Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 7/1 p. 8-12
  • Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-eweta Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-eweta Ọṅụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Site n’Ịbụ Ọkwọ Ụgbọ Okporo Ígwè Gaa n’Ịbụ Onye Na-ekwusa Ozi Ọma
  • Mmegide Ndị M Nwetara ná Mmalite
  • Otu Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Ga-eru
  • Mụ Enweta Enyemaka
  • Iche Ihe Ịma Aka Ndị Ọzọ Ihu
  • Jakị, Ịnyịnya, na Anụ Na-eri Àkị́kà
  • Mụ Enweta Onye Inyeaka n’Ikpeazụ
  • Ịnọgidesi Ike n’Agbanyeghị Ọrịa
  • Obi Ike M n’Ebe Jehova Nọ Kwagidere M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jehova Gọziri Mkpebi M
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nnọgidesi Ike Na-eduga n’Ọganihu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ịza Òkù Jehova Kpọrọ Na-enye Ụgwọ Ọrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 7/1 p. 8-12

Akụkọ Ndụ

Ịnọgidesi Ike n’Ihe Na-eweta Ọṅụ

DỊ KA MÁRIO ROCHA DE SOUZA SI KỌỌ

“Ejighị m n’aka na Maazi Rocha ga-adị ndụ ma a wachaa ya ahụ́.” Taa, ihe dị ka afọ iri abụọ agafeela kemgbe otu dọkịta busịrị amụma ọjọọ ahụ, ma aka dị m ndụ, na-ejekwa ozi dị ka onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Gịnị nyeere m aka ịnọgidesi ike n’afọ nile ndị a?

Ọ BỤ n’ugbo dịdewere Santo Estêvão, bụ́ obodo dị na steeti Bahia nke dị n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil ka m nọ tolite. Amalitere m inyere papa m aka n’ugbo mgbe m dị afọ asaa. Kwa ụbọchị, ọ na-ekenye m ọrụ m ga-arụ ma m lọta akwụkwọ. Ka oge na-aga, amalitere m ịdị na-elekọta ugbo anyị ma papa m gaa ọrụ na Salvador, nke bụ́ isi obodo anyị.

Anyị enweghị ọkụ eletrik, mmiri pọmpụ, ma ọ bụ ngwá ọgbara ọhụrụ ndị e ji ebi ndụ, bụ́ ndị e nwere taa, ma anyị nwere obi ụtọ. M na-efe kaịt ma ọ bụ buru ụgbọala ndị mụ na ndị enyi m ji osisi rụọ na-agbagharị. Eso m n’òtù ndị ukwe chọọchị anyị ma na-akụ otu n’ime ngwá egwú ndị anyị nwere na chọọchị. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m nọ hụ otu akwụkwọ a na-akpọ História Sagrada (Akụkọ Dị Nsọ), bụ́ nke mere ka m nwee mmasị na Bible.

Na 1932, mgbe m dị afọ iri abụọ, oké ọkọchị nọtere aka kpara ebe ugwu ọwụwa anyanwụ Brazil aka ọjọọ. Ehi anyị nwụrụ, ihe ndị anyị kọrọ n’ugbo emeghịkwa nke ọma, n’ihi ya, akwagara m Salvador, bụ́ ebe m nwetara ọrụ ịkwọ ụgbọ okporo ígwè. Mgbe e mesịrị, achọtara m ụlọ ma gaa kpọrọ ndị ezinụlọ m ka mụ na ha biri. Na 1944, papa m nwụrụ, hapụrụ m mama m na ụmụnne m ndị nwanyị asatọ na ndị nwoke atọ ka m lekọtawa.

