Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 10/1 p. 23-28
  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Nile Na-echere Jehova’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Nile Na-echere Jehova’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Kụọ Mkpụrụ nke Ije Ozi Ala Ọzọ
  • Nsogbu Dị Iche Iche na Spain
  • Ime Nkwusa n’Okpuru Onye Ọchịchị O Kwusịa O Bie bụ́ Onye Katọlik
  • Mkpagbu na Nchụpụ
  • Ọrụ Ọzọ, Asụsụ Ọzọ
  • Oge Nsogbu Amalite
  • Ime Nkwusa ná Mba Ndị Alakụba Bụ Morocco
  • Ọ̀ Bụ Ọrụ Ga-adịru Nwa Oge?
  • Ule na Ngọzi Dị Iche Iche
  • Mmụba n’El Salvador
  • Ndụ Jupụtara n’Ihe Ịtụnanya n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Site n’Ogbenye Ọnụ Ntụ Gaa n’Inwe Akụ̀ na Ụba Kasịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Anyị Hụrụ Ọtụtụ Ụzọ Jehova Si Meere Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • E Nyere Anyị Pearl Dị Nnọọ Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 10/1 p. 23-28

‘Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Nile Na-echere Jehova’

DỊ KA DOMENICK PICCONE SI KỌỌ YA

Ndị mụrụ m si Itali kwalaga United States ná mmalite afọ ndị 1920 wee mesịa biri na South Philadelphia, nke a maara mgbe ahụ dị ka Itali Nta. Ka ọ na-erule 1927 ha na-esonyere Ndị Mmụta Bible, bụ́ ndị e mesịrị mara dị ka Ndịàmà Jehova.

A MỤRỤ m na 1929, wee si otú ahụ  kpughepụ m nye eziokwu Bible site   na nwata. M pụrụ icheta na Ndịàmà ga-ezukọ n’ụlọ anyị tupu ha apụọ ịga mee nkwusa n’obodo ndị Roman Katọlik jisiri aka ike n’ógbè Pennsylvania ahụ ebe a na-egwupụta kol, bụ́ ebe e jidere ụmụnna ahụ ọtụtụ ugbo. E mere m baptism na 1941 ná mgbakọ Ndịàmà Jehova mere na St. Louis, Missouri. Mgbe ahụ ihe malitere ịgahie.

Amalitere m iso ndị ntorobịa na-adịghị mma na-akpakọ n’ógbè ebe anyị bi wee malite ise siga na ịgba chaa chaa n’akụkụ ụzọ dị iche iche. Ọ bụ ihe dị mma na ndị mụrụ m hụrụ na ha adịghịkwa enwe ike ịchịkwa m wee kpebie ịkwaga n’akụkụ ọzọ nke obodo ahụ. Ọ masịghị m, ebe ọ bụ na ndị enyi m nile n’okporo ụzọ fụnarịrị m. Otú ọ dị, taa m na-eleghachi anya azụ ma nwee ekele dị ukwuu maka nna m. O mefuru ego dị nnọọ ukwuu iji dọpụta m na gburugburu ebe ahụ. Ọ bụ ezie na ná mmalite ọ pụrụ iji ụkwụ gaa ọrụ, ugbu a ọ ghaghị iji ụgbọ okporo ígwè na-aga n’okpuru ala gaa njem dị ogologo. Ma nkwagharị nke a mere ka m laghachi n’ihe omume nke usoro ọchịchị Chineke.

A Kụọ Mkpụrụ nke Ije Ozi Ala Ọzọ

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’afọ ọ bụla, anyị na-aga South Lansing, New York, maka ememe ngụsị akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. Ịhụ ndị ozi ala ọzọ ahụ nile ka e zipụrụ ha gburugburu ụwa mere ka m nwee ọchịchọ ije ozi ala ọzọ n’ime obi m. Ya mere, mgbe m gasịrị ụlọ akwụkwọ dị elu, amalitere m ọrụ dị ka onye na-eje ozi ọsụ ụzọ oge nile, na-amalite na May 1947.

Onye ọsụ ụzọ ọzọ bụ onye na-eto eto n’ime ọgbakọ anyị bụ Elsa Schwarz, ọ na-anụkwa ọkụ n’obi nke ukwuu n’ọrụ nkwusa. Ndị mụrụ ya agbawo ya ume mgbe nile ịghọ onye ozi ala ọzọ, ya mere ọ ghaghị ịbụ na ị ga-akọtali ihe si na ya pụta. Anyị lụrụ di na nwunye na 1951. Ka anyị na-ejekọ ozi ọnụ dị ka ndị ọsụ ụzọ na Pennsylvania, anyị tinyere akwụkwọ ịga ụlọ akwụkwọ ndị ozi ala ọzọ bụ Gilead. Na 1953 a kpọrọ anyị òkù ịbịa klasị nke 23 nke Gilead. Mgbe ọnwa isii nke oké agụmakwụkwọ na nkwadebe gasịrị na Gilead, anyị gụsịrị akwụkwọ n’otu mgbakọ e mere na Toronto, Canada, anyị wee natakwa ọrụ anyị—bụ́ Spain!

Nsogbu Dị Iche Iche na Spain

Ka anyị na-akwadebe ịhapụ maka ọrụ ozi ala ọzọ e kenyere anyị na 1955, ajụjụ jupụtara mụ na Elsa n’uche. Spain! Gịnị ka ọ ga-adị ka ya? Mba ahụ nọ n’okpuru ọchịchị onye Katọlik bụ o kwusịa o bie nke bụ Generalissimo Francisco Franco, ọrụ Ndịàmà Jehova bụkwa nke a machibidoro iwu. Olee otú anyị ga-esi mee ihe n’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ?

Ụmụnna nọ n’isi ụlọ ọrụ Society dị na Brooklyn agwawo anyị na e jidere Frederick Franz, bụ́ osote onye isi oche Watch Tower Society mgbe ahụ, na Alvaro Berecochea, onye ozi ala ọzọ si Argentina, tinyere ọtụtụ ụmụnna ndị ọzọ. E mewo nhazi inwe otu mgbakọ nta ná nzuzo n’ime ọhịa osisi dị Barcelona nso. Otú ọ dị, ndị uwe ojii matara banyere mgbakọ nzuzo nke a, ha jidekwara ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị bịaranụ.a

A gwawo anyị na ma eleghị anya ọ dịghị onye ga-abịa izute anyị mgbe anyị rutere na Barcelona. Ntụziaka ndị e nyere anyị bụ: “Chọta ụlọ oriri na ọṅụṅụ ebe unu ga-anọ, mgbe ahụ mee ka Society na New York mara adres ya.” Anyị bu n’uche okwu ndị dị n’Aịsaịa ndị bụ: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ndị nile ndị na-echere [Jehova] bụ. Ntị gị abụọ ga-anụkwa okwu n’azụ gị, sị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsaịa 30:18, 21) Anyị aghaghị ịnọ nnọọ na-echere Jehova ma na-agbaso nduzi nke nzukọ ya.

Anyị gwara ndị mụrụ anyị na ndị enyi anyị ka o mesịa, bụ́ ndị bịara New York ịgwa anyị nọdụ nke ọma, mgbe na-adịghị anya ụgbọ mmiri anyị, bụ́ Saturnia nupụrụ na-agbada Osimiri Hudson iji banye n’Atlantic. Nke ahụ bụ nke ikpeazụ m hụrụ nna m. Afọ abụọ nke a gasịrị, mgbe m nọ n’ofesi, ọ nwụrụ site n’ọrịa nke dịtere anya.

E mesịa anyị rutere ebe e kenyere anyị ọrụ, bụ́ obodo Barcelona nke nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Ọ bụ ụbọchị mmiri ozuzo nke na-adịghị akpali mmasị, ma mgbe anyị na-agabiga ndị na-enyocha ihe a na-ebubata ná mba, anyị hụrụ ihu “ìhè anyanwụ” ndị na-amụkepụ amụkepụ. Alvaro Berecochea, tinyere ụmụnna ụfọdụ bụ ndị Spain, nọ ebe ahụ izute anyị. Obi dị anyị ụtọ n’ihi ịmata na a tọhapụwo ụmụnna anyị.

Ugbu a, ọ dịrị mkpa ka anyị mụọ asụsụ Spanish. N’oge ahụ, ndị ozi ala ọzọ na-amụ asụsụ n’ụzọ siri ike— n’enweghị akwụkwọ ọgụgụ ma ọ bụ ndị nkụzi. E nweghị usoro ịkụzi asụsụ na mgbe ahụ. Anyị aghaghị inwetazu hour ole a chọrọ n’ọrụ nkwusa ahụ, na-amụkwa asụsụ ahụ n’otu oge ahụ—mgbe anyị nọ n’ọrụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya.

Ime Nkwusa n’Okpuru Onye Ọchịchị O Kwusịa O Bie bụ́ Onye Katọlik

Mgbe ahụ nzukọ Jehova ka na-amalite ọhụrụ na Spain. Na 1955 e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ 366 ndị nkwusa ná mba nke nwere ihe dị ka 28 nde mmadụ. E nwere nanị ọgbakọ iri ná mba ahụ dum. Ọ̀ ga-adị otú ahụ ruo ogologo oge? Ozugbo mụ na nwunye m malitere ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị chọpụtara na Spain dị ka paradaịs nye ndị na-ekwusa ozi ọma. Ee, ndị ahụ nwere agụụ maka eziokwu.

Ma olee otú e si arụ ọrụ nkwusa ahụ, ebe ọ bụ na a na-arụ ya n’okpuru mmachibido iwu? Dị ka ọ na-adịkarị, anyị adịghị aga n’ụlọ nile dị n’otu okporo ụzọ, ma ọ bụ n’ọnụ ụlọ nile n’otu ụlọ. Barcelona jupụtara n’ọtụtụ ụlọ ndị dị okpukpu ise na okpukpu isii, a gwakwara anyị ka anyị na-amalite site n’okpukpu nke kasị elu ma rụrụ ọrụ na-agbadata. Ma eleghị anya anyị pụrụ ịkpọtụrụ otu ọnụ ụlọ n’okpukpu nke ọ bụla ma ọ bụ ọbụna hapụ okpukpu ụfọdụ. Ụzọ nke a mere ka o siere ndị uwe ojii ike ijide anyị ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ iwe ji ekpee anyị.

A na-enwe nzukọ nile nke ọgbakọ n’ebe obibi nke ndị mmadụ, site n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ atọ ruo anọ na-emejupụta otu ọgbakọ. Nke a na-eme ka o kwe onye na-ejere ọgbakọ ozi omume ileta nke ọ bụla n’ime ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ndị a otu ugbo n’otu ọnwa. Ọ bụ ọrụ dịịrị onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ iduzi nzukọ nile, bụ́ ndị a na-enwe n’abalị abụọ dị iche iche n’ime izu maka ìgwè nta ndị mmadụ 10 ruo 20 na-emejupụta.

Anyị aghaghị ịmụta ụzọ ndụ ọhụrụ. N’oge ahụ e nweghị ndokwa ebe obibi ndị ozi ala ọzọ na Spain. N’ebe ọ bụla o kwere omume, anyị na-ebinyere ụmụnna n’ebe obibi ha. Ịmụta iji ekwu unyi esi nri bụ oké ahụmahụ nye Elsa! E mesịa o kwere anyị omume ịzụta otu ekwu nta na-eji kerosin arụ ọrụ, bụ́ nke bụ oké ọganihu.

Mkpagbu na Nchụpụ

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị anyị nụrụ na usoro mkpagbu amalitewo n’Andalusia, bụ́ ebe e jideworo otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ ihe mwute na o ji otu akwụkwọ nta nke nwere aha na adres nke ụmụnna nọ n’akụkụ nile nke mba ahụ. Anyị nọgidere na-anata ozi na a na-ejide ụmụnna anyị n’obodo dị iche iche. Mwakpo ndị ahụ nọgidere na-erute nso karị na Barcelona. N’ikpeazụ, mkpagbu rutere Barcelona.

N’ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, ndị uwe ojii akpọrọwo m gaa n’isi ụlọ ọrụ ha iji gbaa m ajụjụ. Mgbe ọtụtụ hour gasịrị a tọhapụrụ m, m cheekwa na okwu agwụla. E mesịa ụlọ ọrụ American Embassy kpọtụụrụ m wee tụọ aro ka m jiri aka m hapụ mba ahụ iji zeere mmechuihu nke ịbụ onye a gbaara ụgbọ nwa mkpị. Ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị, ndị uwe ojii gwara m na m nwere ụbọchị iri iji hapụ. Ebe anyị na-enweghị oge iji degara Watch Tower Society akwụkwọ, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Ọnọdụ ndị dịnụ yiri ka ọ na-egosi na anyị kwesịrị ịhapụ gaa n’ubi ozi ala ọzọ nke kasị nso ná mpụga Spain—Portugal, n’akụkụ ọdịda anyanwụ.

Ọrụ Ọzọ, Asụsụ Ọzọ

Ozugbo anyị rutere Lisbon, Portugal, na July 1957, e kenyere anyị ọrụ dị ka ndị ozi ala ọzọ na Porto, obodo dị nnọọ n’ebe ugwu Lisbon. E lere ya anya dị ka isi obodo nke abụọ nke mba ahụ, ọ dịkwa n’ógbè a ma ama n’ihi mmanya ụtọ ya. Otu ọgbakọ nke na-enwe ọganihu na-enwe nzukọ ya nile n’okpukpu ala ụlọ nke otu ụlọ dị n’ógbè azụmahịa. A machibidoro ọrụ nkwusa ahụ iwu na Portugal kwa, ebe mba ahụ nọ n’okpuru ọchịchị o kwusịa o bie nke Salazar. Ma, ọnọdụ ndị e nwere dị nnọọ iche site ná ndị e nwere na Spain. A na-enwe nzukọ nile n’ebe obibi nke ụmụnna, ìgwè mmadụ site 40 ruo 60 na-abịakwa. E nweghị ihe ngosi ọ bụla nke na ebe obibi ndị ahụ bụ ebe nzukọ nke Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na adịghị m asụ asụsụ Portuguese ma ọlị, a họpụtara m dị ka onye na-ejere ọgbakọ ozi. Ọzọkwa, anyị mụrụ asụsụ ọhụrụ n’ụzọ siri ike.

Mgbe ihe dị ka otu afọ gasịrị, e kenyere anyị ọrụ na Lisbon. N’ebe a, na nke mbụ ya, anyị nwere ebe obibi nke anyị, bụ́ ụlọ nke chere obodo Lisbon ihu. E kenyere anyị ọrụ ilekọta otu sekit—bụ́ mba Republic of Portugal dum. Mgbe anyị rutere Portugal, e nwere nanị 305 ndị nkwusa na ọgbakọ ise.

Oge Nsogbu Amalite

Na map ụfọdụ ndị na-egosi Portugal na obodo ndị ọ na-achị, e nwere okwu ahụ bụ: “Anyanwụ adịghị ada ada n’ókèala Portugal.” Otú a ka ọ dị, ebe ọ bụ na Portugal nwere obodo ndị ọ na-achị n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, abụọ n’ime ndị kasị ukwuu wee bụrụ Mozambique na Angola n’Africa. Na 1961 o yiri ka e nwere nsogbu ndị na-amalite n’obodo ndị a ọ na-achị, Portugal hụkwara mkpa ọ dị iwelite ọnụ ọgụgụ nke ndị agha ya.

Ugbu a, gịnị ka ụmụnna ndị na-eto eto ga-eme mgbe e denyere aha ha maka ije ozi agha? O kwere ụfọdụ omume ịnata ikike ka a ghara idenye aha ha n’ihi ahụ esighị ike, ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ weere nguzo siri ike maka nnọpụiche ndị Kraịst. N’oge na-adịghị anya usoro mkpagbu siri ike malitere. Alaka ụlọ ọrụ natara akụkọ na a na-ejide ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ma tie ha ihe nke ukwuu n’aka ndị uwe ojii na-arụ ọrụ ná nzuzo, bụ́ P.I.D.E. (Polícia Internacional e Defesa do Estado) ahụ na-arụ arụrụala. A kpọrọ ụfọdụ n’ime anyị bụ ndị ozi ala ọzọ òkù n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii iji gbaa anyị ajụjụ. E mesịa, e nyere di na nwunye atọ 30 ụbọchị iji hapụ mba ahụ. Anyị nile tinyere akwụkwọ ka a tụlegharịa okwu ahụ.

N’otu n’otu a kpọrọ di na nwunye ndị ahụ bụ ndị ozi ala ọzọ n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ka onye nduzi nke P.I.D.E. gbaa ha ajụjụ. Nke mbụ, onye na-ejere alaka ụlọ ọrụ ahụ ozi, bụ́ Eric Britten na nwunye ya bụ Christina ka a gbara ajụjụ. E mesịa a gbara Eric Beveridge na nwunye ya bụ Hazel na n’ikpeazụ mụ na Elsa ajụjụ ọnụ. Onye isi ndị uwe ojii ahụ boro anyị ebubo ụgha nke ịbụ ndị ndị Kọmunist ji eme ihe iji megide mba ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ site n’ozizi anyị nke nnọpụiche. Akwụkwọ ndị anyị tinyere maka mkpegharị ikpe abaghị uru.

Lee ka o si bụrụ ihe mwute ịhapụ 1,200 ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bụ́ ndị nọ n’oge ihe isi ike n’ihi ọchịchị aka ike nke onye ọchịchị o kwusịa o bie obi tara mmiri! Ebe Beveridge na nwunye ya gara Spain, Britten na nwunye ya laghachikwa England, gịnị ga-abụ ọrụ ọzọ a ga-ekenye anyị? Mba ndị Alakụba bụ Morocco!

Ime Nkwusa ná Mba Ndị Alakụba Bụ Morocco

Ọzọkwa, anyị nọ na-echere Jehova. Ọrụ ọhụrụ e kenyere anyị, omenala ndị ọhụrụ, na asụsụ ndị ọhụrụ! Arabic, French, na Spanish bụ asụsụ ndị gọọmenti ji eme ihe n’Alaeze Morroco, ebe e nwere 234 Ndịàmà n’ọgbakọ asatọ. Okpukpe iwu kwadoro nke mba ahụ bụ Alakụba, imekwa ndị na-eso ụzọ site ná ndị Alakụba megidere iwu. Ya mere a pụrụ ime nkwusa n’ụzọ bụ isi nanị n’etiti ndị Europe na-abụghị ndị Alakụba.

Ozugbo ndị ozi ala ọzọ malitere ịbata n’afọ ndị ikpeazụ nke 1950, e nwere mmụba. Ma gọọmenti Morocco malitere ịrụgide ndị Europe, e nwekwara ọpụpụ dị ukwuu nke ndị ofesi, gụnyere ọtụtụ ụmụnna.

Ka ọnụ ọgụgụ ndị na-abụghị ndị Alakụba belatara, anyị hụrụ onwe anyị dị ka ndị na-aghaghị ịchọta ụzọ akọ dị iche iche isi gwa ndị Alakụba okwu, nke a mekwara ka e mee mkpesa nye ndị uwe ojii. Ka mkpesa ndị a na-eme na-adịwanye ọtụtụ karị na Tangier na n’obodo ndị ọzọ, e mesịrị gwa anyị na anyị nwere nanị 30 ụbọchị iji hapụ mba ahụ. Na May 1969, e sikwa n’ọrụ ọzọ e kenyere anyị chụpụ mụ na Elsa.

Ọ̀ Bụ Ọrụ Ga-adịru Nwa Oge?

A gwara anyị ka anyị laghachi Brooklyn, a kpọkwara m ka m kere òkè ná nzukọ e mere maka ndị na-ejere alaka ụlọ ọrụ dị iche iche ozi nke e mere n’oge okpomọkụ ahụ. Ka m nọ ebe ahụ, a gwara m na ọrụ ọhụrụ anyị ga-abụ El Salvador, Central America, na m ga-ejekwa ozi ebe ahụ dị ka onye na-ejere alaka ụlọ ọrụ ozi. A gwara m na nke a ga-abụ ma eleghị anya ihe dị ka afọ ise, bụ́ ogologo oge kasịnụ nke a na-ekwere ka ndị ozi ala ọzọ nọgide ná mba ahụ, ebe ọ bụ na iwu akwadoghị ọrụ anyị n’ebe ahụ.

El Salvador—lee aha ọrụ ọ bụ! E nwere 1,290 ndị nkwusa, gụnyere 114 ndị ọsụ ụzọ ndị na-enye akụkọ ozi ná nkezi kwa ọnwa. Ndị ahụ na-atụ egwu Chineke, hụ Bible n’anya, na-elekwa ọbịa nke ọma. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnụ ụzọ ọ bụla, ha na-akpọbata anyị n’ime ụlọ ka anyị gwa ha okwu. Ná mkpirikpi oge, anyị nwere ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible ndị anyị ga-enwe ike iduzi.

Ka anyị na-ahụ mmụba na oké mkpa e nwere ebe ahụ, anyị nwere mwute na anyị ga-ahapụ ọrụ nke a mgbe afọ ise gasịrị nnọọ. Ya mere e kpebiri na anyị ga-agbalị inweta nkwado iwu maka ọrụ Ndịàmà Jehova. Anyị tinyere akwụkwọ ya nye ndị gọọmenti na December 1971, n’April 26, 1972, anyị nwekwara obi ụtọ ịgụ n’akwụkwọ ndị gọọmenti, bụ́ Diario Oficial, na ha anabatawo arịrịọ anyị. Ọ gaghị adịkwa mkpa ka ndị ozi ala ọzọ hapụ mgbe afọ ise gasịrị kama ha pụrụ inweta akwụkwọ ikike ibiri ná mba ahụ.

Ule na Ngọzi Dị Iche Iche

N’afọ ndị gafeworonụ n’ọrụ dị iche iche e kenyere anyị, anyị emewo ọtụtụ ezi ndị enyi, hụkwa mkpụrụ nke ozi anyị. Elsa nwere ahụmahụ dị mma na San Salvador ebe otu onye nkụzi ụlọ akwụkwọ na di ya bụ soja nọ. Otu n’ime ndị enyi onye nkụzi ụlọ akwụkwọ ahụ malitekwara inwe mmasị n’eziokwu. Na mbụ di ya egosighị mmasị na Bible; ka o sina dị, anyị letara ya mgbe ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, o gosikwara omume enyi. O mesịrị mụọ Bible, hapụ ọrụ agha ya, wee malite iso anyị na-eme nkwusa.

Ka ọ dị mgbe ahụ, otu nwa agbọghọ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze wee jụọ Elsa ma ọ na-eduziri onye ahụ bụbu soja ọmụmụ ihe. E mesịrị mata na ya na nwoke ahụ na-emebu enyi! Ọ na-esokwa Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ná mgbakọ distrikt, e mere nwoke ahụ bụbu onye agha, nwunye ya, enyi nwunye ya, na onye ahụ ya na nwoke ahụ na-emebu enyi baptism!

Mmụba n’El Salvador

N’ihi oké ịrị elu ahụ, e wuwo ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, mba ahụ nwekwara ugbu a ihe karịrị 18,000 Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike. Otú ọ dị, ọganihu nke a agabeghị n’enweghị ule na ọnwụnwa dị iche iche. Ruo afọ iri, ọ dịwo ụmụnna ahụ mkpa ime uche Chineke n’oge a na-alụ agha obodo. Ma ha ejigidewo nnọpụiche ha ma nọgide na-eguzosi ike maka Alaeze Jehova.

N’etiti anyị abụọ, mụ na Elsa anọwo n’ije ozi oge nile ruo 85 afọ. Anyị ahụwo na mgbe anyị nọgidere na-echere Jehova ma na-aṅa ntị ‘n’okwu ahụ nke si n’azụ na-asị, Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya,’ ọ dịghị mgbe anyị na-enwe mmechuihu ọ bụla. N’ezie, anyị enwewo ndụ nke afọ ojuju na nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ dị ka ndị na-ejere Jehova ozi oge nile.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nweta nkọwa zuru ezu, lee 1978 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 177-179.

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbakọ nta n’otu ọhịa dị na Spain, 1956

[Foto dị na peeji nke 25]

Anyị na-emebu nkwusa nye ndị na-abụghị ndị Alakụba na Morocco

[Foto dị na peeji nke 26]

Alaka Ụlọ Ọrụ dị n’El Salvador, ọrụ e kenyere anyị ugbu a

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya