Site n’Ogbenye Ọnụ Ntụ Gaa n’Inwe Akụ̀ na Ụba Kasịnụ
Dị Ka Manuel De Jesus Almeida Si Kọọ
A mụrụ m n’October 1916, ọ bụ m kasị obere n’ime ụmụ 17. Itoolu n’ime ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị anwụwo n’ihi ọrịa na erighị ihe na-edozi ahụ, n’ihi ya amaghị m ha ma ọlị. Anyị asatọ fọdụrụnụ so nne na nna anyị biri n’obodo nta dị nso na Porto, Portugal.
OBERE ụlọ anyị nwere otu ntakịrị palọ na otu ọnụ ụlọ ihi ụra. Ebe anyị na-echu mmiri ọṅụṅụ bụ n’otu olulu mmiri dị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara kilomita site n’ụlọ anyị, ihe ndị anyị ji esi nri bụchakwa ndị ochie.
Ozugbo ụmụnne m ndị nwoke nwetara ikike ọkpụkpụ aka, ha malitere ịrụ ọrụ n’ubi ọka. Ego ha nọ na-akpata nyeere ezinụlọ anyị aka inwetatụ nri. Site n’enyemaka ha, aghọrọ m nwa nanị ya gụtụrụ akwụkwọ. Ọ bụ ezie na ndụ siiri anyị ike, anyị kwesịrị ntụkwasị obi n’ụzọ dị ukwuu nye Chọọchị Katọlik, na-enwe olileanya na n’ụzọ ụfọdụ nke a ga-enyere ndụ anyị aka.
N’ọnwa May, chọọchị ahụ nwere ihe a kpọrọ novena. Ruo ụbọchị itoolu, anyị ji ụkwụ na-eje chọọchị n’isi ụtụtụ mgbe ọchịchịrị ka gbara. N’ebe ahụ, anyị na-ekpe ekpere, na-ekwere na nke a ga-eweta ngọzi Chineke. Anyị chekwara na onye ụkọchukwu bụ nwoke dị nsọ, onye nnọchiteanya Chineke. Ma, ka oge na-aga, echiche anyị gbanwere.
Ịchọ Ihe Ka Mma
Mgbe anyị na-atụghị ụtụ chọọchị, onye ụkọchukwu echebaraghị ụkọ ego anyị nọ na ya echiche. Nke a kụdara anyị obi. Echiche m nwere banyere chọọchị ahụ gbanwere n’ụzọ dị ukwuu, ya mere, mgbe m gbara afọ 18, ekpebiri m ịhapụ ezinụlọ m iji chọpụta ma ọ̀ bụ na e nweghị ihe dị mma ná ndụ karịa ịrụ ọrụ n’ubi na iso chọọchị na-ese okwu. Na 1936, abịarutere m Lisbon, bụ́ isi obodo Portugal.
N’ebe ahụ ka m zutere Edminia. Ọ bụ ezie na enwere m mmetụta nke ịbụ onye okpukpe ghọgbuworo, anyị gbasoro omenala ma lụọ na Chọọchị Katọlik. Mgbe ahụ, na 1939, Agha Ụwa nke Abụọ malitere. N’oge agha ahụ, ana m elekọta ụlọ nkwakọba ihe dị 18, anyị na-ezipụkwa ihe ruru gwongworo 125 a kwajuru ngwá agha n’otu ụbọchị.
Ọnọdụ na-atụ ụjọ nke agha ahụ tinyere òkè dị ukwuu Chọọchị Katọlik na-ekere metụtara m nke ukwuu. Echere m, sị, ‘Chineke ọ̀ na-eche banyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ezie? Olee otú anyị kwesịrị isi fee ya?’ Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị na 1954, otu nwa amadị merela okenye, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, gwara m okwu banyere ajụjụ ndị m nwere. Mkparịta ụka a gbanwere ndụ m nile.
Olileanya Bible Akpalie Mmasị M
Nwoke obi ọma a, bụ́ Joshua, kọwaara m na Alaeze Chineke bụ nanị ihe ngwọta e nwere maka nsogbu nke ụwa nakwa na a ga-enweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi site nanị n’ịchịisi Alaeze ahụ. (Matiu 6:9, 10; 24:14) Ihe o kwuru tọrọ m ụtọ, ma anabataghị m nkọwa ndị o nyere ozugbo n’ihi ahụmahụ m nweburu n’okpukpe. Mgbe o kwuru ka ya soro m mụọ Bible, ekwetara m nanị ma ọ bụrụ na ọ gaghị asị ka m kwụọ ya ụgwọ nakwa ma ọ bụrụ na ọ gaghị ekwu banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị. O kwetara, na-emesi m obi ike na ihe ọmụmụ ahụ bụ n’efu.—Mkpughe 22:17.
Obi ike m nwere n’ebe Joshua nọ rịrị elu ngwa ngwa. Ya mere arịọrọ m ya maka ihe gụworo m agụụ kemgbe m bụ nwa okorobịa. “Ọ̀ ga-ekwe omume mụ inweta Bible nke m?” Mgbe m natasịrị ya, lee obi ụtọ m nwere ịgụ na nke mbụ ya site n’Okwu nke Onye Okike anyị, nkwa ndị dị ka: “Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara [ihe a kpọrọ mmadụ], bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ; ihe mbụ nile agabigawo”!—Mkpughe 21:3, 4.
Karịsịa, nkwa Bible banyere mwepụ nke ịda ogbenye na ọrịa kasiri m obi. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Elaịhu kwuru banyere Chineke, sị: “Ọ na-enye ihe oriri n’ụba.” (Job 36:31) N’okpuru ịchịisi ezi omume nke Alaeze Chineke kwa, Bible na-ekwu, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Lee mmasị ịhụnanya nke Jehova Chineke nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ! Lee ka mmasị m nwere ná nkwa ya si rịa elu!
Ejere m nzukọ nke Ndịàmà Jehova ná nke mbụ ya n’April 17, 1954. Ọ bụ nzukọ pụru iche—Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Site n’oge ahụ gaa n’ihu, anọ m na-agachi nzukọ anya. N’oge na-adịghị anya, amalitere m isoro ndị ọzọ na-ekerịta ezi ihe ndị m na-amụta. N’oge ahụ na Portugal, anyị na-enwe mkpapụ ntụrụndụ kwa ọnwa na nso ụsọ mmiri, e mesịakwa anyị na-eme baptism. Ọnwa asaa mgbe mụ na Joshua kwurịtasịrị okwu ná nke mbụ ya, araara m onwe m nye Jehova Chineke ma gosipụta ya site na baptism ime mmiri n’oké osimiri ahụ.
Ná mmalite nke 1954, e nwere nanị ihe dị ka otu narị Ndịàmà nọ na Portugal nile. N’ihi ya, e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị ikom ga na-edu ndú n’ọrụ nkwusa. Enwere m ọganihu ime mmụọ dị ngwa, n’oge na-adịghịkwa anya, e nyere m ibu ọrụ ụfọdụ n’ime ọgbakọ. Na 1956, a họpụtara m ịbụ ohu ọgbakọ, dị ka a na-akpọ onyeisi oche ndị nlekọta n’oge ahụ, n’ọgbakọ nke abụọ nke Ndịàmà Jehova dị na Lisbon. Taa, e nwere ihe karịrị otu narị ọgbakọ n’obodo ukwu a nakwa n’ógbè ya ndị dịpụrụ adịpụ.
Erite M Uru Site n’Igosi Afọ Ọma
Ọ bụ ezie na mụ na Edminia ejichaghị ego, anyị na-anabata ụmụnna anyị bụ́ ndị Kraịst n’ụlọ anyị mgbe nile. Na 1955, otu onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị na-ezisa ozi ọma oge nile nke Ndịàmà Jehova, kwụsịrị na Portugal n’oge o si n’ebe obibi ya na Brazil na-aga Mgbakọ nke mba nile “Alaeze nke Na-enwe Mmeri” e nwere na Germany. N’ihi nsogbu ime njem, ọ nọrọ n’ụlọ anyị ruo otu ọnwa, leekwa uru anyị ritere site ná nleta ya!
Ndị ọbịa ọzọ bịara n’ụlọ anyị n’oge ahụ gụnyere ndị òtù ezinụlọ nke isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn, New York, ndị dị ka Hugo Riemer na onye ya na ya bi n’ụlọ bụ́ Charles Eicher. Ha sooro anyị rie nri ma gwa ụmụnna ndị Portugal okwu. Dị ka ụrịọm ọkụkọ a bụrụ ọhụrụ ndị meghere ọnụ ha, anyị cheere maka irighiri akụkọ ime mmụọ ndị dị otú ahụ na-akọ.
Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova nọkwara n’ụlọ anyị n’oge nleta ha. Onye ọbịa kwesịrị ncheta na 1957 bụ Álvaro Berecochea, bụ́ onye nlekọta alaka nke Morocco, bụ́ onye e kenyere ileta Portugal iji gbaa ụmụnna ume. Ọ bịara ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ n’ụlọ anyị, anyị siri ọnwụ ka ọ nọtọpụ oge ọ ga-anọ na Portugal n’ụlọ anyị. A gọziri anyị ma mee ka anyị maa abụba n’ụzọ ime mmụọ n’oge nleta ya ruru otu ọnwa, ebe Álvaro buru ibu n’ụzọ anụ ahụ n’ihi ezi nri nke Edminia m hụrụ n’anya na-esiri ya.
Ụdị ogbenye ọnụ ntụ m nwere ahụmahụ ya n’oge m bụ nwata, pụrụ imetụta mmadụ n’ụzọ dị ukwuu. Ma, abịara m ghọta na ka anyị na-enyekwu Jehova na ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị ihe, otú ahụ ka ọ na-agọzikwu anyị. Ugboro ugboro, e mere ka m hụ ịbụ eziokwu dị na nke a ka anyị na-egosi ndị nile anyị nwere ike, afọ ọma.
Ná mgbakọ anyị nwere na Porto na 1955, a mara ọkwa banyere mgbakọ mba nile nke Ndịàmà Jehova a ga-enwe na 1958 n’Ámá Egwuregwu Yankee dị na New York City. E debere igbe onyinye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla dị ná mba ahụ—nke dị nnọọ ole na ole n’oge ahụ—iji nye aka ịhụ maka mmefu a ga-enwe n’iziga ndị nnọchiteanya Portugal ná mgbakọ ahụ. Ị̀ pụrụ iche n’echiche ụdị aṅụrị anyị nwere mgbe a họpụtara mụ na nwunye m iso ná ndị nnọchiteanya? Lee ihe ọṅụ ọ bụ ileta isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na Brooklyn n’oge anyị nọ na United States maka mgbakọ ahụ!
Idi Mkpagbu
Na 1962, a machibidoro ọrụ nkwusa nke Ndịàmà Jehova iwu na Portugal, a chụlara ndị ozi ala ọzọ—gụnyere Eric Britten, Domenick Piccone, Eric Beveridge, na nwunye ha. Mgbe nke ahụ gasịrị, e kweghị ka anyị na-enwe nzukọ anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya mere anyị nwere ha na nzuzo n’ụlọ ndị mmadụ; o kweghịzikwa omume inwe mgbakọ ndị buru ibu na Portugal. Ya mere ọ ghọrọ ibu ọrụ m imere ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị bụ́ ndị Kraịst ndokwa maka ime njem iji gaa mgbakọ ndị dị otú ahụ ná mba ndị ọzọ.
Ime ndokwa maka ọnụ ọgụgụ buru ibu nke Ndịàmà ime njem gaa mba ọzọ adịghị mfe. Ma, mgbalị e tinyere kwesịrị ya nnọọ ma a tụlee abamuru ime mmụọ nke ụmụnna ndị Portugal ahụ nwetara. Lee ahụmahụ na-ewuli elu ọ bụ nye ha ịnọ ná mgbakọ ndị e nwere na Switzerland, England, Itali, nakwa na France! Mgbakọ ndị dị otú ahụ nyekwara ha ohere iwebata akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’ime Portugal. N’afọ ndị ahụ, anyị rịọrọ ọtụtụ arịrịọ ka e debanye aha anyị dị ka òtù okpukpe dị na Portugal, ma a jụrụ arịrịọ nile a.
Mgbe a chụlasịrị ndị ozi ala ọzọ ahụ ná mmalite 1962, ndị uwe ojii nzuzo malitere itinyekwu ihe ná mgbalị ha na-eme iji kwụsị ọrụ nkwusa anyị. E jidere ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ma kpụga ha n’ụlọikpe. E bipụtara akụkọ e dere ede banyere ọtụtụ n’ime ihe omume ndị a na magazin a nakwa na magazin a na-ebipụtakọ ya na ya bụ́ Teta!a
N’ime ndị a tụrụ mkpọrọ maka ime nkwusa bụ otu ọsụ ụzọ nke m mere ka ọ mara banyere ozi Alaeze Chineke. Ebe ọ bụ na ndị uwe ojii hụrụ adres m n’ime ihe onwunwe ya, a kpọrọ m òkù ma gbaa m ajụjụ.
Mgbe e mesịrị, ndị ọrụ ndị uwe ojii abụọ bịara n’ebe obibi m. Ha jichiri ihe ndị m na-eji amụ Bible nakwa Bible 13. Ha nọgidere na-amaja m, na-alọghachi ná ngụkọta nke ugboro asaa dị iche iche iji nyochaa ebe obibi anyị. N’oge nke ọ bụla, ha jụkasịrị anyị ajụjụ ahụ.
A kpọrọ m ọtụtụ ugboro ịbịa gbaara Ndịàmà ibe m akaebe n’ụlọikpe. Ọ bụ ezie na agụghị m akwụkwọ hie nne, Jehova nyere m ‘amamihe, nke ndị nile na-emegide m na-apụghị iguzogide ma ọ bụ ikwugide okwu.’ (Luk 21:15) N’otu oge, akaebe m gbara juru ọkàikpe anya nke ukwuu nke na ọ jụrụ m ókè m gụruru akwụkwọ. Ndị nile nọ n’ụlọikpe ahụ chịrị ọchị mgbe m sịrị na ọ bụ nanị praịmarị nke anọ ka m gụruru akwụkwọ.
Ka mkpagbu ahụ na-arị elu, otú ahụ ka ọnụ ọgụgụ ndị nabatara ozi Alaeze ahụ na-arị. N’ihi ya, ihe na-erughị Ndịàmà 1,300 ahụ nọ na Portugal na 1962 mụbara ruo ihe karịrị 13,000 na 1974! Ka ọ dịgodị, na May 1967, a kpọrọ m òkù ije ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. N’ọrụ a, eletara m ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova iji wusie ha ike n’ụzọ ime mmụọ.
Inwe Akụ̀ na Ụba Kasịnụ
Na December 1974, enwere m ihe ùgwù nke ikere òkè ná ndebanye aha nke mere ka ọrụ Ndịàmà Jehova nwee nkwado iwu na Portugal. N’afọ sochirinụ, mụ na nwunye m ghọrọ ndị òtù nke ezinụlọ Betel nke Ndịàmà Jehova dị n’Estoril. A họpụtakwara m ije ozi dị ka onye so na Kọmitii Alaka Portugal.
Lee ihe ọṅụ ọ bụwooro m ịhụ ka ọrụ nkwusa ahụ na-aga n’ihu na Portugal nakwa n’ókèala ndị alaka anyị na-elekọta! Ha gụnyere Angola, Azores, Cape Verde, Madeira, na São Tomé na Príncipe. Eri ọtụtụ afọ, ọ bụwo ihe na-akpali mmasị ịhụ ndị ozi ala ọzọ e si Portugal zipụ ije ozi n’ala ndị a, bụ́ ebe e gosiworo mmasị dị ukwuu n’ozi Alaeze ahụ. Cheedị echiche ọṅụ anyị nwere ugbu a inwe ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 88,000 n’ebe ndị a, gụnyere ihe karịrị 47,000 nọ na Portugal! Ndị bịara Ememe Ncheta ná mba ndị a na 1998 ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 245,000, ma e were ya tụnyere ihe na-erughị mmadụ 200 n’oge m ghọrọ Onyeàmà na 1954.
Mụ na Edminia ji obi anyị nile kwenyere ọbụ abụ ahụ so dee Bible bụ́ onye sịrị na “otu ụbọchị n’ogige [Jehova] nile dị mma karịa [otu puku ụbọchị] n’ebe ọzọ.” (Abụ Ọma 84:10) Mgbe ọ bụla m chelara echiche azụ ná ndụ ogbenye m dịrị n’oge m na-etolite ma jiri ha tụnyere akụ̀ na ụba ime mmụọ ndị m nweworo eri oge, ana m enwe mmetụta yiri nke Aịsaịa onye amụma: “Jehova, Chineke m ka Ị bụ; m ga-eme ka Ị dị elu, m ga-ekele aha Gị; n’ihi na I mewo ihe ebube . . . N’ihi na Ị bụworo onye na-enweghị ike ebe siri ike, Ị bụworo ogbenye ebe siri ike.”—Aịsaịa 25:1, 4.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta! (Bekee) nke May 22, 1964, peji nke 8-16, na Ụlọ Nche (Bekee) nke October 1, 1966, peji nke 581-592.
[Foto ndị dị na peeji nke 24]
N’elu: Nwanna Almeida ka ọ nọ na Lisbon na-ekwupụta ndokwa e mere iziga ndị nnọchiteanya ná mgbakọ e nwere na New York na 1958
N’etiti: Iduzi nzukọ nlereanya nke ndị ohu ná Mgbakọ Mba Nile “Udo n’Elu Ala” e nwere na Paris
N’okpuru: Bọs ndị a kwụrụ ụgwọ ka ha na-ejikere maka mgbakọ distrikti e nwere na France
[Foto dị na peeji nke 25]
Iduzi ofufe ụtụtụ n’alaka Portugal
[Foto dị na peeji nke 25]
Alaka Portugal, nke a raara nye na 1988
[Foto dị na peeji nke 26]
Okwu ndị Nwanna Hugo Riemer kwuru gbara anyị ume n’oge o si Betel dị na Brooklyn leta anyị
[Foto dị na peeji nke 26]
Mụ na nwunye m