Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 12/15 p. 24-25
  • “Adị M Oké Ọnụ Ahịa Nye Jehova!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Adị M Oké Ọnụ Ahịa Nye Jehova!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Ji Gị Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọ Dịghị Ihe Pụrụ “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Ụlọ Nche na Teta!—Akwụkwọ Eziokwu Ndị Na-abịa n’Oge Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 12/15 p. 24-25

“Adị M Oké Ọnụ Ahịa Nye Jehova!”

N’IME “oge dị oké egwu” ndị a, ọtụtụ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi na-atachi obi ná mgba a na-agbaso mmetụta nke abaghị uru oge nile. (2 Timoti 3:1) Nke a abụghị ihe ijuanya, n’ihi na otu n’ime ‘ụzọ aghụghọ’ nke Setan bụ ime ka anyị chee na a hụghị anyị n’anya, ọbụna Onye Okike anyị! (Ndị Efesọs 6:11, ntụaka ala ala peji, NW) N’ụzọ kwesịrị ekwesị, mbipụta Ụlọ Nche nke April 1, 1995, nwere isiokwu abụọ maka ọmụmụ ihe ọgbakọ ndị isiokwu ha bụ́ “Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!” na “Ịkpasu Ịhụnanya na Ọrụ Ọma Dị Iche Iche—N’ụzọ Dị Aṅaa?” A haziri isiokwu ndị a iji chetara anyị na Jehova weere mgbalị anyị nile n’ihe dị oké ọnụ ahịa. Ihe na-esonụ bụ okwu ekele ụfọdụ ndị a natara:

“Ọ dịtụbeghị mgbe magazin ọ bụla metụrụ m n’ahụ otú a n’ime 27 afọ m dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova. Edilighị m ibe ákwá—isiokwu ndị a wetaara m ahụ efe dị ukwuu. Ugbu a ana m enwe mmetụta nke ịbụ onye Jehova hụrụ n’anya nke ukwuu. O yiri ka a napụrụ m ibu dị arọ.”—C. H.

“Agụrụ m magazin a ugboro anọ n’otu ụbọchị. Enwere m mmasị n’ụzọ isiokwu ahụ si kwuo na a kụziiri gị ụgha ma ọ bụrụ na i kwetara na ị baghị uru ma ọlị. M ga-eji isiokwu a mee ihe maka ịzụ atụrụ na ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”—M. P.

“Setan arụwo ọrụ bụ ọkpọka nke ime ka ọbụna ndị hụrụ Jehova n’anya nwee mmetụta nke abaghị uru na ndị a na-apụghị ịhụ n’anya. Òtù ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ ichetaghachiri anyị na Jehova hụrụ anyị n’anya n’ụzọ dị omimi nakwa na ọ na-enwe mmasị n’ụmụ irighiri ihe nile anyị na-emere ya bụ otu n’ime ihe ndị kasị agba ume m gụworo. Ruo ọtụtụ afọ enwewo m mmetụta ndị unu kwuru banyere ha n’isiokwu ndị a. Enwetụbeghị m mmetụta nke iru eru inweta ịhụnanya Jehova, ya mere agbalịrị m imekwu ihe n’ozi ya dị ka ụzọ isi nweta ịhụnanya ahụ. Ma ọ bụ obi amamikpe na ihere na-akwali m. Ya mere n’agbanyeghị hour ole m tinyere n’ozi, ma ọ bụ mmadụ ole m nyeere aka, enwere m mmetụta na o zughị ezu. M hụrụ nanị ihe ndị kọrọ m. Ugbu a mgbe m na-ejere Jehova ozi n’ihi ịhụnanya, m na-eche n’uche m na ọ na-amụmụ ọnụ ọchị nakwa na obi dị ya ụtọ banyere m. Nke a na-eme ka ịhụnanya m nwere n’ebe ọ nọ ọbụna buwanye ibu ma na-eme m imekwu ihe. Ugbu a ana m enwe ọṅụ dị ukwuu site n’ozi m na-ejere Jehova.”—R. M.

“Ndị a bụ n’ezie isiokwu ndị kasị mma, ndị kasị ewuli elu, ee, ndị pụrụ iche imetụ obi anyị ndị m gụtụworo! Anọwo m na-agụ Ụlọ Nche ruo 55 afọ, e nwewokwa ọtụtụ mbipụta ndị dị ịrịba ama. Ma mbipụta nke a karịrị ihe ọ bụla anyị nweworo n’ikpochapụ echiche anyị ndị na-ezighị ezi, ụjọ, na egwu na anyị ‘abaghị uru’ bụrụkwa ‘ndị a na-ahụghị n’anya’ na ọ dịghịkwa mgbe anyị pụrụ ime ihe zuru ezu iji ‘nweta’ ịhụnanya Jehova. Ụlọ Nche a nwere ụdị enyemaka ime mmụọ ahụ dịsi ụmụnna anyị mkpa ike. Ọ bụ nzube m iji isiokwu ndị a mee ihe ọtụtụ ugboro mgbe m na-azụ atụrụ.”—F. K.

“Nye ụfọdụ n’ime anyị ndị na-agbaso ùgwù onwe onye dị ala mgba, ma ọ bụ ọbụna mmetụta nke ịkpọ onwe onye asị, ọ pụrụ isi oké ike inwetaghachi ume anyị iji gaa n’ihu n’eziokwu ahụ. Isiokwu a gosipụtara ọmịiko na nghọta dị omimi, o yiri ite balm na-ebelata ụfụ, nke na-agwọ ọrịa, kpọmkwem n’obi. Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịgụ okwu ndị dị otú ahụ n’Ụlọ Nche na ịmara n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla na Jehova na-aghọta! Unu emeela maka ichetara anyị na Jehova adịghị anwa ịkwali ndị ya site n’obi amamikpe, ihere, ma ọ bụ egwu. N’agbanyeghị na òkè m n’ọrụ nkwusa abụrụwo nke nsogbu ego na ahụ ike dị n’ezinụlọ anyị kpaara ókè nke ukwuu, aka m na-enweta afọ ojuju n’ihe m nwere ike ime. M na-achọpụta na m na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’ozi m mgbe gbalịrị ikwe ka ịhụnanya bụrụ ike na-akwali m.”—D. M.

“M ka gụsịrị ‘Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!’ Paragraf nke ọ bụla mere ka anya mmiri gbaa m. Esi m n’ezinụlọ nke na-egosi ntakịrị ịhụnanya. E ledara m anya, maa m njakịrị, chịakwa m ọchị. Ya mere, n’oge m bụ nwata enwere m mmetụta nke abaghị uru. M ka bu mmetụta ndị siri ike n’ime obi m site n’oge m bụ nwata ndị na-emekpa m ahụ mgbe m nwere ọdachi. Mgbe m kwụsịrị ije ozi dị ka onye okenye ọgbakọ, ọ dị m ka m bụ onye dara ada dị ka m ọ na-adịkarị—nye Chineke, ezinụlọ m, na ụmụnna m n’ọgbakọ. Mmetụta ndị a adịghị apụ n’otu ntabi anya, ma isiokwu a bịara n’oge ya nyeere m aka inwetaghachi ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nguzozi. O mewo ka olileanya m na-egbukepu egbukepu.”—D. L.

“Unu emeela maka isiokwu ahụ bụ́ ‘Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!’ M na-alụso oké ịkpọ onwe m asị na mmetụta abaghị uru dị omimi ọgụ, bụ́ ndị gbanyere mkpọrọgwụ ná mmetọ n’oge m bụ nwata. O kwesịrị ekwesị n’ezie ile echiche a hiere ụzọ anya dị ka ụzọ aghụghọ nke Setan n’onwe ya. Ọ pụrụ ọbụna ibibi ọchịchọ mmadụ ịdị ndụ. Aghaghị m ịrụ ọrụ kwa ụbọchị n’eziokwu iji guzogide ụgha ahụ bụ na a pụghị ịhụ m n’anya. Isiokwu a dị mkpa nye m karịa otú unu pụrụ ịmara.”—C. F.

“Taa ụmụnna na-azaghachi karịsịa n’echiche bụ na Jehova na-enwe mmasị n’ọrụ ndị ịhụnanya kwaliri kama ịbụ mkpali efu ma ọ bụ nrụgide. Ntụle nke àgwà ikpo ọkụ na ịhụnanya nke Jehova, mmasị o nwere n’ahụ ndị ya n’otu n’otu, na ụzọ ịhụnanya o si na-agbatịpụ onwe ya na-enye ume ọhụrụ ma na-akpali akpali. N’ihi nke a, ozugbo anyị natara isiokwu ahụ bụ́ ‘Ị Dị Oké Ọnụ Ahịa n’Anya Chineke!’ ọtụtụ ndị gosipụtara ekele ha. O yiri ka ọ na-emeghere ọtụtụ ndị ụzọ iwulite mmekọrịta onwe onye ka ukwuu nke ha na Jehova. Mụ na nwunye m chọrọ ikwupụta ekele anyị maka olu na mmetụta e gosipụtara na magazin Ụlọ Nche dị iche iche na nso nso a. Anyị na-arụ ọrụ itinye ọtụtụ n’ime isi ihe ndị a n’ọrụ ka anyị na-eleta ọgbakọ dị iche iche.”—Site n’aka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.

“Abụwo m onye na-agụchi ihe anya ruo 30 afọ, ma agụtụbeghị m ihe ọ bụla na-akpali akpali, nke na-ewuli elu otú a. Akụkụ akwụkwọ nsọ dị ike, ndị e ji eme ihe n’ụzọ nkà enyeworo m aka iwepụsị ụgha ndị zoro ná mmetụta ndị nke m, na-enye m ohere ịbịakwu Jehova nso. Ruo ọtụtụ afọ ejeere m Jehova ozi site n’obi amamikpe. Enwere m nanị nghọta ọgụgụ isi banyere ihe mgbapụta ahụ na ịhụnanya Chineke. Unu emeela maka ụdị isiokwu ndị ahụ gosiri nghọta na nchebara echiche. Ana m atụ anya ịgụkwu ọtụtụ ndị yiri ha.”—M. S.

“N’ime 29 afọ m nile nke ịnọ n’eziokwu, apụghị m icheta mgbe otu isiokwu kpasuworo n’ime m ụdị mmeghachi omume nke obi ekele na mmetụta uche dị omimi dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na e ji ịhụnanya dị ukwuu zụlite m, sitekwa n’aka ezinụlọ na-ahụ n’anya, enwetụbeghị m mmetụta nke iru eru ịdị ndụ, ya fọdụziekwa iru eru ijere Jehova ozi. Mgbe m gụsịrị isiokwu a, egburu m ikpere n’ala, n’anya mmiri dịkwa ukwuu ekelere m Jehova. M ga-eji isiokwu a kpọrọ ihe ruo mgbe ebighị ebi. M ga-ele onwe m anya n’ụzọ dị iche n’ihi na ugbu a enwere m nghọta na adị m oké ọnụ ahịa nye Jehova.”—D. B.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya