Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/1 p. 20-25
  • E Nyere Anyị Pearl Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Nyere Anyị Pearl Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ahụmahụ Kwesịrị Ncheta
  • Ọdịbendị Ọhụrụ
  • Ịmụ Asụsụ Spanish na Ịmalite
  • Ule Ndị Mbụ na Madrid
  • Ahụmahụ Ndị Magburu Onwe Ha na Madrid
  • Ozi Mịrị Mkpụrụ n’Ebe Ndị Agha Nọ
  • Ọmụmụ Bible Pụrụ Iche
  • Ọkpụkpọ Òkù Dị Ịtụnanya
  • Mkpa Ịhapụ Ọrụ Ala Ọzọ Anyị
  • Ime Nkwusa n’Etiti Ọgwụ Ọjọọ na Ime Ihe Ike
  • Mkpebi Siri Ike
  • “Ebe Anyị Nwere Ije Ozi A . . . , Ike Agwụghị Anyị n’Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndụ Jupụtara n’Ihe Ịtụnanya n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Nile Na-echere Jehova’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịtụkwasị Anya na Obi n’Ihe Nrite Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/1 p. 20-25

E Nyere Anyị Pearl Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa

DỊ KA RICHARD GUNTHER SI KỌỌ

Ọ bụ September 1959. Anyị nọ n’ụgbọ mmiri Itali bụ́ Julio Caesar na-agafe Oké Osimiri Atlantic site New York gaa Cádiz, Spain. Watch Tower Society ekenyewo mụ na nwunye m, Rita, na Paul na Evelyn Hundertmark, di na nwunye ọzọkwa bụ́ ndị ozi ala ọzọ, ọrụ n’otu mba dị n’ebe Iberia ahụ. Anyị na-aga iche ọtụtụ ihe ịma aka ihu. Ma olee otú o si bụrụ na anyị amalitewo ọrụ ozi ala ọzọ?

EMERE mụ na Rita baptism dị ka Ndịàmà Jehova na 1950 na New Jersey, U.S.A. Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, anyị mere mkpebi nke ga-atụkwasị pearl dị nnọọ oké ọnụ ahịa n’aka anyị mgbe oge na-aga. Anyị nọ n’ọgbakọ nwere ụmụnna nwoke na nwanyị zuru ezu ije ozi n’ókèala ahụ. Ya mere anyị chere n’iwu ji anyị inyefe onwe anyị ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa. Ná mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova na New York City n’oge okpomọkụ nke 1958, anyị tinyere akwụkwọ maka ije ozi ala ọzọ.

N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, a kpọrọ anyị òkù ịga Watchtower Bible School of Gilead, mgbe ọ na-erukwala otu afọ anyị nọ na-aga Spain dị ka ndị ozi ala ọzọ. N’ịbụ ndị mikpuru onwe ha n’ọtụtụ nhazi ma bụrụ ndị obi aṅụrị rikpuru, anyị aghọtaghị n’oge ahụ ihe e nyeworo anyị. Jisọs ekwuworị okwu banyere pearl dị oké ọnụ ahịa. (Matiu 13:45, 46) Ọ bụ ezie na ọ bụghị isi ihe nke ilu ya, ihe ùgwù anyị nke ije ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ bụụrụ anyị ihe yiri pearl ahụ. Ileghachi anya azụ, anyị na-enwekwu ekele ugbu a n’ụzọ zuru ezu maka onyinye nke a dị oké ọnụ ahịa nke ije ozi ná nzukọ Jehova.

Ahụmahụ Kwesịrị Ncheta

N’oge ahụ e duziri ihe ọmụmụ ndị ozi ala ọzọ Gilead na gburugburu ime obodo mara mma n’ógbè ọdọ mmiri Finger Lakes nke New York State. N’ebe ahụ, anyị tinyere ọnwa isii magburu onwe ha n’ịbụ ndị mikpuru onwe anyị kpam kpam n’ọmụmụ Bible na ezi mmekọrịta ndị Kraịst, bụrụ ndị e dopụrụ iche site n’ihe omume na nsogbu nile nke ụwa. Ụmụ akwụkwọ ibe anyị sitere n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, tinyere Australia, Bolivia, Britain, Gris, na New Zealand. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ụbọchị ngụsị akwụkwọ wụchara. N’August 1959, anyị ji anya mmiri feere ndị mmadụ aka ka anyị so ụgbọ kwọpụ gaa n’ọrụ ozi ala ọzọ anyị dị iche iche. Otu ọnwa mgbe nke ahụ gasịrị anyị zọrọ ụkwụ n’ala Spain.

Ọdịbendị Ọhụrụ

Anyị wụrụ ụkwụ n’ala n’ọdụ ụgbọ mmiri ebe ndịda nke Algeciras, n’akụkụ Oké Nkume Gibraltar gbara nnọọ agba. N’abalị ahụ anyị anọ, mụ na Rita tinyere ezinụlọ Hundertmark, gbara ụgbọ okporo ígwè gaa Madrid. Anyị gara na Hotel Mercador, nọrọ ebe ahụ ichere ruo mgbe ndị òtù nke alaka ụlọ ọrụ nzuzo nke Society zutere anyị. Spain nọ n’okpuru ọchịchị aka ike nke Generalissimo Francisco Franco. Nke a pụtara na nanị okpukpe iwu kwadoro ná mba ahụ bụ Chọọchị Roman Katọlik. Ọ bụ ihe iwu na-akwadoghị ikpe okpukpe ọzọ n’ihu ọha, a machibidokwara ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ nke Ndịàmà Jehova iwu. A machibidokwara ọbụna nzukọ dị iche iche nke okpukpe iwu, nke mere na Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị dị ihe dị ka 1,200 n’ọnụ ọgụgụ n’ime 30 ọgbakọ na Spain n’oge ahụ, apụghị izukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị ka n’ala ndị ọzọ. Anyị aghaghị izukọ na nzuzo n’ebe obibi ndị mmadụ.

Ịmụ Asụsụ Spanish na Ịmalite

Ihe ịma aka mbụ anyị bụ ịmụ asụsụ ahụ. N’ọnwa mbụ anyị ji hour 11 kwa ụbọchị na-amụ Spanish—hour 4 kwa ụtụtụ n’ebe a na-akụzi Spanish, werezie hour 7 na-amụ ya n’onwe anyị. Ọnwa nke abụọ bụ otu ihe ahụ n’ụtụtụ, ma e ji ehihie nile na-eme nkwusa ụlọ n’ụlọ. Ị̀ pụrụ icheli ya n’echiche! Ebe anyị ka nọ n’amaghị asụsụ ahụ, jirikwa nanị okwu mmeghe e bu n’isi nke e dere na kaadị, mụ na Rita pụrụ nanị anyị n’ọrụ ụlọ n’ụlọ!

Echetara m ịkụ aka n’ọnụ ụzọ na Vallecas, bụ́ akụkụ ebe ndị ọrụ nke Madrid bi. Na-eji kaadị m n’aka, a dịghị ama ama, m sịrị n’asụsụ Spanish: “Ụtụtụ ọma. Anyị na-arụ ọrụ ndị Kraịst. Bible sịrị (anyị ga-agụ otu akụkụ akwụkwọ nsọ). Anyị ga-enwe mmasị ka i nweta akwụkwọ nta nke a.” Nwanyị ahụ lere nanị anya, werezie akwụkwọ nta ahụ. Mgbe anyị mere nletaghachi ya, ọ kpọbatara anyị n’ime ụlọ, ka anyị na-ekwukwa okwu, ọ nọ na-ele nanị anya anya. Anyị maliteere ya ọmụmụ Bible n’ụzọ kasị mma anyị pụrụ, n’oge ọmụmụ ihe ahụkwa, o gere nanị ntị ma lee nanị anya anya. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị n’ikpeazụ ọ gwara anyị na ya aghọtaghị ihe anyị kwuru ná nleta mbụ anyị kama na ya nụrụ okwu bụ́ Dios (Chineke), nke ahụ zukwaara ya ịmara na ọ bụ ihe ọma. Ka oge na-aga, o nwetara ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe ọmụma Bible wee bụrụ onye e mere baptism, na-aghọ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova.

Ịmụ asụsụ Spanish siri oké ike nye m. Mgbe m na-eme njem n’ime obodo ukwu ahụ, m na-ebubu njikọ ngwaa dị iche iche n’isi. Ihe m buuru n’isi n’otu izu mụ echezọọ n’izu na-eso ya! Ọ na-akụda mmụọ nke ukwuu. Ọtụtụ oge ọ fọrọ nke nta ka m hapụ ịmụkwa ya. Ebe ọ bụ na m na-asụjọ asụsụ Spanish n’ụzọ dị otú ahụ, ụmụnna ndị Spain aghaghị inwe nnọọ ndidi ka m na-edu ndú n’etiti ha. N’otu mgbakọ distrikti, otu nwanna nyere m ịma ọkwa e ji aka dee ka m gụọ n’elu ikpo okwu. Ebe ọ na-esiri m ike ịgụ aka akwụkwọ ya, m mara ọkwa, sị: “Wetanụ muletas (mkpara ndị ngwụrọ) unu n’ámá egwuregwu a echi.” O kwesịrị ịbụ, “Butenụ maletas (ibu) unu n’ámá egwuregwu a echi.” Otú ọ dị, ìgwè mmadụ ahụ chịrị ọchị, dịkwa ka o kwesịrị ịdị ihere mere m.

Ule Ndị Mbụ na Madrid

Afọ ole na ole ndị mbụ ahụ na Madrid bụ ndị siri oké ike n’ụzọ mmetụta uche nye mụ na Rita. Agụụ ebe obibi anyị na ndị enyi anyị hapụrụ gụrụ anyị nke ukwuu. Mgbe ọ bụla anyị natara akwụkwọ ozi site na United States, oké ọchịchọ ịla ụlọ na-erikpu anyị. Oge ndị ahụ nke agụụ ụlọ na-erikpu erikpu, ma ha gafere. E kwuwerị, anyị ahapụwo ụlọ, ezinụlọ, na ndị enyi iji nata pearl nke ka oké ọnụ ahịa karị n’ọnọdụ ha. Ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe.

Ná mmalite anyị ibi ndụ na Madrid, anyị hụrụ onwe anyị n’ụlọ ndị ọbịa na-ebi nke na-adịghị mma n’anya. Anyị nwere ọnụ ụlọ nke anyị na ugbo nri atọ kwa ụbọchị. Ọ bụ ntakịrị ọnụ ụlọ gbara ọchịchịrị, e jikwa okporo ọka mee matrasị ya. Ụgwọ ụlọ nke ọnwa ahụ richara ego mmachi akpa anyị dị nta nke a na-enye anyị kwa ọnwa. Anyị na-erikarị nri ehihie anyị ebe ahụ n’etiti ehihie, nwanyị nwe ụlọ ahụ na-etiba nri abalị anyị n’ovun iji mee ka ọ dị ọkụ otú ọ ga-abụ n’ime abalị anyị ga-enwe ihe anyị ga-eri. Otú ọ dị, n’ihi iji ụkwụ na-eme nkwusa n’okporo ámá ahụ n’oge ehihie na n’uhuruchi, agụụ na-agụsi anyị ike. Ọ bụrụ na anyị enwekwaghị ego mmachi akpa fọdụrụnụ, anyị na-eji ego nke aka anyị dị nta iji zụta switi chocolate dị ọnụ ala karịsịa nke anyị pụrụ ịhụ. Otú ọ dị, ọnọdụ a gbanwere n’oge na-adịghị anya mgbe onye nlekọta zonu nke Society letasịrị anyị. Ọ hụrụ nsogbu anyị wee kwuo na anyị pụrụ ịchọ ntakịrị ụlọ iji eme ihe dị ka ebe obibi ndị ozi ala ọzọ. Nke a ga-aka nnọọ mma karịa iguzo ọtọ na-asa ahụ n’ime bọketi a na-anọ asa ahụ n’ala ụlọ n’ime kichin. Ugbu a anyị ga-enwe shawa, friji anyị ga-etinye nri, na stoovu eletrik anyị ga-eji na-esi nri anyị. Anyị nwere nnọọ obi ekele maka nchebara echiche ahụ.

Ahụmahụ Ndị Magburu Onwe Ha na Madrid

E ji ezi akọ mee nkwusa ụlọ n’ụlọ. Ọgba aghara na-adị na Madrid kwa ụbọchị baara anyị uru, na-eme ka anyị ghara ịpụtacha ìhè. Anyị gbalịrị iji ejiji na ime omume dị ka ndị ọzọ ka anyị ghara ịpụtacha ìhè dị ka ndị mba ọzọ. Ụzọ anyị na-esi eme nkwusa ụlọ n’ụlọ bụ ịbanye n’ebe obibi nwere ụlọ dị iche iche, kụọ aka n’ọnụ ụzọ, gwa onye nọ ebe ahụ okwu, hapụzie ebe obibi ahụ, okporo ámá ahụ, na ógbè ahụ. Ọ pụkwara ikwe omume mgbe nile na onye nwe ụlọ ga-akpọtụrụ ndị uwe ojii, ya mere ọ bụghị ihe amamihe ịnọrọ n’akụkụ ebe ahụ. N’ezie, ọbụna na ha dị ezigbo akọ n’iji usoro a eme ihe, e jidere Paul na Evelyn Hundertmark ma chụpụ ha ná mba ahụ na 1960. Ha gara Portugal ya na mba ahụ gbara agbata obi, na-eje ozi ebe ahụ ruo ọtụtụ afọ, ebe Paul na-elekọta alaka ụlọ ọrụ ahụ na-arụ ọrụ na nzuzo. Taa ọ bụ onye nlekọta obodo ukwu na San Diego, California.

Otú ọ dị, nye anyị ihe ịha nhata weere ọnọdụ. Nanị ọnwa ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, e nyere ndị ozi ala ọzọ isii e kenyere ọrụ na Portugal iwu ka ha si ná mba ahụ pụọ! Nke a wetara ihe omume obi ụtọ n’ihi na a gwaziri Eric na Hazel Beveridge, bụ́ ndị nọkwa na klas anyị nke Gilead, ka ha hapụ Portugal wee bịa Spain. Ya mere na February 1962, anyị nọ na Hotel Mercador otu ugbo ọzọkwa—n’oge a iji nabata Eric na Hazel ka ha rutere.

Ọ bụ n’ụbọchị mbụ ndị a na Madrid ka mụ na Rita nwere ahụmahụ onwe onye nke ihu abụọ okpukpe. Anyị duziiri otu di na nwunye, Bernardo na Maria ọmụmụ Bible, bụ́ ndị bi ná nkịkara ụlọ nke e ji mkpirisi ihe ọ bụla e ji ewu ụlọ bụ́ ndị a tụfuru atụfu nke Bernardo pụrụ ịchọta wuo. Anyị duziiri ha ọmụmụ ihe n’ime abalị, mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịkwara, ha na-enye anyị bredi, mmanya, na ụfọdụ cheese ma ọ bụ ihe ọ bụla ha nwere. M chọpụtara na cheese ahụ yiri nnọọ cheese ndị America. Otu abalị mgbe ọmụmụ ihe ahụ gasịrị, ha wepụtara kom kom cheese ahụ si na ya pụta. E dere n’elu ya ná mkpụrụ okwu buru ibu, na Bekee, “Site ná ndị America gaa ná ndị Spain—a gaghị ere ya ere.” Olee otú ezinụlọ a dara ogbenye si nata cheese ahụ? Gọọmenti ji Chọọchị Katọlik mee ihe n’ikesara ya ndị ogbenye. Ma onye ụkọchukwu ahụ nọ na-ere ya ere!

Ozi Mịrị Mkpụrụ n’Ebe Ndị Agha Nọ

N’oge na-adịghị anya ihe magburu onwe ya mere nke ga-aghọ ngọzi bara ụba nye anyị na ọtụtụ ndị ọzọ. Anyị natara ozi site n’alaka ụlọ ọrụ na-agwa anyị ka anyị ga leta otu nwa okorobịa aha ya bụ Walter Kiedaisch, bụ́ onye nọ n’ogige Ndị Agha Ụgbọ Elu nke United States na Torrejón, nke dị maịlụ ole na ole ná mpụga nke Madrid. Anyị letara ya na nwunye ya, na-amalitere ha na di na nwunye ọzọ nọ n’òtù Ndị Agha Ụgbọ Elu n’ebe ahụ ọmụmụ Bible.

Otú ọ dị, n’oge ahụ, m na-eduziri ndị òtù nke Ndị Agha Ụgbọ Elu United States ihe dị ka ọmụmụ Bible ise, ha nile na Bekee. N’ime ndị ahụ, e mesịrị mee asaa baptism, mgbe ha laghachikwara United States, anọ n’ime ndị ikom ahụ ghọrọ ndị okenye ọgbakọ.

Nke a bụ oge mgbe e nwere ụzọ ole na ole dị nnọọ nta e ji ewebata akwụkwọ, magazin, na Bible n’ime mba ahụ n’ihi mmachibido iwu a machibidoro ọrụ anyị. Otú ọ dị, ndị bịara njem mkpagharị na ndị America na-ebugharịrị anyị ozi webatara ụfọdụ akwụkwọ. Alaka ahụ kenyere m ọrụ ilekọta ebe nkwasa akwụkwọ nzuzo. Ọ bụ ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe n’azụ ụlọ ahịa a na-ere ngwá ọfịs na Vallecas. Nwunye onye nwe ya bụ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na ọ bụghị Onyeàmà, onye nwe ya kwanyeere ọrụ anyị ùgwù, ọbụnakwa n’oké ihe ize ndụ nye onwe ya na azụmahịa ya, o nyere m ohere iji akụkụ a dị n’azụ ụlọ mee ihe iji kwadebe ngwugwu nke akwụkwọ a ga-eziga n’obodo ukwu dị iche iche gburugburu mba ahụ. Ebe ọ bụ na ọnụ ụlọ a aghaghị ịdị ka ihe o kwesịrị ịdị ka ya mgbe nile—ọnụ ụlọ kporo ntụ, ghasasịrị aghasa nke jupụtara na katọn—m ghaghị ịrụ bench ọrụ na ihe ndebe akwụkwọ nke a pụrụ ịkụkọta wee kwadebe ya maka ọrụ ngwa ngwa ma mgbe ahụ zochie ya ná mkpirikpi oge otú ahụ. Mgbe ọrụ ụbọchị ahụ gasịrị, m ga-echere ruo mgbe mmadụ na-agaghị anọ n’ụlọ ahịa ahụ, mgbe ahụkwa buru ngwugwu m pụọ ngwa ngwa.

Ọ bụ ezi ihe ùgwù ikere òkè n’ikesa ihe ime mmụọ, dị ka magazin Ụlọ Nche na Teta! na akwụkwọ ndị ọzọ, n’ọgbakọ nile dị gburugburu mba ahụ. Ndị ahụ bụ oge na-akpali mmasị.

Rita nwere ọṅụ nke iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi 16, nke ihe dị ka ọkara n’ime ha ghọrọ Ndịàmà Jehova e mere baptism. Dolores bụ nwa agbọghọ a na-alụ alụ, bụ́ onye dinaworo n’àkwà n’oge oyi nile n’ihi ọrịa obi. N’oge opupu ihe ubi ọ pụrụ ibili ọtọ ma na-arụtụ ọrụ. Okwukwe Dolores siri ike, ya mere mgbe oge bịara maka mgbakọ distrikti anyị na Toulouse, France, ọ chọsiri ike ịga. Onye dọkịta dọrọ ya aka ná ntị na ọ gaghị abụ ihe amamihe ime otú ahụ n’ihi ọnọdụ obi ya. Ka o yinyere uwe o ji anọ n’ụlọ na slịpas ya n’ebughịkwa ngwongwo ọ bụla, ọ gara n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ịga idupụ di ya, nne ya, na ndị ọzọ. Ka anya mmiri jupụtara ya n’anya, ọ pụghị idili ịhụ ka ha gawara hapụ ya, ya mere ọ banyere n’ụgbọ okporo ígwè ahụ, ma mee njem ahụ gaa France! Rita amaghị na nke a emewo. Ma n’ebe ahụ ná mgbakọ ahụ, lee ihe ijuanya ọ bụ mgbe ọ hụrụ Dolores, ka ọ na-achị nnọọ ọchị!

Ọmụmụ Bible Pụrụ Iche

Anyị apụghị imechi akụkọ a nke ọrụ anyị na Madrid n’agụnyeghị Don Benigno Franco, “el profesor.” Otu Onyeàmà ala ahụ kpọọrọ m gaa ileta otu agadi nwoke ya na nwunye ya bi n’ụlọ na-adịghị mma. M maliteere ya ọmụmụ Bible. Mgbe ọ mụsịrị ihe ruo ihe dị ka otu afọ na ọkara, ọ rịọrọ ka e mee ya baptism ka ọ ghọọkwa otu onye n’ime Ndịàmà Jehova.

Agadi nwoke nke a, Don Benigno Franco, bụ onye ikwu nke Francisco Franco, bụ́ onye ọchịchị aka ike nke Spain n’oge ahụ. O yiri ka Don Benigno bụ onye na-enwe mmasị mgbe nile ná nnwere onwe. N’oge Agha Obodo nke Spain, ọ dụnyeere ndị Republic úkwù ma na-emegide onye ikwu ya—ọchịagha ahụ meriri n’agha ahụ ma guzobe ọchịchị aka ike Katọlik. Kemgbe 1939, a napụwo Don Benigno ikike nke ịrụ ọrụ, e mekwara ka ego o ji ebi ndụ dị ntakịrị. Otú a ka o si bụrụ na onye ikwu Generalissimo Francisco Franco, onye ọchịchị aka ike nke Spain, ghọrọ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova.

Ọkpụkpọ Òkù Dị Ịtụnanya

Na 1965 alaka ụlọ ọrụ nke Spain kpọrọ anyị òkù ịmalite ijegharị n’ọrụ sekit na Barcelona. Nke a pụtara ịhapụ ụmụnna nile na-ahụ n’anya, bụ́ ndị anyị nọworo ezi nso na Madrid. Ugbu a ka ọ ga-amalite ọ bụghị nanị ahụmahụ ọhụrụ kamakwa, nye m, ule. Ahụmahụ ahụ na-atụ egwu n’ihi na m na-arụ ikike m ụka mgbe nile. Amaara m nke ọma na ọ bụ Jehova nyere m ume ịdị irè n’akụkụ nke a nke ije ozi.

Ileta otu ọgbakọ kwa izu pụtara ibi n’ebe obibi nke ụmụnna. Anyị na-ebi ndụ nkwagharị ibu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụkwa izu abụọ ọ bụla, anyị na-akwaga n’ebe obibi ọzọ. Nke a siri ike karịsịa nye nwanyị. Ma n’oge na-adịghị anya José na Roser Escudé, bụ́ ndị biri na Barcelona, kpọrọ anyị òkù ịbịa binyere ha ruo ọtụtụ ụbọchị n’esepụghị aka. Nke a bụ ihe ịhụnanya n’akụkụ ha, n’ihi na ọ pụtara na anyị ga-enwe ebe na-adịgide adịgide anyị ga-adọsa ngwongwo anyị, bụrụkwa ebe anyị ga na-alọbata na ya n’uhuruchi Sunday.

Mụ na Rita tinyere afọ anọ na-esonụ n’ọrụ sekit n’ógbè Catalonia, nke dị n’Ụsọ Osimiri Mediterranean. A na-enwe nzukọ Bible anyị nile na nzuzo n’ebe obibi ndị mmadụ, a na-ejikwa akọ eme nkwusa ụlọ n’ụlọ anyị ka anyị ghara ịdọta uche ndị mmadụ. Mgbe ụfọdụ anyị na-eme ka ọgbakọ nile zukọọ ọnụ na Sunday maka “mkpapụ ntụrụndụ” n’ime ọhịa, karịsịa mgbe a na-enwe mgbakọ sekit.

Anyị ga-anọgide na-enwe mmasị n’ebe ọtụtụ ụmụnna ime mmụọ ji ihe kpọrọ ihe nọ, bụ́ ndị tinyere ọrụ na nnwere onwe ha n’ihe ize ndụ, na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji mee ka ọgbakọ ndị ahụ dịrị n’otu ma na-arụ arụ. Ọtụtụ n’ime ha butere ụzọ n’ịgbasa ọrụ ahụ baa n’ime obodo nta ndị dịcha ná mpụga obodo ukwu ahụ. Nke a tọrọ ntọala maka oké mmụba ahụ e nwere na Spain mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ ma nye nnwere onwe okpukpe na 1970.

Mkpa Ịhapụ Ọrụ Ala Ọzọ Anyị

N’afọ iri anyị nọrọ na Spain, ọnọdụ nne na nna anyị ebelatawo obi ụtọ anyị na-enwe ná ngọzi nke a pụrụ iche n’ijere Jehova ozi n’ihe ize ndụ. N’ọtụtụ oge, ọ fọrọ nke nta ka anyị hapụ ọrụ anyị ma laa ụlọ ije lekọta nne na nna m. Otú ọ dị, n’ihi ụmụnna nwoke na nwanyị na-ahụ n’anya nọ n’ọgbakọ ndị dị nne na nna m nso, anyị nwere ike ịnọgide na Spain. Ee, ihe ùgwù nke ije ozi n’afọ ndị ahụ n’ọrụ ije ozi ala ọzọ bụ nke kwere omume n’otu akụkụ n’ihi ndị ọzọ sooro anyị kere òkè n’itinye ọdịmma Alaeze Chineke n’ihe mbụ.

N’ikpeazụ, na December 1968, anyị lara ụlọ ije lekọta nne m. N’ọnwa ahụ kpọmkwem nna m nwụrụ, nne m anọrọkwa nanị ya. Ma ebe anyị ka nwetụkwara ohere ije ozi oge nile, anyị natara ọrụ ije ozi n’ọrụ sekit, kama n’oge a na United States. Ruo 20 afọ na-esonụ, anyị letara sekit ndị na-asụ asụsụ Spanish. Ọ bụ ezie na pearl anyị dị oké ọnụ ahịa nke ije ozi ala ọzọ efunahụwo anyị, a tụkwasịrị ọzọ n’aka anyị.

Ime Nkwusa n’Etiti Ọgwụ Ọjọọ na Ime Ihe Ike

Ugbu a anyị na ụmụnna nwoke na nwanyị ndị bi n’akụkụ obodo dị iche iche ebe mpụ na-arị ibe ya elu na-ejekọ ozi. Leenụ, kpọmkwem n’ime izu mbụ n’ọrụ sekit na Brooklyn, New York, a pụnaara Rita akpa ya.

N’otu oge mụ na Rita so otu ìgwè na-arụ ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ n’akụkụ ọzọ nke New York City. Ichigharị ihu n’otu akụkụ, anyị hụrụ ụfọdụ ndị kwụrụ n’ahịrị n’ihu oghere dị ná mgbidi nke ụlọ a na-enweghị onye bi ya. Ka anyị jere nzọụkwụ ole na ole gbagotekwuo n’okporo ámá ahụ, anyị hụrụ otu nwa okorobịa guzo n’akụkụ ụzọ na-ele anyị anya. E nwere onye ọzọ nọ n’akụkụ ebe dị anya na-elegharị anya maka ụgbọ ala ndị uwe ojii. Anyị adabawo n’etiti ebe a na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ! Onye mbụ na-eche nche kụjara, ma mgbe ahụ ọ hụrụ magazin Ụlọ Nche wee zee ume. E kwuwerị, m pụrụ ịbụworị onye ọrụ uwe ojii! Mgbe ahụ ọ kpọrọ na Spanish, “¡Los Atalayas! ¡Los Atalayas!” (Ụlọ Nche! Ụlọ Nche!) Ha maara ndị anyị bụ, na-eji magazin ahụ amata anyị, nsogbu adịghịkwa. Ka m garuru ya nso, m sịrị, “¿Buenos dias, como está?” (Ụtụtụ ọma, olee otú i mere?) Ọ zaghachiri site n’ịrịọ m ka m kpeere ya ekpere!

Mkpebi Siri Ike

Na 1990 o doro anya na m ga-anọnyerịrị nne m kwa ụbọchị. Anyị agbalịsiela ike ịnọgide n’ọrụ njegharị, ma amamihe gosiri na ọ gaghị ekwe omume imezu ibu ọrụ abụọ ahụ. Anyị chọrọ nnọọ ijide n’aka na e lekọtara nne m n’ụzọ ịhụnanya. Ma otu ugbo ọzọ anyị ga-ahapụ pearl nke dị oké ọnụ ahịa, ihe dị ezi mma nye anyị. Nkume nkịtị nile dị oké ọnụ ahịa n’ime ụwa na ihe nile ha pụrụ imere mmadụ dị nnọọ ntakịrị ma e jiri ha tụnyere nkume dị oké ọnụ ahịa nke ije ozi dị ka onye ozi ala ọzọ ma ọ bụ onye nlekọta sekit ná nzukọ Jehova.

Mụ na Rita nọ ugbu a n’ime afọ ndụ anyị ndị nke 60. Anyị nwere nnọọ afọ ojuju ma na-anụ ụtọ nke isoro ọgbakọ dị n’ebe anyị bị nke na-asụ asụsụ Spanish na-eje ozi. Ka anyị na-eleghachi anya azụ n’afọ nile n’ije ozi Jehova, anyị na-ekele ya maka inye anyị ụfọdụ pearl ndị dị oké ọnụ ahịa.

[Foto dị na peeji nke 23]

Mụ na Rita na Paul na Evelyn Hundertmark (n’aka nri) n’èzí ogige ebe a na-alụso oké ehi ọgụ na Madrid

[Foto dị na peeji nke 24]

Ileta otu ọgbakọ n’otu “mkpapụ ntụrụndụ” n’ime ọhịa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya