Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 6 p. 3
  • “Ọ Bụ Onyinye Kacha Mma E Nyetụrụla M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Bụ Onyinye Kacha Mma E Nyetụrụla M”
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ịchọta Onyinye Kacha Mma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ì Nwere Mmụọ nke Inye Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Gịnị Mere Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị Ji Dị Oké Ọnụ Ahịa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 6 p. 3
Ebe otu nwata nwaanyị ku obere nkịta, ebe otu nwaanyị na-apị kọmputa, na ebe otu nwoke ji kaadị e ji aka mee

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE ONYINYE KACHA ONYINYE NIILE?

“Ọ Bụ Onyinye Kacha Mma E Nyetụrụla M”

Ihe a bụ ihe otu nwata nwaanyị dị afọ iri na atọ kwuru mgbe mmadụ nyere ya obere nkịta. Otu nwaanyị ịchụ nta ego doro anya kwuru na kọmputa papa ya nyere ya mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị mere ka ndụ ya ka mma. Otu nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ kwuru na onyinye kachanụ e nyetụrụla ya bụ kaadị nwunye ya ji aka ya mee, nke o nyere ya n’ụbọchị ha na-echeta otu afọ ha gbara akwụkwọ.

N’afọ ọ bụla, ndị mmadụ na-eji oge buru ibu agbalị ịchọta onyinye ha chere kacha mma ha ga-enye enyi ha ma ọ bụ nwanne ha n’oge a na-eme ememme pụrụ iche. Ọtụtụ n’ime ha ga-enwekwa mmasị ka ndị ha nyere onyinye kwuo ụdị ihe ahụ ụfọdụ ndị kwuru na paragraf bu nke a ụzọ. Gịnwa kwanụ? Ị̀ ga-achọ inye mmadụ onyinye ga-eme ya obi ụtọ ma ọ bụkwanụ ka mmadụ nye gị onyinye ga-eme gị obi ụtọ?

Ihe mere inye mmadụ onyinye ji magbuo onwe ya abụghị naanị na ọ ga-eme onye e nyere ya obi ụtọ, kamakwa, ọ na-eme ka onye nyere onyinye ahụ nweekwa obi ụtọ. A sị ka e kwuwe, Baịbụl sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) N’eziokwu, onye nyere mmadụ onyinye na-enwekwu obi ụtọ ma onye o nyere ya jiri ya kpọrọ ihe.

Oleezi ihe ị ga-eme ka onyinye i nyere mmadụ mee ma gịnwa ma onye i nyere ya ezigbo obi ụtọ? Ọ bụrụ na o siere gị ike ịmata onyinye kacha mma ị ga-enye mmadụ, gịnị ga-enyere gị aka inye onye ahụ ihe ga-eme ya obi ụtọ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya