Nnọgidesi Ike Na-eduga n’Ọganihu
DỊ KA JOSÉ MAGLOVSKY SI KỌỌ
Mgbe onye uwe ojii ahụ jidere aka m, m chọrọ nna m. Otú ọ dị, n’amaghị ihe na-emenụ, a kpọrọwo ya gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Mgbe m rutere ebe ahụ, ndị uwe ojii ahụ naara anyị akwụkwọ anyị nile, tinyere Bible anyị, ma tụkọba ha n’ala ụlọ ahụ. Mgbe ọ hụrụ nke a, nna m jụrụ, sị: “Ùnu na-atụsakwu Bible n’ala?” Onye isi ndị uwe ojii rịọrọ mgbaghara, ma welite Bible ndị ahụ wee tụkwasị ha n’elu table.
OLEE otú anyị si gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii? Gịnị ka anyị nọworo na-eme? Ànyị nọ na steti na-ekweghị na Chineke nke ndị uwe ojii na-akpa ike na ya, nke mere na ọbụna na a napụrụ anyị Bible? Iji zaa ajụjụ ndị a, anyị ga-alaghaghi azụ na 1925, tupu a mụọrị m.
N’afọ ahụ nna m, bụ́ Estefano Maglovsky, na nne m, bụ́ Juliana, hapụrụ ebe bụ mgbe ahụ Yugoslavia ma kwaga na Brazil, na-ebi na São Paulo. Ọ bụ ezie na papa m bụ onye Protestant, mama m abụrụkwa onye Katọlik, okpukpe abụghị ihe nkewa n’etiti ha. N’ezie, afọ iri mgbe nke ahụ gasịrị otu ihe mere nke mere ka ha dị n’otu n’okpukpe. Ọgọ nwoke papa m wetaara ya akwụkwọ nta nwere àgwà anọ nke e biri n’asụsụ Hungarian nke na-atụle ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ natawo akwụkwọ nta ahụ dị ka onyinye, ọ gwakwara papa m ka ọ gụọ ya ma gwa ya ihe bụ uche ya banyere ihe dị n’ime akwụkwọ ahụ, karịsịa akụkụ kwuru maka “hell.” Papa m ji abalị ahụ nile gụọ ma gụgharịa akwụkwọ nta ahụ, n’echi ya kwa, mgbe ọgọ ya nwoke bịara ịma ihe bụ uche ya, papa m kwupụtara hoo haa, sị: “Ebe a ka eziokwu dị!”
Mmalite Ndị Dị Nta
Ebe ọ bụ na akwụkwọ ahụ sitere n’aka Ndịàmà Jehova, ha abụọ gara chọọ ha ka ha wee mụtakwuo ihe banyere ihe ndị ha kwenyere na ozizi ha. Mgbe ha mesịrị zute ha, ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ anyị malitere isoro Ndịàmà ahụ na-enwe nkwurịta okwu Bible. N’otu afọ ahụ, na 1935, a malitere ọmụmụ Bible oge nile n’asụsụ Hungarian, na-enwe nkezi nke mmadụ asatọ ndị na-abịanụ, kemgbe ahụkwa anyị enwewo ọmụmụ Bible oge nile n’ebe obibi anyị.
Mgbe afọ abụọ nke ịmụ Bible gasịrị, e mere papa m baptism na 1937, ọ ghọkwara Onyeàmà Jehova nke na-anụ ọkụ n’obi, na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ, na-ejekwa ozi dị ka ohu a họpụtara ahọpụta na onye nduzi ọmụmụ ihe. O nyere aka ná nguzobe nke ọgbakọ mbụ na São Paulo, n’akụkụ nke Vila Mariana. E mesịrị buga ọgbakọ ahụ n’etiti obodo ahụ, e wee mara ya dị ka Ọgbakọ Central. N’afọ iri n’ihu e hiwere ọgbakọ nke abụọ, n’ógbè Ypiranga, a họpụtakwara papa m dị ka ohu ọgbakọ n’ebe ahụ. Na 1954 e hiwere ọgbakọ nke atọ, n’akụkụ nke Moinho Velho, ebe o jekwara ozi dị ka ohu ọgbakọ.
Ngwa ngwa e wusichara ìgwè nke a ike nke ọma, o bidoro ịdị na-enyere ìgwè nọ nso na São Bernardo do Campo aka. N’ihi ngọzi Jehova ná mgbalị ìgwè ndị a nke Ndịàmà n’afọ ndị ahụ, uto abụrụwo ihe dị ịrịba ama nke ukwuu, nke mere na n’afọ 1994 e nwere ihe karịrị 70,000 ndị nkwusa n’ime 760 ọgbakọ n’ime São Paulo ka ukwuu. N’ụzọ dị mwute, papa m adịghị ndụ hụ uto a. Ọ nwụrụ na 1958 n’afọ ndụ nke 57.
Ịgbalịsi Ike Ịgbaso Ihe Nlereanya Nna M
Otu njimara pụtara ìhè nke nna m, dịkwa ka ọ dị ndị Kraịst ndị ọzọ tozuru okè, bụ àgwà ile ọbịa nke ọma ya. (Lee 3 Jọn 1, 5-8.) Dị ka ihe si na ya pụta, anyị nwere ihe ùgwù inwe dị ka ọbịa Antonio Andrade na nwunye ya na nwa ha nwoke, bụ́ ndị si United States bịa Brazil ha na Nwanna Nwoke na Nwanna Nwanyị Yuille n’afọ 1936. Ndị ọzọ bịakwara n’ụlọ anyị bụ mmadụ abụọ gụsịworo akwụkwọ na Watchtower Bible School of Gilead, Harry Black na Dillard Leathco, ndị bụ ndị ozi ala ọzọ mbụ e kenyere ọrụ na Brazil na 1945. Ọtụtụ ndị ọzọ sochiri ha. Ụmụnna nwoke na nwanyị ndị a bụ isi iyi na-adịgide adịgide nke agbamume nye onye ọ bụla n’ezinụlọ anyị. Ịghọta nke a nakwa maka abamuru nke ezinụlọ m, agbalịwo m iṅomi ihe nlereanya nna m n’ihe banyere àgwà ndị Kraịst nke ile ọbịa nke ọma.
Ọ bụ ezie na adị m nanị afọ itoolu mgbe nna m mụtara eziokwu ahụ na 1935, dị ka ọkpara ya, m malitere na-esonyere ya n’ọrụ ọchịchị Chineke ya dị iche iche. Anyị nile na-eso ya na-eje nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà na São Paulo na Eça de Queiroz Street, Nọmba 141. N’ihi ozizi na ọzụzụ nke nna m nyere m, azụlitere m ọchịchọ siri ike ijere Jehova ozi, na 1940 kwa, araara m onwe m nye Jehova, na-egosipụta nke a site ná mmikpu ime mmiri n’Osimiri Tietê nke e metọworo ugbu a, bụ́ nke na-asọfe n’etiti São Paulo.
Ngwa ngwa amụtara m ihe ọ pụtara ịbụ onye nkwusa ozi ọma na-ejechi ozi anya, ịkụ na ịkwọsa ozi nke eziokwu ahụ mmiri n’ime ndị ọzọ ma na-eduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi. Ugbu a, ka m na-ahụ ọtụtụ puku Ndịàmà Jehova rarawooro onwe ha nye na Brazil, m na-enwe ọṅụ dị omimi ịmara na O ji m rụọ ọrụ n’inyere ọtụtụ n’ime ha aka ịmara eziokwu ahụ ma ọ bụ ime ka nghọta ha ghọtara ya dịkwuo omimi.
N’ime ndị m nyeere aka bụ Joaquim Melo, bụ́ onye m zutere n’ozi ụlọ n’ụlọ. M nọ na-agwa ndị ikom atọ ndị ọzọ na-ege ntị ma ha enwechaghị mmasị okwu. Mgbe ahụ m hụrụ otu nwa okorobịa sonyewooro anyị ma na-ege ntị nke ọma. N’ịhụta mmasị ya, m chere okwu m ihu n’ebe ọ nọ ma, mgbe ezi ịgba àmà gasịrị, m kpọrọ ya òkù ka ọ bịa n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọ bịaghị ọmụmụ ihe ahụ, ma ọ bịara Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, sitekwa na mgbe ahụ ọ bịachiri nzukọ anya. O nwere ọganihu dị mma, e mere ya baptism, ruokwa ọtụtụ afọ o jere ozi dị ka onye ozi na-ejegharị ejegharị, nke nwunye ya sonyeere.
E nwekwara Arnaldo Orsi, onye m zutere n’ebe m na-arụ ọrụ. M na-agbara onye ọrụ ibe m àmà mgbe nile ma m hụtara na otu nwoke gbajuru ajị agba na-ege ntị mgbe nile, ya mere m bidoro na-agwa ya okwu kpọmkwem. O sitere n’ezinụlọ ji Katọlik kpọrọ ihe ma ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ banyere okwu ndị dị ka ise siga, ikiri sinima ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, na ịgba judo. Egosiri m ya ihe Bible nwere ikwu, n’ịbụrụ m ihe ịtụnanya na-enye ọṅụ, echi ya ọ kpọrọ m ikiri ka ọ na-agbaji ọkpọkọ ya na ihe e ji amụnye ya ọkụ tinyekwara obé ya, bibie sinima ya ndị na-egosi ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, ma kpụpụ ajị agba ya. Nwoke gbanweworonụ n’ime minit ole na ole! Ọ kwụsịkwara ịgba judo ma rịọ ka o soro m na-amụ Bible kwa ụbọchị. N’agbanyeghị nguzogide sitere n’aka nwunye na nna ya, o nwere ezi ọganihu ime mmụọ site n’enyemaka nke ụmụnna ndị bi ya nso. Ná mkpirikpi oge, e mere ya baptism, taakwa ọ na-eje ozi dị ka okenye ọgbakọ. Nwunye ya na ụmụ ya nakwerekwaara eziokwu ahụ.
Ikere Òkè n’Ije Ozi Alaeze
Mgbe m gbara ihe dị ka afọ 14, m bidoro ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-eme mkpọsa, ebe m mụtara otú e si ede saịn bọdụ. Nke a ghọrọ ihe bara ezigbo uru, ruokwa ọtụtụ afọ abụ m nanị nwanna nwoke na São Paulo e jiri mee ihe n’ide ihe kaadị obodobo na ọkọlọtọ na-adị n’okporo ámá nke na-akpọsa okwu ihu ọha na mgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30 afọ, enwere m ihe ùgwù nke ije ozi dị ka onye isi nke Ngalaba Ihe Odide nke mgbakọ. M na-edebekarị oge ezumike m iji rụọ ọrụ ná mgbakọ ndị ahụ, ọbụna na-arahụ n’ụlọ mgbakọ ahụ iji dee ihe odide ndị ahụ n’oge.
Enwekwara m ohere iji ụgbọ ala Society nwere ígwè na-ekwu okwu, bụ́ nnọọ ihe ọhụrụ mgbe ahụ, rụọ ọrụ. Anyị ga-atụkwasị akwụkwọ anyị ndị dabeere na Bible n’elu table, mgbe ụgbọ ala ahụ na-akpọsa ozi a gụnyere na rekọd, anyị ga-agwa ndị si n’ụlọ ha pụta ịhụ ihe na-emenụ okwu. Ụzọ ọzọ anyị ji mee ihe iji kpọsaa ozi ọma nke Alaeze ahụ bụ gramophone dị mfe mbugharị, m ka nwekwara rekọd ndị e ji na-akpọ akwụkwọ Society dị iche iche. E tinyere ọtụtụ akwụkwọ dabeere na Bible n’ihi nke a.
N’oge ndị ahụ Chọọchị Katọlik na-enwe ogologo ndị na-akwụ n’ahịrị n’okporo ámá nke São Paulo, mgbe mgbe na-enwe ndị ikom kwụ n’ihu na-achara ha ụzọ. Otu ụbọchị Sunday, mụ na nna m na-enyefe Ụlọ Nche na Teta! n’okporo ámá ahụ mgbe a hụrụ otu ogologo ahịrị. Nna m, dị ka ọ na-emekarị, yi okpu ya. Otu n’ime ndị ikom ahụ kwụ n’ihu tiri mkpu, sị: “Kpupụ okpu gị! Ọ̀ bụ na ị hụghị na ndị kwụrụ n’ahịrị na-abịa?” Mgbe nna m na-ekpupụghị okpu ya, ndị ikom ọzọ bịara, na-akwagide anyị na window otu ụlọ ahịa ma na-eme ka mkpọtụ dị. Nke a dọọrọ uche otu onye uwe ojii, bụ́ onye bịara ịhụ ihe na-emenụ. Otu n’ime ndị ikom ahụ jidere ya n’aka, na-achọ ịgwa ya okwu. “Wepụ aka gị n’uwe m!” ka onye uwe ojii ahụ nyere ya iwu, na-etichapụ aka nwoke ahụ. Mgbe ahụ ọ jụrụ ihe na-emenụ. Nwoke ahụ kọwara na nna m ekpupụghị okpu ya maka ahịrị ndị mmadụ ahụ, na-agbakwụnye, sị: “Abụ m onye ozi Roman Katọlik.” Azịza ọ na-atụghị anya ya bụ: “Ị̀ sịrị na ị bụ onye Rom? Mgbe ahụ laghachi na Rom! Ebe a bụ Brazil.” Mgbe ahụ o chere anyị ihu, na-ajụ, sị: “Ònye bu ụzọ nọrọ ebe a?” Mgbe nna m zara na ọ bụ anyị, onye uwe ojii ahụ chụpụrụ ndị ikom ahụ ma gwa anyị ka anyị gaa n’ihu n’ọrụ anyị. O guzoro n’akụkụ anyị ruo mgbe ahịrị ndị ahụ nile gafesịrị—okpu nna m nọgidekwara ya n’isi!
A dịghị ahụkarị ihe omume ndị dị otú a. Ma mgbe ọ bụla ha mere, ọ na-agba ume ịmara na e nwere ndị kwenyere n’ikpe ziri ezi maka ndị dị nta karị nakwa ndị na-adịghị adara Chọọchị Katọlik n’ala.
N’oge ọzọ, ezutere m otu onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu bụ́ onye gosiri mmasị ma gwa m ka m bịaghachi n’izu na-esonụ. Mgbe m bịaghachiri ọ nabatara m nke ọma ma gwa m ka m bata n’ụlọ. Lee otú m si nwee ihe ijuanya ịhụ ìgwè ndị ntorobịa gbara m gburugburu na-akwa m emo ma na-agbalị ịkpasu m iwe! Ọnọdụ ahụ kawanyere njọ, ọ dịkwa m ka ha ga-awakpo m n’oge na-adịghị anya. Agwara m onye nke ahụ kpọbatara m na ọ bụrụ na ihe ọ bụla emee m, nanị ya ga-eji isi ya buru ihe si na ya pụta nakwa na ezinụlọ m maara ebe m nọ. M gwara ha ka ha hapụ m ka m pụọ, ha kwekwara. Otú ọ dị, tupu mụ apụọ, m sịrị na ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ha chọrọ ịgwa m okwu nanị ya, m ga-anọ ya. Mgbe e mesịrị, m nụrụ na ha bụ ìgwè nke ndị na-anụbiga ọkụ n’obi ókè, ndị enyi nke ụkọchukwu ógbè ahụ onye kwadoro ka ha hazie nzukọ nke a. Obi dị m ụtọ ịpụ n’aka ha.
Otú ọ dị, ná mmalite, ọganihu na Brazil na-arị arị, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-adịghị ahụchata. Anyị nọ n’agba nke mbụ nke “ịkụ mkpụrụ,” na-enwe ntakịrị oge maka “ịkọlite” na “ịghọrọ” mkpụrụ ọrụ anyị rụrụ mịrị. Anyị na-echetakarị ihe Pọl onyeozi dere: “Mụ onwe m kụrụ osisi, Apọlọs kwọsara ya mmiri; ma ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-aba ụba. Ya mere onye na-akụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-akwọsa mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla; kama Chineke, Onye na-eme ka ọ na-aba ụba, bụ ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 3:6, 7) Ka mmadụ abụọ mbụ gụsịrị akwụkwọ na Gilead na 1945 bịarutere, anyị nwere mmetụta na oge abịawo maka ịba ụba nke a a nọworo na-atụ anya ya.
Obi Ike n’Ihu Mmegide
Otú ọ dị, ịba ụba abịaghị n’enweghị mmegide, karịsịa mgbe Agha Ụwa nke Abụọ malitesịrị na Europe. E nwere mkpagbu pụtara ìhè n’ihi na ndị mmadụ n’ozuzu ha na ụfọdụ ndị ọchịchị aghọtaghị nguzo nnọpụiche anyị. N’otu oge, na 1940, mgbe anyị ji kaadị obodobo na-arụ ọrụ okporo ámá n’etiti São Paulo, otu onye uwe ojii si n’azụ bịakwute m, dọkaa kaadị obodobo ahụ, ma jichie m n’aka ịkpọrọ m gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. M legharịrị anya maka nna m, ma ọ dịghị ebe a hụrụ ya. Amaghị m na ya na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ọzọ, tinyere Nwanna Yuille, onye na-elekọta ọrụ ahụ na Brazil, abụrụwo ndị a kpọọrọ gaa n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ahụ. Dị ka e gosiri na paragraf e ji malite, n’ebe ahụ ka m zutere nna m ọzọ.
Ebe ọ bụ na abụbeghị m onye toruworo ogo mmadụ, a pụghị ịtụ m mkpọrọ, ngwa ngwa otu onye uwe ojii kpọlara m ụlọ ma nyefee m n’aka nne m. N’otu uhuruchi ahụ a tọhapụkwara ụmụnna nwanyị ahụ. E mesịa ndị uwe ojii ahụ kpebiri ịtọhapụ ụmụnna nwoke ahụ nile, ihe dị ka mmadụ iri n’ọnụ ọgụgụ, ma e wezụga Nwanna Yuille. Otú ọ dị, ụmụnna nwoke ahụ nọgidere na-ekwu, sị: “Tọhapụ anyị nile ma ọ bụ ọ dịghị onye n’ime anyị ga-esi ebe a pụọ.” Ndị uwe ojii ahụ gbara isi akwara, ya mere mmadụ nile nọkọrọ ọnọdụ abalị ahụ ọnụ n’ọnụ ụlọ jụrụ oyi n’ala simenti. N’echi ya a tọhapụrụ mmadụ nile n’achọghị ihe ọ bụla. Ọtụtụ oge e jidere ụmụnna maka iji kaadị obodobo agba àmà. Ihe ndị e dere na ha kpọsara okwu ihu ọha nakwa akwụkwọ nta a kpọrọ Fascism or Freedom, ụfọdụ ndị ọchịchị ghọtakwara ya ịpụta na anyị dụnyeere ọchịchị aka ike Fascist úkwù, bụ́ nke dujekarịrị nnọọ ná nghọtahie.
Ịmanye mmadụ ije ozi agha wetakwaara ụmụnna na-eto eto nsogbu dị iche iche. Na 1948, abụ m onye mbụ a tụrụ mkpọrọ na Brazil n’ihi ihe iseokwu a. Ndị ọchịchị amaghị nnọọ ihe ha ga-eji mụ eme. A kpọfere m n’ogige ndị soja dị na Caçapava ma tinye m n’ọrụ ịkụ ihe na ilekọta akwụkwọ nri n’ubi nakwa ihicha ọnụ ụlọ ndị isi na-anọ egwu egwuregwu ịkpa mma. Enwere m ọtụtụ ohere ịgbara ndị ikom ahụ àmà na inye ha akwụkwọ. Onye na-elekọta ogige ahụ bụ onye mbụ natara otu n’ime akwụkwọ Society bụ́ Children. Mgbe e mesịrị, ọbụna na e kenyere m ọrụ ịkụziri ihe dị ka 30 ma ọ bụ 40 ndị soja bụ́ ndị na-enweghị ike inwe mmegharị ahụ na ndị na-adịghị apụta èzí ihe banyere okpukpe. N’ikpeazụ, mgbe ihe dị ka ọnwa iri n’ụlọ mkpọrọ gasịrị, e kpere m ikpe ma tọhapụ m. Ekelere m Jehova, bụ́ onye nyere m ume ịtachi obi n’ihu iyi egwu, ihe ihere, na ịkwa emo ndị m natara site n’aka ụfọdụ ndị ikom ahụ.
Onye Inyeaka Kwesịrị Ntụkwasị Obi ma Na-anọgidesi Ike n’Ihe
Na June 2, 1951, m lụrụ Barbara, kemgbe ahụkwa ọ bụrụwo onye inyeaka na-anọgidesi ike n’ihe ma na-ekwesị ntụkwasị obi n’ịkụziri ụmụ anyị ihe na ịzụlite ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) N’ime ụmụ ise anyị mụrụ, anọ ji ọṅụ na-ejere Jehova ozi n’ọkwá dị iche iche. Olileanya anyị bụ na, tinyere anyị, ha ga na-anọgidesi ike n’eziokwu ma na-etinye ihe n’ọganihu nke nzukọ a na ọrụ a na-arụ. Ndị òtù ezinụlọ ahụ nọ na foto na-eso ihe odide a bụcha ndị ohu Jehova raara onwe ha nye ma e wezụga nke kasị nta, nwa ọhụrụ e ku n’aka. Anọ bụ ndị okenye, abụọ bụkwa ndị ọsụ ụzọ oge nile, na-eme ihe atụ ịbụ eziokwu nke Ilu 17:6: “Okpueze ndị okenye ka ụmụ ụmụ bụ; ọzọ, ịma mma nke ụmụ bụ nna ha.”
Ugbu a, n’afọ ndụ nke 68, ahụ ike m adịchaghị mma. Na 1991, e ji ịwa ahụ dozie m akwara atọ ọbara si agafe. Otú ọ dị, enwere m obi ụtọ inwe ike ịnọgide na-eje ozi dị ka onye isi oche ndị nlekọta n’ọgbakọ dị na São Bernardo do Campo, na-agbaso nzọụkwụ nna m, bụ́ onye so ná ndị mbụ malitere ọrụ ahụ n’ebe a. Ọgbọ anyị pụrụ iche n’ezie, na-enwe ohere ikere òkè n’ihe ùgwù a na-agaghị enwe ọzọ nke ịkpọsa nguzobe e guzobere Alaeze Mesaịa nke Jehova. Ya mere anyị agaghị echezọ okwu ndị Pọl gwara Timoti mgbe ọ bụla: “Ma gị onwe gị, . . . rụọ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.”—2 Timoti 4:5.
[Foto dị na peeji nke 23]
Nne na nna m, bụ́ Estefano na Juliana Maglovsky
[Foto dị na peeji nke 26]
José na Barbara ha na ndị òtù ezinụlọ ha nke ndị ohu Jehova raara onwe ha nye