Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—India
INDIA! Ala a sara mbara nke na-eruchaghị otu kọntinent bụ ebe obibi nke 1 n’ime mmadụ 6 ọ bụla bi n’ime mbara ụwa nke a. Ná ngụkọta, a na-asụ ihe karịrị 1,000 asụsụ na asụsụ mpaghara dị iche iche n’ala a gwara ọgwa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị obodo ahụ bụ ndị Hindu, ha dị 83 pasent, ebe 11 pasent bụ ndị Alakụba, ebe ndị Sikh, ndị Buddha, ndị Jain, na ndị Kraịst nkịtị mejupụtara ọnụ ọgụgụ fọrọ afọ.
Ndịàmà Jehova anọwo na-enwe ihe ịga nke ọma pụtara ìhè n’India n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ha achọtawo ndị yiri atụrụ bụ́ ndị dị njikere iwere nguzo siri ike n’akụkụ nke Alaeze Jehova, n’agbanyeghị ụdị nrụgide na mmegide nile.
Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ nọ n’otu ezinụlọ bụ nnọọ nke ndị Hindu bụ onye ọrịa polio meworo ka ọ daa ngwụrọ site na nwata. Ahụhụ ọ tara mere ka o chee banyere Chineke na nzube nke ndụ. O lebara anya n’ime ọtụtụ okpukpe maka azịza ma o nwetaghị nkasi obi ọ bụla. N’ihi ya, o nwekwaghị okwukwe n’okpukpe, kama ọ bụghị na Chineke.
Ihe dị ka n’oge a, Ndịàmà abụọ hụrụ nwa agbọghọ a n’ozi ụlọ n’ụlọ ha. “Anya mmiri gbara m mgbe m nụrụ ka ha gụrụ Mkpughe 21:4,” ka ọ na-echetaghachi. Ọ natara ọtụtụ mbipụta nke Watch Tower Society ma kwenye n’ọmụmụ Bible ebe obibi n’agbanyeghị mmegide nne ya. Nwa agbọghọ ahụ mere ọtụtụ mgbanwe ná ndụ ya, jiri anyaike chee mmegide sitere n’aka ndị ikwu ya ihu ma ghọọ Onyeàmà e mere baptism. Ọ na-asị: “Enwewo m ọganihu dị ukwuu, ọ bụwokwa nke siri nnọọ ike. Ma Jehova Chineke anọwo na-anọnyere m mgbe nile ma nye m udo na ọṅụ dị ukwuu.”
Ịkwụsi Ike Maka Ofufe Dị Ọcha n’Ụlọ Akwụkwọ
Onye nkụzi nke otu nwanna nwanyị na-eto eto gwara ya ka o soro ndị ọzọ nọ na klas jee na chọọchị Katọlik. Nwanna nwanyị ahụ ji nkwanye ùgwù jụ, na-asị na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova nakwa na ya agaghị efe onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị Jehova. Onye nkụzi ahụ kwuru na mgbe ndị ọzọ nile gawachara chọọchị, ya onwe ya kwesịkwara ịga. Ma nwanna nwanyị ahụ kwụsiri ike ma kwuo na ebe ọ bụ na ndị ahụ na-aga chọọchị agaghị na-ekpegara Jehova ekpere, na ya ahụghị otú ya ga-esi soro ha nọrọ n’ebe ahụ.
N’ihi nkwụsi ike nke nwatakịrị nwanyị ahụ, onye nkụzi ya chọrọ ịmatakwu ihe. Ya mere, n’ụbọchị na-eso ya, nwanna nwanyị ahụ nyere ya otu isiokwu Ụlọ Nche banyere ofufe Jehova. N’ịbụ onye ihe ọ gụtara masịrị, onye nkụzi ahụ gụpụziri ya n’ihe omume okpukpe nile a na-eme n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Nwanna nwanyị ahụ nwere ike inye ya na ndị nkụzi ndị ọzọ magazin iri.
A Kwụghachi Nrubeisi Nye Iwu Chineke Banyere Ọbara Ụgwọ
Na nso nso a, ahụ ọkụ nke nje virus kpatara bilitere n’ụdị ntiwapụ ọrịa n’akụkụ ụfọdụ nke steeti Kerala. Ọrịa a na-ebibi akụrụ nke ukwuu ma na-eme ka e nwee mkpa nke usoro iji ígwè ọrụ na-azapụ mmiri. A na-enyekarị mmịnye ọbara. N’otu obodo ukwu e nyere mmadụ 14 nwere ọrịa a àkwà n’ụlọ ọgwụ. Otu n’ime ndị ọrịa a bụ Onyeàmà, onye okenye n’ọgbakọ dị n’ógbè ahụ. A gwara ya na mmịnye ọbara bụ nanị ọgwụgwọ e nwere. Onye okenye ahụ kọwara nkweta ya ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ma jụwapụ isi ịnara ọbara. (Ọrụ 15:28, 29) Mgbe oké ịrụ ụka gasịrị, ndị dọkịta ahụ kwuru na ọ ga-anwụ n’ihi ọjụjụ ọ jụrụ ịnara mmịnye ọbara.
Ndị ọrịa 13 ndị nke ọzọ naara ọbara. N’ụzọ dị mwute, ha nile nwụrụ n’ime ụbọchị ole na ole. Nwanna nwoke ahụ agwụla onye lanarịrị! O juru ndị isi ụlọ ọgwụ anya. Nleta chiri anya nke ndị òtù ọgbakọ metụrụ ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ n’ahụ nke ukwuu. Ka o sisịrị n’ụlọ ọgwụ ahụ laa, nwanna ahụ gara ije kelee ndị dọkịta ahụ, ma ha sịrị: “Ị̀ na-ekele anyị n’ihi gịnị? Kelewe Chineke gị, bụ́ Jehova. Ọ bụ Ya zọpụtara gị. Biko kpeere Chineke gị, bụ́ Jehova, ekpere maka anyị.”
[Igbe dị na peeji nke 24]
IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ
Afọ Ije Ozi 1994
ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 14,271
NKEZI: 1 Onyeàmà maka 65,266
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 38,192
NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ́ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 1,780
NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 12,453
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 1,312
ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 410
ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: LONAVLA
[Foto dị na peeji nke 25]
Alaka ụlọ ọrụ, Lonavla
[Foto dị na peeji nke 25]
Ịgba àmà n’oge mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” e nwere na 1963
[Foto dị na peeji nke 25]
Izi onye na-ere ihe ozi ọma ná mpụga nke Red Fort na Delhi