Ị̀ Pụrụ Ikwere na Bible?
IKWENYE na Bible ka gbasazuru ebe nile, ọbụna n’ụwa nke oge a. Dị ka ihe atụ, n’otu njụta echiche pụrụ iche e mere ndị America na nso nso a, pasent 80 kwupụtara na ha kwenyere na Bible bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ma pasent ahụ ọ̀ dịruru elu otú ahụ n’ógbè gị ma ọ bụ na ọ dịrughị, ị pụrụ ịghọta na ndị kwere ekwe dị otú ahụ na-atụ anya ka a kụziere ha Bible na chọọchị. Ma ọtụtụ mgbe a dịghị akụziri ha. Were dị ka ihe atụ, ozizi ntaramahụhụ nke mkpụrụ obi mgbe a nwụsịrị.
À kụziri pọgatrị ma ọ bụ hel na-ere ọkụ n’ebe ọ bụla na Bible? Taa, ọtụtụ ndị ọkà mmụta na Krisendọm ga-aza ee e. New Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “N’ikpeazụ, ozizi Katọlik banyere pọgatrị dabeere n’ọdịnala, ọ bụghị n’Akwụkwọ Nsọ.” Banyere hel, akwụkwọ bụ́ A Dictionary of Christian Theology na-ekwu, sị: “Anyị adịghị achọta ọkụ ala mmụọ n’A[gba] Ọ[hụrụ] ịbụ akụkụ nke ime nkwusa oge mbụ.”
N’eziokwu, na nso nso a òtù na-ahụ maka ozizi Chọọchị England mere ihe akụkọ n’isiakụkọ dị iche iche mgbe ọ tụrụ aro ka a jụ ozizi ọkụ ala mmụọ kpam kpam. Dr. Tom Wright, bụ́ onyeisi nke Katidral Litchfield, na-ekwu na nkọwa gara aga nke hel “mere Chineke onye obi tara mmiri, ma hapụ àpà na-ebibi ebibi n’uche ọtụtụ ndị.” Akụkọ òtù ahụ na-akọwa hel dị ka “ihe na-adịghị adị ma ọlị.”a “N’otu aka ahụ, New Catholic Encyclopedia na-ekwu banyere echiche ndị Katọlik, sị: “Nkà mmụta okpukpe nke taa na-ele nsogbu nke hel anya dị ka nkewapụ site n’ebe Chineke nọ.”
N’ezie, ihe Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi na-emegide ozizi nke pọgatrị na ọkụ ala mmụọ. Bible na-ekwukarị banyere ọnwụ nke mkpụrụ obi. “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4; tụlee nsụgharị King James na nsụgharị Douay nke Katọlik.) Dị ka Bible si kwuo, ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe, ha enweghị ike inwe ihe mgbu. “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” (Eklisiastis 9:5) Olileanya Bible na-enye maka ndị nwụrụ anwụ bụ mbilite n’ọnwụ n’ọdịnihu. Mgbe enyi Jisọs bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jisọs jiri ọnwụ tụnyere ụra. Nwanne nwanyị Lazarọs bụ́ Mata kwupụtara olileanya ahụ a kụziri na Bible mgbe o kwuru, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Site n’ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ, Jisọs mere ka olileanya ahụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere sie ike.—Jọn 5:28, 29; 11:11-14, 24, 44.
Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwupụta na ozizi ahụ bụ́ na mmadụ nwere mkpụrụ obi nọ iche, na-adịghị anwụ anwụ esiteghị na Bible kama o sitere na nkà ihe ọmụma ndị Gris. New Catholic Encyclopedia na-ekwu na ndị Hibru oge ochie echeghị na anụ ahụ a na-ahụ anya na mkpụrụ obi a na-adịghị ahụ anya bụ ihe mejupụtara mmadụ. Ọ na-ekwu banyere nkwenkwe ndị Hibru, sị: “Mgbe ume ndụ banyere n’ime nwoke mbụ ahụ bụ́ onye Chineke jiri ájá kpụọ, ọ ghọrọ ‘onye dị ndụ’ (J[enesis] 2.7). E wereghị ọnwụ dị ka nkewa nke ihe abụọ dị iche mejupụtara mmadụ, dị ka ọ dị na nkà ihe ọmụma ndị Gris; ume ndụ na-apụ, mmadụ aghọọkwa ‘onye nwụrụ anwụ’ (L[evitikọs] 21.11; Ọ[nụ] Ọ[gụgụ] 6.6; 19.13). N’ọnọdụ nke ọ bụla okwu ahụ bụ́ ‘onye’ ga-abụ okwu Hibru bụ́ [neʹphesh], nke a na-asụgharịkarị ịbụ ‘mkpụrụ obi’ ma, n’eziokwu, ọ fọrọ nke nta ka e jiri ya tụnyere mmadụ.”
Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ekwu na na nso nso a ndị ọkà mmụta Katọlik “anọgidewo na-ekwu na A[gba] Ọ[hụrụ] adịghị akụzi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi n’echiche nke ndị Gris.” Ọ na-ekwubi, sị: “A gaghị achọtacha ngwọta bụ́ isi nye nsogbu ahụ n’ịkọ nkọ nke nkà ihe ọmụma dị ka a ga-achọta n’onyinye Mbilite n’Ọnwụ nke karịrị ike mmadụ.”
Bible Ka Ọ̀ Bụ Ọdịnala?
Otú ọ dị, olee otú echiche ndị na-esiteghị na Bible si banye n’ozizi chọọchị? Ọtụtụ chọọchị na-asị na Bible bụ ikike ha kasịnụ. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya Popu John Paul nke Abụọ kwuru okwu banyere mkpa ọ dị Akwụkwọ Nsọ ịbụ nke “ndị Katọlik nabatara dị ka ihe bụ eziokwu kpam kpam nakwa dị ka ụkpụrụ kasị elu nke okwukwe anyị.” Otú ọ dị, ndị mmadụ n’ozuzu ha kweere na ozizi Krisendọm taa ekwekọghị na nke ndị Kraịst narị afọ mbụ. Ihe ka ọtụtụ na chọọchị dị iche iche na-ele mgbanwe ndị ahụ anya dị ka akụkụ ntolite nke ozizi chọọchị ji nwayọọ nwayọọ na-etolite. Ọzọkwa, Chọọchị Katọlik nwere echiche nke bụ́ na ọdịnala chọọchị nwere otu ikike ahụ Akwụkwọ Nsọ nwere. New Catholic Encyclopedia na-ekwu na chọọchị “adịghị akụzi ozizi ọ bụla ná ndabere nke Akwụkwọ Nsọ nanị, n’adabereghị n’ọdịnala; ọ dịghịkwa akụzi ozizi ọ bụla ná ndabere nke ọdịnala nanị, n’adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ.”
Dị ka akụkọ ihe mere eme si gosi, chọọchị dị iche iche ejiriwo ozizi ndị dabeere nanị n’ọdịnala dochie anya ozizi nke Akwụkwọ Nsọ. N’eziokwu, ọtụtụ chọọchị na-ekwenye ugbu a na ozizi Bible ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, New Catholic Encyclopedia na-ekwu na ọ bụ ihe “doro anya na ọtụtụ okwu ndị dị na Bible abụghị nnọọ eziokwu ma a tụlee ha n’ụzọ ihe ọmụma ọgbara ọhụrụ nke sayensị na akụkọ ihe mere eme.” N’ikwu banyere ozizi Bible nke na ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe, ọ gbakwụnyere, sị: “Ọbụna n’okwu ndị metụtara okpukpe, A[gba] O[chie] na-agba akaebe banyere ihe ọmụma na-ezughị ezu nke . . . ndụ mgbe a nwụsịrị.” Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-ehota Abụ Ọma 6:5 (amaokwu 6 na Bible ụfọdụ) dị ka ihe atụ nke a: “Ọ dịghị ncheta Gị dị n’ọnwụ: [na Sheol, NW] [ma ọ bụ, Hedis] ònye ga-ekele Gị?” Ụfọdụ seminarị na kọleji ndị Protestant adịghịzi akụzi na Bible enweghị ike inwe ntụpọ. N’aka nke ọzọ, Chọọchị Katọlik na-ekwere na ya nwere ikike izi ihe, bụ́ nke o ji na-akọwa ihe a kụziri na Bible. Otú ọ dị, ị pụrụ iche, ‘Gịnị ma ọ bụrụ na nkọwa ndị dị otú ahụ eyie ka hà na-emegide Akwụkwọ Nsọ?’
Ịdị Mkpa nke Akwụkwọ Nsọ
Jisọs hotara Akwụkwọ Nsọ ugboro ugboro dị ka nke nwere ikike, na-amalitekarị okwu ya site n’ikwu, sị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị.” (Matiu 4:4, 7, 10; Luk 19:46) N’ezie, mgbe Jisọs kwuru okwu banyere ọnọdụ alụmdi na nwunye nke mmadụ, ọ dabereghị n’echiche nkà ihe ọmụma ndị Gris, kama n’ihe ndekọ Jenesis banyere okike. (Jenesis 1:27; 2:24; Matiu 19:3-9) N’ụzọ doro anya, Jisọs weere Akwụkwọ Nsọ ịbụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke na nke dabeere n’eziokwu. N’ekpere o kpegaara Chineke, o kwuru, sị: “Okwu Gị bụ eziokwu.”—Jọn 17:17.b
Bible na-enye ihe ndekọ nke ọmụma ikpe Jisọs mara ndị ndú okpukpe n’oge ya: “Unu na-ajụ ihe Chineke nyere n’iwu nke ọma, ka unu wee debe ozizi nke e nyere n’aka unu idebe. . . . Na-eme okwu Chineke ka ọ bụrụ ihe efu site n’ozizi e nyere unu n’aka idebe.” (Mak 7:6-13) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi guzogidere nrụgide nke iwebata nkà ihe ọmụma ndị Gris ma ọ bụ ọdịnala na-ezighị ezi, n’ozizi ya. “Lezienụ anya,” ka ọ dọrọ aka ná ntị. “Ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe.” (Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Ndị Kọrint 1:22, 23; 2:1-13) E nwere ụfọdụ ọdịnala, ma ọ bụ ozizi, ndị Pọl gbara ndị Kraịst ume ịnọgide na-enwe, ma ndị a dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ha kwekọkwara na ha kpam kpam. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:13-15) “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru,” ka Pọl dere, “ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.—2 Timoti 3:16, 17.
Pọl buru ụzọ hụ na a gaje isi n’Akwụkwọ Nsọ kpafuo. Ọ dọrọ Timoti aka ná ntị, sị: “Oge ga-adị mgbe ha agaghị anagide ozizi ahụ nke na-enye ezi ndụ; . . . ha ga-echigharịkwa ntị ha ka ha ghara ịnụ eziokwu.” Ọ gbara Timoti ume, sị: “Ma gị onwe gị, na-enwe anya udo n’ihe nile.” (2 Timoti 4:3-5) Ma ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ bụ ịdị “mma n’obi.” Otu akwụkwọ ọkọwa okwu Grik na-akọwa okwu Bible a dị ka “ịdị njikere ịmụta ihe na iji ezi obi tụọ ihe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” Luk jiri okwu a mee ihe ịkọwa ndị gere Pọl ntị na Beria nke narị afọ mbụ. Ozizi Pọl bụ ihe ọhụrụ nye ha, ha achọghịkwa ka e duhie ha. N’ịja ha mma, Luk dere, sị: “[Ndị Beria] ka ndị bi na Tesalọnaịka mma n’obi, ebe ha weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị ma ihe ndị a dị otú a.” Ịdị mma n’obi emeghị ka ndị Beria nwee obi abụọ, ghara ịdị njikere ikwenye n’ihe ọ bụla. Kama nke ahụ, ihe si na nchọpụta ha ji ezi obi mee pụta bụ na “ọtụtụ mmadụ n’ime ha kweere na Jisọs.”—Ọrụ 17:11, 12.
Abamuru nke Ibi Ndụ n’Ụzọ Kwekọrọ na Bible
A maara ndị Kraịst oge mbụ maka ma nrapara ha rapaara na Bible ma maka ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà ha. Otú ọ dị, taa ọtụtụ ndị nwere “ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha [na-agọ] ike ya.” (2 Timoti 3:5) Ụdị ọ bụla nke Iso Ụzọ Kraịst taa nke na-ekwekọghị na nke mbụ apụghị ịkpa ike ná ndụ ndị mmadụ n’ụzọ dị mma. Nke a ọ̀ pụrụ inye aka ịkọwa ihe mere anyị ji ahụ mmụba nke ime ihe ike, omume rụrụ arụ, ndakpọ ezinụlọ, na ịhụ ihe onwunwe n’anya n’akụkụ ka ukwuu nke Krisendọm? A na-alụ agha agbụrụ dị oké njọ n’ala ụfọdụ nke “ndị Kraịst” ọbụna n’etiti ndị si n’otu okpukpe.
Mmụọ nke ịdị mma n’obi nke ndị Beria ọ̀ nwụọla? È nwere òtù ụmụ mmadụ ọ bụla taa bụ́ ndị kwere na Bible ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya?
Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia Canadiana na-ekwu, sị: “Ọrụ Ndịàmà Jehova bụ ntụte na nguzobeghachi nke Iso Ụzọ Kraịst ọkpụtọrọkpụ nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gbasoro n’ime narị afọ nke mbụ na nke abụọ nke oge anyị.” N’izo aka n’ebe Ndịàmà nọ, New Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ha weere Bible dị ka nanị isi iyi ha nke nkwenkwe na ụkpụrụ omume.”
Obi abụọ adịghị ya na nke a bụ isi ihe mere Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ji bụrụ ndị a ma ama n’ihi ọganihu ime mmụọ, udo, na obi ụtọ ha. Ya mere anyị na-agba ndị na-agụ akwụkwọ anyị ume ịmụtakwu banyere ozizi Bible na-enye ezi ndụ n’ụzọ ime mmụọ. Ihe ọmụma ka ukwuu pụrụ iduje na ọbụna ntụkwasị obi ka ukwuu na Bible na okwukwe siri ike karị na Chineke. Abamuru ebighị ebi nke okwukwe dị otú ahụ kwesịrị nnọọ mgbalị ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a National Public Radio—“Morning Edition”
b Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere Bible ịbụ nke a pụrụ ịdabere na ya, lee broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, nke Watchtower Bible and Tract Society of Pennsylvania, bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 6]
Pọl onyeozi na ndị ọzọ mere nkwusa n’ọmà ahịa
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndịàmà Jehova “weere Bible dị ka nanị isi iyi ha nke nkwenkwe na ụkpụrụ omume”