Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/15 p. 31
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Na-ebi Akwụkwọ nke Hapụrụ Akara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Chọọ Eziokwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • À Pụrụ Inweta Eziokwu Okpukpe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/15 p. 31

Ị̀ Na-echeta?

Ì nwewo obi ụtọ ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-achọta ya ịbụ ihe na-adọrọ mmasị ichetaghachi ihe ndị na-esonụ:

▫ À pụrụ inweta eziokwu okpukpe?

Jisọs Kraịst sịrị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Jisọs egosipụtaghị nanị na a pụrụ inweta eziokwu kama o gosiri na ịchọta ya bụ ihe a chọrọ n’ofufe anyị na-efe Chineke. Ọ gwara otu nwanyị Sameria, sị: “Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23)—4/15, peji nke 5.

▫ Ònye bụ Robert Estienne, oleekwa otú o si hapụ akara ya?

Robert Estienne bụ onye na-ebi akwụkwọ dịrị ndụ na narị afọ nke 16. O tinyere ndụ ya ná mbipụta nke Akwụkwọ Nsọ ma gbalịsie ike ikpughepụ okwu nile nke Bible dị ka e si dee ha na mbụ. Usoro ya nke ikebi ihe odide Bible gaa n’amaokwu ndị e nyere nọmba bụ usoro e ji eme ihe ebe nile taa.—4/15, peji nke 10, 14.

▫ Olee otú anyị si erite uru site n’ọgụgụ Bible kwa ụbọchị?

Akwụkwọ Nsọ na-apụta ihe ọhụrụ nye anyị mgbe nile, amụma ndị metụtakwara mgbe ikpeazụ na-aghọ ihe dị ebube n’ihi ihe ndị anyị hụworo, nụ, ma nwee ahụmahụ ha n’onwe anyị. Ka ahụmahụ nke onwe anyị ná ndụ na-agbasawanye, anyị ana-anagidekwa nsogbu dị iche iche, anyị na-aghọta n’ụzọ zuru ezu karị ndụmọdụ nke Bible. (Ilu 4:18)—5/1, peji nke 15.

▫ Olee otú a pụrụ isi cheta akụkụ Bible dị iche iche?

Ka ị na-agụ Bible, katụ amaokwu ndị ị họọrọ bụ́ ndị ị ga-achọ icheta akara, ma ọ bụ detuo ha na kaadị ma tinye ndị a n’ebe ị ga na-ahụ ha kwa ụbọchị. Ka ị na-eme mgbalị iji buru amaokwu ndị ahụ n’isi, tụgharịa uche na ha ma jiri ha mee ihe. Anwala iburu ọtụtụ ihe n’isi otu mgbe, eleghị anya nanị otu ma ọ bụ abụọ kwa izu.—5/1, peji nke 16, 17.

▫ Ihe ọmụma dị aṅaa ka Oziọma Luk nwere nke bụ́ ihe ntụkwasị n’ihe ndị ọzọ so dee Oziọma ahụ dere?

Ọ bụ ezie na ihe dị ukwuu n’ihe Luk dere yiri ihe ndekọ nke Matiu, 59 pasent dị iche. Luk dekọrọ ọrụ ebube isii ndị dị nanị n’akwụkwọ ya, ma kọọ ihe jiri okpukpu abụọ karịa ọtụtụ n’ime ilu Jisọs nke ndị ọzọ dere Oziọma na-akpọtụghị aha.—5/15, peji nke 12.

▫ Olee mgbukepụ ìhè nke eziokwu ndị pụtara ìhè e kpughere na 1935?

N’afọ ahụ ndị Jehova bịara ghọta na oké ìgwè mmadụ ahụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe 7:9, 14 adịghị ezo aka ná ndị òtù eluigwe ndị nọ n’ọkwá nke abụọ, kama n’ebe ndị olileanya ha bụ n’elu ala nọ. (Jọn 10:16)—5/15, peji nke 20.

▫ N’ụzọ ndị dị aṅaa dị irè ka anyị pụrụ isi kasie ndị na-eru újú obi?

Gee ntị. Nye ihe mmesi obi ike. Nọrọ nso. Bute ụzọ n’ime ihe mgbe o kwesịrị ekwesị. Dega akwụkwọ ozi ma ọ bụ ziga kaadị na-akasi obi. Soro ha kpee ekpere. (Jemes 5:16) Nọgide na-enyere ha aka.—6/1, peji nke 13, 14.

▫ Gịnị ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ pụrụ ime iji nyere ndị bi n’ezinụlọ ndị e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe aka iji na-atachi obi?

Mgbe mgbe, na-agwa ha okwu na-agba ume, na-ewuli elu, na-akasikwa obi. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Nke a na-arụ ọrụ dị ka ihe na-enye uche na ahụ ha ume ọhụrụ. Mgbe a pụrụ ime ya, mgbe o kwesịkwara ekwesị, gụnye ha n’ihe omume gị dị iche iche nke ọchịchị Chineke na nke nnọkọ mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Cheta ha n’ekpere gị. (Ndị Rom 1:9; Ndị Efesọs 1:16)—6/1, peji nke 29.

▫ Ụgwọ ọrụ ndị dị aṅaa na-abịa site n’inwe ndidi ka anyị na-ekere òkè n’ozi ubi?

Ndidi na-enyere onye nkwusa Alaeze aka ịtachiri enweghị mmasị ma ọ bụ mmegide ọ bụla obi. Kama iso ndị nwe ụlọ iwe ji na-arụ ụka, ndị ozi na-enwe ndidi ga-enwe ike inye azịza dị nro ma ọ bụ jiri nwayọọ pụọ, si otú ahụ nọgide na-enwe udo na ọṅụ. (Matiu 10:12, 13) Ọzọkwa, a ga-adọta ndị yiri atụrụ n’ozi Alaeze ahụ.—6/15, peji nke 9.

▫ N’ihi gịnị ka ịmara eziokwu Bible ji baa oké uru?

Ịmara eziokwu na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ụgha, nghọgbu, na nkwenkwe ụgha dị iche iche. Mgbe anyị na-ebi ndụ kwekọrọ na ya, eziokwu na-ewusi anyị ike ịtachiri ihe isi ike obi, na-enyekwa anyị olileanya nke na-enyere anyị aka iguzosi ike n’okpuru ule.—7/1, peji nke 8.

▫ Olee ibu ọrụ bụ́ isi nke ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ weghaara site n’Israel anụ ahụ?

Ihe ùgwù nke ịgba àmà maka ịdị ukwu nke Jehova n’etiti mba nile. (Aịsaịa 43:21; 1 Pita 2:9)—7/1, peji nke 19.

▫ Gịnị ka okwu Pita onyeozi gụnyere na di kwesịrị ‘ikenye nwunye ya nsọpụrụ’? (1 Pita 3:7)

Di nke na-asọpụrụ nwunye ya adịghị ewetu ya ala ma ọ bụ lelịa ya. Kama nke ahụ, ọ na-egosi site n’okwu ya na omume ya—na nzuzo na n’ihu ọha—na o ji ya kpọrọ oké ihe. (Ilu 31:10-31)—7/15, peji nke 19.

▫ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ bụ ihe ịhụnanya ịchụpụ onye na-eme ihe ọjọọ nke na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ ndị Kraịst?

Nchụpụ bụ ngosipụta nke ịhụnanya maka Jehova na ụzọ ya nile. (Abụ Ọma 97:10) Ọ na-egosi ịhụnanya maka ndị na-agbaso ụzọ ezi omume n’ihi na ọ na-ewepụ n’etiti ha onye pụrụ ịkpa ike ọjọọ n’ahụ ha; nke a na-echebekwa ịdị ọcha nke ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:1-13)—7/15, peji nke 25.

▫ Olee otú a pụrụ isi mata taa “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke Jisọs kwuru banyere ya na Matiu 24:45-47?

A na-amata ha karịsịa site n’ọrụ ha na-arụ n’iwepụta akwụkwọ dị iche iche dabeere na Bible, n’izi ihe na n’ikwusa ‘ozi ọma nke alaeze,’ nakwa nrapagidesi ike ha n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Matiu 24:14; 28:19, 20)—8/1, peji nke 16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya