Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/15 p. 13-18
  • Ndị E Jikọtara n’Ihe Nkekọ Zuru Okè nke Ịhụnanya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị E Jikọtara n’Ihe Nkekọ Zuru Okè nke Ịhụnanya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị n’Otu n’Ịkwekọ n’Ihe Ọmụma
  • Ndọpụ Uche Pụrụ Imebi Ịdị n’Otu
  • Ịkpachara Anya Banyere Ịrụ Ụka Ndị Na-arụgide Arụgide
  • Jehova Pụrụ Ime Ka Ị Dị Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịchọta Akụ̀ ‘e ji Nlezianya Zochie n’Ime Ya’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ijegharị n’Ụzọ Kwesịrị Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ihe Ọmụma Chineke Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/15 p. 13-18

Ndị E Jikọtara n’Ihe Nkekọ Zuru Okè nke Ịhụnanya

‘Bụrụnụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya.’​—⁠NDỊ KỌLỌSI 2:2.

1, 2. Olee mmetụta na-akpata nkewa nke a na-enwe karịsịa taa?

GEE ntị! Otu olu na-adasi ike n’eluigwe nile na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) Ka afọ ọ bụla na-agafe ozi ahụ na-adịwanye njọ nye ndị bi n’elu ụwa.

2 A mawo onye iro ukwu nke Jehova eri ogologo oge dị ka onye mmegide (Setan) na onye nkwutọ (Ekwensu). Ma onye nduhie nke a na-akpazi ike ugbu a n’ụzọ ọzọ​—⁠ọ ghọọla chi ọnụma juru obi! N’ihi gịnị? N’ihi na Maịkael na ndị mmụọ ozi ya chụpụrụ ya n’eluigwe n’agha ahụ a malitere ịlụ n’eluigwe na 1914. (Mkpughe 12:​7-⁠9) Ekwensu maara na o nwere nanị nwa oge iji nwapụta ịma aka ya bụ́ na ya pụrụ iwezụga mmadụ nile pụọ n’ife Chineke ofufe. (Job 1:11; 2:4, 5) Ebe ọ na-enwekwaghị ebe ọzọ ọ ga-echigharịkwuru maka mgbapụ, ya na ndị mmụọ ọjọọ ya yiri ìgwè aṅụ nke ọnụma ji nke na-awụsa iwe ha n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ na-agba aghara.​—⁠Aịsaịa 57:20.

3. Gịnị bụworo mmetụta nke Setan ịbụ onye a chụdara n’oge anyị?

3 Ihe ndị a na-emenụ, ndị anya ụmụ mmadụ na-adịghị ahụ, na-akọwa ihe mere e ji nwee oké ndakpọ nke omume ọma ugbu a n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Ha na-akọwakwa oké mgbalị nke ụmụ mmadụ ijikọta mba ndị na-ekewasị ekewasị bụ́ ndị na-apụghị nnọọ ibikọta ọnụ. Ebo na agbụrụ dị iche iche na-ebusorịta ibe ha agha n’ụzọ obi ọjọọ, na-emepụta ọtụtụ nde nke ndị na-enweghị ebe obibi na ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha. Ka a sịkwa ihe mere mmebi iwu ji na-arị elu n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị ihe yiri ya! Dị ka Jisọs buru n’amụma, ‘ịhụnanya nke ndị ka n’etiti mmadụ na-ajụ oyi.’ Ebe ọ bụla i lere anya, adịghị n’otu na enweghị ịhụnanya kara ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ọgba aghara akara.​—⁠Matiu 24:12.

4. N’ihi gịnị ka ndị Chineke ji nọrọ n’ihe ize ndụ pụrụ iche?

4 N’ihi ọnọdụ ụwa, ekpere Jisọs maka ụmụazụ ya nwere ihe dị omimi karị ọ pụtara: “Ekpeghị m ekpere ka I wepụ ha n’ụwa, kama ka I debe ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ. Ha esiteghị n’ụwa, dị ka Mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:​15, 16) Taa, “ajọ onye ahụ” na-awụkwasa iwe ya karịsịa n’ahụ “ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs.” (Mkpughe 12:17) E wezụga nlekọta ịhụnanya na nke nleru anya nke Jehova, a ga-ekpochapụ Ndịàmà ya na-ekwesị ntụkwasị obi. Ndụ anyị dabeere na anyị iji ndokwa nile Chineke na-eme maka nchebe na ọdịmma ime mmụọ anyị eme ihe. Nke ahụ gụnyere anyị ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’ịrụ ọrụ nke ike Ya site na Kraịst, dị ka onyeozi ahụ gbara ume ná Ndị Kọlọsi 1:29.

5, 6. Mmetụta dị aṅaa ka Pọl onyeozi nwere banyere ndị Kraịst bụ́ ndị Kọlọsi, n’ihi gịnịkwa ka akụkụ akwụkwọ nsọ nke isiokwu afọ 1995 sitere na ya ji kwesị ekwesị?

5 Ọ bụ ezie na o yiri ka Pọl ahụtụbeghị ha anya ihu na ihu, ọ hụrụ ụmụnna ya nọ na Kọlọsi n’anya. Ọ gwara ha, sị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na unu pụrụ ịghọta otú nchegbu m nwere maka unu dịruru n’omimi.” (Ndị Kọlọsi 2:1, The New Testament in Modern English, nke J. B. Phillips dere) Ebe ụmụazụ Jisọs na-abụghị akụkụ nke ụwa, “ajọ onye ahụ” gaje ịnọgide na-agbalị imebi ịdị n’otu nke ụmụnna site n’ịkụnye mmụọ nke ụwa n’etiti ha. Akụkọ Epafras si Kọlọsi weta gosiri na nke a anọwo na-eme ruo n’ókè ụfọdụ.

6 Otu n’ime nchegbu bụ isi nke Pọl maka ụmụnna ya ndị Kraịst bụ nke a pụrụ ịchịkọta ọnụ n’okwu ndị a: ‘Bụrụnụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya.’ Okwu ya nwere ihe ndị pụrụ iche ha pụtara taa, n’ime ụwa nke jupụtara n’adịghị n’otu na enweghị ịhụnanya. Ọ bụrụ na anyị buru ndụmọdụ Pọl n’obi, anyị ga-enweta nlekọta nke Jehova. Anyị ga-enwekwa mmetụta nke ike nke mmụọ ya ná ndụ anyị, na-enyere anyị aka iguzogide nrụgide dị iche iche nke ụwa. Lee ka ndụmọdụ a si bụrụ ihe amamihe dị na ya! N’ihi ya, Ndị Kọlọsi 2:2 ga-abụ akụkụ akwụkwọ nsọ ebe isiokwu anyị maka afọ 1995 sitere.

7. Ịdị n’otu dị aṅaa ka e kwesịrị ịhụ n’etiti ndị Kraịst?

7 N’akwụkwọ ozi o bu ụzọ degara ndị Kọrint, onyeozi ahụ ji ahụ mmadụ mee ihe atụ. O dere na ‘nkewa ekwesịghị ịdị’ n’ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ kama na ‘ihe dị ya n’ahụ kwesịrị ịdị na-echegbu onwe ha maka ibe ha n’otu ụzọ ahụ.’ (1 Ndị Kọrint 12:​12, 24, 25) Lee aha ihe atụ magburu onwe ya ọ bụ! Aka na ụkwụ anyị na-adabererịta n’ibe ha, bụrụ ndị e jikọtara ha na akụkụ ahụ anyị ndị ọzọ. Ọ bụ otu ihe ahụ n’ebe òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ nọ, nke ndị mejupụtara ya bụ ndị e tere mmanụ na ọtụtụ nde ndị na-enwe olileanya ịdị ndụ n’elu ala paradaịs. Anyị agaghị ekewapụ onwe anyị iche ma ọlị n’ebe ahụ nke ndị Kraịst ibe anyị nọ iji biri nanị n’onwe anyị! N’ịrụ ọrụ site na Kraịst Jisọs, mmụọ Chineke na-erutere anyị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu site ná mkpakọrịta nke anyị na ụmụnna anyị.

