Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/15 p. 10-14
  • Onye Na-ebi Akwụkwọ nke Hapụrụ Akara Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Na-ebi Akwụkwọ nke Hapụrụ Akara Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Vulgate nke A Nụchara Anụcha
  • Onye Na-ebiri Eze Akwụkwọ
  • Sorbonne Megide Ndozigharị Ahụ
  • Sorbonne Emee Mwakpo
  • Ndị Nkà Mmụta Okpukpe Amachibido Bible Ya Iwu
  • Onye E Boro Ebubo Ịbụ Onye Jụrụ Okwukwe
  • Onye Na-ebi Akwụkwọ nke Gbapụrụ n’Ala Ya
  • Ị̀ Na-echeta?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ònye Tinyere Isiakwụkwọ na Amaokwu Ndị Dị́ na Baịbụl?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Complutensian Polyglot—Ngwá Ọrụ Nsụgharị Mere Ihe Akụkọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/15 p. 10-14

Onye Na-ebi Akwụkwọ nke Hapụrụ Akara Ya

Ọ̀ DỊWO mgbe ị chọrọ ịchọta amaokwu na Bible ma ị pụghị icheta ebe ọ dị? Ma, site n’icheta nanị otu okwu, i nwere ike ịchọta ya na-eji akwụkwọ ndepụta okwu ndị dị na Bible. Ma ọ bụ ma eleghị anya ị gawo mgbakọta ndị Kraịst ebe ọtụtụ narị, ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ puku, ndị na-ege ntị nwere ike ịsapeta Bible ha ịgụ otu akụkụ ihe odide nanị sekọnd ole na ole mgbe a kpọsịrị ya.

N’ọnọdụ nke ọ bụla, i ji otu nwoke onye ọ pụrụ ịbụ na ị maghị ụgwọ. O mere ka ọmụmụ Bible gị kara mfe, o kerekwaara òkè n’ịhụ na anyị nwere taa Bible ndị ziri ezi. O nwere mmetụta ọbụna n’ụzọ ọtụtụ Bible dị n’anya taa.

Nwoke ahụ bụ Robert Estienne.a Ọ bụ onye na-ebi akwụkwọ, nwa nwoke nke onye na-ebi akwụkwọ, na Paris, France, ná nso mmalite nke narị afọ nke 16. Ọ bụ ọgbọ nke Oge Ntụte na Ndozigharị ahụ. Ígwè obibi akwụkwọ ghọrọ ngwá ọrụ maka oge abụọ ahụ. Henri Estienne, nna Robert, bụ onye na-ebi akwụkwọ a ma ama, na-ewepụta ụfọdụ n’ime mbipụta ndị kasị mma nke akwụkwọ ndị e biri n’Oge Ntụte ahụ. Ọrụ ya gụnyere akwụkwọ agụmakwụkwọ na Bible maka University of Paris na ụlọ akwụkwọ ya nke nkà mmụta okpukpe—Sorbonne.

Ma ka anyị lekwasị anya n’ebe nwa ya nwoke, Robert Estienne nọ. A maara ihe dị nta banyere agụmakwụkwọ ya. Ma, site na nwata, ọ mụtara Latin nke ọma, mụtakwa Grik na Hibru ngwa ngwa. Site n’aka nna ya, Robert mụtara nkà ibi akwụkwọ. Mgbe o weghaara ụlọ ọrụ ibi akwụkwọ Henri na 1526, Robert Estienne abụrụworị onye a ma ama dị ka onye mmụta nke na-amụta asụsụ nke ukwuu. Ọ bụ ezie na o biri mbipụta dị iche iche nke nkatọ maka ọtụtụ akwụkwọ Latin na akwụkwọ nkà mmụta ndị ọzọ, ebe ịhụnanya mbụ ya na nke a na-agbaghaghị agbagha dị bụ na Bible. N’ịnụ ọkụ n’obi imezuru Bible nke Latin ihe e mezuwoororịị akwụkwọ nkà mmụta dị iche iche nke Latin, Estienne banyere n’ọrụ iguzobeghachi ihe fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ ruo otú nile o kwere omume mbipụta nke narị afọ nke ise nke Bible Latin Vulgate nke Jerome.

Vulgate nke A Nụchara Anụcha

Jerome sụgharịrị site na Hibru na Grik mbụ nke Bible, ma ka ọ na-eru n’ụbọchị Estienne, Vulgate ahụ adịworị adị ruo otu puku afọ. Ọtụtụ ihe ndị na-ezighị ezi na ngwagbu egbebatawo dị ka ihe sitere n’ọtụtụ ọgbọ nke iji aka edepụtaghachi Vulgate ahụ. Ọzọkwa, n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, okwu ndị Chineke nyere ike mmụọ nsọ ha nke Bible abụrụwo ndị e ji ùkwù e kekọtara ekekọta nke akụkọ ifo ndị oge ahụ, nkọwa ihe odide, na ihe ndị na-abụghị ezie e tinyegasịrị kpuchite. Ndị a agwakọtawo nke ukwuu n’ihe e dere na Bible nke na a malitere ịnakwere ha dị ka ihe odide ndị sitere n’ike mmụọ nsọ.

Iji wepụsịa ihe nile na-adịbughị, Estienne jiri usoro nke nkatọ ihe odide e jiri mee ihe maka ọmụmụ nke akwụkwọ nkà ihe ọmụma mee ihe. Ọ chọtara akwụkwọ mpịakọta ndị kasị ochie na ndị kasị mma e nwere. N’ọbà akwụkwọ ndị dị n’ime na gburugburu Paris na n’ebe ndị dị ka Évreux na Soissons, ọ chọtara ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta ndị ochie, nke otu yiri ka e dere ya na narị afọ nke isii. Estienne jiri nlezianya tụlee ihe odide Latin ndị ahụ site n’otu akụkụ ihe odide gaa n’ọzọ, na-ahọrọ nanị akụkụ ihe odide ndị yiri ka ha nwere ihe nkwado kasịnụ. Ihe o mesịrị rụpụta, Bible Estienne, bụ nke e bipụtara mbụ ya na 1528, ọ bụkwa nzọụkwụ dị ịrịba ama n’ịga n’ihu n’ịnụcha izi ezi nke ihe e dere na Bible. Mbipụta ndị e meziwanyere nke Estienne sochiri. Ndị ọzọ bu ya ụzọ anwawo idozi Vulgate ahụ, ma nke ya bụ mbipụta nke mbụ nyere ihe nkatọ dị irè. N’agbata peji ya gasị, Estienne gosiri ebe ọ hapụworo akụkụ ihe odide a na-enyo enyo ma ọ bụ ebe a pụrụ inwe ihe karịrị otu ụzọ isi gụọ ya. O detukwara ebe o si nweta akwụkwọ mpịakọta ndị nyere nkwado maka ndezigharị ihe ndị a.

Estienne webatara ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị nnọọ ọhụrụ na narị afọ nke 16. O kewara akwụkwọ dị iche iche nke Apọkrịfa na Okwu Chineke. O debere akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi mgbe Oziọma ndị ahụ gasịrị na tupu akwụkwọ ozi nile nke Pọl. N’elu peji nke ọ bụla, o nyere okwu ole na ole bụ isi iji nyere ndị na-agụ ya aka ịchọta akụkụ ihe odide dị iche iche. Nke a bụ ihe atụ mbụ nke ihe a na-akpọkarị taa isiokwu nchịkọta. Kama iji mkpụrụ aka akwụkwọ dị okpotokpo nke ndị Goth, ma ọ bụ nke ojii, nke malitere na Germany, Estienne bụ otu n’ime ndị mbụ biri Bible dum ná mkpụrụ aka akwụkwọ na-agbaghị okpotokpo na nke guzo ọtọ, bụ́ ndị ka mfe ọgụgụ, bụ́ nke a na-ejikarị eme ihe ugbu a. O nyekwara ọtụtụ ntụaka etiti peji na ihe odide ịrịba ama maka ọmụmụ ihe iji nye aka ime ka akụkụ ihe odide ụfọdụ doo anya.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndị ụkọchukwu nwere mmasị na Bible Estienne, n’ihi na ọ ka mbipụta ọ bụla ọzọ nke Vulgate mma. Maka ịma mma, nkà ọrụ, na ịba uru, mbipụta ya ghọrọ ụkpụrụ ọ̀tụ̀tụ̀, n’isi nso kwa bụrụ nke a na-eṅomi na Europe nile.

Onye Na-ebiri Eze Akwụkwọ

“Ị̀ hụwo mmadụ nke [nwere nkà, NW] n’ije ozi ya? n’ihu ndị eze ka ọ ga-eguzo onwe ya,” ka Ilu 22:29 na-ekwu. Nkà ọrụ nchepụta ihe na ikike ịnụ asụsụ dị iche iche nke Estienne agafenahụghị Francis nke Mbụ, bụ́ eze France. Estienne ghọrọ onye na-ebiri eze akwụkwọ na Latin, Hibru, na Grik. Otú a, Estienne wepụtara ihe ka nọgidere na-abụ ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị kasị mma na French. Na 1539 ọ malitere ibi Bible Hibru dum mbụ nke kasịkwa mma nke e biri na France. Na 1540 o webatara ihe osise na Bible Latin ya. Ma kama ihe osise ndị mara mma nke ihe ndị mere eme na Bible dị ka a na-ahụkarị n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, Estienne sere ihe osise ndị na-ezi ihe ndị dabeere n’ihe àmà nkà ihe ndị e gwupụtara n’ala ma ọ bụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na nkọwa ndị a na-achọta n’ime Bible n’onwe ya. Ihe ndị a e ji osisi e bekatara ebekata bie gosiri n’ụzọ zuru ezu isiokwu ndị dị ka igbe ọgbụgba ndụ ahụ, uwe onye isi nchụàjà, ụlọikwuu, na ụlọ nsọ Solomọn.

N’iji mkpụrụ aka akwụkwọ ndị Grik ọ tụworo ọda ya maka ibi nchịkọta akwụkwọ mpịakọta eze, Estienne gara n’ihu iwepụta mbipụta nkatọ nke mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na mbipụta abụọ mbụ nke ihe odide Grik nke Estienne akachaghị nke Desiderius Erasmus mma, ná mbipụta nke atọ nke 1550, Estienne gbakwụnyere ụmụ irighiri ihe na ntụaka dị iche iche site n’ihe dị ka akwụkwọ mpịakọta 15, gụnyere Codex Bezae nke narị afọ nke ise O.A. na Bible Septuagint. Mbipụta nke a nke Estienne bụ nke a nakweere nke ukwuu nke na o mesịrị bụrụ ihe ndabere nke ihe ahụ a na-akpọ Textus Receptus, ma ọ bụ Ihe Odide A Nakweere, nke ọtụtụ nsụgharị ndị mesịrị sochie, gụnyere King James Version nke 1611, dabeere na ya.

Sorbonne Megide Ndozigharị Ahụ

Site n’echiche Luther na nke ndị Ndozigharị ndị ọzọ ịgbasa ebe nile na Europe, Chọọchị Katọlik nwara ịchịkwa ihe ndị mmadụ na-eche site n’ịchịkwa ihe ha na-agụ. Na June 15, 1520, Pope Leo nke Iri enyewo iwu onye popu na-enye iwu ka a ghara ibi, ire, ma ọ bụ ịgụ akwụkwọ ọ bụla nwere “ihe ịjụ okwukwe” n’ala Katọlik ọ bụla ma na-achọ ka ndị isi ọchịchị tinye iwu onye popu ahụ n’ọrụ n’ebe ndị ha na-achị. N’England, Eze Henry nke Asatọ hapụụrụ bishọp Katọlik bụ́ Cuthbert Tunstall ọrụ inyocha akwụkwọ. Otú ọ dị, n’ihe kanụ na Europe nile, ike a na-adịghị ama aka n’okwu ozizi, ndị na-esote popu, bụ ngalaba nkà mmụta okpukpe na University of Paris—bụ́ Sorbonne.

Sorbonne bụ ọnụ na-ekwuru Katọlik omenala. Ruo ọtụtụ narị afọ, e lewo ya anya dị ka mgbidi na-akwado okwukwe Katọlik. Ndị nnyocha akwụkwọ nke Sorbonne megidere mbipụta nkatọ nile na nsụgharị asụsụ ndị ọzọ nke Vulgate, na-ele ihe dị otú ahụ anya ọ bụghị nanị dị ka “ihe na-abaghịrị chọọchị ahụ uru kamakwa dị ka nke na-emerụ ahụ.” Nke a abụghị ihe ijuanya n’oge mgbe ndị Ndozigharị na-arụ ozizi, ememe, na ọdịnala ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ ụka. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nkà mmụta okpukpe na Sorbonne lere ozizi chọọchị ndị a na-asọpụrụ anya dị ka ihe ndị ka mkpa karịa idepụta Bible n’onwe ya n’ụzọ ziri ezi. Otu ọkà mmụta okpukpe sịrị: “Ozugbo e nwetara ozizi ndị ahụ, Akwụkwọ Nsọ dị ka ubube e ji arị elu nke a na-ebupụ mgbe e wusịrị mgbidi.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ngalaba mmụta ahụ amaghị Hibru na Grik, ma ha katọrọ ọmụmụ ihe Estienne na nke ndị mmụta ndị ọzọ nke Oge Ntụte na-enwe bụ́ ndị na-emikpu emikpu n’ihe mbụ okwu ndị e jiri mee ihe na Bible pụtara. Otu prọfesọ nke Sorbonne ọbụna nwara ikwu na “ịgbasawanye ihe ọmụma Grik na Hibru ga-eduje n’ibibi okpukpe nile.”

Sorbonne Emee Mwakpo

Ọ bụ ezie na mbipụta ndị mbụ nke Vulgate Estienne gafere ndị nnyocha ngalaba mmụta ahụ, ọ bụghị n’enweghị esemokwu. Laa azụ na narị afọ nke 13, a fụchiwo Vulgate ahụ dị ka Bible mahadum ahụ ji eme ihe, nyekwa ọtụtụ ndị ihe odide ya bụ nke na-apụghị inwe ihe ndị na-ezighị ezi. Ọbụna na ngalaba ahụ amaworị ọkà mmụta bụ́ Erasmus a ma ama ikpe n’ihi ọrụ ya na Vulgate ahụ. Na onye nkịtị nke obodo ahụ ga-enwe anyaike idezi ihe odide ahụ iwu kwadoro bụ ihe nkụja nye ụfọdụ.

Ma eleghị anya karịa ihe ọ bụla ọzọ, ọ bụ okwu ịrịba ama ndị Estienne dere n’agbata peji nyere ndị ọkà mmụta okpukpe ahụ nsogbu. Okwu ịrịba ama ndị ahụ welitere ajụjụ n’izi ezi nke ihe odide nke Vulgate. Ọchịchọ Estienne ime ka akụkụ ihe odide ụfọdụ doo anya kpatara ya ịbụ onye e boro ebo ịmanye aka n’ógbè nkà mmụta okpukpe. Ọ gọrọ ebubo ahụ, na-azọrọ na okwu ịrịba ama ya nile bụ nanị nchịkọta ndị dị mkpirikpi ma ọ bụ n’ụdị nke nkọwa. Dị ka ihe atụ, okwu ịrịba ama ya na Jenesis 37:35 kọwara na okwu ahụ bụ “hell” [Latin, infernum] bụ nke a na-apụghị ịghọta n’ebe ahụ ịbụ ebe a na-ata ndị ọjọọ ahụhụ. Ngalaba ahụ kwuru na ọ jụrụ anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ikike ịrịọchite arịrịọ nke “ndị nsọ.”

Otú ọ dị, Estienne nwere ihu ọma na nchebe nke eze. Francis nke Mbụ gosiri mmasị dị ukwuu n’ihe ọmụmụ Oge Ntụte ahụ, karịsịa ọrụ nke onye na-ebiri ya bụ́ eze akwụkwọ. A kọrọ na Francis nke Mbụ ọbụna letara Estienne, n’otu oge kwa jiri ndidi chere ka Estienne na-eme ndezigharị ụfọdụ ndị ikpeazụ n’otu ihe odide. Site ná nkwado eze, Estienne guzogidere Sorbonne.

Ndị Nkà Mmụta Okpukpe Amachibido Bible Ya Iwu

Ma, na 1545, ihe ndị merenụ mere ka ọnụma dum nke ngalaba mmụta Sorbonne ahụ wụkwasị Estienne. N’ịhụ uru nke imekọ ihe ọnụ megide ndị Ndozigharị ahụ, mahadum Katọlik ndị nke Cologne (Germany), Louvain (Belgium), na nke Paris eburuwo ụzọ kwere imekọ ihe ọnụ n’inyochasị nkụzi ndị na-abụghị ndị nke omenala. Mgbe ndị nkà mmụta okpukpe nke Louvain University degaara Sorbonne akwụkwọ na-egosipụta ijuanya ha na Bible Estienne apụtaghị ná ndepụta Paris nke akwụkwọ ndị a kagburu, Sorbonne ji ụgha zaghachi na ha gaara akagbuworị ha ma a sị na ha hụrụ ha. Ndị iro Estienne n’ime ngalaba mmụta ahụ ugbu a nwere obi ike na ikike e jikọtara ọnụ nke ngalaba mmụta Louvain na nke Paris ga-ezu ezu ime ka Francis nke Mbụ kweta n’ihie ụzọ nile nke onye na-ebiri ya akwụkwọ.

Ka ọ dị na mgbe ahụ, n’ịbụ onye a dọworo aka ná ntị banyere ihe ndị iro ya bu n’uche, Estienne bu ụzọ gakwuru eze. Estienne tụrụ aro na ọ bụrụ na ndị nkà mmụta okpukpe ahụ ga-eweta ndepụta nke ihe ọ bụla na-ezighị ezi ha chọtaworo, na ya dị nnọọ njikere ibipụta ndị a tinyere ndezigharị nke ndị nkà mmụta okpukpe ahụ na itinye ha na Bible nke ọ bụla a na-ere. Ihe ngwọta nke a nwetara nkwado eze. Ọ gwara Pierre du Chastel, onye na-ahụ maka okwu okpukpe eze, ilekọta okwu ahụ. N’October 1546 ngalaba ahụ degaara Du Chastel akwụkwọ na-eme mkpesa na Bible Estienne bụ “nri maka ndị na-agọnarị Okwukwe anyị ma na-akwado . . . ihe ịjụ okwukwe . . . ndị e nwere ugbu a” nakwa na ha jupụtara nnọọ n’ihe ndị na-ezighị ezi nke na ha ruru eru “n’ozuzu ha ịbụ ndị e kpochapụrụ ma mee ka ha ghara ịdịkwa.” N’abụghị onye e mere ka o kwere, ugbu a eze ahụ ji aka ya nye iwu ka ngalaba ahụ wepụta ihe ndị ha nyochapụtara ka e wee binye ndị a na Bible Estienne. Nke a ka ha kwere nkwa ime, ma n’ezie ha mere ihe nile ha pụrụ ime iji zere iwepụta ndepụta ọ bụla nke ihe ndị e chere na-ezighị ezi.

Francis nke Mbụ nwụrụ na March 1547, ọnwụ ya wetakwara mfu nke onye kasị ike na-akwado Estienne megide ike Sorbonne ahụ. Mgbe Henry nke Abụọ nọkwasịrị n’ocheeze, o mere ka iwu nna ya nyere dịghachi ọhụrụ ka ngalaba ahụ wepụta ihe ndị ha nyochapụtara. Ka o sina dị, n’ịhụ ụzọ ndị eze Germany si na-eji Ndozigharị ahụ eme ihe maka uru ndọrọ ndọrọ ọchịchị, Henry nke Abụọ enwekebeghị mmasị n’uru ma ọ bụ ọghọm ndị a sị na ha dị na Bible nke onye na-ebiri eze akwụkwọ karịa ka o nwere n’ịhụ na France nọgidere na-abụ nke Katọlik ma bụrụ nke dị n’otu n’okpuru eze ọhụrụ ya. Na December 10, 1547, Nzukọ Òtù Ndụmọdụ nke eze kpebiri na e kwesịrị ịmachibido orire nke Bible Estienne ruo mgbe ndị nkà mmụta okpukpe wepụtara ndepụta ha nke ihe ndị ha nyochapụtara.

Onye E Boro Ebubo Ịbụ Onye Jụrụ Okwukwe

Ngalaba ahụ chọrọ ugbu a ụzọ isi rara okwu Estienne tinye n’aka ụlọikpe pụrụ iche nke a ka guzobere ọhụrụ ikpe ikpe ịjụ okwukwe. Estienne enweghị mkpa maka ihe ncheta nke ihe ize ndụ ọ nọ na ya. N’ime afọ abụọ nke nhiwe ya, a marawo ụlọikpe ahụ ama dị ka chambre ardente, ma ọ bụ “ọnụ ụlọ na-ere ọkụ.” E gbuwo ihe dị ka 60 mmadụ n’elu osisi, gụnyere ụfọdụ ndị na-ebi na ndị na-ere akwụkwọ bụ́ ndị a kpọrọ ọkụ ná ndụ na Place Maubert, ebe na-ewe ije ụkwụ nanị minit ole na ole site n’ụlọ Estienne. A kwaghasịrị ụlọ Estienne ugboro ugboro iji chọta ihe àmà ụfọdụ megide ya. A gbara ihe karịrị 80 ndị akaebe ajụjụ. E kwere ndị ọgba àmà nkwa inweta otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ngwongwo ya ma ọ bụrụ na a pụrụ ịma ya ikpe ịjụ okwukwe. Ma, nanị ihe àmà ha nwere bụ ihe Estienne bipụtara n’ihu ọha n’ime Bible ya.

Ọzọ eze nyere iwu ka e nyefee Nzukọ Òtù Ndụmọdụ ya ndepụta nke ihe ngalaba ahụ nyochapụtara. N’ịkpọ ekwo nkụ, ngalaba ahụ zaghachiri na ‘ndị ọkà mmụta okpukpe enweghị àgwà nke ide ihe ndị mere ha ji machibido ihe iwu dị ka nke ịjụ okwukwe ede kama na ha na-azaghachi nanị n’okwu ọnụ, bụ́ nke ị na-aghaghị ikwere, ma ọ́ bụghị ya a gaghị enwe ọgwụgwụ nke ide ihe.’ Henry kwenyere. E tinyere mmachibido iwu ikpeazụ. A kagburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ nile metụtara Bible nke Estienne bipụtatụrụla. Ọ bụ ezie na ọ lanarịwo ire ọkụ nke Place Maubert, o kpebiri ịhapụ France n’ihi mmachibido iwu nke Bible ya nile na iyi egwu ndị pụrụ ịdapụta n’ihu.

Onye Na-ebi Akwụkwọ nke Gbapụrụ n’Ala Ya

Na November 1550, Estienne kwagara Geneva, Switzerland. Ngalaba ahụ emewo ya ihe megidere iwu na France ibipụta Bible ọ bụla e wezụga Vulgate. Ugbu a o nweere onwe ya ibipụta ihe ọ chọrọ, Estienne bigharịrị “Agba Ọhụrụ” ya nke Grik na 1551, na-enwe nsụgharị Latin abụọ (nke Vulgate na nke Erasmus) na kọlụm ndị na-echerịta ibe ha ihu. Nke a ka o ji nsụgharị French nke Akwụkwọ Nsọ Grik na kọlụm ndị na-eche ihe odide Latin nke Erasmus ihu sochie na 1552. Ná mbipụta abụọ ndị a, Estienne webatara usoro ya nke ikebi ihe odide Bible gaa n’amaokwu ndị e nyere nọmba—otu usoro ahụ e ji eme ihe ebe nile taa. Ọ bụ ezie na ndị ọzọ anwabuwo ụzọ dị iche iche isi kebie amaokwu, nke Estienne ghọrọ ụdị nke a nakweere. Bible French ya nke 1553 bụ Bible mbụ zuru ezu nke nwere nkebi amaokwu ya.

Bible Latin nwere nsụgharị abụọ nke Estienne nke 1557 dịkwa ịrịba ama n’ihi ya iji aha onwe onye nke Chineke, Jehova, mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dum. N’agbata peji nke abụ ọma nke abụọ, ọ rịbara ama na okwu ndochi ahụ bụ́ ʼAdho·naiʹ maka mkpụrụ okwu Hibru Tetragrammaton (יהוה) bụ nke dabeere kpam kpam ná nkwenkwe ụgha nke ndị Juu nakwa na e kwesịrị ịjụ ya. Ná mbipụta nke a, Estienne jiri mkpụrụ akwụkwọ ndị dị n’ụdị dị iche gosi okwu Latin ndị e webatara iji mee ka ihe okwu Hibru pụtara doo anya. Usoro ime ihe nke a bụ nke e mesịrị webata na Bible ndị ọzọ, ihe sitere n’oge ochie nke juworo ọtụtụ ndị na-agụ ihe anya taa bụ́ ndị usoro iji mkpụrụ akwụkwọ ndị dị n’ụdị dị iche egosi mmesi okwu ike bụ́ nke a na-eme taa mawooro ahụ.

N’ikpebisi ike iji mmụta ya baara ndị ọzọ uru, Estienne tinyere ndụ ya n’ibipụta Akwụkwọ Nsọ. Ndị ji Okwu Chineke kpọrọ ihe taa pụrụ inwe obi ekele maka mgbalị ya nile na maka ndọgbu ndị ọzọ dọgbusiri onwe ha n’ọrụ ike iji kpughepụ okwu nile nke Bible dị ka e si dee ha na mbụ. Usoro ha malitere na-anọgide na-aga n’ihu ka anyị na-enwekwu ezi ihe ọmụma nke asụsụ ndị mgbe ochie ndị ahụ ma na-achọpụta akwụkwọ mpịakọta ndị ka ochie na ndị ka zie ezie nke Okwu Chineke. Mkpirikpi oge tupu ọnwụ ya (1559), Estienne na-arụ ọrụ ná nsụgharị ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik. A jụrụ ya, sị: “Ònye ga-azụ ya? Ònye ga-agụ ya?” O ji obi ike zaa: ‘Ndị nile maara akwụkwọ bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.’

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E jikwa ụzọ Latin e si akpọ aha ya, Stephanus, na ụzọ nke Bekee, Stephens mara ya.

[Foto dị na peeji nke 10]

Mgbalị Robert Estienne enyeworo ọtụtụ ọgbọ nke ndị mmụta Bible aka

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bibliothèque Nationale, Paris

[Foto dị na peeji nke 12]

E ṅomiri ihe osise ndị na-ezi ihe nke Estienne ruo ọtụtụ ọgbọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Bibliothèque Nationale, Paris

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya