Mgbe Ọdịnala na Eziokwu Sọkọrọ Isi
IHE IZE NDỤ—MMIRI A ADỊGHỊ MMA ỌṄỤṄỤ. Ọ pụrụ ịbụ na ịhụ ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ abụghịrị anyị ihe ọhụrụ. N’ọtụtụ ógbè ndị mmadụ na-akpachapụ anya banyere ihe ha na-aṅụ n’ihi na ha maara na a na-eji ihe a kpọworo “ngwakọta yiri nsí” nke ihe ndị na-egbu egbu emetọ mmiri ụfọdụ. N’ihi mmetọ a, ka otu ihe ọmụmụ na-ekwu, kama ịbụ “ihe nkwado na ihe nchebe nke ndụ,” mmiri pụrụ ịghọ “ihe na-ekesa ụmụ nje ọrịa na . . . mmiri ọgwụ ndị na-emetọ ihe.”—Water Pollution.
Imetọ Mmiri nke Eziokwu
Ọdịnala ndị ha na eziokwu na-asọkọta isi yiri mmiri ndị e metọrọ emetọ. Anyị pụrụ iji obi eziokwu jigidesie ọdịnala dị iche iche ike—ihe ọmụma, echiche, nkweta, ma ọ bụ omenala ndị sitere n’aka otu ọgbọ fere n’ọzọ—bụ́ ndị e jiworo, n’ezie, “ngwakọta yiri nsí” nke echiche na nkà ihe ọmụma ụgha, ndị na-eduhie eduhie metọọ. Dị nnọọ ka mmiri e metọrọ emetọ, ndị a pụrụ ịkpata mmerụ ahụ dị ukwuu—mmerụ ahụ ime mmụọ.
Ọ bụrụgodị na anyị echee na nkweta ọdịnala okpukpe anyị dabeere na Bible, anyị nile kwesịrị iwepụta oge iji jiri nlezianya nyochaa ha. Cheta, mgbe Martin Luther jigidesiri nkweta ọdịnala nke oge ya ike ma katọọ Copernicus, o kwetara na ya nwere nkwado Bible. Ma, Luther agbasoghị ihe nlereanya ọma nke ndị Beria oge ochie bụ́ ndị ‘obi dị mma n’inyocha akwụkwọ nsọ iji mata ma ihe ndị a dị otú a.’—Ọrụ 17:10, 11.
Chee echiche banyere mmerụ ahụ nke nkweta ọdịnala kpataara ụfọdụ ndị Juu nke oge Jisọs. Ha kwenyesiri ike na ọdịnala ha bụ eziokwu. Mgbe ha mere mkpesa na ndị na-eso ụzọ Jisọs edebeghị ọdịnala dị iche iche, Jisọs mara ha aka site n’ajụjụ bụ́: “N’ihi gịnị ka unu onwe unu na-ejehiekwa n’ihe Chineke nyere n’iwu n’ihi ozizi e nyere unu n’aka?” (Matiu 15:1-3) Olee ihe gahierenụ? Jisọs kọwara nsogbu ahụ mgbe o hotara okwu Aịsaịa onye amụma, sị: “Ha na-ebiri [Chineke] isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Matiu 15:9; Aịsaịa 29:13.
Ee, ha ji echiche ndị sitere n’aka mmadụ, ọbụna nke ka njọ, ndị sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ dochie anya eziokwu ndị sitere n’aka Chineke. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 506, na-akọwa, sị: “Ndị Farisii n’oge ahụ kụziri na ozugbo mmadụ kwuru na ihe onwunwe ya bụ ‘kọban,’ ma ọ bụ onyinye a raara nye Chineke, ọ pụghị iji ndị a mee ihe iji gboo mkpa ndị mụrụ ya, n’agbanyeghị otú mkpa jiruru ha, ọ bụ ezie na ọ pụrụ iji ihe onwunwe ndị dị otú ahụ mee ihe n’onwe ya ruo mgbe ọ nwụrụ ma ọ masị ya ime otú ahụ.” Amamihe mmadụ nke metọrọ mmiri nke eziokwu nwere mmetụta dị njọ n’ahụ ndị Juu ahụ n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ọbụna jụrụ Mesaịa ha nọworo na-atụ anya ya eri ogologo oge.
Krisendọm Atụkwasị Ihe ná Mmetọ Ahụ
A kpatara mbibi ime mmụọ yiri nke ahụ mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị. Ọtụtụ ndị zọọrọ na ha bụ ụmụazụ ya chigharịkwuuru ọdịnala a na-edeghị ede dị ka ebe mgbakwasị ụkwụ maka nkụzi ndị ọhụrụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke McClintock na Strong dere si kwuo, ụfọdụ ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst chere na ọdịnala dị otú ahụ bụ “ntụziaka nke chọọchị mbụ nke ndị Kraịst natara site n’ọnụ ndị ozi, nke e nwetara site n’oge ndị ozi, na nke e chekwara n’ịdị ọcha ruo oge nke ha.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
N’ezie ọtụtụ n’ime ọdịnala ndị a bụ echiche ndị na-adịghị ọcha, ndị na-ezighị ezi. Dị ka Cyclopedia ahụ na-akọwa, nkà ihe ọmụma ọhụrụ ndị a “abụghị nanị na ha dị iche n’ebe ọdịnala ndị ọzọ dị, kama kpọmkwem n’ebe ihe odide nke ndị ozi ahụ ndị ha nwere dị.” Nke a abụchaghị ihe a na-atụghị anya ya. Pọl onyeozi adọwo ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.”—Ndị Kọlọsi 2:8.
Taakwa, ọtụtụ nkweta ọdịnala dị ‘iche n’ebe ihe odide ndị ozi ahụ dị.’ Krisendọm ejiriwo ọtụtụ echiche sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ, dị ka Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, ịhụ mba n’anya, na ikpere arụsị, metọọ mmiri nke eziokwu ahụ.a (1 Timoti 4:1-3) Akụkọ ihe mere eme na-agba akaebe banyere ọrịa ime mmụọ nke jideworo ụmụ mmadụ ndị nkụzi ndị mmụọ ọjọọ nke ghọworo nkụzi ọdịnala nke Krisendọm nwụdeworo.—Tụlee Aịsaịa 1:4-7.
N’ezie mmetọ dị otú ahụ nke eziokwu anọwo na-aga n’ihu kemgbe mmalite mmadụ. Setan ewerewo usoro ahụ ọ malitere n’Iden nke iji ụgha na nghọgbu na-emetọ uche ndị mmadụ gaa n’ihu. (Jọn 8:44; 2 Ndị Kọrint 11:3) Ka ezinụlọ mmadụ na-agbasa n’ụwa nile mgbe Iju Mmiri nke ụbọchị Noa gasịrị, ndị mmadụ sitere n’ọdịbendị dị iche iche ghọrọ ndị a nwụdere ná mmetọ a ma ụma jiri nkà ihe ọmụma na echiche ndị sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ na-emetọ ọdọ ihe ọmụma ụmụ mmadụ.
Mmetụta Nile nke Mmetọ Ime Mmụọ
Mmerụ ahụ dị aṅaa ka mmetọ ime mmụọ dị otú ahụ pụrụ ịkpata? Anyị pụrụ iji ya tụnyere mmetụta mmiri e metọrọ emetọ na-enwe n’ahụ ike anụ ahụ anyị. Otu onye ọkachamara na-ekwu, sị: “Ihe dị ka 200 nde mmadụ na-arịa ọrịa schistosomiasis (bilharzia) [ahụ ọkụ ogbu na nwayọọ, bụ́ nke na-akpata ụkọ ọbara, ahụ ntakasị, ahụ esighị ike, na ọbụna ọnwụ], nke ọ bụ mmiri e metọrọ emetọ na-emetụ n’akpụkpọ ahụ na-akpata. Narị nde mmadụ ise nwere ọrịa anya bụ́ trachoma, otu n’ime ihe ndị kasị akpata ikpu ìsì, n’ihi mmiri ịsa ahụ ruru unyi. . . . Ihe dị ka ijeri mmadụ abụọ enweghị mmiri ọṅụṅụ dị ọcha.” (Our Country, the Planet) Ọtụtụ nde mmadụ abụrụwo ndị ike gwụrụ, ndị kpuru ìsì, na ọbụna ndị e gburu n’ụzọ ime mmụọ n’ihi ịgbaso ọdịnala ndị e ji nkụzi ụgha, nke ndị mmụọ ọjọọ gwagbuo.—1 Ndị Kọrint 10:20, 21; 2 Ndị Kọrint 4:3, 4.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nọ ná mgbagwoju anya ma ọ bụ kpuo ìsì n’ihe banyere mmekọrịta dị n’agbata Jisọs Kraịst na Nna ya, bụ́ Jehova Chineke. Ọ ghọrọ omenala n’etiti ụfọdụ ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst izere aha nsọ Chineke, bụ́ Jehova, n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. George Howard na-ekwu n’akwụkwọ bụ́ Journal of Biblical Literature, sị: “Mwepụ nke a e wepụrụ Tetragram[maton] ahụ, ná nghọta nke anyị, wetara mgbagwoju anya n’uche ndị Jentaịl bụ́ ndị Kraịst oge gboo n’ihe banyere mmekọrịta dị n’agbata ‘Onyenwe anyị Chineke’ na ‘Onyenwe anyị Kraịst.’”
Cheekwa echiche banyere mgbagwoju anya, nkwenkwe ụgha, na ụjọ nke ọdịnala ahụ na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ kpataworo. (Tụlee Eklisiastis 9:5; Ezikiel 18:4.) Mmadụ ole nọ n’agbụ nye ofufe ndị nna ochie ma ọ bụ na-ebi mgbe nile n’ụjọ na ndị nwụrụ anwụ ga-alaghachi ịbịa merụọ ha ahụ? Nkweta a ọbụna agbawo ndị mmadụ ume igbu onwe ha na ndị ọzọ.
Ọtụtụ ndị Japan chere na mgbe ha nwụrụ na mmụọ ha pụrụ apụ ga-ejikọtaghachi n’ụwa ọzọ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị nne na nna na-egbu onwe ha echewo na ọ kasị mma igbukwa ụmụ ha. Akwụkwọ bụ́ An English Dictionary of Japanese Ways of Thinking na-akọwa, sị: “Na Japan, ọ bụghị mgbe nile ka a na-akatọ igbu onwe onye, ma a na-elekarị ya anya dị ka ụzọ a nakweere isi rịọ mgbaghara maka oké mmejọ nke mmadụ . . . Ọbụna ezinụlọ igbu onwe ha yiri ka a ga-eji okwu ime ebere kọọ banyere ha.”
Nwalee Ọdịnala Ndị Ahụ
N’ihi ihe ize ndụ ndị dị n’ịgbaso nkweta ọdịnala na omenala n’ajụghị ase, gịnị ka anyị kwesịrị ime? Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke narị afọ mbụ, Jọn onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya okwu ndụmọdụ a, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwela okwu mmụọ nile, kama nwapụtanụ ndị mmụọ ahụ [dị nnọọ ka ị ga-anwale mmiri iji mara ma ọ dị ọcha], ma hà bụ ndị siri na Chineke pụta: n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha apụwo baa n’ụwa.” (1 Jọn 4:1; leekwa 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.) Olee otú ị ga-esi mara ma otu ọdịnala ọ dị njọ? Ọ dị gị mkpa inwe ebe mgbakwasị ụkwụ ụfọdụ, ụkpụrụ ụfọdụ nke ịdị ọcha, iji nwalee ihe i kwere na ya.
Bible bụ ihe mgbakwasị ụkwụ dị otú ahụ. Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Were eziokwu doo ha nsọ: okwu Gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17) O kwukwara, sị: “Oge hour na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23) Site n’iji Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ mee ihe, ị ga-erute ná mmiri dị ọcha nke eziokwu kama ịbụ ná mmiri e metọrọ emetọ nke nkà ihe ọmụma mmadụ na nke ndị mmụọ ọjọọ.—Jọn 8:31, 32; 2 Timoti 3:16.
Cheta, ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ nta nke ihe ndị na-emetọ ihe pụrụ inwe mmetụta dị oké njọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-ewe ọtụtụ afọ tupu mmetụta ha apụta ìhè. “Mmiri ruru unyi,” ka Shridath Ramphal, onye bụbu onye isi oche nke Njikọ Maka Nchekwa Ụwa, na-ekwu, “aghọwo ihe kasị egbu mmadụ n’ụwa nke dị ize ndụ. Ọ dịkarịa ala iri puku mmadụ abụọ na ise na-anwụ kwa ụbọchị n’ihi ojiji ha ji ya mee ihe.” Ọdịnala ndị e metọrọ emetọ n’ụzọ ime mmụọ dị ize ndụ ọbụna karị.
Ì nwere obi ike ịdọbipụ onwe gị ná nkweta ọdịnala ndị ị pụrụ ịgbasoworị eri ọtụtụ afọ ma ọ bụrụ na ha na eziokwu na-asọkọta isi? Ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị ahụ. Chebe onwe gị na ezinụlọ gị site n’ijide n’aka na ọdịnala gị nile kwekọrọ n’Okwu Chineke dị ọcha nke eziokwu.—Abụ Ọma 19:8-11; Ilu 14:15; Ọrụ 17:11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Reasoning From the Scriptures maka ihe àmà na nkụzi ndị dị otú ahụ enweghị ntọala n’ime Bible. Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta akwụkwọ a.
[Foto dị na peeji nke 7]
Okwu Chineke nke eziokwu yiri osimiri nwere mmiri dị ọcha, nke dị mma