Ọ̀ Bụ Iwu Na Ọdịnala na Eziokwu Ga-asọkọtarịrị Isi?
MARTIN LUTHER kwetara na ya ziri ezi. O chere na Bible kwadoro ya. N’aka nke ọzọ, onye Poland na-enyocha mbara igwe bụ́ Copernicus chere na nkweta ọdịnala nke oge ya ezighị ezi.
Nkweta dị aṅaa? Na ụwa bụ etiti nke eluigwe na ala na ihe nile na-agba ya gburugburu. Nke bụ eziokwu, ka Copernicus kwuru, bụ na ụwa n’onwe ya na-agba anyanwụ gburugburu. Luther jụrụ nke a, na-asị: “Ndị mmadụ na-ege onye na-agụ kpakpando ihe dabaara ntị, bụ́ onye gbalịrị igosi na ụwa na-agba gburugburu, ọ bụghị eluigwe ma ọ bụ mbara igwe, anyanwụ na ọnwa.” —History of Western Philosophy.
NKWETA ọdịnala dị iche iche na ihe ndị mere eme, eziokwu, asọkọtawo isi ọtụtụ mgbe. Ha pụrụ ọbụna ime ka ndị mmadụ na-eme ihe ndị na-akpata mmerụ ahụ.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ọdịnala na eziokwu na-asọkọta isi mgbe nile. N’ezie, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst nke oge ya ume ka ha nọgide na-agbaso ọdịnala ndị o nyefere ha n’aka: “Ugbu a ana m aja unu mma n’ihi na . . . unu na-ejisi ọdịnala ndị ahu ike dị nnọọ ka m si nyefee unu ha n’aka.”—1 Ndị Kọrint 11:2, NW; leekwa 2 Ndị Tesalọnaịka 2:15; 3:6.
Gịnị ka Pọl bu n’uche n’ikwu “ọdịnala”? Akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 2, peji nke 1118, na-eme ka ọ pụta ìhè na okwu Grik o ji mee ihe maka “ọdịnala,” pa·raʹdo·sis, pụtara ihe “e ji okwu ọnụ ma ọ bụ ihe odide kwuo.” Okwu Bekee ahụ pụtara “ihe ọmụma, ozizi, ma ọ bụ omume ndị si n’aka ndị nne na nna fere n’aka ụmụ ha ma ọ bụ nke ghọworo ụzọ iche echiche ma ọ bụ ime ihe nke gbanyeworo mkpọrọgwụ.”a N’ihi na ọdịnala ndị Pọl onyeozi nyefere sitere n’ebe dị mma, ndị Kraịst mere nke ọma ijisi ha ike.
Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, ọdịnala pụrụ ịbụ eziokwu ma ọ bụ ụgha, dị mma ma ọ bụ dị njọ. Dị ka ihe atụ, onye Britain bụ́ onye ọkà ihe ọmụma bụ́ Bertrand Russell, na-aja ndị mmadụ dị ka Copernicus nke narị afọ nke 16 mma, bụ́ onye kwụwara aka ọtọ, nweekwa obi ike nke ịgbagha nkweta ọdịnala dị iche iche. Ha zụlitere “nghọta na ihe ndị e kwetara na ha eri oge ochie pụrụ ịbụ ụgha.” Gị onwe gị kwa ị na-ahụ amamihe dị n’ịghara ịdị na-agbaso ọdịnala n’ajụghị ase?—Tụlee Matiu 15:1-9, 14.
Ya bụrụ otú ahụ, gịnị banyere nkweta okpukpe na omenala? Ànyị pụrụ iwere ya na ha ziri ezi ma bụrụ ndị na-adịghị emerụ ahụ? Olee otú anyị pụrụ isi mara? Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na ọdịnala okpukpe na eziokwu na-asọkọta isi n’ezie? Isiokwu na-esonụ ga-enyocha ajụjụ ndị a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]
Ihu magazin: Jean-Leon Huens © National Geographic Society
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Universität Leipzig