ụgwọ pụrụ ịmanye onye ahụ ji ụgwọ ịbanye n’ọnọdụ ọ ga-achọ ichebe onwe ya. N’ụzọ dị aṅaa? N’ọnọdụ ụfọdụ nanị ihe ndị e ji ụgwọ ga-anabata bụ nzọụkwụ iwu kwadoro nke nrekpọsị ihe onwunwe. Ya mere onye Kraịst, onye na-enweghị anyaukwu ma ọ bụ na-elefurughị ụgwọ o ji anya, pụrụ idejupụta akwụkwọ maka nrekpọsị ihe onwunwe.

Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịmara akụkụ nke ọzọ nke okwu ahụ. Onye Kraịst pụrụ iji ụgwọ nanị n’ihi na o jighị njide onwe onye mee ihe n’ihe ma ọ bụ n’ụzọ o si mefuo ego ma ọ bụ n’ihi na o jighị ezi uche lepụ anya n’ọdịnihu ná mkpebi ya dị iche iche nke azụmahịa. Ọ̀ ga-enwe nnọọ àgwà ọ gbasaghị m banyere ụgwọ ahụ ma mee ngwa ngwa ịchọ inwere onwe ya site ná nrekpọsị ihe onwunwe, si otú a na-ata ndị ọzọ ahụhụ n’ihi mkpebi ya na-ezighị ezi? Bible adịghị akwado ileghara ibu ọrụ ego dị otú ahụ anya. Ọ na-agba ohu Chineke ume ka ee ya bụrụ ee. (Matiu 5:37) Chetakwa, ihe Jisọs kwuru banyere ịgụ ihe ọ ga-ewe tupu a na-amalite iwu ụlọ elu. (Luk 14:​28-⁠30) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, onye Kraịst kwesịrị ichebara ọnọdụ ndị na-adịghị mma pụrụ ịpụta echiche nke ọma tupu ọ malite iji ụgwọ. Ozugbo ọ banyere n’ụgwọ, o kwesịrị ịghọta ibu ọrụ ya nke ịkwụghachi ndị mmadụ na ụlọ ọrụ dị iche iche o ji ụgwọ ego. Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị ọzọ achọpụta onye Kraịst dị ka onye na-ejighị ihe akpọrọ ihe ma ọ bụ onye a na-apụghị ịtụkwasị obi, ma eleghị anya o mebiwo aha ọma ya ọ nọworo na-agbalị inweta, sikwa otú ahụ ghara inwe àmà dị mma site ná ndị nọ n’èzí.​—⁠1 Timoti 3:​2, 7.

Cheta ihe Abụ Ọma 15:4 na-agwa anyị banyere ụdị mmadụ Jehova na-anabata. Anyị na-agụ: “Ọ [onye Chineke na-anwapụta] ṅụwo iyi nke ga-emejọ ya onwe ya, ma ọ dịghị agbanwe okwu ya.” Ee, Chineke na-atụ anya ka ndị Kraịst mesoo ndị ha ji ụgwọ otú ha ga-esi chọọ ka e mesoo ha.​—⁠Matiu 7:12.

Mgbe ahụ, ná nchịkọta, Bible adịghị akagbu na ọ pụrụ ikwe omume na n’ọnọdụ ndị tara akpụ, onye Kraịst pụrụ iji iwu nchebe nrekpọsị ihe onwunwe ndị Siza nyere mee ihe. Otú ọ dị, ndị Kraịst kwesịrị ịdị iche n’ihe metụtara ime ihe n’eziokwu na ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. Ya mere, ha kwesịrị ịbụ ihe nlereanya n’ọchịchọ ha siri ike nke iburu ibu ọrụ ha nile nke ego.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya