Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 1/15 p. 8-9
  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Puerto Rico

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Puerto Rico
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ubi Ọhụrụ
  • Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Dara Ogbi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ndị Ntị Chiri Etoo Jehova
    Teta!—1997
  • Otú Inye Ihe Si Mee Ka M Nwee Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • ‘Jehova Emeela Ka Ha Nweta Ihu Ọma Ya’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 1/15 p. 8-9

Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Puerto Rico

N’ETITI Osimiri Caribbean na Oké Osimiri Atlantic ka e nwere ala na-eme nri, àgwàetiti ebe okpomọkụ nke Puerto Rico. Christopher Columbus zọtaara ya ndị Spain na 1493 ma kpọọ ya San Juan Bautista iji na-echeta Jọn Onye Na-eme Baptism. Obodo ukwu ya kasị ibu ka a kpọworo Puerto Rico ruo ogologo oge, ma ọ bụ “Ọdụ Ụgbọ Mmiri Bara Ọgaranya.” Ka oge na-aga, e jiri aha nke a mara àgwàetiti ahụ dum ebe a kpọrọ obodo ukwu ahụ San Juan.

Puerto Rico aghọwo ọdụ ụgbọ mmiri bara ọgaranya n’ọtụtụ ụzọ. E si ebe a jiri ụgbọ mmiri bupụ ọtụtụ ọlaedo n’afọ ndị mbụ nke ọchịchị ndị Spain. Ugbu a àgwàetiti ahụ na-ebupụ okpete, kọfị, abịrịka, na oroma na mkpụrụ osisi na ndị yiri ya, ọ bụ ezie na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe na ndị na-eje ozi mejupụtara ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ọnọdụ akụ̀ na ụba ahụ taa. Otú ọ dị, Puerto Rico aghọwo ọdụ ụgbọ mmiri bara ọgaranya n’ụzọ kasị dị oké mkpa.

A malitere ikwusa ozi ọma banyere Alaeze Chineke n’ebe a n’afọ ndị 1930. Taa, e nwere ihe karịrị 25,000 ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ na Puerto Rico. Na 1993 ndị ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ a nke Watch Tower Society mụbara site na 23 ruo ihe karịrị 100. Mmụba nke a dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ ahụ wee nwee ike ilekọta nsụgharị nke akwụkwọ ndị e ji amụ Bible gaa n’asụsụ Spanish, ime ka akwụkwọ ndị ahụ rute ihe ruru 350,000,000 ndị na-asụ asụsụ Spanish gburugburu ụwa.

Ubi Ọhụrụ

Alaka ụlọ ọrụ ahụ na-akọkwa, sị: “Ubi ọhụrụ egherewo oghe na Puerto Rico n’ihi na anyị anọgidewo na-eme mgbalị iji ozi Alaeze ahụ rute ndị ntị chiri. Otu nwanna nwanyị na-akọ ahụmahụ na-esonụ: ‘M na-arụ ọrụ n’etiti ndị ntị chiri ma leta otu nwaada nwere ụmụntakịrị abụọ. Mgbe ọ ghọtara na abụ m Onyeàmà, ọ jụrụ m ozugbo ahụ n’ihi na di ya, bụkwa onye ntị chiri, enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ.

“‘Mgbe ọnwa ụfọdụ gasịrị otu nwaada ahụ letara otu enyi ya nke so Ndịàmà na-amụ Bible. O sonyere ma nweekwa obi ụtọ dị ukwuu maka ya. Eletara m nwaada ahụ ọzọ, o kwughachikwara na di ya enweghị mmasị ná Ndịàmà. Otú ọ dị, ọ chọrọ ịghọta Bible, ike chọọchị agwụwokwa ya n’ihi na o nweghị ihe ha na-akụzi. Anyị malitere ịmụ ihe, na-eji traktị na-eme ihe. Otu ụbọchị ọ gwara m ka m bịaghachi na Saturday n’ihi na di ya ga-anọ ya. “Ma o nweghị mmasị n’ebe anyị nọ, ka ò nwere?” ka m jụrụ. Ọ zaghachiri: “Ọ chọrọ ịchọpụta ihe nile banyere nke a.”

“‘N’ụbọchị na-esonụ ha abụọ bịara na-akụ aka n’ụzọ m! Ebe di ya nwere ọtụtụ ajụjụ, akpọrọ m ha òkù ịbịa nzukọ anyị maka ndị ntị chiri. Ọ nọrọwo n’ebe ahụ tupu mụ erute, kemgbe ahụkwa ọ dịbeghị mgbe ọ bụla nzukọ kwara ya. Ọ na-ezi ndị ọzọ ntị chiri ozi ọma, o jewokwa otu mgbakọ, ọ na-atụkwa anya baptism n’ọdịnihu.’”

Akụkọ ozi alaka ụlọ ọrụ ahụ na-agakwa n’ihu: “Ná mgbakọ distrikti anyị nke afọ a, e mere ihe omume ahụ dum n’asụsụ ndị ntị chiri, ọtụtụ ndị ntị chiri na ezinụlọ ha nile bịachara. Oge mmetụta dị nnọọ ukwuu weere ọnọdụ n’oge okwu ikpeazụ mgbe onye ọkà okwu ahụ kpọtụrụ uche ọrụ a na-arụ n’etiti ndị ntị chiri ma kwuo na ihe dị ka 70 nọ n’ebe a. E nwere ịkụ aka dara oké ụda, ma, dị ka onye ọkà okwu rịbara ama, ndị ntị chiri apụghị ịnụ ya. Ya mere, ịgwa ndị ahụ ntị chiri ka ha lee ndị na-ege ntị anya, onye ọkà okwu ahụ jụghachiri ajụjụ ahụ ọzọ, ‘Ùnu nwere obi ụtọ unu na ụmụnna unu ndị ntị chiri ịnọ n’ebe a?’ wee gwa ndị na-ege ntị ka ha kụọ aka—site n’ifegharị aka ha abụọ. Ọ bụ ihe ịtụnanya ịhụ 11,000 ụmụnna nwoke na nwanyị na-akụ aka site n’ifegharị aka ha abụọ. Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ntị chiri nwebigara ọṅụ ókè ma nwee mmetụta nke akụkụ nke òtù ụmụnna ahụ buru ibu. Anya mmiri ọṅụ gbara ọtụtụ ndị.”

Ka Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ọrụ owuwe ihe ubi ahụ na Puerto Rico, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-anọgide na-abụ ọdụ ụgbọ mmiri bara ọgaranya. “Atụrụ” Chineke, ndị ọ na-akpọ “ihe a na-achọsi ike nke mba nile,” ga-anọgide na-abata ka ụlọ Jehova wee jupụta n’ebube.—Jọn 10:16; Hagaị 2:7.

[Igbe dị na peeji nke 9]

IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ

Afọ Ije Ozi 1994

ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 25,428

NKEZI: 1 Onyeàmà maka 139

NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 60,252

NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 2,329

NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 19,012

ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 919

ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 312

ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: GUAYNABO

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya