Ihe I Kwesịrị Ịma Banyere Ekworo
GỊNỊ bụ ekworo? Ọ bụ mmetụta uche siri ike nke pụrụ ime ka mmadụ nwee nchegbu, mwute, ma ọ bụ iwe. Anyị pụrụ inwe ekworo mgbe mmadụ yiri ka ọ na-enwe ihe ịga nke ọma n’otu ọrụ karịa anyị. Ma ọ bụ anyị nwere ike inwe ekworo mgbe enyi anyị na-anata otuto karịa ka anyị na-anata. Ma ọ̀ dị njọ mgbe nile ikwo ekworo?
Ndị ekworo rikpuru na-enyokarị ndị nwere ike ịma ha aka enyo. Eze Sọl nke Israel oge ochie bụ ihe atụ nke a. Na mbụ, ọ hụrụ onye na-eburu ya ihe agha ya, bụ́ Devid, n’anya, ọbụna na-ebuli ọkwá ya ịbụ onye isi ndị agha. (1 Samuel 16:21; 18:5) E mesịa otu ụbọchị Eze Sọl nụrụ ka ndị inyom na-eto Devid n’okwu ndị a: “Sọl etigbuwo ndị iro ya, [otu puku] ndị ikom, [otu puku] ndị ikom, Devid kwa ndị iro ya, [ọtụtụ puku iri] ndị ikom, [ọtụtụ puku iri] ndị ikom.” (1 Samuel 18:7) Sọl ekwesịghị ikweworị ka nke a metụta ezi mmekọrịta ya na Devid. Otú ọ dị, iwe were ya. “Sọl wee na-ele Devid anya ọjọọ site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.”—1 Samuel 18:9.
Onye na-ekwo ekworo pụrụ ịbụ onye na-achọghị ka ihe ọjọọ mee mmadụ. Ọ pụrụ nanị iwe iwe n’ihe ịga nke ọma nke enyi ya ma chọsie ike inwe ụdị àgwà ma ọ bụ ọnọdụ ahụ. N’aka nke ọzọ, ime anya ụfụ bụ kpọmkwem ụdị ekworo na-ezighị ezi. Onye na-eme anya ụfụ pụrụ ijichiri onye ahụ kpasuru ekworo ya ihe ọma ná nzuzo ma ọ bụ nwee ọchịchọ na ihe ọjọọ ga-adakwasị onye ahụ. Mgbe ụfọdụ, onye na-eme anya ụfụ apụghị izochi mmetụta ya. A pụrụ iduga ya n’imerụ onye ọzọ ahụ n’ihu n’ihu, dị ka Eze Sọl nwara igbu Devid. N’ihe karịrị otu mgbe, Sọl tụrụ ube ná mgbalị ‘ịtụgide Devid ná mgbidi.’—1 Samuel 18:11; 19:10.
Ị pụrụ ịzaghachi sị, ‘Ma abụghị m onye na-ekwo ekworo.’ N’eziokwu, e nwere ike ekworo adịghị achịkwa ndụ gị. Otú ọ dị, ruo n’ókè ụfọdụ, ekworo na-emetụta anyị nile—ekworo nke anyị na nke ndị ọzọ. Ọ bụ ezie na anyị na-adị ngwa ịhụta ekworo n’ebe ndị ọzọ nọ, anyị pụrụ ịbụ ndị na-adịghị ngwa n’ịhụ ya n’ime onwe anyị.
“Ọchịchọ Ime Anya Ụfụ”
Ihe ndekọ nke ọdịdị mmadụ na-eme mmehie dị ka e kpughere ya n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-emekarị ka mmehie nke ime anya ụfụ pụta ìhè. Ị̀ na-echeta akụkọ Ken na Ebel? Ụmụ Adam na Iv abụọ a chụụrụ Chineke àjà. Ebel mere nke ahụ n’ihi na ọ bụ nwoke nwere okwukwe. (Ndị Hibru 11:4) O nwere okwukwe n’ikike Chineke imezu nzube Ya dị ebube banyere ụwa. (Jenesis 1:28; 3:15; Ndị Hibru 11:1) Ebel kwenyekwara na Chineke ga-eji ndụ n’ime ụwa Paradaịs na-abịanụ kwụghachi ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ. (Ndị Hibru 11:6) N’ihi ya, Chineke gosiri obi ụtọ ya n’ebe àjà nke Ebel dị. Ọ bụrụ na Ken hụrụ nwanne ya n’anya n’ezie, ọ gaara enwe obi ụtọ na Chineke gọziri Ebel. Kama nke ahụ, Ken “wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu.”—Jenesis 4:5.
Chineke gbara Ken ume ime ezi ihe ka ya onwe ya kwa wee nwee ike ịnata ngọzi. Mgbe ahụ Chineke dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụkwa na i meghị nke ọma, n’ọnụ ụzọ ka mmehie na-amakpu dị ka anụ ọhịa: ọ bụkwa n’ebe ị nọ ka ọchịchọ ya dị, ma o kwesịrị ka gị onwe gị chịa ya.” (Jenesis 4:7) N’ụzọ dị mwute, Ken achịkwaghị iwe nke ekworo ya. O dubara ya n’igbu nwanne ya na-eme ezi omume. (1 Jọn 3:12) Kemgbe ahụ, ọgụ na agha dị iche iche egbuwo ọtụtụ narị nde mmadụ. “Ụfọdụ n’ime ihe ndị bụ isi na-akpata agha pụrụ ịbụ ọchịchọ maka inwekwu ala, ọchịchọ maka inwekwu akụ̀ na ụba, ọchịchọ maka inwekwu ike, ma ọ bụ ọchịchọ maka ịnọ ná ntụkwasị obi,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-akọwa.
Ezi ndị Kraịst adịghị ekere òkè n’agha nke ụwa a. (Jọn 17:16) Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute ndị Kraịst n’otu n’otu na-etinye aka n’ịgba égbè ọnụ mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na ndị òtù nke ọgbakọ adụnye úkwù, ọgụ ndị a pụrụ ịghọ agha okwu ọnụ na-emerụ ahụ. “Olee ebe ibu agha si bịa, olee ebe kwa ịlụ ọgụ si bịa, bụ́ nke dị n’etiti unu?” ka onye so dee Bible bụ́ Jemes jụrụ ndị kwere ekwe ibe ya. (Jemes 4:1) Ọ zara ajụjụ ahụ site n’ikpughe anyaukwu ha maka ihe onwunwe ha ma gbakwụnye, sị, “Unu na-aga n’ihu . . . na-enwe anyaukwu,” ma ọ bụ na-enwe “ekworo.” (Jemes 4:2, NW) Ee, ịhụ ihe onwunwe n’anya pụrụ iduje n’inwe anyaukwu na n’ikwoso ndị o yiri ka ha na-enwe ọnọdụ ndị ka mma ekworo. N’ihi nke a, Jemes dọrọ aka ná ntị megide “ọchịchọ ime anya ụfụ nke mmadụ.”—Jemes 4:5, NW.
Uru dị aṅaa dị n’ịtụle ihe ndị na-akpata ekworo? Nke a pụrụ inyere anyị aka ịkwụwa aka ọtọ na ịkwalite mmekọrịta dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ pụkwara inyere anyị aka inwekwu nghọta, ikwe ibe nọrọ, na mgbaghara. Karịsịa, ọ na-emesi ike mkpa dị ukwuu mmadụ nwere maka ndokwa ịhụnanya Chineke nke nzọpụta na nnapụta site n’ọchịchọ ime mmehie nke mmadụ.—Ndị Rom 7:24, 25.
Ụwa nke Na-enweghị Ekworo Mmehie
Site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ụwa nke na-enweghị ekworo mmehie pụrụ ịda ná ntị dị ka ihe na-apụghị ime eme. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Rom Landau kwetara, sị: “Nkwakọba amamihe nke ọtụtụ ọgbọ, ya na ihe nile ndị ọkà ihe ọmụma . . . na ndị ọkà n’ọrịa uche kwuworo n’isiokwu ahụ, adịghị enye onye ekworo na-enye nsogbu nduzi. . . . Ọ̀ dịwo onye dọkịta gwọtụrụla onye ekworo?”
Ma Okwu Chineke na-enye olileanya nke inweta ndụ mmadụ zuru okè n’ụwa ọhụrụ ebe ekworo na-adịghị asọpụrụ Chineke ma ọ bụ anya ụfụ na-agaghị eti onye ọ bụla ihe otiti ma ọlị. Ọzọkwa, ndị na-egosipụta ụdị àgwà ọjọọ ndị dị otú ahụ agaghị etisasị udo nke ụwa ọhụrụ ahụ.—Ndị Galetia 5:19-21; 2 Pita 3:13.
Ma, ọ bụghị ekworo nile bụ nke na-ekwesịghị ekwesị. N’ezie, Bible na-ekwu na Jehova bụ “Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 34:14) Gịnị ka nke ahụ pụtara? Gịnịkwa ka Bible na-ekwu banyere ekworo kwesịrị ekwesị? N’otu mgbe ahụ, olee otú mmadụ ga-esi merie ekworo na-ekwesịghị ekwesị? Lee isiokwu ndị na-esonụ.