Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/15 p. 21-24
  • Ị̀ Ga-emenyụ Ogho Oriọna Na-akwụ Anwụrụ Ọkụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-emenyụ Ogho Oriọna Na-akwụ Anwụrụ Ọkụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ileba Anya n’Amụma Ahụ
  • Mmetụta nke Nkatọ
  • Gịnị Banyere Ịdị Na-eme Ntụnyere?
  • Ụzọ Ụfọdụ Isi Wulie Elu
  • Na-ewuli Elu Mgbe Nile
  • Imezu Amụma Aịsaịa
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Imezu Amụma Aịzaya
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ihe Ọhụrụ Ga Na-adịzi n’Ọmụmụ Ihe Etiti Izu Anyị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Na-eṅomi Otú Jizọs Si Dị Umeala n’Obi na Otú O Si Nwee Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/15 p. 21-24

Ị̀ Ga-emenyụ Ogho Oriọna Na-akwụ Anwụrụ Ọkụ?

JISỌS KRAỊST kwusara ozi ọma Alaeze Chineke nye ụdị mmadụ nile. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị a na-akpagbu, ndị nwere nkụda mmụọ. Ma Jisọs nyere ha ozi na-enye obi ike. O nwere ọmịiko maka ndị na-ata ahụhụ.

Matiu bụ́ onye so dee Oziọma mere ka ọmịiko Jisọs pụta ìhè site n’ịdọrọ uche gaa n’otu amụma Aịsaịa dekọrọ. N’ihota okwu ndị Kraịst mezuru, Matiu dere, sị: “Ọ gaghị akpaji amị a pịara apịa, Ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ, ruo mgbe Ọ ga-atụpụ ikpe Ya ruo ná mmeri.” (Matiu 12:20; Aịsaịa 42:3) Gịnị ka okwu ndị a pụtara, oleekwa ụzọ Jisọs si mezuo amụma a?

Ileba Anya n’Amụma Ahụ

Amị na-etokarị n’ebe dị mmiri mmiri, ọ bụghịkwa ihe ọkụkụ siri ike ma na-akwụsi ike. “Amị a pịara apịa” agaghị adị ike n’ezie. Ya mere o yiri ka ọ na-anọchite anya ndị a na-akpagbu ma ọ bụ ndị na-ata ahụhụ dị ka nwoke ahụ nwere aka kpọnwụrụ akpọnwụ onye Jisọs gwọrọ n’Ụbọchị Izu Ike. (Matiu 12:10-14) Ma gịnị banyere aka e zoro n’ụzọ amụma gaa n’ogho oriọna?

Oriọna a na-ejikarị eme ihe n’ụlọ na narị afọ mbụ O.A. bụ arịa nta e ji ụrọ kpụọ n’ụdị iko nwere aka rọgọrọ arọgọ. A na-agbajukarị oriọna ahụ mmanụ olive. Site n’ike ndọgo, ogho oriọna e ji flax mee na-amịrị mmanụ iji mee ka ọkụ na-enwu. Otú ọ dị, ‘ogho oriọna na-akwụ anwụrụ’ ga-abụ nke na-achọ ịnyụ anyụ.

Jisọs kwusara ozi nkasi obi ya nye ọtụtụ ndị dị ka amị a pịara apịa n’ụzọ ihe atụ, ndị huru ehuru, a tụsasịrị atụsasị. Ndị a dịkwa ka ogho oriọna nke na-akwụ anwụrụ n’ihi na ihe ikpeazụ ji ha ndụ fọrọ nke nta ka e menyụọ ya. Ha bụ n’ezie ndị a na-akpagbu na ndị nwere nkụda mmụọ. Otú ọ dị, Jisọs akpajighị amị ihe atụ a pịara apịa ma ọ bụ menyụọ ogho oriọna ihe atụ nke na-akwụ anwụrụ. Okwu ịhụnanya ya, ndị dị nro, etinyekwughị ndị na-ata ahụhụ ná nkụda mmụọ na ịda mbà n’obi. Kama nke ahụ, okwu ya na ụzọ o si mesoo ha nwere mmetụta nke ibuli elu.—Matiu 11:28-30.

Taakwa, ọtụtụ ndị nọ ná mkpa ọmịiko na agbamume n’ihi na ha na-eche nsogbu ndị na-akpata nkụda obi ihu. Ọbụna ndị ohu Jehova adịghị abụ mgbe nile ndị jupụtara n’ume. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ na-eyi ogho oriọna ndị na-akwụ anwụrụ. Ya mere ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-agba ume—na-afụnwu ọkụ, dị ka a pụrụ ikwu ya—si otú ahụ na-ewusirịta ibe ha ike.—Luk 22:32; Ọrụ 11:23.

Dị ka ndị Kraịst anyị kwesịrị ịdị na-ewuli elu. Anyị agaghị amara ụma na-anwa ime ka ike gwụ onye ọ bụla na-achọ enyemaka ime mmụọ. N’ezie, anyị na-achọ iṅomi ihe nlereanya Jisọs n’iwusi ndị ọzọ ike. (Ndị Hibru 12:1-3; 1 Pita 2:21) Eziokwu bụ na anyị pụrụ n’amaghị ama ịkpaji onye na-elekwasị anyị anya maka agbamume bụ ezi ihe mere anyị ga-eji chesie echiche ike n’ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ. N’ezie anyị achọghị ‘imenyụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ.’ Olee usoro nduzi Akwụkwọ Nsọ ndị pụrụ inyere anyị aka n’akụkụ nke a?

Mmetụta nke Nkatọ

Ọ bụrụ na onye Kraịst ‘nọ ná ndahie, ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị ime ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ.’ (Ndị Galetia 6:1) Otú ọ dị, ọ̀ ga-ekwesị ekwesị ịchọ mmejọ n’ime ndị ọzọ ma jiri ohere ọ bụla dapụtara mee ihe ịgbazi ha olu? Ka ọ̀ ga-ezi ezi ịdị na-enu ha aka ime nke ọma karị site n’inye echiche nke na mgbalị ndị ha na-etinye ugbu a ezughị ezu, ma eleghị anya na-eme ka ha nwee mmetụta nke obi amamikpe? E nweghị ihe àmà ọ bụla na-egosi na Jisọs mere ihe yiri nke ahụ. Ọ bụ ezie na ọ bụ ebumnuche anyị inyere ndị ọzọ aka imekwu nke ọma, ndị a na-enye nkatọ obi ọjọọ nwere ike nwee mmetụta ike ọgwụgwụ kama ịbụ ndị e wusiri ike. Ọbụna ezi nkatọ pụrụ nnọọ ịkụda obi ma ọ bụrụ na e were ya gabiga ókè. Ọ bụrụ na mgbalị kasị mma ndị onye Kraịst dị uchu na-etinye ga-abụ nanị nke a na-akatọ, ọ pụrụ nnọọ ịchịli aka ma sị, ‘M̀ jidị gịnị na-anwa?’ N’ezie, ọ pụrụ ịchịsa ọwa kpam kpam.

Ọ bụ ezie na inye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ dị mkpa, o kwesịghị ịbụ ihe e ji mara mmụọ ndị okenye a họpụtara ahọpụta ma ọ bụ ndị ọzọ n’ime ọgbakọ. Inye na ịnara ndụmọdụ abụghị ihe ndị bụ isi e ji enwe nzukọ ndị Kraịst. Kama nke ahụ, anyị na-ezukọ mgbe nile iji wulie ma gbaa ibe anyị ume ka mmadụ nile wee nụ ụtọ nnọkọrịta ha na ozi dị nsọ ha na-ejere Chineke. (Ndị Rom 1:11, 12; Ndị Hibru 10:24, 25) Lee ka o si dị mma mgbe anyị ghọtara ọdịiche dị n’etiti mmejọ dị oké njọ na ezughị okè nke na amamihe na ịhụnanya dị na ya ileghara ya anya!—Eklisiastis 3:1, 7; Ndị Kọlọsi 3:13.

Ndị mmadụ na-anabata agbamume ngwa ngwa karịa ka ha na-anabata nkatọ. N’ezie, mgbe ọ dị ndị mmadụ ka e nyere ha nkatọ na-ezighị ezi, ha pụrụ ijigidesikwu omume ahụ a katọrọ akatọ aka ike! Ma mgbe a jara ha mma n’ụzọ ziri ezi, a na-ebuli mmụọ ha elu, a na-akwalikwa ha ime nke ọma karị. (Ilu 12:18) Dị ka Jisọs, ka anyị si otú a na-agba ume ma ghara ‘imenyụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ.’

Gịnị Banyere Ịdị Na-eme Ntụnyere?

Ịnụ ọmarịcha ahụmahụ nke ndị Kraịst ọzọ pụrụ ịdị na-akpali nnọọ akpali. Jisọs n’onwe ya ṅụrịrị mgbe ọ nụrụ banyere ihe ịga nke ọma nke ndị na-eso ụzọ ya ná nkwusa ozi Alaeze. (Luk 10:17-21) N’otu aka ahụ, mgbe anyị nụrụ banyere ihe ịga nke ọma, ihe nlereanya ọma, ma ọ bụ nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ọzọ nọ n’okwukwe, a na-agba anyị ume, anyị ekpebisikwuokwa ike ịnọgide n’ụzọ ndị Kraịst anyị.

Ma, gịnị ma ọ bụrụ na a kọrọ ihe n’ụzọ na-atụ aro sị, ‘Ị dịrughị mma ka ndị Kraịst a, i kwesịkwara ịdị na-eme nnọọ nke ọma karịa ka ị na-eme’? Ò yiri ka onye na-ege ntị ọ̀ ga-amalite usoro ihe omume nke ime nke ọma karị site n’ume ya? O yiri ka ọ ga-enwe nkụda mmụọ na ma eleghị anya chịlie aka, karịsịa ma ọ bụrụ na a na-emekarị ntụnyere ahụ ma ọ bụ na-enye echiche ya. Nke a ga-adị nnọọ ka nna ịjụ nwa ya, ‘Gịnị mere ị gaghị adịkwu ka nwanne gị?’ Okwu dị otú ahụ pụrụ ịkpata iwe na nkụda mmụọ, ma o yighị ka ọ ga-akwalite akparamàgwà ka mma. Ntụnyere pụrụ inwe mmetụta dị otú ahụ n’ahụ ndị toruworo ogo mmadụ, ọbụna na-eme ka ha burutu iwe n’obi n’ebe ndị e ji ha na-atụnyere nọ.

Anyị apụghị ịtụ anya mmadụ nile ime ihe hà nhata n’ozi Chineke. N’otu n’ihe atụ nile nke Jisọs, otu nna ukwu nyere ndị ohu ya otu talent ọlaọcha, abụọ, ma ọ bụ ise. E nyere ndị a “onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà.” A jara ohu abụọ zụrụ ahịa n’ụzọ amamihe ma mụbaa talent ha mma n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọrụ ha rụpụtara ihe dị iche iche.—Matiu 25:14-30.

Pọl onyeozi dere n’izi ezi, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.” (Ndị Galetia 6:4) Mgbe ahụ, iji bụrụ onye na-agba ume n’ezie nye ndị ọzọ, anyị kwesịrị ịgbalị izere ime ntụnyere ndị na-adịghị mma.

Ụzọ Ụfọdụ Isi Wulie Elu

Gịnị ka anyị pụrụ ime iji wulie ndị nwere nkụda mmụọ elu ma zere ‘imenyụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ’? Ịgba ume abụghị okwu metụtara ịgbaso otu ụkpụrụ. Otú ọ dị, o yiri ka okwu anyị hà ga-ewuli ndị ọzọ elu ma ọ bụrụ na anyị etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Olee ụfọdụ n’ime ndị a?

Dị umeala n’obi. Ná Ndị Filipaị 2:3, Pọl gbara anyị ume ‘ịghara ime ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu.’ Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịdị na-ekwu okwu ma na-eme omume n’ụzọ ịdị umeala n’obi. ‘N’obi dị umeala anyị kwesịrị ịgụ ndị ọzọ ná ndị ka anyị onwe anyị mma.’ Pọl ekwughị na anyị ekwesịghị iche ihe ọ bụla banyere onwe anyị. Ma, anyị gaje ịghọta na onye ọ bụla ka anyị onwe anyị mma n’ụzọ ụfọdụ. Okwu Grik a sụgharịrị ebe a ịbụ “ka mma” na-atụ aro na mmadụ “na-ewepụ anya ya n’ihe ùgwù ndị nke ya, wee jiri ịdị uchu na-atụle onyinye ndị onye ọzọ nwere bụ́ ebe ndị ọ ka ya mma.” (New Testament Word Studies, nke John Albert Bengel dere, Mpịakọta nke 2, peji nke 432) Ọ bụrụ na anyị emee nke a ma gụọ ndị ọzọ ná ndị ka anyị mma, anyị ga na-emeso ha n’ụzọ ịdị umeala n’obi.

Gosi nkwanye ùgwù. Site n’ikwupụta uche anyị n’obi eziokwu, anyị pụrụ ime ka o doo anya na anyị nwere obi ike ná ndị kwere ekwe ibe anyị na-ekwesị ntụkwasị obi, na-ele ha anya dị ka ndị mmadụ na-achọsi ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ma ka e were na mkpa enyemaka ime mmụọ dị ha. Mgbe ahụ ka anyị nye aka n’ụzọ nkwanye ùgwù, dị nsọpụrụ. Pọl kwuru ya otú a: “N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.”—Ndị Rom 12:10.

Bụrụ onye na-ege ntị nke ọma. Ee, iji gbaa ndị pụrụ inwe nsogbu ndị na-akụda mmụọ ume, ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị na-ege ntị nke ọma, ọ bụghị ndị oké okwu. Kama ịtụ aro na-abaghị ime ngwa ngwa, ka anyị wepụta oge a chọrọ iji nye nduzi Akwụkwọ Nsọ nke ga-egbo mkpa e nwere n’ezie. Ma anyị amaghị ihe anyị ga-ekwu, nnyocha Bible ga-enyere anyị aka ịgwa ndị ọzọ okwu ngụgụ obi ma wusie ndị ọzọ ike.

Na-ahụ n’anya. Ọ dị anyị mkpa ịhụ ndị anyị chọrọ ịgba ume n’anya. Mgbe ọ bụ n’ebe ndị ohu ibe anyị nke Jehova nọ, ịhụnanya anyị kwesịrị ịgabiga nanị ime ihe maka ọdịmma ha kasịnụ. O kwesịrị ịgụnye mmetụta siri ike. Ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya dị otú ahụ maka ndị Jehova nile, okwu anyị ga-abụ ezigbote agbamume nye ha. A sịgodị na ọ dị anyị mkpa ịtụ aro maka ime nke ọma karị, o yighị ka à ga-aghọtahie ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụ ka ọ̀ ga-akpata mbibi mgbe ebumnobi anyị na-abụghị nanị ikwu echiche anyị kama iji ịhụnanya nye aka. Dị ka Pọl kwuru n’ụzọ ziri nnọọ ezi, “ịhụnanya na-ewuli elu dị ka ụlọ.”—1 Ndị Kọrint 8:1; Ndị Filipaị 2:4; 1 Pita 1:22.

Na-ewuli Elu Mgbe Nile

Na “mgbe ikpeazụ” a, ndị Jehova na-eche ọtụtụ ọnwụnwa ihu. (2 Timoti 3:1-5) Ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ụfọdụ ha na-ata ahụhụ ruo n’ihe yiri ka ọ bụ njedebe nke ntachi obi ha. Dị ka ndị ohu Jehova, n’ezie anyị agaghị achọ ikwu ma ọ bụ ime ihe ndị pụrụ ime ka otu n’ime ndị anyị na ha na-efekọ ofufe nwee mmetụta nke ịbụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ nke na-achọ ịnyụ anyụ.

Ya mere, lee ka o si dị mkpa na anyị na-agbarịta ibe anyị ume! Ka anyị tinye mgbalị nile iji na-ewuli elu site n’ịdị umeala n’obi ma na-akwanyere ndị ibe anyị n’ofufe bụ́ ndị nwere nkụda mmụọ ùgwù. Ka anyị na-ege ntị nke ọma mgbe ha na-akọrọ anyị obi ha ma na-achọ mgbe nile inyere ha aka site n’ịdọrọ uche gaa n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Karịsịa ihe nile, ka anyị gosipụta ịhụnanya, n’ihi na mkpụrụ a nke mmụọ nsọ Jehova ga-enyere anyị aka iwusirịta ibe anyị ike. Ya adịla mgbe anyị ga-ekwu okwu ma ọ bụ mee ihe n’ụzọ pụrụ ‘imenyụ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ.’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya