“Agba Ochie” Ka Ọ Bụ “Akwụkwọ Nsọ Hibru”—Olè nke?
TAA ọ bụ ihe a na-emekarị na Krisendọm iji okwu ndị ahụ bụ “Agba Ochie” na “Agba Ọhụrụ” eme ihe iji kọwaa akụkụ Bible e ji asụsụ Hibru/Aramaic na Grik dee. Ma è nwere ebe ndabere Bible ọ bụla maka iji okwu ndị a eme ihe? N’ihi gịnịkwa ka Ndịàmà Jehova na-eji ezerekarị iji ha eme ihe n’ihe ndị ha na-ebipụta?
N’eziokwu, 2 Ndị Kọrint 3:14, dị ka ọ dị na King James Version na nsụgharị ndị ọzọ meworo ochie karị, dị ka Septembertestament nke asụsụ German, bụ́ nsụgharị mbụ nke Martin Luther (1522), pụrụ iyi ka ha kwadoro omume nke a. Na King James Version, amaokwu a na-agụ, sị: “Ma e mere ka uche ha kpuo ìsì: n’ihi na ruo taa ihe mkpuchi ahụ nke a na-ewepụghị n’ọgụgụ nke agba ochie ka dịgidere; ihe mkpuchi nke e wepụrụ na Kraịst.”
Otú ọ dị, onyeozi ahụ ọ̀ na-ekwu n’ebe a banyere 39 akwụkwọ ahụ a na-akpọkarị “Agba Ochie”? Okwu Grik asụgharịrị ebe a ịbụ “agba” bụ di·a·theʹke. Akwụkwọ nkà mmụta okpukpe a ma ama nke dị n’asụsụ German bụ́ Theologische Realenzyklopädie, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere 2 Ndị Kọrint 3:14, sịrị na ‘ọgụgụ a na-agụ di·a·theʹke’ ochie ahụ n’amaokwu ahụ na ‘ịgụ Mosis’ n’amaokwu na-esonụ bụ otu ihe ahụ. Ya mere, ọ sịrị, ‘di·a·theʹke ochie ahụ’ nọchitere anya Iwu Mosis, ma ọ bụ ọ dịkarịa ukwuu, Pentateuch ahụ. Ọ nọchighị anya ozuzu nile nke Akwụkwọ Nsọ e ji ike mmụọ nsọ dee tupu oge ndị Kraịst ma ọlị.
Onyeozi ahụ na-ezo aka nanị n’otu akụkụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ, nke Mosis dekọrọ na Pentateuch; ọ dịghị ezo aka n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na Aramaic n’ozuzu ha. Ọzọkwa, o bughị n’uche na ihe odide ndị Kraịst e ji ike mmụọ nsọ dee na narị afọ mbụ O.A. mejupụtara “agba ọhụrụ,” ebe okwu a na-apụtaghị ebe ọ bụla n’ime Bible.
A ga-arịbakwa ama na okwu Grik bụ́ di·a·theʹke nke Pọl ji mee ihe n’ebe a pụtara n’ezie “ọgbụgba ndụ.” (Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee New World Translation of the Holy Scriptures—With References, Appendix 7E, peji nke 1585, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, 1984.) Ya mere, ọtụtụ nsụgharị ọgbara ọhụrụ na-agụ n’ụzọ ziri ezi “ọgbụgba ndụ ochie” kama ịbụ “agba ochie.”
Banyere nke a, “National Catholic Reporter” kwuru, sị: “Okwu ahụ bụ́ ‘Agba Ochie’ n’ụzọ a na-apụghị izere ezere na-enye echiche nke adịrughị mma na ịbụ ihe oge ya gafeworo.” Ma Bible n’ezie bụ otu akwụkwọ, ọ dịghịkwa akụkụ nke oge ya gafeworo, ma ọ bụ “dị ochie.” Ozi ya na-ekwu otu ihe site n’akwụkwọ mbụ n’akụkụ nke Hibru ruo n’akwụkwọ ikpeazụ n’akụkụ nke Grik. (Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16, 17) Ya mere anyị nwere ezi ihe ndị mere anyị ga-eji na-ezere okwu ndị a dabeere n’echiche na-ezighị ezi, anyị na-ahọrọkwa iji okwu ndị ka zie ezi bụ́ “Akwụkwọ Nsọ Hibru” na “Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst” eme ihe.