Gịnị Na-akpali Gị Ijere Chineke Ozi?
“Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.”—MAK 12:30.
1, 2. Olee ihe ndị na-akpali akpali a na-arụzu n’ihe banyere ọrụ nkwusa ahụ?
ADỊGHỊ ekpebi ezi uru nke ụgbọ ala nanị site n’otú ọ dị n’anya. Agba e tere ya pụrụ iwelite ọdịdị elu ahụ ya, ụkpụrụ na-adọrọ adọrọ n’anya pụkwara ịdọta onye ga-azụ ya; ma ihe dị mkpa nke ukwuu karị bụ ihe ndị a na-adịghị ahụ ngwa ngwa—injin nke na-eme ka ụgbọ ahụ na-agba agba, tinyere ihe ndị ọzọ nile e ji achịkwa ya.
2 Ọ dị otú ahụ n’ihe banyere ozi onye Kraịst na-ejere Chineke. Ndịàmà Jehova jupụtara n’ọrụ nke Chineke. Kwa afọ, a na-etinye ihe karịrị otu ijeri hour n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọzọkwa, a na-eduzi ọtụtụ nde ọmụmụ Bible, ndị a na-eme baptism na-erukwa ọtụtụ narị puku. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-ekwusa ozi ọma, i nwere òkè—ọbụna ma ọ bụrụ na o yie ihe nta—n’ọnụ ọgụgụ ndị a na-akpali akpali. Obi pụkwara isi gị ike na “Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu na ịhụnanya ahụ unu gosiri n’ebe aha Ya dị.”—Ndị Hibru 6:10.
3. Gịnị e wezụga ọrụ kwesịrị ịdị na-echegbusi ndị Kraịst ike, n’ihi gịnịkwa?
3 Otú ọ dị, a dịghị atụ ezi uru nke ozi anyị—n’ìgwè ma ọ bụ n’otu n’otu—n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nanị n’ọnụ ọgụgụ. Dị ka a gwara Samuel, “mmadụ na-ele ihe anya n’ahụ, ma Jehova na-ele obi.” (1 Samuel 16:7) Ee, ọ bụ ihe anyị bụ n’ime dị Chineke mkpa. N’eziokwu, ọrụ dị mkpa. Ọrụ nke nsọpụrụ Chineke na-achọ ozizi Jehova mma ma na-adọta ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ. (Matiu 5:14-16; Taịtọs 2:10; 2 Pita 3:11) Ma, ọrụ anyị adịghị akọzu ihe a chọrọ. Jisọs ahụ a kpọlitere n’ọnwụ nwere ihe mere ọ ga-eji chee banyere ọgbakọ dị n’Efesọs—n’agbanyeghị ihe ndekọ ha nke ọrụ ọma. “Amatara m ọrụ gị nile,” ka ọ gwara ha. “Ma enwere m nke a imegide gị, na ị hapụrụ ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.”—Mkpughe 2:1-4.
4. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ozi anyị na-ejere Chineke pụrụ isi ghọọ ọrụ imezu iwu? (b) N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa maka nnyocha onwe onye?
4 E nwere ihe ize ndụ dịnụ. Ka oge na-agafe, ozi anyị na-ejere Chineke pụrụ ịghọ ọrụ e ji emezu iwu. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst kọwara ya otú a: “M ga-apụ n’ozi, gaa nzukọ, mụọ ihe, kpee ekpere—ma m na-eme ha dum n’echeghị ha eche, n’enweghị mmetụta ihe ọ bụla.” Ee, a ga-aja ndị ohu Chineke mma mgbe ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’agbanyeghị inwe mmetụta nke ịbụ ndị ‘a na-atụda n’ala’ ma ọ bụ nke ‘ịdị ala n’obi.’ (2 Ndị Kọrint 4:9; 7:6) Ka o sina dị, mgbe usoro ime ihe anyị nke ndị Kraịst dabara n’ihe e ji emezu iwu, ọ dị anyị mkpa ileba anya n’injin, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ọbụna ụgbọ ala ndị kasị mma na-achọ nlekọta anya mgbe mgbe; n’otu aka ahụ, ndị Kraịst nile nwere mkpa ịdị na-eme nnyocha onwe onye mgbe mgbe. (2 Ndị Kọrint 13:5) Ndị ọzọ pụrụ ịhụ ọrụ anyị, ma ha apụghị ịmata ihe na-akwali omume anyị. Ya mere, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iburu n’uche ajụjụ bụ́: ‘Gịnị na-akpali m ijere Chineke ozi?’
Ihe Mgbochi Nye Mkpali Ndị Ziri Ezi
5. Olee iwu Jisọs sịrị na o bu ndị ọzọ nile ụzọ?
5 Mgbe a jụrụ ya nke bu ndị ọzọ nile ụzọ n’ime iwu ndị e nyere Israel, Jisọs hotara iwu nke lekwasịrị anya, ọ bụghị n’ọdịdị elu ahụ, kama n’ihe mkpali dị n’ime: “Ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.” (Mak 12:28-30) Jisọs si otú a kọwapụta ihe kwesịrị ịbụ ike nkwali maka ozi anyị na-ejere Chineke—ịhụnanya.
6, 7. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Setan siworo jiri aghụghọ na-awakpo njikọ ezinụlọ, n’ihi gịnịkwa? (2 Ndị Kọrint 2:11) (b) Olee otú ụzọ nzụlite pụrụ isi metụta àgwà mmadụ n’ebe ịchịisi Chineke dị?
6 Setan chọrọ igbochi ikike anyị ịzụlite àgwà ahụ dị mkpa bụ́ ịhụnanya. Iji mezuo nke a, otu ụzọ o jiworo na-eme ihe bụ ịwakpo njikọ ezinụlọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ebe a ka a na-azụlite mmetụta anyị ndị mbụ na ndị kasị na-adịte anya banyere ịhụnanya. Setan maara nke ọma ụkpụrụ Bible nke na ihe a mụtara na nwata pụrụ ịba uru mgbe e mere okenye. (Ilu 22:6) Ọ na-eji aghụghọ na-anwa ịgwagbu nghọta anyị nke ịhụnanya mgbe anyị bụ nwata. Dị ka “chi nke oge a,” Setan na-ahụ na e mezuru nzube ya nke ọma mgbe ọtụtụ ndị tolitere n’ezinụlọ ndị na-abụghị ebe ịhụnanya na-eto kama ha bụ ọgbọ agha nke obi ilu, ọnụma, na okwu mkparị.—2 Ndị Kọrint 4:4; Ndị Efesọs 4:31, 32; 6:4, NW, nkọwa ala ala peji; Ndị Kọlọsi 3:21.
7 Akwụkwọ bụ́ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ rịbara ama na ụzọ nna si elekọta ọrụ ya nke ịbụ nna “puru inwe nmetuta aribara ama n’àgwà umu-ya genwe n’ikpe-azu n’ebe ichi-isi di, ma nke madu ma nke Chineke.”a Otu nwoke bụ́ onye Kraịst, onye a zụlitere n’okpuru aka dị ike nke nna dị obi ọjọọ kwetara, sị: “Nye m, irubere Jehova isi dị mfe; ịhụ ya n’anya siri ike nke ukwuu karị.” Otú ọ dị, nrubeisi dị mkpa, n’ihi na n’anya Chineke “ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà.” (1 Samuel 15:22) Ma gịnị pụrụ inyere anyị aka ịgabiga nrubeisi nkịtị ma zụlite ịhụnanya maka Jehova dị ka ike mkpali maka ofufe anyị?
“Ịhụnanya Kraịst Na-arụgide Anyị”
8, 9. Olee otú àjà mgbapụta Jisọs kwesịrị isi kpalite ịhụnanya anyị maka Jehova?
8 Ihe mkpali kasịnụ maka ịzụlite ịhụnanya sitere n’obi dum maka Jehova bụ obi ekele maka àjà mgbapụta Jisọs Kraịst. “N’ime nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ime anyị, na Chineke ewerewo Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya zite n’ụwa, ka anyị wee dị ndụ site n’aka Ya.” (1 Jọn 4:9) Ozugbo anyị ghọtara ma nwee ekele maka ya, ọrụ ịhụnanya nke a na-adọpụta mmeghachi omume nke ịhụnanya. “Anyị onwe anyị na-ahụ n’anya, n’ihi na [Jehova] buru ụzọ hụ anyị n’anya.”—1 Jọn 4:19.
9 Jisọs ji ọchịchọ obi ya nakwere ọrụ e kenyere ya nke bụ́ ije ozi dị ka Onye Nzọpụta nke mmadụ. “N’ime nke a ka anyị mawooro ịhụnanya, n’ihi na Ya onwe ya tọgbọrọ ndụ Ya n’ihi anyị.” (1 Jọn 3:16; Jọn 15:13) Ịhụnanya Jisọs nke iji onwe onye achụ àjà kwesịrị ịkpalite nzaghachi obi ekele n’ime anyị. Iji maa atụ: Were ya na a dọpụtawo gị n’ịbụ onye mmiri riri. Ị̀ pụrụ nnọọ ịlara ụwa gị, hichaa ahụ gị, ma chezọọ banyere ya? Mbanụ! Ị ga-enwe mmetụta nke ịbụ onye ji onye dọpụtara gị ụgwọ. E kwuwerị, i ji onye ahụ ụgwọ maka ndụ gị. Ànyị ji Jehova Chineke na Jisọs Kraịst ụgwọ ihe dị nta karị? Ma ọ bụghị ihe mgbapụta ahụ, mmiri ga-eri anyị nile, dị ka a pụrụ ikwu ya, ná mmehie na ọnwụ. Kama nke ahụ, n’ihi oké ọrụ nke a nke ịhụnanya, anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs.—Ndị Rom 5:12, 18; 1 Pita 2:24.
10. (a) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe mgbapụta ahụ mee ihe banyere onwe anyị? (b) Olee otú ịhụnanya Kraịst si arụgide anyị?
10 Tụgharịa uche n’ihe mgbapụta ahụ. Jiri ya mee ihe banyere onwe gị, dị ka Pọl mere: “Ndụ ahụ m na-adị n’anụ ahụ ugbu a, ana m adị ya n’okwukwe, bụ́ nke m kwere n’Ọkpara Chineke, Onye hụrụ m n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi m.” (Ndị Galetia 2:20) Ntụgharị uche dị otú ahụ ga-ewelite ihe mkpali sitere n’obi, n’ihi na Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị; ebe . . . Ọ nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) The Jerusalem Bible na-asị na ịhụnanya Kraịst “na-erikpu anyị.” Mgbe anyị chere banyere ịhụnanya Kraịst, a na-arụgide anyị, na-akwali anyị n’ụzọ dị omimi, ọbụna ọ na-erikpu anyị. Ọ na-emetụ anyị n’obi ma na-akwali anyị ime ihe. Dị ka nsụgharị J. B. Phillips si chịkọta ya, “kpọmkwem mmalite nke ihe ndị anyị na-eme bụ ịhụnanya Kraịst.” Ụdị ihe mkpali ọ bụla ọzọ agaghị amịpụta mkpụrụ na-adịgide adịgide n’ime anyị, dị ka e gosiri site n’ihe atụ nke ndị Farisii.
‘Na-ezenụ Ihe Ndị Farisii Bụ́ Ihe Na-eko Achịcha’
11. Kọwaa àgwà ndị Farisii n’ebe ọrụ okpukpe dị.
11 Ndị Farisii wepụrụ ndụ nile dị n’ofufe Chineke. Kama imesi ịhụnanya maka Chineke ike, ha kwusiri okwu ike banyere ọrụ dị ka ihe e ji atụ ọnọdụ ime mmụọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Iji ọtụtụ ụkpụrụ iwu mejupụta uche ha mere ka ha yie ndị ezi omume n’ìhè, ma n’ime ha “jupụtara n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ, na adịghị ọcha nile.”—Matiu 23:27.
12. Mgbe Jisọs gwọsịrị otu nwoke, olee otú ndị Farisii si gosi onwe ha ịbụ ndị obi ha mere etili?
12 N’otu oge Jisọs ji ọmịiko gwọọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Lee ka nwoke a na-aghaghị isiworị nwee obi ụtọ ịbụ onye nwetara ozugbo ọgwụgwọ nke ọrịa ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ na-akpata oké ihe mgbu n’anụ ahụ na ná mmetụta uche! Ma, ndị Farisii esoghị ya ṅụrịa ọṅụ. Kama nke ahụ, ha mere nkatọ n’ihi otu ụkpụrụ—na Jisọs nyeere mmadụ aka n’Ụbọchị Izu Ike. N’ibu ndị tinyere uche ha nile ná nkọwa ụkpụrụ ha nke Iwu ahụ, ndị Farisii enwetatụghị ma ọlị mmụọ nke Iwu ahụ. Ka a sịkwa ihe mere ‘o ji wute Jisọs nke ukwuu na a na-eme ka obi ha mee etili’! (Mak 3:1-5) Ọzọkwa, ọ dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Na-ezekwa ihe ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ihe na-eko achịcha.” (Matiu 16:6) E kpughere omume na àgwà ha n’ime Bible maka abamuru anyị.
13. Olee ihe mmụta dịịrị anyị site n’ihe atụ nke ndị Farisii?
13 Ihe atụ nke ndị Farisii na-akụziri anyị na ọ dị anyị mkpa inwe echiche ziri ezi banyere ọrụ. N’ezie, ọrụ dị mkpa, n’ihi na “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.” (Jemes 2:26) Otú ọ dị, ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere àgwà nke ikpe ndị ọzọ ikpe site n’ihe ha na-eme kama ịbụ site n’ihe ha bụ. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ọbụna isi otú a kpee onwe anyị ikpe. Anyị pụrụ itinyebiga uche ókè n’ihe a rụrụ, dị ka a ga-asị na nke a agwụla ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọnọdụ ime mmụọ anyị. Anyị pụrụ ichezọ ịdị mkpa nke inyocha ebumnobi anyị. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 5:12.) Anyị pụrụ ịghọ ndị kwesiri olu ike n’iwu bụ́ ndị “na-azapụ anwụnta, ma . . . na-eloda camel,” na-agbasochi iwu anya ma na-emebi nzube ya.—Matiu 23:24.
14. Olee otú ndị Farisii si dị ka iko ma ọ bụ efere ruru unyi?
14 Ihe ndị Farisii na-aghọtaghị bụ na ọ bụrụ na mmadụ hụrụ Jehova n’anya n’ezie, ọrụ nke nsọpụrụ Chineke ga-esochi n’onwe ya. Ọnọdụ ime mmụọ na-eru site n’ime pụta n’èzí. Jisọs katọsiri ndị Farisii ike n’ihi echiche ha hiere ụzọ n’akụkụ nke a, na-asị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ; n’ihi na unu na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha, ma n’ime ha jupụtara site n’ịpụnara mmadụ ihe na ejideghị onwe unu. Gị Farisii kpuru ìsì, buru ụzọ mee ka ime iko na efere dị ọcha, ka azụ ha wee ghọọkwa ọcha.”—Matiu 23:25, 26.
15. Hota ihe atụ ndị na-egosi na Jisọs na-ele anya gabiga nanị ọdịdị elu ahụ.
15 Otú iko, efere, ma ọ bụ ọbụna ụlọ dị n’anya adịghị ekpughe ihe nile. Ịma mma nke ụlọ nsọ Jerusalem, bụ́ nke Jisọs kpọrọ “ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe” n’ihi ihe na-ewere ọnọdụ n’ime ya, tụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs n’anya. (Mak 11:17; 13:1) Ihe bụ eziokwu banyere ụlọ nsọ ahụ bụ eziokwu banyere ọtụtụ nde ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst, dị ka ihe ndekọ nke Krisendọm na-egosi. Jisọs sịrị na ya ga-ama ụfọdụ ndị rụrụ “ọtụtụ ọrụ dị ike” n’aha ya ikpe ịbụ “ndị na-arụ ọrụ na-emebi iwu.” (Matiu 7:22, 23) N’ụzọ dịwagara nnọọ iche, o kwuru banyere otu nwanyị di ya nwụrụ nke tụnyere ego na-enwekebeghị uru ọ bara dị ka ụtụ n’ụlọ nsọ ahụ, sị: “Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ndị nile na-atụba n’ime ebe ụtụ ahụ . . . Nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ka ihe nile o nwere hà, bụ́ ihe dum o ji biri.” (Mak 12:41-44) Ọ̀ bụ ikpe na-ekwekọghị ekwekọ? Ee e ma ọlị. N’ọnọdụ abụọ ahụ, Jisọs gosipụtara ụzọ Jehova si ele ihe anya. (Jọn 8:16) Ọ hụrụ ihe mkpali nke ọrụ ndị ahụ ma kpee ikpe kwesịrị ekwesị.
“Onye Ọ Bụla Dị Ka Ike nke Aka Ya Hà”
16. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị anyị mkpa ijiri ọrụ anyị tụnyere nke onye Kraịst ọzọ mgbe nile?
16 Ọ bụrụ na ihe mkpali anyị kwesịrị ekwesị, ọ dịghị mkpa ịnọgide na-eji ihe na-atụnyere ibe ya. Dị ka ihe atụ, a na-arụzu ihe ọma dị nta site n’iji ịma aka na-agbalịsi ike itinye oge hà ka nke onye Kraịst ọzọ na-etinye n’ozi ma ọ bụ iru ihe onye ahụ rụzuru ná nkwusa. Ihe Jisọs kwuru bụ ịhụ Jehova n’anya site n’obi, uche, mkpụrụ obi, na ume gị dum—ọ bụghị nke onye ọzọ. Ikike, ume ọrụ, na ọnọdụ nke onye ọ bụla dị iche. Ọ bụrụ na ọnọdụ gị enye ohere ya, ịhụnanya ga-akpali gị itinye oge dị ukwuu n’ozi ahụ—ma eleghị anya ọbụna dị ka onye ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ma, ọ bụrụ na ị na-alụso otu ọrịa ọgụ, oge ị na-etinye n’ozi pụrụ ịdị nta karịa otú ị ga-achọ. Adala mbà n’obi. A dịghị atụ ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’ọnụ ọgụgụ hour. Site n’inwe ihe mkpali ndị dị ọcha, ị ga-enwe ihe mere ị ga-eji nwee ọṅụ. Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.”—Ndị Galetia 6:4.
17. N’okwu nke gị, kọọ ná mkpirikpi ilu nke talent ndị ahụ.
17 Tụlee ilu Jisọs nke talent ndị ahụ, dị ka e dekọrọ na Matiu 25:14-30. Otu nwoke nke na-ejikere ịga ofesi kpọkọtara ndị ohu ya ma nye ha ihe onwunwe ya. “Otu ka o nyere talent ise, nke ọzọ talent abụọ, nke ọzọ otu talent; o nye onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà.” Mgbe onyenwenụ ahụ laghachitere iso ndị ohu ya mee mpịazi, gịnị ka ọ hụrụ? Ohu nke e nyeworo talent ise ritere talent ise ọzọ. N’otu aka ahụ, ohu nke e nyere talent abụọ ritere talent abụọ ọzọ. Ohu nke e nyere otu talent liri ya n’ala, o meghịkwa ihe ọ bụla iji mụbaa akụ̀ onye nwe ya. Olee otú onyenwenụ ahụ si tụọ ọnọdụ ahụ?
18, 19. (a) N’ihi gịnị ka onyenwenụ ahụ na-ejighị jiri ohu nke e nyere talent abụọ tụnyere ohu nke e nyere talent ise? (b) Gịnị ka ilu nke talent ndị ahụ na-akụziri anyị banyere ịja mma na iji mmadụ tụnyere ibe ya? (ch) N’ihi gịnị ka e ji maa ohu nke atọ ahụ ikpe?
18 Nke mbụ, ka anyị tụlee ndị ohu ahụ e nyere talent ise na abụọ n’otu n’otu. Nye nke ọ bụla n’ohu ndị a, onyenwenụ ahụ sịrị: “I mere nke ọma, ezi ohu nke kwesịrị ka a tụkwasị gị obi.” Ọ̀ gaara agwaworị ohu ahụ nke nwere talent ise nke a ma ọ bụrụ na o ritere nanị abụọ? O yighị! N’aka nke ọzọ, ọ gwaghị ohu nke ritere talent abụọ: ‘Gịnị mere i riteghị ise? Leenụ ohu ibe gị na ole o riteere m!’ Ee e, onyenwenụ ahụ dị ọmịiko, nke sere onyinyo Jisọs, ejighị otu onye tụnyere ibe ya. O kere talent ndị ahụ nye “onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà,” ọ tụghịkwa anya ihe ọ bụla karịrị ihe onye nke ọ bụla pụrụ inye. Ohu abụọ ahụ nwetara ịja mma hà nhata, n’ihi na ha abụọ ji obi ha dum rụọrọ onye nwe ha ọrụ. Anyị nile pụrụ ịmụta ihe site na nke a.
19 Ma, a jaghị ohu nke atọ ahụ mma. N’ezie, a tụbara ya n’ọchịchịrị dị n’èzí. Ebe ọ nataworo nanị otu talent, a garaghị atụ anya na ọ ga-erite ihe ruru ka nke onye nke nwere talent ise. Ma, o medịghị mgbalị! Ikpe a mara ya bụ n’ụzọ bụ isi n’ihi ọnọdụ obi ya ‘dị njọ ma dị umengwụ,’ nke gosipụtara enweghị ịhụnanya maka onye nwe ya.
20. Olee otú Jehova si ele adịghị ike anyị nile anya?
20 Jehova na-atụ anya n’aka onye ọ bụla n’ime anyị ịhụ ya n’anya site n’ike anyị dum, ma lee ka o si bụrụ ihe na-ekpo obi ọkụ na “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ”! (Abụ Ọma 103:14) Ilu 21:2 na-asị na “onye na-atụzi obi nile ka Jehova bụ”—ọ bụghị onye na-atụzi ọnụ ọgụgụ. Ọ na-aghọta adịghị ike ọ bụla anyị na-apụghị ịchịkwa, ma hà bụ nke ego, anụ ahụ, mmetụta uche, ma ọ bụ ndị ọzọ. (Aịsaịa 63:9) N’otu oge ahụ, ọ na-atụ anyị anya iji ihe nile anyị pụrụ inwe mee ihe kasị mma. Jehova zuru okè, ma mgbe ọ na-emeso ndị na-ezughị okè na-efe ya ofufe ihe, ọ bụghị onye na-achọ izu okè. Ọ bụghị onye na-enweghị ezi uche ná mmeso ya ma ọ bụ ghara ịdị na-echezi echiche n’ihe ndị ọ na-atụ anya ha.
21. Ọ bụrụ na ịhụnanya na-akpali ozi anyị na-ejere Chineke, ihe ọma dị aṅaa ka ọ ga-arụpụta?
21 Ịhụ Jehova n’anya site n’obi, mkpụrụ obi, uche, na ike anyị dum “kachasị àjà nsuresị ọkụ nile na àjà ọzọ nile nke ukwuu.” (Mak 12:33) Ọ bụrụ na ọ bụ ịhụnanya na-akpali anyị, mgbe ahụ anyị ga-eme ihe nile anyị pụrụ ime n’ozi Chineke. Pita dere na ọ bụrụ na àgwà nile nke Chineke, gụnyere ịhụnanya, ‘dị n’ime unu, unu nweekwa ha hie nne, ha ga-edo unu ndị na-abụghị ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ ruo ịmazu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.’—2 Pita 1:8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ná Ntụleghachi
◻ Gịnị kwesịrị ịbụ ike nkwali nke ozi anyị na-ejere Chineke?
◻ Olee otú ịhụnanya Kraịst si arụgide anyị ijere Jehova ozi?
◻ Ihe dị aṅaa ndị Farisii weere mejupụta uche ha ka anyị na-aghaghị izere?
◻ N’ihi gịnị ka o ji ghara ịbụ ihe amamihe ịnọgide na-eji ozi anyị atụnyere nke onye Kraịst ọzọ?
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Ikike, ume ọrụ, na ọnọdụ ndị mmadụ n’otu n’otu dịgasị iche iche