Site n’Ịbụ Ọkwọ Ụgbọ Okporo Ígwè Gaa n’Ịbụ Onye Na-ekwusa Ozi Ọma

Otu n’ime ihe mbụ ndị m mere mgbe m rutere Salvador bụ ịzụ Bible. Mgbe m gasịrị chọọchị Baptist ruo afọ ụfọdụ, mụ na Durval, bụ́ onye na-akwọkwa ụgbọ okporo ígwè dị ka mụ, ghọrọ enyi. Mụ na Durval na-eji ogologo oge akparịtakarị ụka banyere ihe ndị dị na Bible. Otu ụbọchị, o nyere m akwụkwọ nta isiokwu ya bụ Where Are the Dead?a Ọ bụ ezie na m kweere na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, achọsiri m nnọọ ike ịmata ihe akụkụ Bible ndị e hotara n’akwụkwọ nta ahụ kwuru. Ọ tụrụ m nnọọ n’anya ịhụ na Bible kwuru na mkpụrụ obi ọ bụla nke mehierenụ ga-anwụ.—Ezikiel 18:4.

Mgbe Durval hụrụ na m nwere mmasị na Bible, ọ rịọrọ Antônio Andrade, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, ka ọ na-abịa eleta m n’ụlọ m. Mgbe ọ bịasịrị leta m nke ugboro atọ ya, Antônio gwara m ka m soro ya gaa ozi ọma. Mgbe o ziri ozi ọma n’ụlọ abụọ mbụ anyị gara, ọ gwara m, sị, “Ọ bụ gị ga-ezi ozi ọma n’ụlọ nke ọzọ.” Ụjọ jidere m, ma enwere m nnọọ ọṅụ dị ukwuu mgbe otu ezinụlọ gere m ntị nke ọma ma nara akwụkwọ abụọ m nyere ha. M ka na-enwe ọṅụ yiri nke ahụ mgbe ọ bụla m zutere onye nwere mmasị n’eziokwu Bible.

E mere m baptizim n’Oké Osimiri Atlantic ná nso nso Salvador n’April 19, 1943, bụ́ ụbọchị e chetara ọnwụ Kraịst n’afọ ahụ. Ebe ọ bụ na e nwechaghị ụmụnna nwoke ndị nwere ahụmahụ, a họpụtara m ilekọta ìgwè Ndịàmà na-ezukọ n’ụlọ Nwanna Andrade nke dị n’otu n’ime nwa okpo ụzọ e si aga ma mgbago ma mkpọda nke obodo Salvador.

Mmegide Ndị M Nwetara ná Mmalite

Ndị mmadụ enweghị mmasị n’ọrụ Ndị Kraịst anyị n’afọ ndị ahụ a lụrụ Agha Ụwa nke Abụọ (1939-1945). Ụfọdụ ndị ọchịchị chere na anyị bụ ndị nledo nke ndị Ebe Ugwu America n’ihi na a na-ebi ihe ka ọtụtụ n’akwụkwọ anyị na United States. N’ihi ya, a malitere ịnwụchi anyị na ịgba anyị ajụjụ ọnụ aghara aghara. Ụbọchị Onyeàmà ọ bụla na-alọtaghị ozi ọma, anyị na-ekwubi na a nwụchiela ya, anyị na-aga n’ogige ndị uwe ojii iji gbapụta ya.

N’August 1943, Adolphe Messmer, bụ́ Onyeàmà si Germany, bịara Salvador inyere anyị aka ịhazi mgbakọ mbụ anyị nwere. Mgbe a natasịrị ikike n’aka ndị ọchịchị maka inwe mgbakọ ahụ, a kpọsara isiokwu okwu ihu ọha a ga-ekwu na ya nke isiokwu ya bụ “Nnwere Onwe n’Ime Ụwa Ọhụrụ” n’akwụkwọ akụkọ ndị a na-ebipụta n’obodo ahụ, a mapagasịkwara akwụkwọ ịma ọkwa ya na windo ụlọ ahịa na n’akụkụ ụgbọ okporo ígwè. Ma n’ụbọchị nke abụọ nke mgbakọ ahụ, otu onye uwe ojii gwara anyị na a kagbuola ikike e nyere anyị inwe mgbakọ ahụ. Achịbishọp nke Salvador rụgidere onyeisi ndị uwe ojii ka ọ kwụsị mgbakọ anyị. N’April nke afọ sochirinụ, e mechara kwe ka anyị kwuo okwu ihu ọha ahụ anyị kpọsara isiokwu ya.

Otu Ihe Mgbaru Ọsọ nke M Ga-eru

Na 1946, a kpọrọ m oku ịga Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Mba Ndị Nwere Ọṅụ n’obodo São Paulo. Na Salvador, otu onyeisi ụgbọ mmiri e ji ebu ibu kwere ka anyị soro ya n’ụgbọ ya nanị ma ọ bụrụ na anyị ga-arahụ n’ala ụgbọ ahụ. Mgbe anyị nọsịrị ụbọchị anọ n’oké osimiri, anyị rutere Rio de Janeiro n’agbanyeghị oké ifufe nke kpataara anyị nile ọrịa n’ihi ịnọ n’elu mmiri ruo ogologo oge. Ndịàmà nọ na Rio nabatara anyị n’ụlọ ha ruo ụbọchị ole na ole anyị nọrọ na Rio tupu anyị ejiri ụgbọ okporo ígwè gaa n’ihu na njem anyị. Otu obere ìgwè bu ákwà e dere “Ndịàmà Jehova Nnọọnụ” bịara kelee anyị mgbe ụgbọ okporo ígwè anyị rutere São Paulo.

Obere oge ka m lọghachisịrị Salvador, agwara m Harry Black, bụ́ onye ozi ala ọzọ nke si United States, na m chọrọ ịghọ onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. Harry chetaara m na m nwere ibu ọrụ ezinụlọ m ga-elekọta ma tụọ aro ka m nwee ndidi. N’ikpeazụ, na June 1952, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị kpawara afọ ha, e zigaziri m ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ n’obere ọgbakọ dị n’Ilhéus, bụ́ obodo dị n’ụsọ oké osimiri, ọ dị ihe dị ka narị kilomita abụọ na iri site na Salvador.

Mụ Enweta Enyemaka

N’afọ sochiri ya, e kenyere m ọrụ na Jequié, bụ́ nnukwu obodo dịbara n’ime bụ́ ebe a na-enweghị Ndịàmà ọ bụla. Onye mbụ m gara na nke ya bụ ụkọchukwu ndị ebe ahụ. Ọ kọwaara m na ọ bụ ya nwe obodo ahụ ma nye m iwu ka m ghara ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Ọ dọrọ ndị parish ya aka ná ntị na “onye amụma ụgha” abịala, o debekwara ndị ga na-enyo m enyo n’obodo ahụ dum. N’agbanyeghị nke ahụ, enyefere m akwụkwọ ndị e ji amụ Bible iri itoolu ma malite ọmụmụ Bible anọ n’ụbọchị ahụ. Afọ abụọ ka nke ahụ gasịrị, e nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ndịàmà iri atọ na isii na Jequié! Taa, e nwere ọgbakọ asatọ na ihe dị ka narị Ndịàmà asaa na Jequié.

Ebiri m n’obere ụlọ m chọtara ná mpụga obodo Jequié n’ọnwa ndị mbụ m nọrọ ebe ahụ. Amataziri m Miguel Vaz de Oliveira, onye nwe Hotel Sudoeste, nke bụ́ otu n’ime họtel ndị kasị mma na Jequié. Miguel kwere ka m mụwara ya Bible, ọ rịọkwara m ka m bịa biri n’otu n’ime ọnụ ụlọ ndị dị na họtel ya. Miguel na nwunye ya mesịrị ghọọ Ndịàmà.

Ihe ọzọ mere n’oge ndị ahụ m nọrọ na Jequié nke ọ na-abụ m cheta, ya ana-eme m obi ụtọ bụ ihe banyere Luiz Cotrim, bụ́ onye na-akụzi nkụzi n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, bụ́ onye m mụụrụ Bible. Luiz kwere nkwa inyere m aka ịmụtakwu asụsụ Portuguese na ịkụziri m mgbakọ na mwepụ. Ihe m gara bụ nanị ụlọ akwụkwọ praịmarị, n’ihi ya, ekwetara m n’egbughị oge. Ihe ndị ahụ Luiz na-akụziri m ma mụ na ya mụchaa Bible kwa izu nyere aka kwadebe m maka ihe ùgwù ndị ọzọ nzukọ Jehova nyere m oge na-adịghị anya ka nke ahụ gasịrị.

Iche Ihe Ịma Aka Ndị Ọzọ Ihu

Na 1956, enwetara m akwụkwọ ozi e ji kpọọ m oku ịbịa n’alaka ụlọ ọrụ nke dị na Rio de Janeiro n’oge ahụ, ịbịa nara ọzụzụ dị ka onye nlekọta sekit, dị ka a na-akpọ ndị ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova. Ọzụzụ ahụ, bụ́ nke mmadụ asatọ ọzọ so nata were ihe karịtụrụ otu ọnwa. Mgbe anyị natasịrị ọzụzụ ahụ, e zigara m São Paulo, nke ahụ mekwara ka m nwetụ nchegbu. Ajụrụ m onwe m, sị: ‘Olee ihe onye ojii dị ka m na-aga imere ndị Ịtali bi n’ebe ahụ? Hà ga-anabata m?’b

N’ọgbakọ mbụ m letara n’ógbè Santo Amaro, ịhụ na ọ bụ Ndịàmà ibe m na ndị nwere mmasị jupụtara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ gbara m ume. Ihe mere ka m kweta na nchegbu ahụ m nọ na-echegbu onwe m enweghị isi bụ na mmadụ iri itoolu na asaa ahụ nọ n’ọgbakọ ahụ so m gaa ozi ọma ná ngwụsị izu. Agwara m onwe m, sị, ‘Ha bụkwanụ ụmụnna m.’ Ọ bụ omume enyi nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a mere ka m nwee obi ike ịnọgide n’ozi njegharị m.

Jakị, Ịnyịnya, na Anụ Na-eri Àkị́kà

Otu n’ime nsogbu ndị kachasịnụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eche ihu n’oge ndị ahụ bụ ogologo njem ndị ha na-adị na-eme iji ruo ọgbakọ na obere ìgwè Ndịàmà bi n’ime ime obodo. N’ebe ndị ahụ, ụgbọ njem ọhaneze ndị e nwere dị ize ndụ, mgbe ụfọdụkwanụ, adịghịdị ahụ ha ahụ, ihe ka ọtụtụ n’ụzọ ndị dị n’ebe ndị a bụ okpo ụzọ.

Ụfọdụ sekit doziri nsogbu ahụ site n’ịzụta ịnyịnya ibu onye nlekọta ha ga-eji na-agagharị. N’ọtụtụ Monday, ana m akwadebe ịnyịnya ibu m, kenye ibu m n’ịnyịnya ibu ma gbaa ihe dị ka awa iri na abụọ iji ruo ọgbakọ ọzọ. Ndịàmà nọ na Santa Fé do Sul nwere ịnyịnya ibu a na-akpọ Dourado (Goldie) nke maara ụzọ e si aga ebe ìgwè ndị dị n’ime ime obodo nọ. Dourado rute n’ọnụ ụzọ ubi, ya akwụrụ ma chere ka m gaa mepeere ya ụzọ. Mgbe anyị letachara ìgwè nke ọ bụla, mụ na Dourado na-agawakwa ileta ìgwè nke ọzọ.

Ihe ọzọ mere ka ọrụ sekit bụrụ ihe ịma aka bụ na e nweghị usoro nzirịta ozi a pụrụ ịdabere na ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mụ achọọ ịga leta otu obere ìgwè Ndịàmà na-ezukọ n’ugbo dị na Mato Grosso State, m na-eji ụgbọ mmiri agafe Osimiri Araguaia ma jiri ịnyịnya ibu gbaa ihe dị ka kilomita iri abụọ na ise n’oké ọhịa iji ruo ebe m na-aga. N’otu oge, edegaara m ìgwè a akwụkwọ ozi iji gwa ha na m na-abịa ileta ha, ma akwụkwọ ozi ahụ erughị ha aka, n’ihi ya, ọ dịghị onye bịara izute m mgbe gafetara mmiri ahụ. O ruwele mgbede mgbe m gafetara, ya mere, agwara m otu nwoke nwe ụlọ ebe a na-ere kọfị ka o legidere m ibu m, ebuuru m nanị otu akpa m ma jirizie ụkwụ gawa.

N’oge na-adịghị anya, chi malitere iji. Ka m nọ na-aga n’ọchịchịrị ahụ, anụ na-eri àkị́kà mere mkpọtụ. Anụtụla m na anụ ahụ pụrụ iji aka ya siri ike gbuo mmadụ. N’ihi ya, mgbe ọ bụla ihe mere ụkpọrọ n’ọhịa, m na-eji nwayọọ na-aga ma na-elegharị anya, ana m edewekwa akpa m n’ihu iji chebe onwe m. Mgbe m gara ije ruo ọtụtụ awa, abịarutere m n’otu obere iyi. N’ụzọ dị mwute, n’ihi ọchịchịrị ahụ gbachiri ebe nile, amataghị m na e jiri babụ waya gbachie ofe mmiri ahụ. Ejisiri m ike wụfee mmiri ahụ, ma danye na babụ waya, merụchaa ahụ́!

Emechara m rute n’ugbo ahụ, nkịta ndị nọ ebe ahụ malitere ịgbọ ụja. Ndị ohi atụrụ na-awakpokarị ndị bi n’ebe ahụ n’abalị, n’ihi ya, akọwara m onye m bụ ozugbo ha mepere ụzọ. Eyiri m nnọọ onye e kwesịrị imetere ebere n’ihi uwe m yi nke dọkasịcharanụ nakwa nke ọbara tetọsịrị, ma ụmụnna ahụ nwere obi ụtọ ịhụ m.

Oge ndị ahụ bụ oge obi ụtọ n’agbanyeghị ihe isi ike ndị m nwetara. Ogologo njem ndị ahụ m ji ịnyịnya na ụkwụ mee tọrọ m ụtọ, mgbe ụfọdụ, m na-ezuru ike na ndò, na-egere ube nnụnụ, ma na-ekiri nkịta ọhịa ka ha na-agafe n’ụzọ ndị ahụ na-eke owu. Ihe ọzọ wetaara m ọṅụ bụ ịmara na nleta ndị ahụ m mere nyeere ndị mmadụ aka nke ukwuu. Ọtụtụ n’ime ha na-edetara m ozi ekele. Ndị ọzọ na-ekele m ma anyị zute ná mgbakọ. Ọ na-enye m nnọọ ọṅụ ịhụ ka ndị mmadụ na-emeri nsogbu ndị na-abịara ha ma nwee ọganihu n’ozi Jehova!

Mụ Enweta Onye Inyeaka n’Ikpeazụ

N’oge ndị ahụ m nọ n’ọrụ njegharị, ọ bụ nanị m na-esokarị aga, nke ahụ kụziiri m ịdabere n’ebe Jehova nọ dị ka “nkume m dị elu, na ebe m e wusiri ike.” (Abụ Ọma 18:2) Tụkwasị na nke ahụ, aghọtara m na ịnọ n’alụghị nwunye mere ka o kwe m omume ilekwasị anya nanị n’ihe ndị metụtara Alaeze ahụ.

Otú ọ dị, na 1978, amatara m nwanna nwanyị bụ onye ọsụ ụzọ nke aha ya bụ Júlia Takahashi. Ọ hapụrụ ọrụ nọọsụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ bụ́ nke ọ na-arụ ná nnukwu ụlọ ọgwụ dị na São Paulo iji jee ozi ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị okenye maara ya kwuru nnọọ okwu ọma banyere otú o si jiri ihe ime mmụọ kpọrọ ihe nakwa otú o si na-asụ ụzọ. Mkpebi m mere ịlụ nwanyị n’agbanyeghị ọtụtụ afọ gafeworonụ tụrụ nnọọ ụfọdụ n’anya dịkwa ka ọ pụrụ ịtụ gị. O siiri otu ezigbo enyi m ike ikweta, o kwuru na ya ga-enye m anụ ehi dị narị kilogram abụọ na iri asaa ma ọ bụrụ na mụ emechaa lụọ nwanyị. Anyị ṅara anụ ehi ahụ n’ọkụ n’ebe anyị nọ mee ememe oriri agbamakwụkwọ anyị na July 1, 1978.

Ịnọgidesi Ike n’Agbanyeghị Ọrịa

Júlia sonyeere m n’ọrụ njegharị, anyị abụọ letakwara ọgbakọ ndị dị n’ebe ndịda na ebe ndịda ọwụwa anyanwụ Brazil ruo afọ asatọ ọzọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịrịa ọrịa obi. Atụbọrọ m ugboro abụọ ka m nọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’ihi ọrịa m, anyị nakweere ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Birigüi nke dị na São Paulo State.

N’oge ahụ, Ndịàmà nọ na Birigüi kwere nkwa iji ụgbọala kwọga m ka m gaa hụ dọkịta na Goiânia, nke dị ihe dị ka narị kilomita ise site na Birigüi. Ozugbo ahụ́ dịtụrụ m mma, a wara m ahụ́ ma tinye m akụkụ ahụ́ nke na-eme ka obi m na-akụ nke ọma. Nke ahụ mere ihe dị ka afọ iri abụọ gara aga. N’agbanyeghị na awaala m obi ugboro abụọ ọzọ, m ka na-arụsi ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ike. Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị nwunye ndị ọzọ bụ́ Ndị Kraịst na-akwụsị ike n’akụkụ di ha, Júlia anọgidewo bụụrụ m onye inyeaka na onye agbamume.

N’agbanyeghị na ọrịa emeela ka m gharazie ịdị na-emeli ihe ndị m na-emebu n’ozi ma na-akpatara m nkụda mmụọ mgbe ụfọdụ, m ka na-asụ ụzọ. M na-echetara onwe m na ọ dịghị mgbe Jehova kwuru na nsogbu agaghị adị na-abịara anyị n’usoro ihe ochie a. Ọ bụrụ na Pọl onyeozi na Ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie nọgidere n’ozi ahụ n’agbanyeghị ihe isi ike ndị bịara ha, nke anyị ọ̀ ga-apụ iche?—Ọrụ 14:22.

N’oge na-adịchabeghị anya, ahụrụ m Bible mbụ m zụrụ n’afọ ndị 1930. Edere m narị atọ na iri ise n’ime mkpo Bible ahụ—nke ahụ bụ ọnụ ọgụgụ nke ndị nkwusa Alaeze nọ na Brazil mgbe m malitere ịga nzukọ Ndị Kraịst na 1943. O yiri nnọọ ihe ga-esi ike nkweta na e nwere Ndịàmà karịrị nnọọ narị puku isii na Brazil ugbu a. Ọ bụụrụ m nnọọ ihe ọṅụ na m so nnọọ mee ka e nwee mmụba a! Jehova akwụghachiwo m nnọọ ụgwọ n’ụba n’ihi ịnọgidesi ike. Dị ka ọbụ abụ ahụ, apụrụ m nnọọ ikwu, sị: “Jehova emeworo anyị ihe ukwu; anyị na-aṅụrị ọṅụ.”—Abụ Ọma 126:3.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Ndịàmà Jehova bipụtara ma a dịghịzi ebipụta ya.

b Ihe fọrọ nke nta ka o ruo otu nde ndị Ịtali kwabatara na São Paulo n’agbata afọ 1870 na 1920.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ebe Ndịàmà na-akpọsa okwu ihu ọha nke mgbakọ mbụ e nwere n’obodo Salvador, 1943

[Foto dị na peeji nke 10]

Ka Ndịàmà na-abịa mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Mba Ndị Nwere Ọṅụ na São Paulo na 1946

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

Mgbe m nọ n’ọrụ njegharị ná ngwụsị afọ ndị 1950

[Foto dị na peeji nke 12]

Mụ na nwunye m, bụ́ Júlia

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya