Ruo Ogologo Oge Hà Aṅaa Ka Ndị Ogbenye Na-aghaghị Ichere?
“Ọ bụrụ na ọha mmadụ ebe onye ọ bụla nweere onwe ya apụghị inyere ọtụtụ ndị dara ogbenye aka, ọ pụghị ịzọpụta ole na ole ndị bara ọgaranya.”—John F. Kennedy.
“MGA-ACHỌ ka ọdịnihu dịrị onye ọ bụla mma—enweghị ịda ogbenye, ọ dịghị onye na-ehi n’èzí, ka ọ bụrụ paradaịs!” Otú a ka otu nwata nwoke dị afo 12 si São Paulo, Brazil, si kwuo ya. Ma ọ̀ pụrụ ikwe omume ịkwụsị ịda ogbenye? Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ndị ogbenye na-aghaghị ichere?
Ụfọdụ na-ele onwe ha anya dị ka ndị ogbenye n’ihi na ha apụghị ịzụta ihe ndị ha chọrọ. Ma, chee echiche banyere ọnọdụ dị mwute nke ndị dara ogbenye n’ezie. Ị̀ pụrụ ichetụ n’echiche banyere ụdị oké ihe isi ike na enweghị obi ụtọ nke ndị dị otú ahụ? Ndị ụfọdụ na ụmụ nnụnụ na òké na-asọrịta mpi, ka ha na-abọsasị ebe mkpofu ahịhịa dị iche iche na-achọ nri! Ogologo oge hà aṅaa ka ọnọdụ ogbenye dị otú ahụ ga-anọ na-emekpọ ihe a kpọrọ mmadụ ọnụ? Arịrịọ Federico Mayor, onye isi nlekọta ọrụ nke UNESCO (Òtù Agụmakwụkwọ, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu), kwesịrị ekwesị: “Ka anyị hapụ nnakwere aghụghọ a nke na-enye anyị ohere ịnagide ihe a na-apụghị ịnakwere anakwere—ọnọdụ ogbenye, ụnwụ nri, ahụhụ nke ọtụtụ nde ụmụ mmadụ.”
À ga-emezu nrọ nke ọdịmma nke ụwa nile? Olileanya dị aṅaa ka ndị ogbenye nwere?
Ohere Ndị Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Ogbenye?
Ndị ndú nwere ezi nzube na-eme atụmatụ ọrụ ndị ọzọ, ụgwọ ọrụ ka mma, enyemaka ọha na eze ka mma, na nhazigharị ala. Ha pụrụ ikwenyere onye bụbu onye isi ala United States bụ́ John F. Kennedy: “Ọ bụrụ na ọha mmadụ ebe onye ọ bụla nweere onwe ya apụghị inyere ọtụtụ ndị dara ogbenye aka, ọ pụghị ịzọpụta ole na ole ndị bara ọgaranya.” Otú ọ dị, ezi nzube obi ezughị ezu iji kpochapụ ọnọdụ ogbenye. Dị ka ihe atụ, ịrị elu nke ọnọdụ akụ̀ na ụba ọ̀ ga-enyere ndị ogbenye aka n’ozuzu ha? Ọ bụchaghị otú ahụ. Jawaharlal Nehru, onye bụbu onye ndú India, kwuru, sị: “Ikike nile nke ọha mmadụ ndị aka ji akụ̀ na-achị, ọ bụrụ na a hapụ ịchịkwa ya, na-achọkarị ime ka ndị bara ọgaranya bakwuo ọgaranya na ka ndị dara ogbenye dakwuo ogbenye.” Otú ọ dị, e wezụga ihe isi ike na ịnọ n’ụkọ, mmetụta nke abaghị uru ọ bụla na-amụba ibu arọ nke ndị ogbenye. Ndị ndú bụ́ mmadụ hà pụrụ inyere ndị ogbenye aka imeri mmetụta nke enweghị enyemaka na enweghị olileanya?
N’eziokwu, ọtụtụ n’ime ndị bụ́ ogbenye ọnụ ntụ́ amụtawo ịnagide ọnọdụ ogbenye, meriekwa mmetụta nke ùgwù onwe onye dị ala n’ihu oké ihe isi ike, ndị dị ka oké ịrị elu nke ọnụ ahịa na enweghị ọrụ. Ọzọkwa, a ga-ewepụrịrị ụnwụ nri, enweghị ebe obibi, na nhụsianya. Nke a ọ̀ na-eju gị anya? Anyị na-akpọ gị òkù ịgụ isiokwu na-esonụ: “N’isi Nso, Ọ Dịghị Onye Ga-abụ Ogbenye!”