Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Brazil
BRAZIL bụ ala buru oké ibu n’ọtụtụ ụzọ. Ma n’otú ọ hà ma ọnụ ọgụgụ mmadụ bi na ya, ọ bụ nke ise ná mba ndị kasị ibu n’ụwa. O kpuchiri ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ókèala nke South America, ọ bụkwa ebe obibi nke ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ dị ukwuu karịa mba ndị ọzọ nile nke kọntinent ahụ ma e jikọta ha ọnụ. Brazil nwekwara oké ọhịa kasị ukwuu mmiri na-ezo na ya n’ụwa. Site n’oké ọhịa ahụ ka osimiri kasị ukwuu n’ụwa—Osimiri Amazon—na-esi asọfe.
Brazil buru oké ibu n’echiche ọzọ. Ọnụ ọgụgụ nke ndị ya na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke na-eru 400,000, n’afọ gara aga kwa ihe karịrị 1,000,000 gakwara Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst. Ya mere ala nke a guzopụrụ iche n’ihe banyere ọrụ nkwusa Alaeze. Ahụmahụ ndị e nwere na nso nso a na-eme ihe atụ nke a.
Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu
Antonio na nwunye ya mere mkpebi ahụ siri ike nke ịhapụ ndị ikwu ha na ọrụ na-akwụ ụgwọ nke ọma, nke e ji n’aka na São Paulo iji jee ozi n’ebe mkpa nke ndị nkwusa Alaeze ka ukwuu na steti Minas Gerais. Ókèala ha gụnyere ógbè ndị ọrụ nọ n’ebe a na-anụcha shuga. Ụbọchị mbụ ha gbara àmà ebe ahụ, ha malitere ọmụmụ Bible itoolu. N’ime ọnwa 18, ha na-eduzi ihe karịrị 40 ọmụmụ ihe!
Na mbụ, a na-enwe nzukọ kpọmkwem n’ebe ahụ a na-anụcha shuga. Otú ọ dị, ndị nkwusa ọhụrụ ahụ chọrọ ịhụ ezigbo Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’ihi ya, a natara otu bọs n’ego iji buru 75 ndị mmadụ gaa n’ọgbakọ dịkarịsịrị ha nso. Ihe ọzọ na-esonụ bụ mgbakọ; 45 n’ime ndị ọhụrụ ahụ na-amụ Bible bịara, a gbakwara ha ajụjụ ọnụ. E mere 15 n’ime ndị a baptism n’oge ahụ. Ọ baghị uru ikwuwe ya na anya mmiri nke ọṅụ jupụtara ndị mmadụ n’anya!
E jikwa otu ụlọ ọrụ bọs ahụ mee ihe maka njem ndị yiri nke ahụ, ndị isi ọrụ ya narakwaara ọnụ ego pụrụ iche. N’obi ekele, Antonio nyere onye nwe ụlọ ọrụ ahụ otu ihe e ji amụ Bible. O kwenyere ịmalite ịmụ Bible n’uhuruchi ahụ kpọmkwem, e mekwara ya baptism mgbe ọtụtụ ọnwa nke ịmụsi ihe ike gasịrị. Na mbụ, nwunye ya megidere ọmụmụ ihe ahụ, ma ka oge na-aga, omume ya dịrị nro. Taa ya onwe ya kwa bụ Onyeàmà e mere baptism nke Jehova.
Na February 1992 e hiwere otu ọgbakọ nwere 22 ndị nkwusa na-arụsi ọrụ ike. Ka ọ na-erule 1994 ọnụ ọgụgụ a amụbawo ruo 42, na-enwe ndị ọsụ ụzọ 4, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile nke ozi ọma ahụ. Dị ka ihe si na nke a pụta, ka Antonio kwubiri: “Mụ na nwunye m ahụwo na ọ bụrụ na anyị ‘anwaa Jehova,’ dị ka Malakaị 3:10 na-ekwu, ọ ‘ga-awụsa anyị ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’”
Inyefe Akwụkwọ Ndị Dabeere na Bible
Eleghị anya ihe ọzọ mere ọrụ nkwusa ahụ ji na-enwe ọganihu dị ukwuu dị otú a na Brazil bụ n’ihi na Ndịàmà na-enyefe akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Dị ka ihe atụ, otu ọgbakọ degaara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society akwụkwọ na-arịọ ka e nye ha 250 mkpụrụ akwụkwọ Questions Young People Ask—Answers That Work. N’ihi gịnị ka e ji tụọ nnukwute ọda ahụ?
Akwụkwọ ozi ahụ kọwara: ‘Otu n’ime ụlọ akwụkwọ ndị dị n’obodo a ekpebiwo iji akwụkwọ a eme ihe dị ka ihe e ji akụzi ihe n’otu n’ime ihe ọmụmụ ya. Mkpebi nke ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ bụ n’ihi àmà mberede nke ndị nne na nna ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà Jehova nakwa nke otu n’ime ndị nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ gbara. Ka Jehova nọgide na-agọzi ndị ohu ya ka ha ji akwụkwọ a na-enye ntụziaka ọma.’ Ee, ka Jehova nọgidekwa na-agọzi ọganihu ọma nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ala ahụ buru oké ibu bụ́ Brazil.
[Igbe dị na peeji nke 8]
IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ
Afọ Ije Ozi 1994
ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 385,099
NKEZI: 1 Onyeàmà maka 404
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 1,018,210
NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ́ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 38,348
NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 461,343
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 24,634
ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 5,928
ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: CESÁRIO LANGE
[Foto dị na peeji nke 9]
Ụgbọ ala nwere ígwè e ji ekwu okwu nke e ji mee ihe na São Paulo ihe dị ka n’afọ 1940
[Foto dị na peeji nke 9]
Ịgba àmà na Botanical Garden dị na Rio de Janeiro
[Foto dị na peeji nke 9]
Alaka ụlọ ọrụ na Cesário Lange