Ịdị n’Otu n’Ịkwekọ n’Ihe Ọmụma

8, 9. (a) Gịnị bụ isi ihe dị n’anyị ịtụnye ụtụ n’ịdị n’otu n’ime ọgbakọ? (b) Olee otú i siworo nweta ihe ọmụma banyere Kraịst?

8 Otu n’ime isi ihe Pọl kwuru bụ na e jikọtara ịdị n’otu ndị Kraịst na ihe ọmụma, karịsịa nke ahụ metụtara Kraịst. Pọl dere na ndị Kraịst kwesịrị ‘ịbụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya, ka ha wee ruokwa akụ̀ nile nke nkwezu ahụ nke nghọta na-ekwezu, ka ha wee mazuo ihe omimi nke Chineke, bụ́ Kraịst.’ (Ndị Kọlọsi 2:2) Anyị enwetawo ihe ọmụma​—⁠eziokwu dị iche iche⁠—​kemgbe anyị malitere ịmụ Okwu Chineke. Dị ka otu akụkụ nke ịghọta otú ọtụtụ n’ime eziokwu ndị a si kwekọọ ná nzube Chineke, anyị na-aghọta òkè dị oké mkpa nke Jisọs na-ekere. “Onye akụ̀ nile nke amamihe na ihe ọmụma dị n’ime Ya, bụ́ ihe e zoro ezo n’ime Ya.”​—⁠Ndị Kọlọsi 2:3.

9 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ na-adị gị banyere Jisọs na òkè ya ná nzube Chineke? Ọtụtụ ndị nọ n’ime Krisendọm na-adị ngwa ikwu okwu banyere Jisọs, na-azọrọ ịbụ ndị nabataworo ya na ịbụ ndị a zọpụtaworo. Ma hà matara ya n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na ihe ka n’ime ha kwetara n’ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụghị nanị na ị maara ihe bụ eziokwu banyere nke a kama i nwere ma eleghị anya ihe ọmụma sara mbara nke ihe Jisọs kwuru, meekwa. E nyeworo ọtụtụ nde aka n’akụkụ a site n’ọmụmụ ihe nke na-enye ihe ọmụma na-eji akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ma ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-eme ka ihe ọmụma anyị nwere banyere Jisọs na ụzọ ya nile dị omimi.

10. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị si enweta ihe ọmụma e zoro ezo?

10 Okwu ahụ bụ́ na “akụ̀ nile nke amamihe na ihe ọmụma” bụ ndị e “zoro ezo n’ime” Jisọs apụtaghị na anyị apụghị ịghọta ihe ọmụma dị otú ahụ. Kama nke ahụ, o yitetụrụ ólùlù a na-egwupụta ihe na ya nke ghere oghe. Ọ dịghị mkpa anyị ịchọgharịwa n’ebe sara mbara ebe anyị ga-amalite igwu ihe. Anyị amaraworị​—⁠ezi ihe ọmụma na-amalite n’ihe ndị Bible kpughere banyere Jisọs Kraịst. Ka anyị na-aghọta n’ụzọ zuru ezu karị òkè Jisọs n’imezu nzube Jehova, anyị na-enweta akụ̀ nke ezi amamihe na ezi ihe ọmụma. Ya mere ihe dị anyị mkpa bụ ịnọgide na-egwumi, na-egwupụtakwu nkume ma ọ bụ ihe ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa ndị a pụrụ inweta site n’ebe a anyị gwuworo.​—⁠Ilu 2:​1-⁠5.

11. Olee otú anyị pụrụ isi mụbaa ihe ọmụma na amamihe anyị site n’ịtụgharị uche banyere Jisọs? (Jiri ọsịsa Jisọs sara ụkwụ nke ndị na-eso ụzọ ya mee ihe atụ, ma ọ bụ jiri ihe atụ ndị ọzọ.)

11 Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịma na Jisọs sara ụkwụ nke ndị ozi ya. (Jọn 13:​1-⁠20) Otú ọ dị, ànyị atụgharịwo uche n’ihe mmụta ọ na-akụzi na àgwà o gosipụtara? N’ime otú ahụ, anyị pụrụ igwupụta akụ̀ nke amamihe nke na-enyere anyị aka​—⁠ee, na-akwali anyị⁠—​ịgbanwe otú anyị si emeso nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị onye àgwà ya kpasuworo anyị iwe ruo ogologo oge. Ma ọ bụ mgbe e kenyere anyị ọrụ anyị na-enwechaghị mmasị na ya, anyị pụrụ imeghachi omume n’ụzọ dị iche ozugbo anyị ghọtara n’ụzọ zuru ezu isi ihe dị na Jọn 13:​14, 15. Nke ahụ bụ otú ihe ọmụma na amamihe si emetụta anyị. Gịnị pụrụ ịbụ mmetụta ya n’ahụ ndị ọzọ ka anyị na-agbaso ihe ọmụma a mụbara amụba nke Kraịst n’ụzọ chiri anya karị? Ma eleghị anya ìgwè ahụ ‘ga-abụ nke e jikọtara n’ịhụnanya karị.’a

Ndọpụ Uche Pụrụ Imebi Ịdị n’Otu

12. Banyere ihe ọmụma dị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche?

12 Ọ bụrụ na ezi ihe ọmụma na-eme ka ‘ịbụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya’ dịwanye mfe, gịnị ka “ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha” na-arụpụta? Ọ bụ nnọọ ihe megidere ya​—⁠esemokwu, adịghị n’otu, na isi n’okwukwe dapụ. Ya mere anyị aghaghị ịnọ na nche megide ihe ọmụma ụgha dị otú ahụ, dị ka Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị. (1 Timoti 6:​20, 21) Pọl dekwara, sị: “Nke a ka m na-ekwu, ka onye ọ bụla wee ghara iwere ire ụtọ rafuo unu. Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”​—⁠Ndị Kọlọsi 2:​4, 8.

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka ụmụnna ndị Kọlọsi ji nọrọ n’ihe ize ndụ n’ihe banyere ihe ọmụma? (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị taa pụrụ iji chee na ha anọghị n’ihe ize ndụ yiri nke ahụ?

13 Mmetụta ọjọọ nke ihe bụ nanị ihe a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha gbara ndị Kraịst bụ́ ndị Kọlọsi gburugburu. Ọtụtụ ndị nọ n’ime Kọlọsi na gburugburu ya jiri nkà ihe ọmụma ndị Grik kpọrọ oké ihe. E nwekwara ndị na-agbaso omenala ndị Juu bụ́ ndị chọrọ ka ndị Kraịst debe Iwu Mosis, dị ka ụbọchị ememe ya dị iche iche na iwu ndị metụtara ihe oriri. (Ndị Kọlọsi 2:​11, 16, 17) Pọl emegideghị ụmụnna ya inweta ezi ihe ọmụma, kama ọ dị ha mkpa ịkpachara anya ka onye ọ bụla ghara ịbụ onye na-ezu ha n’ohi, na-eji ịrụ ụka ndị na-arụgide arụgide eme ka ha kweta ịgbaso omume na otú ụmụ mmadụ si ele ndụ anya. Ị pụrụ ịghọta na ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ ekwe ka echiche na mkpebi ha bụrụ ndị echiche na omume ndị dị otú ahụ na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ na omume banyere ndụ duziri, ọ gaje imebi ịdị n’otu na ịhụnanya nke dị n’etiti ndị òtù ọgbakọ.

14 ‘Ee,’ ka ị pụrụ iche, ‘ana m ahụ ihe ize ndụ nke ndị Kọlọsi chere ihu, ma anọghị m n’ihe ize ndụ nke ịbụ onye echiche ndị Grik metụtara, dị ka nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi ma ọ bụ chi atọ n’ime otu; ahụghịkwa m ihe ize ndụ ọ bụla nke ịbụ onye ezumike ndị ọgọ mmụọ nke okpukpe ụgha ndị m gbanahụrụ rafuru.’ Nke ahụ dị mma. Ọ dị mma ka anyị kwenyesie ike n’ọkaaka nke eziokwu bụ isi nke e kpughere site na Jisọs nke dịkwa n’ime Akwụkwọ Nsọ. Otú ọ dị, ọ̀ pụrụ ịbụ na anyị nọ n’ihe ize ndụ nke nkà ihe ọmụma ma ọ bụ echiche ndị ọzọ nke ụmụ mmadụ nke jupụtara ebe nile taa?

15, 16. Echiche dị aṅaa banyere ndụ pụrụ imetụta otú onye Kraịst si eche echiche?

15 Otu n’ime omume dị otú ahụ anọwo na-adị eri ogologo oge: “Olee ebe nkwa ọbịbịa ya dị ugbu a? Ndị nna anyị hà adawo n’ụra ọnwụ ha, ma ihe nile ka nọgidere na-adị otú ha dị kemgbe.” (2 Pita 3:4, The New English Bible) A pụrụ igosipụta echiche ahụ n’ụzọ ndị ọzọ, ma echiche ahụ bụ otu ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ iche, sị, ‘Mgbe mbụ m mụtara eziokwu ahụ ọtụtụ iri afọ gara aga, ọgwụgwụ “dị nnọọ nso.” Ma ọ bịabeghị, ònye makwanụ mgbe ọ ga-abịa?’ N’eziokwu, ọ dịghị onye ma mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-abịa. Ma, rịba ama echiche Jisọs gbara ume ka e nwee: “Lezienụ anya, mụrụnụ anya . . . n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ ga-abụ.”​—⁠Mak 13:​32, 33.

16 Lee ka ọ ga-esi bụrụ oké ihe ize ndụ inwe ụdị echiche ahụ bụ́ na, ebe a na-amaghị mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, anyị kwesịrị ime atụmatụ maka ndụ jupụtara n’ihe omume na nke “dị otú o kwesịrị”! A pụrụ igosipụta echiche ahụ n’iche, sị, ‘Apụkwara m iwere nzọụkwụ ndị ga-enye m (ma ọ bụ ụmụaka m) ohere inwe ọrụ a na-akwanyere ùgwù nke a na-akwụ ego buru ibu na ya nke ga-enyekwa m ohere ibi ndụ ntụsara ahụ. Otú ọ dị, m ga na-eje nzukọ ndị Kraịst na-ekerekwa òkè ụfọdụ n’ọrụ nkwusa ahụ, ma ọ dịghị ihe mere m ga-eji dọgbuo onwe m n’ọrụ ma ọ bụ chụọ àjà dị ukwuu.’​—⁠Matiu 24:​38-⁠42.

17, 18. Echiche dị aṅaa ka Jisọs na ndị ozi gbara anyị ume inwe?

17 Otú ọ dị, e nweghị ngọpụ ọ bụla na Jisọs na ndị ozi ya tụrụ aro ka anyị na-ebi ndụ na-eburu ịdị ngwa nke ikwusa ozi ọma ahụ n’uche, na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ ma na-adị njikere ịchụ àjà. Pọl dere, sị: “Nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ, ka ndị nwere nwunye wee dị ka ha enweghị, . . . ka ndị na-azụ ahịa wee dị ka ha enweghị ihe; ka ndị na-eji ụwa mee ihe wee dị ka ha ejibigaghị ya ókè: n’ihi na ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.”​—⁠1 Ndị Kọrint 7:​29-⁠31; Luk 13:​23, 24; Ndị Filipaị 3:​13-⁠15; Ndị Kọlọsi 1:29; 1 Timoti 4:10; 2 Timoti 2:4 Mkpughe 22:20.

18 Kama ịtụ aro ka anyị mee ndụ ntụsara ahụ ihe mgbaru ọsọ anyị, Pọl n’okpuru ike mmụọ nsọ dere, sị: “Anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a. . . . Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe ike, jide ndụ ebighị ebi aka, nke a kpọrọ gị ka ị nata ya, i kwupụtakwara nkwupụta ọma ahụ n’ihu ọtụtụ ndị àmà.”​—⁠1 Timoti 6:​7-⁠12.

19. Olee otú o si emetụta ọgbakọ mgbe ndị nọ n’ime ya nakweere echiche nke ndụ Jisọs gbara ume ka e nwee?

19 Mgbe ọ bụ ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi ndị na-agbalịsi ike ‘ime nkwupụta ihu ọha nke mara mma’ mejupụtara ọgbakọ, ịdị n’otu bụ ihe na-esikarị n’ime ya apụta. Ha adịghị adaba n’omume nke bụ́, ‘I nwere ọtụtụ ezi ihe e debere nye gị ruo ọtụtụ afọ; na-ezu ike, na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ka obi na-atọ gị ụtọ.’ (Luk 12:19) Kama nke ahụ, ha bụ ndị e jikọtara n’otu mgbalị ahụ, na-adị njikere ịchụ ihe dị iche iche n’àjà iji kere òkè zuru ezu ruo n’ókè o kwere mee n’ọrụ nke a a na-agaghị arụghachikwa ọzọ.​—⁠Tụlee Ndị Filipaị 1:​27, 28.

Ịkpachara Anya Banyere Ịrụ Ụka Ndị Na-arụgide Arụgide

20. Olee akụkụ ọzọ a pụrụ iduhie ndị Kraịst?

20 N’ezie, e nwere ụzọ ndị ọzọ ndị Kraịst pụrụ isi bụrụ ndị ‘e ji ịrụ ụka ndị na-arụgide arụgide’ ma ọ bụ aghụghọ efu nke na-emegide ‘ịbụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya’ duhie. Ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Germany dere, sị: “Otu okwu dujere n’arụmụka, ndị nkwusa na ọbụna ndị okenye na-akwado akụkụ dị iche iche banyere ụdị usoro ọgwụgwọ nke otu nwanna ji mee ihe.” Ha kwukwasịrị: “N’ihi ụzọ dị iche iche nke e ji mee ihe na ọnụ ọgụgụ ndị ọrịa dị ukwuu, nke a bụ okwu pụrụ ịkpata oké arụmụka, ọ bụrụkwa na usoro ọgwụgwọ dị iche iche yiri ihe metụtara mgbaasị, ọ pụrụ ịdị ize ndụ.”​—⁠Ndị Efesọs 6:12.

21. Olee otú ile ihe anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ isi funahụ onye Kraịst taa?

21 Ndị Kraịst chọrọ ịnọgide na-adị ndụ ma na-enwe ahụ ike ka ha wee nwee ike ife Chineke ofufe. Ka o sina dị, n’usoro ihe nke a anyị na-aka nká, na-arịakwa ọrịa ndị bụ n’ihi ezughị okè. Kama imesi okwu ahụ ike ike, anyị kwesịrị ịtụkwasị uche n’ihe ngwọta bụ ezie, nye anyị nakwa ndị ọzọ. (1 Timoti 4:16) Kraịst bụ ebe ngwọta ahụ hiwere isi, ọbụna dị ka ọ bụ ebe ndụmọdụ nke Pọl nyere ndị Kọlọsi hiwere isi. Ma cheta, Pọl gosiri na ụfọdụ pụrụ iji “ire ụtọ” bịa, na-adọpụ uche anyị pụọ n’ebe Kraịst nọ, ma eleghị anya gaa n’ebe usoro nchọpụta ọrịa, ọgwụgwọ, ma ọ bụ ihe oriri dị iche iche dị.​—⁠Ndị Kọlọsi 2:​2-⁠4.

22. Olee echiche ziri ezi anyị kwesịrị inwe banyere ọtụtụ nzọrọ ndị a na-eme banyere ụzọ dị iche iche nke ịchọpụta na ịgwọ ọrịa?

22 Ọtụtụ mkpọsa ngwa ahịa na nkwupụta okwu ndị na-ekwu banyere ụdị ọgwụgwọ dị iche iche na ụzọ isi chọpụta ọrịa na-eche ndị mmadụ ihu n’ụwa nile. E ji ụfọdụ n’ime ndị a eme ihe n’ụzọ sara mbara bụrụkwa ndị a nabatara; a na-akatọ ndị ọzọ n’ụzọ sara mbara ma ọ bụ na-enyo ha enyo.b Ọ dịịrị onye ọ bụla ikpebi ihe ọ ga-eme banyere ahụ ike ya. Ma ndị nakweere ndụmọdụ Pọl nke a na-achọta ná Ndị Kọlọsi 2:​4, 8 ga-enweta nchebe pụọ n’ịbụ ndị e ji “ire ụtọ” ma ọ bụ “aghụghọ efu” ndị na-eduhie ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-enweghị olileanya Alaeze ahụ, ndi na-achọsi nnapụta ike rafuo. Ọbụna a sị na o doro onye Kraịst anya na otu ọgwụgwọ yiri nke dị mma nye ya, o kwesịghị ịkwalite nke a n’etiti ụmụnna ndị Kraịst, n’ihi na ọ pụrụ ịghọ isiokwu mkparịta ụka na arụmụka gbasapụrụ agbasapụ. Ọ pụrụ isi otú a gosipụta na ya na-akwanyere ịdị mkpa nke ịdị n’otu dị n’ọgbakọ ùgwù n’ụzọ dị ukwuu.

23. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ihe mere anyị ga-eji nwee ọṅụ karịsịa?

23 Pọl onyeozi mesiri ya ike na ịdị n’otu ndị Kraịst bụ ihe ndabere maka ezi ọṅụ. N’ụbọchị ya, o doro anya na ọnụ ọgụgụ ọgbakọ e nwere dị ala karịa ka ọ dị taa. Ma ọ pụrụ idegara ndị Kọlọsi, sị: “Ọ bụ ezie na anọghị m n’etiti unu n’anụ ahụ m, ma anọ m n’etiti unu na mmụọ m, na-aṅụrị, na-elekwa usoro unu, na otú okwukwe unu kwere na Kraịst dị ike.” (Ndị Kọlọsi 2:5; leekwa Ndị Kọlọsi 3:14.) Lee ka anyị si nwee ihe ka ukwuu mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ! Anyị pụrụ ịhụ ezi ihe àmà nke ịdị n’otu, ezi ịdị n’usoro, na iguzosi ike n’okwukwe n’ọgbakọ nke anyị, nke na-egosipụta ọnọdụ zuru ọnụ nke ndị Chineke gburugburu ụwa. Ya mere n’ime mkpirikpi oge fọdụrụnụ n’ime usoro ihe dị ugbu a, ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike ‘ịbụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya.’

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ ohere, site n’ihe nlereanya ndị na-esonụ, lee ihe ị pụrụ ịmụta n’onwe gị banyere Jisọs nke pụrụ ịtụnye ụtụ n’ịdị n’otu n’ọgbakọ unu: Matiu 12:​1-⁠8; Luk 2:51, 52; 9:51-⁠55; 10:20; Ndị Hibru 10:​5-⁠9.

b Lee Ụlọ Nche nke December 15, 1982, peji nke 19-⁠27.

Ị̀ Rịbara Ama?

◻ Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ 1995 maka Ndịàmà Jehova?

◻ N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Kraịst bụ́ ndị Kọlọsi mkpa ịbụ ndị e jikọtara n’ịhụnanya, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị anyị mkpa taa?

◻ Olee echiche dị njọ banyere ndụ nke ọ dị mkpa karịsịa ka ndị Kraịst nọrọ na nche banyere ya taa?

◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji mụrụ anya ka ha ghara ịbụ ndị e ji okwu ire ụtọ banyere ahụ ike na ụzọ isi chọpụta ọrịa rafuo?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Atụmatụ gị dị iche iche maka ọdịnihu hà hiwere isi n’ebe ọnụnọ Jisọs dị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya