Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 9/15 p. 5-6
  • Ekworo Fọrọ Nke Nta Ka O Bibie Ndụ M

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekworo Fọrọ Nke Nta Ka O Bibie Ndụ M
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịhụnanya Na-emeri Ekworo Na-ekwesịghị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ekworo Maka Ofufe Dị Ọcha nke Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Banyere Ekworo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ịdị Na-ekwo Ekworo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 9/15 p. 5-6

Ekworo Fọrọ Nke Nta Ka O Bibie Ndụ M

EKWORO n’ezie malitere imetụta ndụ m n’ụzọ dị njọ mgbe m lụrụ di nke abụọ mụ, bụ́ Mark.a Anyị abụọ aghaghị ilekọta ọtụtụ ụmụ anyị kuchiri ekuchi nakwa imeso ndị anyị lụburu omume. Mgbe ụfọdụ ọnọdụ ahụ na-anyịgbu anyịgbu. Mgbe ọ bụla e nwere esemokwu ezinụlọ, o yiri ka Mark akwadoghị m. M malitere iche na ọ ka hụrụ onye bụbu nwunye ya n’anya. Kama ịchịkwa ekworo m, m nyeere ya ohere ka ọ chịkwaa ndụ m. M na-enwe mmetụta ịbụ onye e yiri egwu mgbe ọ bụla onye bụbu nwunye Mark bịara.

M ga-anọgide na-eche Mark nche, ọbụna na-ele mkpụrụ anya ya anya iji mara ebe ọ na-ele anya. M na-akọwa anya ọ na-ele ịbụ ihe ndị ọ na-adịghịdị eche n’echiche. Mgbe ụfọdụ m ga-ebo ya ebubo ihu n’ihu ịbụ onye ka hụrụ onye bụbu nwunye ya n’anya. N’otu oge ihe a wutere ya nke na o bilitere ma si ná mgbakọ ndị Kraịst pụọ. Enwere m obi ọmụma ikpe n’ihu Jehova. Emere m ka ndụ ezinụlọ m dịrị njọ n’ihi na n’ikpeazụ o mesịrị metụtakwa ụmụ ahụ. Akpọrọ m onwe m asị maka ihe m na-eme, ma n’agbanyeghị ókè m gbalịsiri ike, o yighị nnọọ ka m pụrụ ịchịkwa ekworo m.

Kama inyere m aka, Mark malitere imegwara. Mgbe m boro ya ebubo, ọ ga-etisa m mkpu sị, “Ekworo, ị na-ekwo nnọọ ekworo.” Ọbụna o yiri ka ọ na-ama ụma mee m ka m kwoo ekworo. Eleghị anya o chere na nke a ga-agwọta ekworo m, ma nke a nanị mere ka ihe ka njọ. Ọ malitere ile ndị inyom ọzọ anya, na-ekwu banyere otú ha si maa mma n’anya. Nke a mere m ka m nwee mmetụta ịdị ala na ịbụ onye a na-achọghị ọbụna karị. O ruru n’ọnọdụ ebe mmetụta uche ọzọ—ịkpọasị—welitere isi ọjọọ ya. N’ọnọdụ ahụ, enwere m mgbagwoju anya nke na m chọrọ nnọọ ikewapụ onwe m n’ebe ya na ezinụlọ ya nọ.

Mgbe Bible na-asị na “ire ure nke ọkpụkpụ nile ka ekworo bụ,” nke ahụ bụ n’ezie ihe ọ bụ. (Ilu 14:30) Ọ malitere imetụta ahụ ike m ugbu a. Enwere m ọnyá afọ nke were ogologo oge ịla. Agara m n’ihu ime ka ndụ m dịrị njọ site n’inyo ihe ọ bụla Mark mere enyo. M ga-amagharị aka n’akpa uwe ya, ọ bụrụkwa na mụ achọta nọmba telifon, m ga-akpọ na fon ka m mara onye ga-aza. N’ime obi m ihere onwe m na-eme m, m ga-ebe ákwá n’ihi ihe ihere ahụ n’ihu Jehova. N’agbanyeghị nke a apụghị m ịkwụsị onwe m. Abụ m onye iro kasị njọ nke onwe m.

Ọnọdụ ime mmụọ m tara ahụhụ ruo n’ọnọdụ nke na apụkwaghị m ikpe ekpere. Ahụrụ m Jehova n’anya ma n’ezie chọọ ime ihe ziri ezi. Amaara m akụkụ akwụkwọ nsọ nile metụtara ndị di na nwunye, kama apụghị m itinye ha n’ọrụ. Na nke mbụ ya ná ndụ m, achọkwaghị m ịdị ndụ, n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ na m nwere ụmụaka mara mma.

Ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst bụ oké agbamume, ha gbalịkwara ihe nile ha nwere ike iji nyere m aka. Ma mgbe ha welitere ihe banyere ekworo m, m ga-agọnarị ya n’ihi mmechuihu, n’achọghị ikweta na m nwere ụdị nsogbu ahụ.

N’ikpeazụ, ahụ ike m kawanyere njọ ruo n’ókè nke na aghaghị m ịga ụlọ ọgwụ maka ịwa ahụ. Mgbe m nọ n’ebe ahụ aghọtara m na ndụ apụghị ịga n’ihu dị ka ọ na-agabu. Mụ na Mark kpebiri ikewa ruo ọnwa atọ iji nyochaa ọnọdụ anyị n’enweghị nnọọ mmetụta uche. N’oge a ihe dị ebube mere. Na magazin Teta! e nwere isiokwu pụtaranụ nke a kpọrọ “Enyemaka Maka Agadi Ụmụaka nke Ndị Aṅụrụma.”b

Ị hụla, nne m bụ onye aṅụrụma. Ọ bụ ezie na e metọghị m n’ụzọ anụ ahụ, nne na nna m egosirịtatụghị ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ ma ọ bụ n’ebe m nọ. Apụghị m icheta ka nne m jidere m n’aka ya ma ọ bụ gwa m na ya hụrụ m n’anya. Ya mere etolitere m n’amaghị n’ezie otú e si ahụ mmadụ n’anya ma ọ bụ, n’ụzọ dịkwa mkpa otú ahụ, otú e si abụ onye a hụrụ n’anya.

Nne m na-agwakarị m banyere otú nna m si achụgharị ụmụ nwanyị, nakwa na ọ pụghị ịtụkwasị ya obi. Ya mere echere m na etolitere m ịbụ onye na-atụkwasịghị ndị ikom n’ozuzu ha obi. N’ihi nzụlite m, m na-echekarị na m dị ala karịa ndị ọzọ, karịsịa ndị inyom ndị ọzọ. Ịgụ isiokwu Teta! ahụ nyeere m aka ịghọta ihe ihe ndị a pụtara. Na nke mbụ ya, aghọtara m ihe ndị bụ isi na-akpata nsogbu m n’ikwo ekworo.

Egosiri m di m, bụ́ Mark, isiokwu Teta! ahụ, o nyekwaara ya aka ịghọta m n’ụzọ ka mma. N’oge na-adịghị anya, mụ na ya nwere ike ịgbaso ndụmọdụ Bible nyere di na nwunye na-eche echiche ikewa. Anyị doziri okwu anyị. (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Ugbu a alụmdi na nwunye anyị dị mma karịa otú ọ dị na mbụ. Anyị na-emekọ ọtụtụ ihe ọnụ, karịsịa mgbe o metụtara ọrụ ndị Kraịst. Mark na-egosikwu ọmịiko. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị ọ na-agwa m otú o si hụ m n’anya nke ukwuu, m na-ekwerekwa ya ugbu a n’ezie.

Mgbe ọ bụla m maara na anyị na-aga izute onye bụbu nwunye Mark, m na-ekpegara Jehova ekpere maka ume, na-arịọ ya ka o nyere m aka ịkpa àgwà n’ụzọ onye Kraịst tozuru okè. Ọ na-arụkwa ọrụ. Ọbụna mmetụta iwe m n’ebe nwanyị ahụ nọ na-ebelata. M naghị etinyekwa uche n’echiche na-ezighị ezi ma ọ bụ kwee ka uche m kpasasịa.

M ka na-enweta ụfọdụ mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ekworo. Nanị ndụ zuru okè n’ụwa ọhụrụ Chineke ga-ewepụ ya kpam kpam. Ka ọ dị ugbu a, amụtawo m ịchịkwa ekworo, kama ikwe ka ọ chịkwaa m. Ee, ọ fọrọ ntakịrị ka ekworo bibie ndụ m, ma n’ihi Jehova na nzukọ ya, abụ m onye nwere obi ụtọ ugbu a karị, ahụ ike m abịaghachikwala. Ugbu a kwa, enwere m mmekọrịta siri ike n’ebe Chineke m, bụ́ Jehova nọ.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ahụ.

b Lee Teta! nke August 8, 1992, peji nke 8-12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya