Ì Nwere Mmụọ nke Inye Ihe?
Ị̀CHỌPỤTAWO na e nwere ihe karịrị otu mmụọ nke na-akwali ndị mmadụ inye ihe? Onyinye pụrụ ịbụ ngosipụta nke ịhụnanya, nke mmesapụ aka, nke ekele. Ma, ị̀ chọpụtawo na onyinye pụkwara isite n’ọchịchọ mmadụ nwere ịbụ onye a na-ele anya ọma? Ma ọ bụ a pụrụ inye ya nanị n’ihi mmetụta nke ibu ọrụ ma ọ bụ n’ihi na onye na-enye ya nwere ihe ọ chọrọ ná nkwụghachi.
Onyinye ahụ pụrụ ịdị n’ime ngwugwu e ji eriri ribbon mara mma kechie. Ma ọ̀ bụ na ọ bụghị eziokwu na ùkwù okooko osisi, otu efere nri, ma ọ bụ omume obi ọma pụkwara ịbụ onyinye ọma? N’ezie, onyinye ndị a kasị enwe oké mmasị na ha na-agụnyekarị inye onwe onye.
Ọ̀ Dị Onye Ị Na-achọ Ihu Ọma Ya?
Ọ bụghị ihe ọhụrụ mmadụ inye onye ọ na-achọ ihu ọma ya onyinye. N’ala ụfọdụ nwa okorobịa na-achọ inweta ịhụnanya nke onye ọ na-ele anya ịlụ pụrụ iwetara ya okooko osisi. Otú ọ dị, nwanyị maara ihe na-ahụ ihe karịrị onyinye ahụ. Ọ na-atụle ma mmụọ nke nwa okorobịa ahụ ji nye onyinye ahụ ọ̀ bụ nke ịhụnanya nke ga-emekwa ka ọ bụrụ ezigbo di. Onyinye dị otú ahụ, ọ bụrụ na o gosipụta mmụọ Chineke, pụrụ iduje n’obi ụtọ dị ukwuu nye ma onye nyere ya ma onye natara ya.
Bible na-akọ banyere oge Abigail, bụ́ nwunye Nebal, kwadebeere Devid onyinye mmesapụ aka n’egbughị oge, bụ́ onye ọ matara dị ka onye Chineke họọrọ ịbụ eze ọdịnihu nke Israel. Ọ chọkwara ihu ọma. Di ya akparịwo Devid, bakwaara ndị ikom Devid mba. N’ịnọ n’isi nke ìgwè 400 ndị agha ji ngwá agha, Devid azọliela njem ibibi Nebal na ezinụlọ ya. Abigail gbachiri ya ihu, ngwa ngwa na-ezijere Devid onyinye ihe oriri buru ibu maka ndị ikom ya. Ya onwe ya bịarutere mgbe onyinye ya bịarutesịrị, mgbe o jisịkwara ịdị umeala n’obi rịọ mgbaghara maka ihe di ya mererị, o gosiri ihe àmà nke oké nghọta ka o so Devid na-atụgharị uche.
Ebumnobi ya mara mma, ihe ọ rụpụtara makwara mma. Devid nakweere onyinye ya wee sị ya: “Rịgoruo ụlọ gị n’udo; lee, egewo m ntị olu gị, hụkwa gị ihu ọma.” Ka e mesịrị mgbe Nebal nwụsịrị, Devid ọbụna gwara Abigail okwu ịlụ ya, o jikwa obi ụtọ kwere.—1 Samuel 25:13-42.
Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ, ihu ọma mmadụ na-achọ pụrụ ịgụnye ile mmadụ anya n’ihu, ọbụna ịgbanwe ikpe ziri ezi. N’ọnọdụ dị otú ahụ, onyinye ahụ bụ aka azụ. Onye nyere ya na-eche na ya ga-erite uru, ma ọ na-anapụ onwe ya udo nke uche. A na-enwekarị ihe ize ndụ na ndị ọzọ ga-achọpụta, na ọ ga-aza ajụjụ. Ọ bụrụgodị na e nye ihu ọma ahụ a chọrọ, onye ahụ chọrọ ya pụrụ ịchọpụta na ya emeerela onwe ya aha ugbu a nke ịbụ onye a na-enyo ebumnobi ya enyo. N’igosipụta amamihe Chineke, Bible na-adọ aka ná ntị megide onyinye ndị dị otú ahụ.—Deuterọnọmi 16:19; Eklisiastis 7:7.
Onyinye ahụ Ò Sitere n’Ọchịchọ Obi?
Ihe ịrụ ụka adịghị ya—inye onye ị hụrụ n’anya ihe n’ihi na ị chọrọ ime ya na-eweta ọṅụ dị ukwuu karịa inye ihe n’ihi na ndị ọzọ na-eme gị ka i chee na i kwesịrị ime ya.
Banyere ịchịkọta ihe enyemaka maka ndị Kraịst ibe ya nọ ná mkpa n’ụzọ ihe onwunwe, Pọl onyeozi setịpụrụ ụkpụrụ ndị magburu onwe ha nke inye ihe n’ụzọ nke Chineke. “A sị na obi dị ọkụ dị ya,” ka o dere, “ọ bụ ihe a ga-anara nke ọma dị ka ihe ọ bụla mmadụ nwere si dị, ọ bụghị dị ka ihe ọ na-enweghị.” O kwukwasịrị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.” (2 Ndị Kọrint 8:12; 9:7) N’ihi ya, ihe dị ukwuu dabeere n’ebe ị nọ. Kama ịbanye n’ụgwọ n’ihi inye onyinye aghara aghara, ị̀ na-emefu ego otú akpa gị hà? Kama inwe mmetụta nke ịbụ onye a rụgidere inye ihe n’ụzọ bụ isi n’ihi nrụgide nke ọha mmadụ ma ọ bụ azụmahịa, ị̀ na-eme ihe i kpebiri n’obi gị? Banyere ndị Kraịst oge gboo ndị gbasoro ụkpụrụ Chineke ndị dị otú ahụ, Pọl dere, sị: “Ha were ọtụtụ arịrịọ na-arịọ anyị ka anyị nye ha amara nke a ná nnwekọ ije ozi a na-ejere ndị nsọ.”—2 Ndị Kọrint 8:4.
N’ụzọ dị iche na nke ahụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ Royal Bank Letter nke November/December 1994 kwuru banyere izu ndị bu Krismas ụzọ, sị: “A pụrụ ịhụ oge ahụ dị ka ọnọdụ mkpali aka mere nke ụlọ ọrụ achụmnta ego na-akpali iji kwanye ndị na-azụ ihe ịzụta ihe ndị ha na-agaghị achọworị ịzụ.” Ọ bụrụ na a zụrụ ihe ahụ n’aka, afọ ojuju ọ bụla na-abịa site n’inye onyinye ndị ahụ pụrụ ịbụ nnọọ nke e kpuchiri ngwa ngwa mgbe oge ịkwụ ụgwọ ya ruru.
Nchegbu Gị Bụ Isi—Ọ̀ Bụ Ihe Omume Ahụ? Ka Ọ̀ Bụ Ngosipụta nke Ịhụnanya?
Ị̀ na-achọpụta na inye onyinye gị bụ nke a na-eme n’ụzọ dị ukwuu n’oge ndị yiri ka ha chọrọ ya? Ọ bụrụ otú ahụ, ọṅụ dị ukwuu nke inye ihe site n’ọchịchọ obi na-eweta pụrụ ịdị na-efunahụ gị.
E nwere ọtụtụ ndị na-enweghị obi ụtọ banyere ihe ndị na-esi n’inye onyinye n’ụbọchị ndị a kara aka apụta. Otu nne nke bụkwa onye na-ede akwụkwọ kwetara na anyaukwu pụtara ìhè n’ime ụmụ ya ka ụbọchị ahụ a na-atụ anya onyinye na-akpụdewe. O kwetara na e mebiri ọṅụ nke ya onwe ya ga-enweta site n’onyinye mara mma n’ihi na ya tụrụrị anya ihe ọzọ dị iche. Ọtụtụ akụkọ na-ekwu na ezumike ndị na-egosi ihe ememe dị iche iche na mgbanwerịta nke onyinye bụkwa oge ndị a na-enwe oké ịda mbà n’obi nke mmetụta uche na iji mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.
Ebe ọ chọpụtaworo na anya a na-elekwasị n’inye onyinye n’oge ezumike na-enwe mmetụta na-adịghị mma mgbe ụfọdụ n’ahụ ụmụaka, otu prọfesọ nke nkà mmụta akparamàgwà mmadụ bụ́ onye e hotara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-atụ aro, sị: “Tụlee inye onyinye ụfọdụ n’ụbọchị ndị ọzọ dị ka ụzọ isi belata nrụgide ahụ.” Ì chere na nke ahụ ga-enwe mmetụta dị mma?
Tammy, onye dị afọ 12 nke nọ n’ezinụlọ nke na-adịghị agba Krismas na ncheta ụbọchị ọmụmụ, dere, sị: “Ọ na-enye obi ụtọ karị inweta onyinye mgbe ị na-adịghị atụ anya ya.” O kwuru na kama inye onyinye nanị otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ n’afọ, ndị mụrụ ya na-enye ya na nwanne ya nwoke onyinye n’oge nile n’ime afọ. Ma e nwere ihe dị ya mkpa karịa onyinye ndị ahụ. Dị ka o si tinye ya, “Enwere m nnọọ ndụ obi ụtọ nke ezinụlọ.”
Akwụkwọ bụ́ Secrets of Strong Families na-ekwu hoo haa, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-emefu oge na ego ọtụtụ ugboro n’afọ na-ahọta onyinye ndị bụ ọkpọka maka ncheta ụbọchị ọmụmụ, ememe ịgba afọ, ma ọ bụ ezumike maka ndị anyị hụrụ n’anya. Onyinye kasị mma n’ime ha nile agaghị efu ego. Ọ gaghịkwa adị mkpa ikechi ya ekechi. Ọ bụrụ na i kwetara, dị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ kwetara, na ndụ gị bụ ihe kasị oké ọnụ ahịa i nwere, mgbe ahụ otu akụkụ nke ndụ gị bụ onyinye kasị oké ọnụ ahịa i nwere inye. Anyị na-enye onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa ná nkebi oge anyị ndị anyị na-enye ndị anyị hụrụ n’anya.”
Ị pụrụ ime ka inye ihe ahụ ruo ndị na-anọghị n’ezinụlọ nke aka gị. Inye ihe site n’ọchịchọ obi iji gboo mkpa pụtara ìhè nke ndị ọzọ nwere pụrụ iweta afọ ojuju pụrụ iche. Jisọs Kraịst gbara anyị ume igosi nchegbu ịhụnanya dị otú ahụ maka ndị ogbenye, ndị ngwụrọ, ndị kpuru ìsì, na-ekwukwasị: “Onye ngọzi ka ị ga-abụ; n’ihi na ha enweghị ihe inyeghachi gị.”—Luk 14:12-14.
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Rockland Journal-News (U.S.A.) kọrọ na nso nso a otu ihe atụ nke inye ihe dị otú ahụ. Mgbe ụlọ nke otu agadi nwanyị kpuru ìsì dakpọrọ, ndị enyi wuuru ya ụlọ ọhụrụ. Ọtụtụ ụlọ ọrụ achụmnta ego nọ n’ógbè ahụ nyere onyinye dị iche iche, ụlọ ọrụ gọọmenti ime obodo nyekwara onyinye ego. “Ma, nke kasị mkpa,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, “ihe dị ka 150 mmadụ ahụ, ndị ihe ka n’ime ha na-eje ọgbakọ Haverstraw nke Ndịàmà Jehova, nyere oge iji wuo ụlọ ahụ.”
Isiokwu ahụ gara n’ihu, sị: “E nwere ọtụtụ ikpo ngwongwo iwu ihe ndị dịdewere table ihe oriri jupụtara n’elu ha n’ebe iwu ihe ahụ. N’ime ụbọchị abụọ ndị ọrụ ahụ wuru ebe obibi ga-abata ezinụlọ abụọ, nke dị okpukpu atọ n’elu. . . . A maara Ndịàmà Jehova maka ikike ha nwere iwu ihe owuwu ngwa ngwa. . . . Otú ọ dị, ịdị ngwa dị otú ahụ dị iche n’ịdịgide adịgide nke ọrụ ha: inye ịdịte anya n’ọrụ nke ịhụnanya. Ms. Blakely nwere ike ọ gaghị enwe ike ịhụ ebe obibi ọhụrụ ya anya, ma aka ya pụrụ ibitụ ya, obi ya makwaara otú ọrụ achọghị ọdịmma onwe onye a metụtaruru ya.”
Mmụọ Mmesapụ Aka Mgbe Ọ Bụla n’Afọ
Ndị nwere mmụọ mmesapụ aka n’ezie adịghị echere maka ụbọchị ndị pụrụ iche. Ndụ ha abụghị nke e wulitere nnọọ gburugburu onwe ha. Mgbe ha nwetara ihe ọma, ha na-enwe mmasị isoro ndị ọzọ kerịta ya. Nke a apụtaghị na ha bụ ndị na-enye onyinye ná mkpali efu. Ọ pụtaghị na ha na-enye ihe ruo n’ókè nke na a na-anapụ ezinụlọ ha ihe. Ọ pụtaghị na ha na-enye ihe n’echeghị echiche banyere mmetụta ọ ga-enwe n’ahụ onye ga-anata ya. Ma, ha bụ ndị ‘na-enye ihe,’ dị ka Jisọs kụziiri ndị na-ezo ụzọ ya ka ha na-eme.—Luk 6:38.
Ha maara banyere ọnọdụ nke ndị enyi na ndị agbata obi ndị meworo agadi, na-arịa ọrịa, ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ nwee mkpa nke agbamume. “Onyinye” ha puru ịbụ ije zụta ihe ma ọ bụ enyemaka n’ọrụ ụlọ. Ọ pụrụ ịbụ ịwa nkụ ma ọ bụ ikupụ snow. Ọ pụrụ ịbụ efere ihe oriri e siri esi ma ọ bụ otu hour nke oge ime nleta na ịgụkọ akwụkwọ ọnụ. Ndụ nke ha pụrụ ịbụ nke jupụtara n’ọrụ ma ọ bụghị nke enweghị ohere inye aka. Ha amụtawo site n’ahụmahụ na n’eziokwu “ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
N’ezie, Onye kasị enye ihe, bụ Onye Okike anyị, Jehova Chineke. Ọ “na-enye mmadụ nile ndụ, na ume, na ihe nile.” (Ọrụ 17:25) N’ime Bible, ọ na-enyekwa anyị nghọta banyere nzube ya ime ka ajọ omume, ọrịa, na ọnwụ gwụsịa, na ime ka ụwa a ghọọ paradaịs. (Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 21:4, 5) Mgbe ha mụtara banyere nke a, ndị nwere mmụọ mmesapụ aka adịghị ejigide ozi ọma ahụ n’onwe ha. Otu n’ime ihe kasị enye ha obi ụtọ bụ isoro ndị ọzọ kerịta ya. Nke ha bụ n’eziokwu mmụọ Chineke nke inye ihe. Nke ahụ ọ̀ bụ mmụọ ị na-azụlite?
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ụfọdụ n’ime onyinye ndị kasị oké ọnụ ahịa adịghị efu ego