Isi 33
Imezu Amụma Aịsaịa
MGBE Jisọs matasịrị na ndị Farisii na ndị na-eso òtù Herọd chọrọ igbu ya, ya na ndị na-eso ụzọ ya wezụgara onwe ha gaa n’Osimiri Galili. N’ebe a, ìgwè mmadụ ndị si n’akụkụ nile nke Palestine, ọbụna ná ngafe ókèala ya, gbakọtara n’ebe ọ nọ. Ọ gwọrọ ọtụtụ n’ime ha, nke na ndị nwere ajọ ọrịa dị iche iche nwara ịbịaru nso ibitụ ya aka.
N’ihi na ìgwè mmadụ ahụ dị ukwuu, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debe otu ụgbọ nke ọ ga-anọgide n’ime ya. Site n’ịkwọrọ ụgbọ ahụ banyetụ n’ime mmiri nke nta, ọ pụrụ igbochi oké ìgwè mmadụ ahụ ịdakwasị ya. Ọ pụrụ ịnọ n’ime ụgbọ ahụ na-ezi ha ihe ma ọ bụ gaa akụkụ ọzọ nke ụsọ osimiri ahụ inyere ndị nọ ebe ahụ aka.
Onyeozi bụ Matiu hotara na ọrụ Jisọs mezuru “okwu e kwuru site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma.” Mgbe ahụ, Matiu hotara amụma ahụ Jisọs mezuru:
“Lee, onye na-ejere m ozi onye m họpụtara; onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị mkpụrụ obi m ezi mma: m ga-atụkwasị ya mmụọ nke m, ọ ga-akọkwara mba nile akụkọ ikpe. Ọ gaghị alụ ọgụ, ọ gaghị etisikwa mkpu ike; ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-anụ olu ya n’ámá. Ọ gaghị akpaji amị a pịara apịa. Ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ, ruo mgbe ọ ga-atụpụ ikpe ya ruo ná mmeri. Ọ bụkwa n’aha ya ka mba nile ga-atụkwasị obi.”
N’ezie, Jisọs bụ ohu ahụ a hụrụ n’anya nke dị Chineke ezi mma. Jisọs mekwara ka ikpe ziri ezi, bụ́ nke omenala okpukpe ụgha na-ekpuchi pụta ìhè. N’ihi iji iwu Chineke mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ndị Farisii anaghị enyere onye ahụ na-esighị ike aka n’Ụbọchị Izu Ike! N’ime ka ikpe Chineke pụta ìhè, Jisọs napụrụ ndị mmadụ ibu arọ nke omenala na-ezighị ezi, n’ihi nke a kwa, ndị ndú okpukpe na-achọ ụzọ igbu ya.
Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na ‘ọ gaghị alụ ọgụ, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’ámá’? Mgbe ọ na-agwọ ndị mmadụ, Jisọs ‘na-abasiri ha mba ike ka ha ghara ime ka ọ pụta ìhè.’ Ọ chọghị mkpọsa ga-eweta mkpọtụ maka onwe ya n’ámá ma ọ bụ ka e site ná mkpali kọọ akụkọ a gwagburu agwagbu site n’otu onye ruo onye ọzọ.
Ọzọ, Jisọs bu ozi nkasi obi ya gakwuru ndị dị ka amị a pịara apịa, gbagọọ agbagọọ, bụrụkwa nke a zọdara n’ala. Ha dị ka ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ, nke ike ndụ ikpeazụ dị na ya fọrọ nke nta ka ọ nwụchapụ. Jisọs adịghị akpaji amị a pịara apịa ma ọ bụ menyụọ ogho oriọna na-akwụ anwụrụ. Ma site n’obi ebere na ịhụnanya, ọ na-eji nkà wulite ndị dị umeala n’obi elu. N’ezie, Jisọs bụ onye ahụ nke mba nile ga-atụkwasị obi! Matiu 12:15-21; Mak 3:7-12; Aịsaịa 42:1-4.
▪ Olee otú Jisọs si mee ka ikpe ziri ezi pụta ìhè, na-alụghị ọgụ ma ọ bụ na-eme ka a nụ olu ya n’ámá?
▪ Olee ndị dị ka amị a pịara apịa na ogho oriọna, ma n’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si emeso ha?