Egwu Maka Ndị Nwụrụ Anwụ Zuru Ebe Nile
Anyanwụ adawo eri ogologo oge. Ị na-alata ụlọ n’azụ oge karịa ka ị ga-achọ. Ka ije bu gị na-agabiga ebe a na-eli ozu n’ógbè unu, obi amalite itisitụ gị ike. Ịdị jụụ nke ọchịchịrị abalị na-eme ka ị nụ ụzụ kasị ghara ịdapụta adapụta. Ná mberede ị nụ mkpu dasiri ike nke si n’ebe dị anya, nke na-akụja akụja. Ị malite ịgasi ike—obi gị ana-etisikwu ike—ka ị na-agbaga ná nchebe nke ụlọ gị.
Ọ̀ DỊWO mgbe i nwere ahụmahụ mmetụta ahụ erughị ala mgbe ị nọ n’ime ma ọ bụ nso ala ili ozu? Ọ bụru otú ahụ, ọ pụrụ ịbụ na echiche okpukpe a mazuuru gburugburu ụwa emetụtawo gị—na mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ pụrụ inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ imerụ ha ahụ.
Ọtụtụ omenala nkwenkwe ụgha ebilitewo n’ihi nkwenkwe nke na ndị nwụrụ anwụ nwere mkpa enyemaka nke ndị dị ndụ ma ọ bụ na ha pụrụ imerụ ndị dị ndụ ahụ ma ọ bụrụ na e meghị ka obi dajụọ ha. Ná mba ụfọdụ nke Latin America, dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nwere omenala nke iwu ụlọ ndị dị nta e tinyere obe n’ime ya n’ebe mmadụ nwụworo site n’ihe ọghọm. Ndị mmadụ na-amụnye kandụl ọkụ ma na-etinye okooko osisi n’ebe ahụ ná mgbalị igosi mmasị maka ma ọ bụ inyere mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ aka. N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-agbasa akụkọ banyere azịza “ọrụ ebube” nye ekpere, nke na ndị mmadụ na-amalite na-agachi anya n’ebe animita ahụ dị, ụlọ nta ahụ maka mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ. N’ebe ahụ ha na-eme mandas, ma ọ bụ nkwa, nke na ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ anwụ ga-enyere ha aka ma ọ bụ nata ihe—ma eleghị anya ọgwụgwọ ọrụ ebube—ha ga-egosi obi ekele ha n’ụzọ pụrụ iche. N’aka nke ọzọ, a pụrụ ịkọ na mkpụrụ obi onye nwụrụ anwụ na-apụta n’ọchịchịrị nke abalị, na-eyi ndị nọ n’ebe ahụ egwu. A na-ekwukarị na mkpụrụ obi ndị dị otú ahụ bụ penando, na-akpasu ndị dị ndụ iwe n’ihi ihe ndị mere n’oge gara aga.
N’ọtụtụ ala ndị mmadụ na-etinye mgbalị dị ukwuu ime ka obi dajụọ “mmụọ” nke ndị nwụrụ anwụ. A na-eme oké oriri dị iche iche, chụọ àjà, kwuo okwu ndị na-adajụ mmụọ—ha nile ná mgbalị nke igbochi mmegwara ihe nke mmụọ onye ahụ nwụrụ anwụ. E chere na ime ka obi dị mmụọ ahụ ụtọ ga-arụpụta ụgwọ ọrụ na ngọzi dị iche iche maka ndị ọ hapụrụ.
“Ọtụtụ ndị kwere na ọ dịghị ihe na-eme ‘n’onwe ya ma ọ bụ dị ka okike si dị,’” ka otu akụkọ si Africa na-ekwu. “Ihe ọ bụla merenụ—ọ sọ ya bụrụ ọrịa, ọdachi, enweghị ike ịmụ nwa, ihe isi ike ọnọdụ akụ̀ na ụba, mmiri ozuzo ma ọ bụ anwụ ọchịcha gabigara ókè, ihe ọghọm, adịghị n’otu ezinụlọ, ọnwụ—ka a na-eche na ọ bụ ndị mmụọ a na-adịghị ahụ anya, ndị nwere ike karịrị nke mmadụ, na-akpata ha.” Akụkọ ọzọ na-asị: “Ndị mmadụ kwenyere na mmụọ nke ndị nna ha ochie nwere ebe ha bi n’eluigwe nakwa na ha na-elekwasị ndị ha hapụrụ n’elu ụwa anya mgbe nile. E kwenyere na ndị nna ochie ahụ nwere ike karịrị nke mmadụ, bụ́ nke ha pụrụ iji gọzie ma chebe ndị ikwu ha n’elu ụwa ma ọ bụ taa ha ahụhụ, na-adabere ná nsọpụrụ ma ọ bụ nleghara anya nke ndị ikwu maka ndị nwụrụ anwụ.”
Ma ihe dị otú ahụ ò kwekọrọ n’Okwu Chineke? Gịnị bụ echiche gị?
[Foto dị na peeji nke 4]
Otu “Animita” na Chile