Olee Ezi Ihe Pụrụ Isi n’Ikwurịta Banyere Okpukpe Pụta?
NDỊ mụrụ ụmụ na-echesi okwu ndị mbụ nke nwa ọhụrụ ha na-ekwupụta ike. Mgbe ha nụrụ ụda okwu e kwughachiri ugboro ugboro n’agbanyeghị ntatọ ọnụ ahụ, ma eleghị anya “Mama” ma ọ bụ “Papa,” obi ụtọ na-ejupụta ha obi. Ngwa ngwa ha na-akọrọ ma ndị enyi ma ndị ikwu akụkọ nke a. Okwu mbụ nke nwa ọhụrụ bụ n’ezie ozi ọma nke na-eweta ọṅụ.
Ụda, ihe ndị a hụrụ, na ísìsì bụ́ ndị ikike ịmata ihe nke nwatakịrị nwetara na-akpali mmeghachi omume. Otú ọ dị, mmeghachi omume ahụ na-adị iche iche. Ma ọ bụrụ na mgbe oge ụfọdụ gasịrị, nwa ọhụrụ emeghachighị omume ná mkpali ndị a, ndị mụrụ ụmụ ga-enwe nchegbu n’ụzọ ziri ezi na ntolite nke nwa ha pụrụ ịbụ nke nwere nsogbu.
Ụmụ ọhụrụ na-azaghachikarịsị n’ebe ndị ha maara nọ. Mgbe nne na-amakụ nwa ọhụrụ, ihu ọchị gbasapụrụ agbasapụ na-apụtakarị. Ma, mbitụ aka nke onye ikwu bịara nleta pụrụ ịkpali ibe ákwá, ọbụna ịgba isi akwara na onye ahụ agaghị ejide ya aka. Ike adịghị agwụ ihe ka ná ndị ikwu nke a meworo. Ka nwa ọhụrụ na-amatakwu ha nke ọma karị, ọ na-abụrụ ha ihe ọṅụ mgbe a na-enwekwaghị ihe mgbochi nke amaghị ahụ, ịmụmụ ọnụ ọchị nke nwa ọhụrụ na-ejikwa nwayọọ nwayọọ pụta.
N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị meworo okenye na-alatụ azụ isoro onye na-abụghị onye a mataworo ruo oge dị anya kwurịta banyere nkweta okpukpe ha. Ha nwere ike ha agaghị aghọta ihe mere onye a na-amaghị onye ọ bụ ga-eji chọọ ikwurịta banyere ihe dịịrị onwe onye—okpukpe. Ihe ọ na-arụpụta bụ na ha na-ekwe ka e nwee ihe mgbochi n’agbata ha na ndị ahụ na-ekwu banyere Onye Okike. Ha na-ajụ ọbụna ikwurịta ihe bụ, ma e kwuwerị, njimara e ketara eketa nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọchịchọ nke ife ofufe.
N’ezie, anyị kwesịrị inwe mmasị n’ịmụta banyere Onye Okike anyị, isokwa ndị ọzọ nwee mkparịta ụka pụrụ ime ka anyị nọrọ n’ọnọdụ nke ịmụta ihe. Ọ dị otú ahụ n’ihi na e jikọtawo Chineke na nkwurịta okwu ghere oghe eri ogologo oge. Ka anyị lee otú o si bụrụ otú ahụ.
‘Ṅaa Ntị Mụtakwa Ihe’
Nkwurịta okwu mbụ Chineke so mmadụ nwee bụ ya na Adam n’ogige Iden. Ma, mgbe Adam na Iv mehiesịrị, ha họọrọ izo ezo mgbe Chineke kpọrọ ha òkù, mgbe ọ chọrọ ịgwakwu ha okwu. (Jenesis 3:8-13) Otú ọ dị, Bible dekọrọ ihe sara mbara banyere ndị ikom na ndị inyom ndị nabatara okwu sitere n’aka Chineke.
Chineke gwara Noa okwu banyere mbibi na-abịanụ nke ụwa ahụ na-eme ihe ọjọọ nke oge ya, ebe Noa ghọrọ “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Dị ka ọnụ na-ekwuchitere Chineke nye ndị ọgbọ ya, ọ bụghị nanị na Noa gosiri okwukwe ná mmeso Chineke na-emeso mmadụ kamakwa o kwupụtara onwe ya n’ihu ọha ịnọ n’akụkụ nke Jehova. Mmeghachi omume dị aṅaa ka Noa nwetara? N’ụzọ dị mwute, ihe ka ná ndị ha na ya bikọrọ ndụ “amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.” (Matiu 24:37-39) Ma n’ịbụrụ anyị ihe obi ụtọ, mmadụ asaa n’ezinụlọ Noa ṅara ntị, rube isi ná ntụziaka Chineke, wee lanarị Iju Mmiri ahụ zuru ụwa. Ọ bụ site na ha ka mmadụ nile dị ndụ taa sitere.
Ka e mesịrị, Chineke gwara mba dum jupụtara ná mmadụ, bụ́ Israel oge ochie okwu. Site n’ọnụ Mosis, Chineke nyere ha Iwu Iri ahụ na ihe dị ka 600 iwu ndị ọzọ ha na-aghaghịkwa idebe. Jehova tụrụ anya ka ndị Israel rube isi na ha nile. Mosis nyere ntụziaka na kwa afọ asaa ọ bụla, n’oge Ememe Ụlọ Ntu a na-eme kwa afọ, a ga-agụpụta Iwu Chineke. “Kpọkọta ndị Israel,” ka o nyere ná ntụziaka, “ndị ikom, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ọbịa gị nke nọ n’ime ọnụ ụzọ ámá gị nile.” N’ihi gịnị? “Ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa, wee tụọ egwu Jehova, bụ́ Chineke unu, leziekwa anya ime okwu nile nke iwu a.” Mmadụ nile ga-aṅa ntị ma mụta ihe. Cheedị echiche otú ha ga-esiworị nwee mmasị ikwurịta ihe ndị ha nụrụ!—Deuterọnọmi 31:10-12.
Ihe karịrị narị afọ ise n’ikpeazụ, eze Juda bụ́ Jehoshafat chịkọtara ndị isi na ndị Livaị, ná mgbalị ịtụteghachi ofufe dị ọcha nke Jehova. Ndị ikom a jezuru obodo nile nke Juda na-akụziri ndị obodo iwu Jehova nile. Site n’ikwurịta ihe ndị a n’ihu ọha, eze ahụ gosipụtara anyaike o nwere maka ezi ofufe. Banyere ndị ọ na-achị, ha ga-aṅa ntị ma mụta ihe.—2 Ihe Emere 17:1-6, 9.
Ịgba Àmà Site ná Nkwurịta Okwu
Chineke zitere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs, n’elu ala ije ozi dị ka Onye Na-ekwuchitere Ya. (Jọn 1:14) Ka ndị na-eso ụzọ atọ ji anya ha hụ ka e nwoghara Jisọs, ha nụrụ olu Chineke n’onwe ya ka o kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma; nụrụnụ okwu Ya.” (Matiu 17:5) Ha ji obi ha nile rube isi.
N’otu aka ahụ, Jisọs mere ka ndị ozi ya kpọsaara ndị ọzọ nzube nke Chineke. Ma mgbe ọ fọrọ ihe dị ka ọnwa isii nke ije ozi n’elu ala, Jisọs mere ka a mara na ọrụ nke ikwusa Alaeze eluigwe buru nnọọ ibu nke na a ga-achọkwu ndị na-eso ụzọ. Ọ kụziiri 70 n’ime ha otú e si eso ndị a na-amabughị ekwurịta banyere Alaeze Chineke wee zipụzie ha ịgbasa ozi ahụ n’ihu ọha. (Luk 10:1, 2, 9) Ntakịrị oge tupu ọ laghachikwuru Nna ya n’eluigwe, Jisọs gbara ụmụazụ ya ume ibute ụzọ n’ịgwa ndị ọzọ okwu banyere ozi a, ọbụna na-enye ha iwu, sị: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ nke M nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Gburugburu ụwa, ezi ndị Kraịst taa na-arụzu ọrụ ahụ site n’isoro ndị agbata obi ha na-ekwurịta banyere ozi ọma nke Alaeze Chineke. Nkwurịta okwu ndị a na-enyere ha aka ịgbara eziokwu banyere Onye Okike, bụ́ Jehova, àmà.—Matiu 24:14.
Nkwurịta Okwu Ndị Dị n’Udo, Ndị Na-ewuli Elu
N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esi soro ndị ọzọ kwurịta nkweta ha? Ha agaghị akpasu ndị mmegide iwe, ma ọ bụkwanụ soro ndị mmegide rụrịtawa ụka. Kama nke ahụ, ha ga-achọpụta ndị nabatara ozi ọma ahụ, wee gosizie ihe àmà Akwụkwọ Nsọ iji kwadoo ya. N’ezie, Chineke hụrụ mmeghachi omume nke ndị zutere ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya, ọbụna dị ka Jisọs kwupụtara: “Onye na-anara unu nke ọma, ọ bụ Mụ ka ọ na-anara nke ọma, onye na-anarakwa Mụ onwe m nke ọma na-anara Onye zitere m nke ọma.” (Matiu 10:40) Lee aha ọjụjụ ọ bụ mgbe ihe ka ná ndị ha na Jisọs bikọrọ ndụ jụrụ ozi ya!
“Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ,” ka onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dụrụ n’ọdụ. Kama nke ahụ, ọ “ghaghị ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ, ọ ghaghịkwa ịbụ onye nwere ike izi ihe, onye na-anagide ihe ọjọọ, n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị; ma a sị na ọ bụ ezie ma eleghị anya na Chineke ga-enye ha nchegharị ka ha wee mazuo eziokwu.” (2 Timoti 2:24, 25) Otú Pọl si kwusaara ndị Atens, Gris, ozi ọma na-enye ihe atụ mara mma. O sooro ndị Juu tụgharịa uche n’ụlọ nzukọ ha. Kwa ụbọchị, ọ na-esoro “ndị ọ na-ezute” n’ọma ahịa ekwurịta okwu. Ọ bụ ezie na ụfọdụ, n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, nwere mmasị nanị ịdị na-ege ntị n’echiche ndị ọhụrụ, Pọl kwuru okwu hoo haa nakwa n’ụzọ obi ọma. O sooro ndị na-ege ya ntị kwurịta ozi Chineke, bụ́ nke gbara ha ume ichegharị. Mmeghachi omume ha yiri nnọọ nke ndị mmadụ taa. “Ụfọdụ weere ya mee ihe ọchị; ma ndị ọzọ sịrị, Anyị ga-anụkwa olu gị banyere nke a ọzọ.” Pọl esighị ọnwụ n’ime ka nkwurịta okwu ahụ dị ogologo. Ebe o kwusaworo ozi ya, o “siri n’etiti ha pụọ.”—Ọrụ 17:16-34.
Ka e mesịrị, Pọl gwara ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst dị n’Efesọs na ya ‘ahapụghị ịkọrọ ha otu ihe n’ihe nile baara ha uru, na izi ha ihe n’ihu ọha mmadụ, na n’ụlọ nke aka ha n’otu n’otu.’ Ọzọkwa, ọ ‘gwasiwo ha ike, ma ndị Juu ma ndị Grik, okwu nchegharị n’ebe Chineke nọ, na okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ.’—Ọrụ 20:20, 21.
Ihe atụ ndị a sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe ụzọ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible si kwurịta banyere okpukpe. N’otu aka ahụ taa, Ndịàmà Jehova na-eji nrubeisi eso ndị agbata obi ha na-ekwurịta banyere okpukpe.
Nkwurịta Okwu Ndị Na-arụpụta Ihe Dị Ukwuu
‘Nụrụnụ Okwu Chineke.’ ‘Ṅaanụ ntị n’iwu ya.’ Lee ọtụtụ ugboro agbamume ndị dị otú ahụ pụtara n’ime Bible! Ị pụrụ ime ihe ná nduzi ndị a nke Bible mgbe ọzọ Ndịàmà Jehova na-agwa gị okwu. Ṅaa ntị n’ozi ha na-ewetara gị site na Bible. Ozi a abụghị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama ọ na-akwado ọchịchị eluigwe site n’aka Chineke, Alaeze ya. Nke a bụ ụzọ Chineke ga-esi wepụ ihe ndị na-akpata ọgụ ndị nke oge a. (Daniel 2:44) Mgbe nke a gasịrị, ịchịisi nke a nke Chineke site n’eluigwe ga-eme ndokwa ka a gbanwee ụwa nile ịghọ paradaịs dị ka ogige Iden.
Otu onye bụbu onye uwe ojii na-eme nchọpụta jụrụ ugboro ugboro ịṅa ntị mgbe Ndịàmà Jehova gwara ya okwu banyere Bible. Ma n’ihi ịrị elu nke mpụ ndị ọ na-aghaghị iche ihu, ike ndụ gwụrụ ya. Ya mere ọ gwara Onyeàmà ọzọ kpọtụụrụ ya na ya ga-enyocha ihe àmà e nwere maka ozi Bible. Nkwurịta okwu ndị chiri anya si na ya pụta. Ọ bụ ezie na onye uwe ojii ahụ kwagharịrị ọtụtụ ugboro, Ndịàmà ahụ ji obi ụtọ chọta ya n’ebe ọhụrụ ọ bụla iji nọgide na-enwe nkwurịta okwu ndị ahụ. N’ikpeazụ onye uwe ojii ahụ kwetara, sị: “Ihe àmà m na-achọ dị kpọmkwem n’ime Akwụkwọ Nsọ n’oge ahụ nile. A sị na Ndịàmà ahụ anọgideghị na-agwa m okwu, m ka ga-anọ n’èzí na-eche ihe bụ nzube nke ndụ. Ihe bụ eziokwu bụ na amụtawo m eziokwu ahụ, m ga-etinyekwa ndụ m nile n’ịchọta ndị ọzọ ndị na-achọ Chineke dị nnọọ ka m chọrọ.”
Ndị nwere mmasị nụrụ ya na-achọ n’ezie ịmụtakwu ihe. Ha na-atụ anya n’ụzọ ziri ezi ịmata ihe ndị kpatara nkwenkwe ndị e gosiri ha. (1 Pita 3:15) Dị ka obere nwa na-eji ajụjụ ajụkasị ndị mụrụ ya ahụ ma na-atụ anya ka ha zaa ha, ị na-atụ anya n’ụzọ ziri ezi ka Ndịàmà nye gị azịza ndị nwere isi. Ị pụrụ ijide n’aka na ha ga-eji obi ụtọ laghachite ma soro gị kwurịtakwuo ozi Bible.
Ikekwe ọ dịlarị ntakịrị ihe ị maara banyere Bible. Ị pụrụ ịmata na ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka gị ga-agụnye mgbanwe ụfọdụ n’ụzọ i si ebi ndụ. Alala azụ ime ihe n’ihi ịtụ ụjọ na ihe ndị Chineke chọrọ ga-efu gị oké ihe. Nanị ezi obi ụtọ ka ha ga-eweta. Ị ga-aghọta nke a ka ị na-enwe ọganihu nke nta nke nta.
Nke mbụ, tụlee banyere onye Jehova bụ, ihe ọ na-atụ anya ya n’aka gị, na ihe ọ na-ekwe nkwa ya. Gwa Ndịàmà ahụ ka ha gosi gị ihe Bible kwuru banyere nke a. Nwapụta ihe ha na-ekwu n’ime Bible nke gị. N’ịmụta na Ndịàmà nwere ezi uche n’ihe ha na-egosi gị dị ka ihe ndị bụ eziokwu banyere okpukpe, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọ inyoba anya n’ọtụtụ ezi ihe ndị ọzọ ha pụrụ iso gị kerịta site n’Akwụkwọ Nsọ.—Ilu 27:17.
A na-anabata gị ịbịa kirie Ndịàmà ahụ n’ebe ha na-ezukọ n’ógbè unu, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ị ga-anụ nkwurịta okwu ndị bara uru nke Okwu Chineke n’ebe ahụ. Ị ga-ahụ otú ndị bịaranụ si enwe ọṅụ isoro ibe ha kwurịta banyere nzube nile nke Chineke. Kwee ka Ndịàmà a nyere gị aka ịmụta ihe bụ eziokwu banyere uche Chineke maka anyị taa. Zaghachi n’ọkpụkpọ òkù nke Chineke ikwurịta banyere ezi ofufe ma nata ihu ọma nke nnwapụta ya, ọbụna ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs.—Malakaị 3:16; Jọn 17:3.
[Foto dị na peeji nke 5]
Noa kwuru okwu hoo haa banyere nzube Chineke
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Dị ka Pọl mere n’Atens oge ochie, Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible